< Leviticus 11 >

1 The Lord told Moses and Aaron,
Onyenwe anyị gwara Mosis na Erọn, sị,
2 “Give these instructions to the Israelites. These are the animals you are allowed to eat:
“Gwanụ ụmụ Izrel, sị, ‘Nʼime anụmanụ niile dị nʼụwa, ndị a bụ anụmanụ unu ga-eri.
3 any animal that both has a divided hoof and also chews the cud.
Unu nwere ike iri anụmanụ ọbụla ụkwụ ya wara njakpa. nke na-atagharị ọnụ.
4 However, if it either chews the cud, or has a divided hoof, then you may not eat it. These include: the camel, which though it chews the cud doesn't have a divided hoof, so it is unclean for you.
“‘Ma ọ dị ụfọdụ ndị na-atagharị nri maọbụ ndị nwere naanị ụkwụ wara njakpa, unu agaghị eri anụ ha. Ha bụ ịnyịnya kamel, ọ bụ ezie na ọ na-atagharị nri, ma ụkwụ ya awaghị njakpa. Unu agaghị eri ha nʼihi na ọ bụ anụ na-adịghị ọcha.
5 The rock hyrax, which though it chews the cud doesn't have a divided hoof, so it is unclean for you.
Ewi: Ọ na-atagharị nri ya, ma o nweghị ụkwụ wara njakpa. Ọ bụ anụ na-adịghị ọcha nye unu.
6 The hare, which though it chews the cud doesn't have a divided hoof, so it is unclean for you.
Ewi nkume: Ọ na-atagharị nri ya, ma o nweghị ụkwụ wara njakpa. Ọ bụ anụ na-adịghị ọcha nye unu.
7 The pig, which though it has a divided hoof doesn't chew the cud, so it is unclean for you.
Ezi: Ọ bụ nʼezie na ụkwụ ya wara njakpa ma ọ dịghị atagharị nri ya. Ọ bụ anụ na-adịghị ọcha nye unu.
8 You are not to eat their meat or touch their bead bodies. They are unclean for you.
Unu emetụkwala ozu ha aka maọbụ rie anụ ha, nʼihi na ha bụ ihe na-adịghị ọcha nye unu.
9 You are allowed to eat any creature with fins and scales that lives in the water, whether in the sea or in fresh water.
“‘Nʼime ihe niile e kere eke dị ndụ biri na mmiri, maọbụ nʼiyi nta na nʼoke osimiri, unu nwere ike iri ụdị ọbụla nwere ntu na akpịrịkpa nʼahụ ha.
10 But you are not allowed to eat any of the many creatures that don't have fins and scales that live in the water, whether in the sea or in fresh water.
Ma unu ekwesighị iri ihe ọbụla nke na-enweghị ntu maọbụ akpịrịkpa, ma ha bụ anụ na-enupụta enupụta, maọbụ na ha so nʼanụ ndị ọzọ dị ndụ bi na mmiri, unu kwesiri ịsọ ha asọ.
11 They are repulsive. You must not eat their meat, and you must treat their dead bodies as repulsive.
Ebe ha bụ ihe na-asọ oyi nye unu, unu ekwesighị iri ha, unu ga-agụkwa ozu ha ka ihe na-adịghị ọcha.
12 All such water creatures that don't have fins and scales are to be repulsive to you.
Ihe ọbụla bi nʼime mmiri nke na-enweghị ntu na akpịrịkpa nʼahụ ha, bụ nke unu ga-asọ asọ.
13 As for the birds, these must not be eaten because they are repulsive: eagle, griffon vulture, bearded vulture,
“‘Ndị a bụ nnụnụ ndị unu ga-asọ asọ, nke unu na-ekwesighị iri nʼihi na ha bụ ihe arụ a na-asọ oyi: ugo, udele na udele ojii,
14 buzzard, kite and similar birds of prey,
ndagbụ na ọgankwọ dị iche iche,
15 any raven or crow,
ugolọma ọbụla dị iche iche,
16 tawny owl, long-eared owl, gulls, any kind of hawk,
enyi nnụnụ, egbe abalị, nnụnụ oke osimiri na egbe dị iche iche,
17 little owl, fish owl, eagle owl,
okwukwu nta, komorant na okwukwu ukwu,
18 barn owl, desert owl, Egyptian vulture,
okwukwu nwere mpi, okwolo na udele,
19 storks and any kind of heron, hoopoe, and bats.
ụgbala, utù dị iche iche, nnụnụ ọdụ nta na ụsụ.
20 All flying insects that crawl are repulsive to you.
“‘Ụmụ ahụhụ niile na-efe efe nke na-aga ije nʼụkwụ anọ bụ ihe rụrụ arụ nye unu, unu agaghị eri ya.
21 But you can eat the following kinds of flying insects that crawl: those that have jointed legs they use to jump.
Ma e nwere ụfọdụ ụmụ ahụhụ na-efe efe nke na-aga ije nʼụkwụ anọ ndị unu nwere ike iri: ndị a bụ ndị nwere ogwe ụkwụ nke ha ji na-awụ awụ nʼala,
22 So in this category you can eat any kind of locust, bald locust, cricket, or grasshopper.
ndị a ka unu ga-eri nʼetiti ha, igurube dị iche iche, na akpankwụ dị iche iche, na abụzụ dị iche iche, na ụkpana dị iche iche.
23 All other flying insects that crawl are repulsive to you,
Ahụhụ ndị ọzọ niile na-efe efe, ndị nwere ụkwụ anọ, bụ ihe rụrụ arụ. Unu ekwesighị iri ha.
24 and will make you unclean. If you touch their dead bodies you will be unclean until the evening,
“‘Iri ha ga-eme ka unu rụọ arụọ. Onye ọbụla metụrụ ozu ha aka ga-abụ onye rụrụ arụ site nʼoge o bitụrụ ha aka tutu ruo nʼabalị nke ụbọchị ahụ.
25 and if you pick up one of their dead bodies you must wash your clothes, and you will be unclean until the evening.
Onye ọbụla metụrụ otu nʼime ozu ha aka ga-asakwa uwe ya, gụọkwa onwe ya dịka onye na-adịghị ọcha ruo uhuruchi.
26 Every animal with hooves that are not divided, or that does not chew the cud, is unclean for you. If you touch any of them you will be unclean.
“‘Anụmanụ ọbụla ụkwụ ya na-awasaghị abụọ, maọbụ nke na-adịghị atagharị nri ya ugboro abụọ, rụrụ arụ. Onye ọbụla metụrụ ozu ya aka ga-abụ onye rụrụ arụ.
27 Any four-legged animal that walks on its paws are unclean for you. If you touch their dead bodies you will be unclean until the evening,
Nʼime anụmanụ niile na-aga ije nʼụkwụ anọ, anụmanụ ọbụla na-aga ije nʼọbụaka ya rụrụ arụ, unu agaghị eri ya. Onye ọbụla metụrụ ozu ya aka ga-abụ onye rụrụ arụ ruo uhuruchi.
28 and if you pick up one of their dead bodies you must wash your clothes, and you will be unclean until the evening. They are unclean for you.
Onye ọbụla ga-ebu ozu ya ga-asa uwe ya, bụrụkwa onye rụrụ arụ ruo uhuruchi, nʼihi na ọ bụ ihe rụrụ arụ nʼebe unu nọ.
29 The following animals that run along the ground are unclean for you: rats, mice, any kind of large lizard,
“‘Nʼime anụmanụ niile na-enupụta enupụta nʼala, anụmanụ ndị a bụ ndị rụrụ arụ: nkapi, na oke, na agụ iyi dịka ụdị ha si dị,
30 gecko, monitor lizard, wall lizard, skinks, and chameleon.
na ọba mmiri, na ngwere aghụ, na ngwere, na ngwere uzuzu, na ogumagala.
31 These animals that run along the ground are unclean for you. If you touch a dead one of them you will be unclean until the evening.
Nʼime ihe niile na-enupụta enupụta nʼala ndị a rụrụ arụ nʼebe unu nọ. Onye metụrụ ozu ha aka ga-abụ onye rụrụ arụ tutu ruo uhuruchi ụbọchị ahụ.
32 Anything that one of them dies and lands on becomes unclean. Whatever it is—something made of wood, clothing, leather, sackcloth, or any work tool—it must be washed with water and will be unclean until the evening. Then it will become clean.
Ihe ọbụla nke ozu ha dakwasịrị ga-abụ ihe rụrụ arụ, maọbụ osisi, maọbụ akwa, maọbụ akpụkpọ a na-akwa nʼala, maọbụ akpa, ihe ọbụla nke eji ya eme. A ga-etinye ya na mmiri, ọ ga-adịgide nʼime mmiri tutu ruo uhuruchi, mgbe ahụ ka ọ ga-adị ọcha.
33 If one of them falls into a clay pot, all that's in it becomes unclean. You must smash the pot.
Ọ bụrụ na otu nʼime ihe ndị a adanye nʼite aja, a ga-etiwa ite ahụ. Ihe niile dị nʼite ahụ abụrụla ihe rụrụ arụ.
34 If water from that pot touches any food, that food becomes unclean, and any drink from a pot like that also becomes unclean.
Ihe oriri ọbụla nke mmiri si nʼite a metụrụ abụrụla ihe rụrụ arụ. Mmiri ọṅụṅụ ọbụla dị nʼime ite ahụ rụkwara arụ.
35 Anything that one of their dead bodies falls on becomes unclean. If it's an oven or a stove, it must be smashed. It is permanently unclean for you.
Ihe ọbụla ozu anụmanụ dị otu a dakwasịrị, maọbụ ite ọkụ eji eghe ihe, maọbụ ekwu a ga-etiwa ha. Nʼihi na ha bụ ihe rụrụ arụ, unu ga-agụ ha dịka ihe rụrụ arụ.
36 On the other hand, if it's a spring or cistern containing water then it will remain clean, but if you touch one of these dead bodies in it you will be unclean.
Ọ bụrụkwa na ozu anụmanụ ahụ adaba nʼisi iyi, maọbụ nʼolulu mmiri, mmiri ahụ ga-adị ọcha, kama onye ga-emetụ anụ ahụ aka ga-abụ onye rụrụ arụ.
37 Similarly, if one of their dead bodies falls on any seed used for sowing, the seed remains clean;
Ọ bụrụ na ozu anụ ahụ adakwasị mkpụrụ ubi a na-aga ịkụ nʼubi, ọ gaghị emerụ ha.
38 but if the seed has been soaked in water and one of their dead bodies falls on it, it is unclean for you.
Ma ọ bụrụ na e tinyere mmiri nʼelu mkpụrụ ọghịgha ndị ahụ, ozu adakwasị nʼelu ya, ha ga-abụ ihe rụrụ arụ.
39 If an animal that you are allowed to eat dies, anyone who touches the dead body will be unclean until the evening.
“‘Ọ bụrụ na anụmanụ unu kwesiri iri eri anwụọ, onye ahụ metụrụ ya aka ga-abụ onye rụrụ arụ ruo uhuruchi.
40 If you eat anything from the dead body you must wash your clothes and you will be unclean until the evening. If you pick up the dead body you must wash your clothes and you will be unclean until the evening.
Onye ọbụla riri ozu anụ ahụ, maọbụ bufuo ozu ya, ga-abụ onye rụrụ arụ ruo uhuruchi. Ọ ga-asa uwe ya mmiri.
41 Every animal that crawls along the ground is repulsive—you must not eat it.
“‘Anụmanụ ọbụla na-akpụgharị nʼala bụ ihe rụrụ arụ nye unu. Unu erikwala ha.
42 Don't eat any animal that crawls along the ground, whether it moves on its belly or walks on four feet or many feet. All such animals are repulsive.
Unu agaghị eri anụmanụ ọbụla na-akpụgharị nʼala, ma ha na-akpụgharị nʼafọ ha, ma ha na-agagharị nʼụkwụ anọ, ma ha nwere ụkwụ dị ọtụtụ. Ha bụ ihe rụrụ arụ.
43 Don't defile yourselves by any such crawling animal. Don't make yourselves unclean or defiled by them,
Unu emerụla onwe unu site nʼiri anụmanụ ndị a na-akpụgharị nʼala. Unu abụla ndị na-emerụ onwe unu site nʼanụmanụ ndị a, maọbụ mee ka unu bụrụ ndị e merụrụ site na ha.
44 because I am the Lord your God; so dedicate yourselves and be holy, because I am holy. Don't defile yourselves by any animal that crawls along the ground.
Abụ m Onyenwe anyị Chineke unu. Doonụ onwe unu nsọ, nʼihi na adị m nsọ. Unu emerụla onwe unu site nʼimetụ anụmanụ ndị a na-akpụgharị nʼala aka.
45 I am the Lord who led you out of Egypt so that I could be your God. So be holy, because I am holy.
Abụ m Onyenwe anyị, onye si nʼala Ijipt kpọpụta unu, ka m bụrụ Chineke unu. Unu aghaghị ịdị nsọ, nʼihi na adị m nsọ.
46 These are the regulations about animals, birds, everything that lives in the water, and all animals that crawl along the ground.
“‘Ndị a bụ usoro iwu metụtara ụmụ anụmanụ, na anụ ufe, na anụ bi na mmiri, na anụ ndị na-arịgharị arịgharị nʼala.
47 You must recognize the difference between unclean and clean, between those animals that can be eaten and those that can't.”
Ka unu si otu a kpaa oke nʼetiti ndị rụrụ arụ na ndị dị ọcha, nʼetiti ihe e kere eke dị ndụ ndị unu nwere ike iri nʼihi na ha dị ọcha, na ndị unu na-ekwesighị iri nʼihi na ha rụrụ arụ.’”

< Leviticus 11 >