< Malachi 2 >
1 Now this command is for you priests!
“Ma ugbu a, unu ndị nchụaja, ịdọ aka na ntị a dịrị unu.
2 If you will not listen and if you will not take it to heart to honor me, says the Lord Almighty, then I will place a curse on you and I will curse your blessings—in fact I have already cursed them because you haven't taken what I said to heart.
Ọ bụrụ na unu ajụ ige ntị, ọ bụrụkwa na unu ekpebighị nʼobi unu inye aha m otuto,” ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, na-ekwu, “Aga m ezite ọbụbụ ọnụ nʼahụ unu, aga m abụkwa ngọzị unu niile ọnụ. E, abụọlarị unu ọnụ, nʼihi na unu ekpebighị nʼobi unu ịsọpụrụ m.
3 Watch out! I am going to penalize your descendants. I will spread manure on your faces from the animals you sacrifice, the manure from your religious festivals, and you will be thrown out with it.
“Nʼihi unu, aga m abara ụmụ ụmụ unu mba. Agaghị m anabata onyinye unu, aga m efesakwa nsị anụ nʼihu unu, bụ nsị nke ihe onyinye unu, aga m ewezugakwa unu site nʼihu m.
4 Then you will know that I sent you this command so that my agreement with Levi can continue, says the Lord Almighty.
Otu a ka unu ga-esi mara na ọ bụ mụ zitere unu ịdọ aka na ntị a, ka ọgbụgba ndụ mụ na Livayị gbara dịgide,” Ọ bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, na-ekwu.
5 My agreement with him was one of life and peace, which I gave to him, and respect—he respected me. He stood in awe of me.
“Ọgbụgba ndụ mụ na ya bụ nke ndụ na udo, ọ bụ m nyere ha ya, nke a bụ nʼihi nsọpụrụ. O nyere m nsọpụrụ nʼezie, tụkwaa aha m egwu.
6 He taught the people the truth; nothing in his teaching was false. He walked with me in peace and did what was right, and he helped many to turn way from sin.
Iwu nke eziokwu dị ya nʼọnụ, ọ dịkwaghị okwu ụgha ọbụla a chọpụtara nʼegbugbere ọnụ ya. O soro m jee ije nʼudo, na nʼịkwụba aka ọtọ. O mekwara ka ọtụtụ si nʼajọ omume ha chigharịa.
7 A priest should explain the truth about God, they should go to him to be taught, for he is the Lord Almighty's messenger.
“Nʼihi na egbugbere ọnụ onye nchụaja kwesiri ijupụta nʼihe ọmụma; e kwesikwara isi nʼọnụ ya mụta ihe, nʼihi na ọ bụ onyeozi nke Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile.
8 But you have turned from my way. You have made many people to fall into sin. By your teaching you have broken the agreement with Levi, says the Lord Almighty.
Ma unu esitela nʼụzọ ahụ wezuga onwe unu, sitekwa nʼozizi unu mee ka ọtụtụ mmadụ sụọ ngọngọ. Unu emerụọla ọgbụgba ndụ nke Livayị.” Ọ bụ ihe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru.
9 So I have destroyed any respect you had, and humiliated you before all the people. For you have not kept my ways, and have shown favoritism in what you teach.
“Nʼihi nke a, emeela m ka unu bụrụ ndị a na-elelị anya, na ndị e wedara nʼala nʼihu ndị mmadụ niile, nʼihi na unu agbasoghị ụzọ m, kama unu na-ele mmadụ anya nʼihu, nʼihe metụtara iwu.”
10 Don't we all have one Father? Didn't one God create us? So why are we unfaithful to each other, violating the agreement made by our forefathers?
Ọ bụghị otu Nna ka anyị niile nwere? Ọ bụghị otu Chineke ahụ kere anyị? Gịnị mere anyị ji na-emerụ ọgbụgba ndụ nna anyị ha site na-enweghị ntụkwasị obi na mmekọrịta anyị na ibe anyị?
11 The people of Judah have been unfaithful and have committed a disgusting sin in Israel and Jerusalem. For the men of Judah have defiled the Lord's Temple (which he loves) by marrying women who worship idols.
Juda ekwesighị ntụkwasị obi. E meela ihe arụ nʼIzrel na nʼime Jerusalem: Juda emerụọla ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị hụrụ nʼanya, lụọkwa ada chi ndị mba ọzọ.
12 May the Lord expel the family of any man who does this from the nation of Israel! May there be no one left to bring an offering to the Lord Almighty!
Ka Onyenwe anyị kewapụ onye mere ihe dị otu a nʼụlọ ikwu Jekọb, ka ọ ghara inwe onye akaebe, ka ọ ghara inwe onye ga-aza ya mgbe ọ kpọrọ oku maọbụ butere Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile onyinye.
13 Something else you do is to pour out your tears on the Lord's altar weeping and moaning because he no longer pays attention to your offerings or doesn't want to accept them.
Ihe ọzọ unu na-emekwa bụ ndị a: unu na-eme ka anya mmiri unu jupụta nʼebe ịchụ aja Onyenwe anyị. Unu na-akwa akwa, na-eti mkpu akwa nʼihi na ọ naghị elenye anya nʼonyinye unu, maọbụ jiri obi ụtọ nabata ha.
14 “Why not?” you ask. Because the Lord witnessed the vows you and your wife exchanged when you were young. You were unfaithful to her, your wife and partner joined to you by marriage contract.
Unu na-asị “Nke a ọ bụ nʼihi gịnị?” Ọ bụ nʼihi na Onyenwe anyị bụ onyeama nʼetiti gị na nwunye ị lụrụ nʼokorobịa gị, nʼihi na ị kwesighị ntụkwasị obi, ọ bụ ezie na ọ bụ nwanyị e jikọtara gị na ya, bụrụkwa nwunye ọgbụgba ndụ gị.
15 Did he not make you one, and give some of his Spirit to you? And what does he want? Children of God. So watch what you do, and don't be unfaithful to the wife you married when you were young.
Ọ bụ na ọ bụghị otu Chineke ahụ kere gị? Nʼanụ ahụ na nʼime mmụọ, unu bụ nke ya. Ma gịnị ka otu Chineke a chọrọ? Ka unu bụrụ ụmụ na-atụ ya egwu. Ya mere, jie mmụọ gị aka, ka ị gharakwa ịbụ onye na-ekwesighị ntụkwasị obi nʼebe nwunye ị lụtara nʼokorobịa nọ.
16 For I hate divorce, says the Lord God of Israel, for it's a violent attack on the wife, says the Lord Almighty. So watch what you do, and don't be unfaithful.
“Akpọrọ m ịgba alụkwaghị m asị,” ka Onyenwe anyị Chineke nke Izrel sịrị, “a kpọkwara nwoke na-emeso nwunye ya mmeso nʼụzọ ihe ike asị.” Ọ bụ Onyenwe Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwu. Ya mere, kpachapụrụnụ onwe unu anya, unu abụkwala ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi.
17 You have worn the Lord out with your words. “How have we worn him out?” you ask. By saying everyone who does evil is good in the sight of the Lord and he is happy with them, or by asking, where is the Lord's justice?
Unu esitela nʼoke okwu unu mee ka ike gwụ Onyenwe anyị. Ma unu na-ajụ, “Olee ụzọ anyị si mee ka ike gwụ ya?” Mgbe unu na-asị, “Ndị niile na-eme ihe ọjọọ dị mma nʼanya Onyenwe anyị. Ihe ha na-atọkwa ya ụtọ,” maọbụ na-asịkwa, “Ebee ka Chineke ahụ na-ekpe ikpe ziri ezi nọ?”