< Numbers 16 >

1 Korah, son of Izhar, son of Kohath, son of Levi tried to take over leadership, along with Dathan and Abiram, sons of Eliab, and On, son of Peleth, who were from the tribe of Reuben.
Ugbu a, Kora nwa Izha, nwa Kohat, nwa Livayị, na ụfọdụ ndị agbụrụ Ruben bụ Datan, na Abiram ụmụ Eliab, na On, nwa Pelet nupuru isi
2 They rebelled against Moses, and were joined by 250 well-respected Israelite leaders and members of the assembly.
bilie imegide Mosis. Ndị so ha bụ narị ndị ikom abụọ na iri ise, ndị ndu a maara nke ọma, ndị so nọdụ nʼụlọ nzukọ ukwuu ndị Izrel.
3 They joined together in opposition to Moses and Aaron, telling them, “You've taken too much power for yourselves! Every one of the Israelites is holy, and the Lord is among them. So why do you set yourselves above the Lord's assembly?”
Ha kpọrọ ọgbakọ imegide Mosis na Erọn sị ha, “Omume unu agafeela oke! Ọgbakọ Izrel dị nsọ, onye ọbụla nʼime ha kwa. Onyenwe anyị nọnyeere ha. Gịnị mere unu ji ebuli onwe unu elu karịa ọgbakọ Onyenwe anyị?”
4 When Moses heard what they were saying, he fell facedown on the ground.
Mgbe Mosis nụrụ ihe ndị a ha kwuru, ọ dara nʼala kpuo ihu ya nʼala.
5 Then he told Korah and all those with him, “In the morning the Lord is going to make it clear who is his and who is holy, and allow that person to approach him. He will only allow whoever he chooses to approach him.
Mgbe ahụ, ọ gwara Kora na ndị niile sonyeere ya, sị, “Nʼụtụtụ echi, Onyenwe anyị ga-eme ka amara ndị bụ ndị ya na onye dị nsọ. Ọ ga-eme ka onye ahụ bịaruo ya nso. Onye ọ ga-ahọpụta ka ọ ga-emekwa ka ọ bịaruo ya nso.
6 This is what you, Korah, and everyone with you are going to do. Take some incense burners,
Lee ihe ị ga-eme, Echi gị onwe gị Kora, na ndị niile nọnyeere gị, chịrịnụ ihe ịgụ ọkụ,
7 and tomorrow put incense in them and set it on fire in the presence of the Lord. Then the man the Lord chooses is the one who is holy. It is you Levites who are taking too much power for yourselves!”
mụnye ha ọkụ. Tinyekwanụ ụda na-esi isi ụtọ nʼime ha, were ha bịa nʼihu Onyenwe anyị. Onye ahụ Onyenwe anyị họpụtara ga-abụ onye ahụ dị nsọ. O zuorola unu, unu ụmụ Livayị!”
8 Moses also told Korah, “Listen, you Levites!
Mgbe ahụ, Mosis gwakwara Kora okwu ọzọ sị ya, “Ugbu a, geenụ ntị, unu ndị Livayị!
9 Do you think it's something insignificant that the God of Israel chose you from all the other Israelites and allowed you to approach him and carry out the work in the Lord's Tabernacle, to stand before the Israelites and serve them?
Ọ bụ ihe dị nta nʼanya unu na Chineke nke Izrel kewapụtara unu site na nzukọ ndị Izrel niile, mee ka unu bịaruo ya nso, nʼihi ije ozi nʼụlọ nzute Onyenwe anyị, nakwa iguzo nʼihu nzukọ Izrel niile ijere ha ozi?
10 He has allowed you the privilege of approaching him, Korah, you and all the other Levites, but now you want to have the priesthood as well!
Ọ kpọbatala gị na ndị Livayị ibe gị nso ebe ọ nọ. Ugbu a, unu na-achọkwa ọrụ nchụaja?
11 So in reality you and those who have joined you are fighting against the Lord—because who is Aaron that you should complain about him?”
Ọ bụ Onyenwe anyị ka gị na ndị sonyeere gị gbara izu megide. Onye ka Erọn bụ unu ji atamu ntamu megide ya?”
12 Moses summoned Dathan and Abiram, the sons of Eliab, but they replied, “We're not going to appear before you!
Mgbe ahụ, Mosis ziri ozi ka a kpọọ Datan na Abiram, ụmụ ndị ikom Eliab, ma ha sịrị, “Anyị agaghị abịa.
13 Haven't you done enough by taking us away from a land flowing with milk and honey in order to kill us out here in the desert? Do you have to make yourself a dictator as well, someone to rule us?
Ọ bụ na o zurughị gị na i si nʼala Ijipt ebe mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru kpọpụta anyị igbuchapụ anyị nʼọzara a? Ugbu a ị chọkwara ime onwe gị onyenwe anyị?
14 On top of that you haven't taken us to a land flowing with milk and honey or given us fields and vineyards to own. Do you really think you can fool everyone? No, we will not attend!”
Nke kachasị nke, ị kpọbatabeghị anyị nʼala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya. I nyebeghị anyị ihe nketa ala ubi na ubi vaịnị. Ị chọrọ ịghụpụsị ndị ikom ndị a mkpụrụ anya? Anyị agaghị abịa!”
15 Moses got really angry and said to the Lord, “Don't accept their offerings. I have never taken even a donkey from them or treated any of them badly.”
Mgbe ahụ, oke iwe were Mosis. Ọ kpọkuru Onyenwe anyị sị ya, “Anabatakwala aja ha niile! Ọ dịbeghị oge m naara ha ihe ọbụla, ọbụladị otu ịnyịnya ibu! O nwekwaghị onye ọbụla nʼime ha m mejọrọ.”
16 Moses told Korah, “You and all those who have joined you must appear before the Lord tomorrow—all of you and Aaron too.
Mgbe ahụ, Mosis sịrị Kora, “Echi, gị na ndị na-esonyere gị ga-apụta bịa nʼihu Onyenwe anyị. Erọn ga-abịakwa.
17 Each one will take his incense burner, put incense in it, and offer it before the Lord. All 250 of you will use your incense burners and Aaron will as well.”
Nwoke ọbụla ga-eweta ihe ịgụ ọkụ nke ya, tinye ya ụda na-esi isi ụtọ, chee ha nʼihu Onyenwe anyị. Ha niile dị ihe ịgụ ọkụ narị abụọ na iri ise. Gị na Erọn ga-ejikwa nke unu bịa.”
18 So each one took his incense burner, put incense in it, set it on fire, and stood together with Moses and Aaron at the entrance to the Tent of Meeting.
Ya mere, nwoke ọbụla wetara ihe ịgụ ọkụ nke ya, mụnye ya ọkụ, ma tinye ya ụda na-esi isi ụtọ. Ha niile guzoro nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute ahụ, ha na Mosis na Erọn.
19 When Korah had gathered all his rebellious group at the entrance to the Tent of Meeting, the Lord's glory appeared before the whole congregation.
Mgbe Kora kpọkọtara ndị na-eso ya imegide Mosis na Erọn nʼihu ọnụ ụzọ ụlọ nzute, ebube Onyenwe anyị pụtara ihe nye ọgbakọ Izrel niile.
20 The Lord told Moses and Aaron,
Onyenwe anyị gwara Mosis na Erọn okwu sị,
21 “Step away from these Israelites and I will destroy them right away.”
“Sitenụ nʼetiti ọgbakọ ndị a pụọ, ka m bibie ha nʼotu ntabi anya.”
22 But Moses and Aaron fell facedown on the ground said, “God—God of everything that lives—when it's just one man who sins, do you have to be angry with the everybody?”
Ma Mosis na Erọn dara kpuo ihu nʼala nʼihu Onyenwe anyị rịọọ ya sị, “O Chineke, gị bụ Chineke nwe ndụ mmadụ niile, ị ga-ewe iwe megide nzukọ niile nʼihi mmehie otu onye?”
23 Then the Lord told Moses,
Ma Onyenwe anyị zara Mosis sị ya,
24 “Tell the people to move away from the homes of Korah, Dathan, and Abiram.”
“Gwa nzukọ Izrel niile sị ha, ‘Wezuganụ onwe unu site nʼụlọ ikwu Kora, Datan na Abiram.’”
25 So Moses went over to Dathan and Abiram, and the Israelite elders of Israel followed him.
Mosis biliri jekwuru Datan na Abiram, ndị okenye Izrel sokwa Mosis.
26 He ordered the people, “Move away from the tents of these wicked men and don't touch anything that belongs to them, otherwise you will be destroyed along with them in all their sins.”
Mgbe Mosis ruru nʼebe ahụ, ọ dọrọ nzukọ Izrel aka na ntị sị, “Ngwa, sinụ nʼụlọ ndị ọjọọ a wezuga onwe unu. Unu ebitụkwala ihe ọbụla bụ nke ha aka. Ma ọ bụghị otu a, a ga-agụnyekọ unu na mmehie ha, lakọọ unu na ha nʼiyi.”
27 The people moved away from the homes of Korah, Dathan, and Abiram. Dathan and Abiram came out and stood at the entrances to their tents along with their wives, children and little ones.
Ya mere mmadụ niile wezugara onwe ha site nʼọmụma ụlọ ikwu Kora, na Datan na Abiram. Ma Datan na Abiram pụtara guzoro nʼọnụ ụzọ ụlọ ikwu ha, ha onwe ha na ndị nwunye ha niile, na ụmụ ha niile, na ụmụntakịrị ha niile.
28 Moses said, “This is how you will know that the Lord did send me to carry out everything I've done, for it wasn't anything I thought up.
Mgbe ahụ, Mosis kwuru sị, “Ugbu a ka unu ga-amata na ọ bụ Onyenwe anyị zitere m ime ihe ndị a niile m mere. Nʼihi na-emeghị m ha site nʼuche nke onwe m.
29 If these men die a natural death, experiencing the destiny of every human being, then the Lord didn't sent me.
Ọ bụrụ na ndị ikom ndị a anwụọ ọnwụ chi ha, bụ ụdị nleta nke dịrị mmadụ ọbụla, mgbe ahụ, matanụ na ọ bụghị Onyenwe anyị zitere m.
30 But if the Lord does something totally different, and the earth opens up and swallows them down along with everything that belongs to them so that they go down alive into Sheol, then you will know that these men have acted with contempt to the Lord.” (Sheol h7585)
Ma ọ bụrụ na Onyenwe anyị emee ihe ọhụrụ dị iche, mee ka ala meghee ọnụ ya, lodaa ndị a niile, na ihe niile bụ nke ha, si otu a mee ka ha rịda nʼala ili na ndụ, mgbe ahụ, unu ga-amata na ndị ikom ndị a eledala Onyenwe anyị anya.” (Sheol h7585)
31 Immediately Moses finished saying all this the ground under the rebels split apart,
Mgbe Mosis kpụ okwu a nʼọnụ ya, lee ala ahụ Kora, na Datan, na Abiram, na ndị ezinaụlọ ha niile guzo nʼelu ya kewara abụọ nʼotu ntabi anya ahụ,
32 and the earth opened up and swallowed them and their households down, as well as everyone who was there with Korah and everything that belonged to them.
ala ahụ meghere ọnụ ya, loo ha, na ezinaụlọ ha niile, na ndị ahụ niile so Kora, na ihe niile ha nwere.
33 They went down alive into Sheol with all that they had. The earth closed over them, and they were no more. (Sheol h7585)
Ha niile rịdaruru nʼala ndị nwụrụ anwụ na ndụ. Ala ahụ kpuchikwara ha niile, si otu a mee ka ha laa nʼiyi. (Sheol h7585)
34 When they heard their cries, all the Israelites nearby ran away, shouting, “Watch out! The earth could swallow us too!”
Ndị Izrel niile nọ ha gburugburu gbara ọsọ, mgbe ha tiri mkpu akwa, na-asị, “Ala na-agakwa iloda anyị.”
35 Fire burst out from the Lord and burned up the 250 men who were offering incense.
Mgbe ahụ, ọkụ si nʼebe Onyenwe anyị nọ dara, rechapụ narị mmadụ abụọ na iri ise ndị ahụ na-enye onyinye aja nsure ọkụ na-esi isi ụtọ.
36 Then the Lord said to Moses,
Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya,
37 “Tell Eleazar, son of Aaron the priest, to collect the holy incense burners from among those who have been burned up, and scatter the coals used for the incense well away from the camp.
“Gwa Elieza nwa Erọn, onye nchụaja, ka o site nʼọkụ ahụ wepụta ihe ịgụ ọkụ ndị ahụ niile nʼihi na ha dị nsọ. Ọ ga-ekposakwa icheku ọkụ niile nʼakụkụ niile.
38 Have the incense burners of those who sinned at the expense of their own lives hammered into metal sheets as a covering for the altar, because they were offered before the Lord, and so have become holy. They will be a reminder to Israelites of what happened.”
Ha bụ ihe ịgụ ọkụ nke ndị ikom sitere na mmehie ha tufuo ndụ ha. Ka etipịa ihe ịgụ ọkụ ndị ahụ. Mee ha ka ha ghọọ ihe sara mbara nke a ga-eji machite ebe ịchụ aja, nʼihi na e chere ha nʼihu Onyenwe anyị, ha aghọọla ihe dị nsọ. Ka ha bụrụ ihe ịrịbama nye ndị Izrel niile.”
39 So Eleazar the priest collected the bronze incense burners used by those who had been burned up, and had them hammered out as a covering for the altar,
Ya mere Elieza, onye nchụaja, chịkọtara ihe ịgụ ọkụ bronz ndị ahụ nke ndị ahụ a kpọrọ ọkụ wetara, tipịa ha, mee ka ha ghọọ ihe sara mbara e ji ekpuchi ebe ịchụ aja,
40 following the instructions given to him from the Lord through Moses. This was to remind the Israelites that no one who is not a descendant of Aaron should come and offer incense before the Lord, otherwise they could end up like Korah and those with him.
dịka Onyenwe anyị nyere ya nʼiwu site nʼọnụ Mosis. Ka ọ bụrụ ihe ncheta nye ndị Izrel niile na onye mba ọzọ a na-enyeghị ike, nke na-esiteghị nʼagbụrụ Erọn, ekwesighị ịbịaru Onyenwe anyị nso isure aja nsure ọkụ nye ya, ka ihe mere Kora na ndị sonyere ya ghara ime ha.
41 The next day all the Israelites complained to Moses and Aaron, saying, “You have killed the Lord's people!”
Ma nʼụtụtụ echi ya, nzukọ Izrel niile malitere itamu ntamu megide Mosis na Erọn sị, “Unu egbuchaala ndị nke Onyenwe anyị.”
42 But as the people gathered to confront them, Moses and Aaron went over to the Tent of Meeting, and suddenly the cloud covered it and the Lord's glory appeared.
Ma mgbe ọgbakọ Izrel zukọtara imegide Mosis na Erọn, mgbe ha chere ihu nʼụlọ nzute, na mberede, igwe ojii kpuchiri ụlọ nzute ahụ, ebube Onyenwe anyị pụtakwara ihe.
43 Moses and Aaron went and stood at the front of the Tent of Meeting,
Mgbe ahụ, Mosis na Erọn gara nʼihu ụlọ nzute ahụ.
44 and the Lord said to Moses,
Ma Onyenwe anyị gwara Mosis sị,
45 “Get away from these people and I will finish them off immediately.” Moses and Aaron fell facedown on the ground.
“Sinụ nʼetiti ọgbakọ a pụọ ka m bibie ha nʼotu ntabi anya.” Ha dara kpuo ihu nʼala.
46 Moses told Aaron, “Put some coals from the altar and some incense in your incense burner. Then run to the people and make them right before the Lord, for the Lord is angry with them and a plague has started.”
Mgbe ahụ, Mosis sịrị Erọn, “Ngwa, were ihe ịgụ ọkụ ma site nʼebe ịchụ aja gụnye ya ọkụ. Tinye ya ụda na-esi isi ụtọ. Burukwa ya gaa ngwangwa nʼetiti nzukọ Izrel ka i kpuchiere ha mmehie ha, nʼihi na iwe ọkụ Onyenwe anyị adakwasịla ha. Nrịa nrịa na-efe efe amalitekwalarị ibibi ha.”
47 Aaron took the incense burner just as Moses had told him and ran into the middle of the assembly. He saw that the plague had started to affect the people so he offered the incense and made the people right with the Lord.
Erọn mere dịka Mosis kwuru. O mere ngwangwa gbaba nʼetiti ndị Izrel nʼihi na nrịa nrịa ahụ ebidola nʼezie ịdakwasị ha. Erọn mụnyere ụda na-esi isi ụtọ ahụ ọkụ, si otu ahụ kpuchiere ha mmehie ha niile.
48 He stood between those who had died and those who were still alive, and the plague was stopped.
O guzokwara nʼetiti ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ tutu ihe otiti ahụ akwụsị.
49 However, 14,700 died from the plague in addition to those who'd died because of Korah.
Ma ihe otiti ahụ egbuolarị puku mmadụ iri, puku anọ na narị asaa. A gụnyeghị ndị niile ahụ so Kora nwụọ nʼụbọchị gara aga.
50 Then Aaron went back to Moses at the entrance to the Tent of Meeting because the plague had been stopped.
Mgbe ahụ, Erọn laghachikwutere Mosis nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute ahụ, nʼihi na nrịa nrịa ahụ na-efe efe akwụsịla.

< Numbers 16 >