< Job 13 >

1 Look, I've seen all this with my own eyes, and heard it with my own ears, and I understand it.
“Anya m abụọ ahụla ihe ndị a niile, ntị m anụla ma ghọtakwa ha.
2 I know what you know. You're no better than me.
Mụ onwe m makwa ihe unu maara; abụghị m onye dị ala nʼebe unu nọ.
3 But I would still like to speak to the Almighty: I want to prove myself to God!
Ma ọ bụ Onye pụrụ ime ihe niile ka m chọrọ ịgwa okwu, ka mụ na Chineke rụọkwa ụka banyere okwu m.
4 As for you, you cover things up by telling lies! You are all like doctors who can't heal anyone!
Ma otu ọ dị, unu ji okwu ụgha etechi m dịka ọ bụ mgba ụlọ; unu niile bụ ndị dibịa na-abaghị uru.
5 I wish you would all be quiet! That would be the wisest thing for you to do.
Ọ bụrụ nnọọ na unu ga-agba nkịtị, nke a gaara egosi na unu bụ ndị nwere amamihe.
6 Listen to my argument and pay attention to what I have to say.
Ugbu a, nụrụnụ ịrụ ụka m; geekwanụ ntị nụrụ okwu si m nʼọnụ na-apụta.
7 Do you think you can tell lies to defend God? Are you talking deceitfully on his behalf?
Unu ga-ekpelara Chineke ikpe mmegide? Unu ga-esite nʼokwu aghụghọ kwuchitere Chineke ọnụ ya?
8 Or are you wanting to show God favoritism? Are you going to argue God's case for him?
Unu ga-egosi ya na unu na-ekpelara ya ikpe? Unu ga-ekwuchite ọnụ Chineke?
9 Will you be found to be doing good when God examines you? Can you fool him as if he's a human being?
Ọ ga-adịrị unu mma ma ọ bụrụ na o nyochaa unu? Unu pụrụ ịghọgbu ya dịka unu si aghọgbu ndị mmadụ?
10 No, he will definitely rebuke you if you secretly show him favoritism!
Ọ ghaghị ịbara unu mba ma ọ bụrụ na unu ejiri okwu ụgha chọọ inyere ya aka.
11 Isn't his majesty terrifying to you? Aren't you so afraid of him you're paralyzed?
Ọ ga-abụ na ebube na ịdị ukwuu ya adịghị eme ka unu maa jijiji? Egwu ya ọ dịghị atụ unu?
12 Your sayings are as helpful as ashes; your arguments as weak as clay.
Okwu amamihe unu niile dịka ilu nke ntụ; okwu ngọpụ unu dịka ihe ngọpụ ụrọ.
13 Be quiet. Don't talk to me. Let me speak, come what may.
“Nọọnụ jụụ ka m kwuo okwu; ihe ọ pụtara ya pụta.
14 I take responsibility for myself; I am ready to risk my life.
Nʼihi gịnị ka m ga-eji tinye onwe m na nsogbu, werekwa ndụ m tinye nʼọbụaka m?
15 Even though he kills me, I will hope in him. I am still going to defend my ways before him.
A sịkwarị na ọ ga-etigbu m aghaghị m ịtụkwasị ya obi m. Aga m ekwuchite ọnụ m gwa ya na ụzọ m dị ọcha.
16 By doing this I will be saved since no godless person could come before him.
Nʼezie, nke a ga-aghọrọ m nzọpụta maka na ọ dịghị onye ajọ omume ọbụla pụrụ ịbịa nʼihu ya.
17 Listen carefully to what I say, pay attention to my explanation.
Geenụ ntị nke ọma nʼokwu m. Kwerenụ ka ihe m na-ekwu baa unu ntị.
18 Look, I've prepared my case—I know I will be proved right.
Ugbu a, edoziela m ikpe m nʼusoro, amatala m na ikpe agaghị ama m.
19 Who wants to argue with me? If I'm proved wrong, I'm prepared to be quiet and die.
Ọ dị onye pụrụ ibo m ebubo? Ọ bụrụ na o nwere, aga m emechi ọnụ m ma nwụọ.
20 God, I have two requests, then I can face you.
“Meere m naanị ihe abụọ ndị a, O Chineke, mgbe ahụ agaghị m ezo onwe m nʼihu gị.
21 Stop beating me, and stop terrifying me.
Wepụ aka gị i ji emegide m, meekwa ka ha dị anya nʼebe m nọ. Kwụsị ime ka oke egwu gị mee ka m maa jijiji.
22 Then call, and I will answer. Or let me speak, and then answer me.
Mgbe ahụ, kpọọ m oku, aga m azakwa gị. Maọbụ, kwerekwa ka m kwuo okwu, ka ị zaa m.
23 What are my sins and iniquities? Show me what have I done wrong; how have I rebelled against you?
Ole ka ha dị bụ mmejọ na mmehie m mere? Gosi m ajọ omume m na mmehie m.
24 Why are you unfriendly towards me? Why do you treat me as your enemy?
Gịnị mere i ji gbakụta m azụ? Gịnị mere i ji gụọ m dịka onye iro gị?
25 Would you frighten a leaf blown by the wind or hunt down a piece of straw?
Ị ga-enye ahịhịa ikuku na-ebugharị ntaramahụhụ? Ị ga-achụ ahịhịa kpọrọ nkụ ọsọ?
26 For you write down bitter things against me and pay me back for the sins of my youth.
Nʼihi na ị na-edetu ihe ndị dị ilu megide m, na-emekwa ka m ghọrọ mkpụrụ mmehie m mere nʼoge okorobịa m.
27 You put my feet in the stocks. You keep an eye on every step I take. You even inspect my footprints!
Ị na-eji mkpọrọ igwe kegide ụkwụ m abụọ; na-enyochakwa nzọ ụkwụ m niile site nʼitinye akara nʼebe ọbụla ọbụ ụkwụ m zọrọ.
28 I'm falling apart like something rotten, like moth-eaten clothes.
“Ya mere, mmadụ nʼala nʼiyi dịka ihe rere ere, na dịka akwa nke nla riri.

< Job 13 >