< Job 2 >
1 One day the heavenly beings came to present themselves to the Lord, and Satan came with them to present himself to the Lord.
Ụbọchị ọzọkwa, ụmụ Chineke bịakwara igosi onwe ha nʼihu Onyenwe anyị. Ekwensu sonyekwaara ha ọzọ bịakwa igosi onwe ya nʼihu ya.
2 The Lord asked Satan, “What have you been doing?” “Traveling around on earth, going here and there,” Satan replied.
Mgbe ahụ, Onyenwe anyị jụkwara ekwensu ajụjụ sị, “Ebee ka i si abịa?” Ekwensu zara onyenwe anyị, “Site nʼịwagharị nʼụwa na site nʼịgagharị ihu na azụ nʼime ya.”
3 “Have you noticed my servant Job?” asked the Lord. “There's no one like him on earth, a man of integrity who does what is right, who respects God and avoids evil. And he has kept his integrity, even though you wanted me to harm him for no reason.”
Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sịrị ekwensu, “I leziela ohu m nwoke Job anya? Ọ dịghị onye ọzọ dị nʼụwa nke dịka ya. Ọ bụ nwoke zuruoke, onye na-emekwa ihe ziri ezi. Ọ bụ onye na-atụ egwu Chineke, na-adịghị etinye aka ya nʼihe ọjọọ ọbụla. Ọ ka jidekwara izuoke ya, nʼagbanyeghị na ị kpaliri m imegide ya ka m laa ya nʼiyi mgbe ọ na-adịghị ihe o mere.”
4 “Skin for skin!” Satan replied. “A man will give up everything to save his life.
Ekwensu zaghachiri Onyenwe anyị, “Akpụkpọ anụ ahụ lara akpụkpọ anụ ahụ; mmadụ ga-enye ihe niile o nwere nʼọnọdụ ndụ ya.
5 But reach out and hurt his bones and his flesh, and he will definitely curse you to your face.”
Setịpụ aka gị metụ akpụkpọ anụ ahụ ya na ọkpụkpụ ya, ọ ghakwaghị ị bụ gị ọnụ nʼihu gị.”
6 So the Lord said to Satan, “Very well, you have the power to do whatever you want to him, but don't kill him.”
Onyenwe anyị sịrị ekwensu, “Lee, ọ nọ nʼaka gị. Kama ị ghaghị idebe ndụ ya.”
7 Then Satan left the Lord's presence and inflicted Job with horrible skin sores from the bottom of his feet to the top of his head.
Mgbe ahụ, ekwensu sitere nʼihu Onyenwe anyị pụọ. O were ọnya ọjọọ na-egbu mgbu tie Job, site nʼọbọ ụkwụ ya ruo nʼopi isi ya.
8 Job picked up a piece of broken pottery to scratch himself as he sat in ashes.
Job tụtụụrụ mpekele ite wara awa, jiri ya na-akọ onwe ya ọkọ nʼahụ, ma dinara nʼebe e kpokọtara ntụ.
9 His wife said to him, “Are you still holding on to your integrity? Curse God and die!”
Nwunye ya sịrị ya, “Ị ka na-eguzo nʼizuoke gị? Bụọ Chineke ọnụ, nwụọ.”
10 But he told her, “You're talking just like any foolish woman would! Should we receive only good from God, and not evil?” Despite all this, Job said nothing sinful.
Ma ọ zara, “Ị na-ekwu okwu dịka otu nʼime ndị inyom nzuzu. Anyị ga-anata ihe ọma site nʼaka Chineke, hapụ ịnata ihe ọjọọ?” Ma nʼime nsogbu a niile, Job emehieghị site nʼikwu okwu ọjọọ ọbụla.
11 When three of Job's friends heard of all the trouble that had happened to him, they each left their homes: Eliphaz the Temanite, Bildad the Shuhite, and Zophar the Naamathite. They met together and went to comfort and console him.
Mgbe ndị enyi Job atọ, Elifaz onye Teman, Bildad onye Shua na Zofa onye Neama, nụrụ banyere nsogbu niile dakwasịrị ya, ha biliri ije site nʼụlọ ha, ha zukọtara site na nkwekọrịta ịga nọnyere ya na ịkasị ya obi.
12 When they saw Job from a distance they hardly recognized him. They broke out into loud wailing, tore their robes, and threw dust into the air over their heads.
Mgbe ha hụrụ ya site nʼebe dị anya, ha amataghị ya, ha weliri olu bido iti mkpu akwa, dọkaa uwe ha yi nʼahụ ha, kporo aja kpokwasị onwe ha nʼisi.
13 They sat down on the ground with him for seven days and seven nights. None of them said anything to him because they saw how badly he was suffering.
Ha sooro Job nọdụ nʼala ụbọchị asaa, ehihie na abalị. Ọ dịghị onye gwara ya okwu nʼihi na ha hụrụ otu ihe mgbu ya si dị ukwuu.