< Numbers 10 >

1 The Lord told Moses,
Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị,
2 “Make two trumpets out of hammered silver. They are to be used for summoning the Israelites and to have the camp move out.
“Kpụọ opi ọlaọcha abụọ, jiri ha na-akpọ mkpọkọta nzukọ ụmụ Izrel na ime ka ha mara mgbe mbuli ije nke ọmụma ụlọ ikwu ruru.
3 When both trumpets are blown, all the Israelites are to gather before you at the entrance to the Tent of Meeting.
Mgbe a fụrụ opi abụọ ahụ, nzukọ Izrel niile ga-ezukọta nʼihu gị nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute.
4 But if only one is blown, then only the tribal leaders are to gather before you.
Ma ọ bụrụ naanị otu opi ka a fụrụ, ọ bụ ndị ndu, ndịisi ikwu Izrel niile ga-ezukọta bịakwute gị.
5 When you blow the trumpet loudly, which is the alarm signal to move out, the camps on the east side are to march out first.
Otu ụda opi ike ga-egosi na ebo Izrel niile mara ụlọ ikwu ha nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ ga-ebuli ije.
6 When you blow the trumpet loudly the second time, the camps on the south side are to march out. That's their signal to start moving.
Opi ike ahụ daa ụda nke ugboro abụọ, ọ na-egosi na ndị mara ụlọ ikwu ha na ndịda ga-ebuli ije. Ịda ụda nke opi ike bụ ihe e ji amata na oge ibuli ije eruola.
7 To summon the people, blow the trumpets normally, not the loud alarm signal.
Mgbe a ga-akpọkọta ndị Izrel niile a ga-egbu opi, kama ụda ya ga-adị iche.
8 Aaron's descendants are to blow the trumpets. This regulation is for all time and for all future generations.
“Ọ bụ naanị ụmụ ndị ikom Erọn, ndị nchụaja ga-egbu opi ndị a. Nke a bụ iwu ga-adịgide nye unu site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ niile.
9 When you're in your own land and have to go into battle against an enemy who has attacked you, blow the alarm signal and the Lord your God won't forget you—he will save you from your enemies.
Mgbe unu gara ibu agha nʼala unu imegide onye iro na-akpagbu unu, fụọnụ opi ike. Nke a ga-eme ka Onyenwe anyị Chineke unu cheta unu, ma napụta unu site nʼaka ndị iro unu.
10 Blow the trumpets when you celebrate too, at your regular feasts and at the beginning of each month. This is when you give your burnt offerings and fellowship offerings which act as a reminder for you before your God. I am the Lord your God.”
Unu ga-egbukwa opi ndị a nʼoge aṅụrị, nʼoge mmemme unu a kara aka, na nʼoge mmemme ọnwa ọhụrụ niile. Gbukwaanụ opi mgbe unu na-achụ aja nsure ọkụ unu, na aja udo unu niile. Ka ọ bụrụ ihe a ga-eji na-echeta unu nʼihu Chineke unu. Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke unu.”
11 The cloud rose up from the Tabernacle of the Testimony on the twentieth day of the second month of the second year.
Nʼụbọchị iri abụọ, nʼime ọnwa nke abụọ, nʼafọ nke abụọ, igwe ojii ahụ biliri site nʼelu ụlọ nzute nke igbe iwu ọgbụgba ndụ ahụ.
12 The Israelites left the Desert of Sinai and moved from place to place until the cloud stopped in the Desert of Paran.
Mgbe ahụ, ụmụ Izrel biliri ije site nʼọzara Saịnaị jegharịa site nʼotu ebe ruo nʼebe ọzọ tutu igwe ojii ahụ akwụsị nʼọzara Paran.
13 This was the first time they moved out following the Lord's command through Moses.
Nke a bụ njem mbụ ha mere dịka Onyenwe anyị si nye Mosis iwu banyere ije ha.
14 The tribal divisions of Judah went first, marching out under their flag, with Nahshon, son of Amminadab, in charge.
Usuu ọmụma ụlọ ikwu nke ebo Juda buru ụzọ bulie ije a, nʼokpuru ọkọlọtọ ha. Nashọn, nwa Aminadab, bụ onyendu ha.
15 Nethanel, son of Zuar, was in charge of the tribal division of Issachar,
Netanel nwa Zua bụ onyendu usuu ebo Isaka.
16 and Eliab, son of Helon, was in charge of the tribal division of Zebulun.
Eliab nwa Helọn bụ onyendu usuu ebo Zebụlọn
17 Then the Tabernacle was dismantled, and the Gershonites and the Merarites set off, carrying it.
Mgbe ahụ, e wedara ụlọ nzute ahụ. Ụmụ Geshọn na Merari buru ya, bilikwaa ije ha.
18 Then came the divisions of Reuben who marched out under their flag, with Elizur, son of Shedeur, in charge.
Usuu ọmụma ụlọ ikwu ebo Ruben biliri ije, nʼokpuru ọkọlọtọ ha. Elizọ nwa Shedeua bụ onyendu ha.
19 Shelumiel, son of Zurishaddai, was in charge of the tribal division of Simeon,
Shelumiel nwa Zurishadai bụ onyendu usuu ebo Simiọn.
20 and Eliasaph, son of Deuel, was in charge of the tribal division of Gad.
Eliasaf nwa Deuel bụ onyendu usuu ebo Gad.
21 Then the Kohathites set off, carrying the holy objects. The Tabernacle would be put up before they arrived.
Mgbe ahụ, ụmụ Kohat ndị bu ihe nsọ ndị ahụ niile, biliri ije ha. Tutu ha erute, e guzobere ụlọ nzute ahụ nʼebe o kwesiri ịdị.
22 Then came the divisions of Ephraim who marched out under their flag, with Elishama, son of Ammihud in charge.
Usuu ọmụma ụlọ ikwu ebo Ifrem biliri ije nʼokpuru ọkọlọtọ ha. Elishama nwa Amihud bụ onyendu ha.
23 Gamaliel, son of Pedahzur, was in charge of the tribal division of Manasseh,
Gamaliel nwa Pedazo bụ onyendu usuu ebo Manase.
24 and Abidan, son of Gideoni, was in charge of the tribal division of Benjamin.
Abidan nwa Gidiọni bụ onyendu usuu ebo Benjamin.
25 Lastly came the divisions of Dan who marched out under their flag, defending the rear of all the tribal groups, with Ahiezer, son of Ammishaddai, in charge.
Na ngwụsị usoro ahụ, usuu ọmụma ụlọ ikwu ebo Dan biliri ije nʼokpuru ọkọlọtọ ha. Onyendu ha bụ Ahieza nwa Amishadai.
26 Pagiel, son of Ocran, was in charge of the tribal division of Asher,
Pagịel nwa Okran bụ onyendu usuu ebo Asha.
27 and Ahira, son of Enan, was in charge of the tribal division of Naphtali.
Ahira nwa Enan bụ onyendu usuu ebo Naftalị.
28 This was the order in which the Israelite tribal divisions moved out.
Nke a bụ usoro usuu ụmụ Izrel si bilie ije ha.
29 Moses explained to Hobab, the son of Moses' father-in-law Reuel the Midianite, “We're leaving for the place of which the Lord promised, ‘I'm going to give it to you.’ Come with us, and we'll be good to you, because the Lord has promised good things to Israel.”
Mosis gwara Hobab nwa Reuel, nna nwunye ya onye Midia okwu sị, “Anyị ebiliela ije ịga ebe ahụ Onyenwe anyị gwara anyị sị, ‘Aga m enye unu.’ Bịa ka ị soro anyị. Anyị ga-emezi gị nke ọma nʼihi na Onyenwe anyị ekwela Izrel nkwa ọtụtụ ezi ihe.”
30 “No, I won't go—I'll return to my own country and my own people,” Hobab replied.
Ma ọ zara sị, “E e, agaghị m eso unu. Ana m alaghachi nʼala nke aka m ịlaghachikwuru ụmụnna m.”
31 “Please don't abandon us now,” Moses said, “because you're the one who knows where we should camp in the desert and you can guide us.
Ma Mosis zara sị ya, “Biko ahapụla anyị nʼihi na ị maara ebe anyị nwere ike kwụsị zuo ike nʼọzara. Ị ga-abụrụ anyị anya anyị ji ahụ ụzọ.
32 If you come with us, whatever good things the Lord blesses us with we'll share with you.”
Ọ bụrụ na i soro anyị, anyị ga-ekenye gị ihe ọma ọbụla Onyenwe anyị ga-enye anyị.”
33 They left the mountain of the Lord to go on a three-day journey The Ark of the Lord's Agreement led the way for them during these three days to find a place for them to camp.
Ya mere ha sitere nʼugwu Onyenwe anyị bilie ije. Jeekwa ije abalị atọ. Igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị na-aga ha nʼihu ụbọchị atọ ndị ahụ niile ịchọtara ha ebe ha ga-akwụsị zuo ike.
34 The cloud of the Lord was above them during day as they moved on from the camp.
Igwe ojii Onyenwe anyị dị nʼelu ha nʼehihie mgbe ha si nʼọmụma ụlọ ikwu ha bilie ije.
35 Whenever the Ark was carried out, Moses would call out, “Stand up, Lord, and may your enemies be scattered, and may those who hate you run away from you.”
Mgbe ọbụla igbe ọgbụgba ndụ ahụ biliri ije, Mosis na-ekwu sị, “Bilie O Onyenwe anyị, ka ndị iro ya bụrụ ndị a chụsasịrị; ka ndị iro gị niile site nʼihu gị gbalaga.”
36 Whenever it was set down, he would call out, “Return, Lord, to the thousands and thousands of the people of Israel.”
Ma mgbe ọbụla igbe ọgbụgba ndụ bịara ebe izuike, Mosis na-ekwukwa sị, “Lọghachi O Onyenwe anyị, bịakwute ọtụtụ mmadụ ndị a, bụ imerime puku ndị Izrel.”

< Numbers 10 >