< Isaiah 8 >

1 Then the Lord told me, “Get a large tablet and write on it in with an ordinary pen, ‘Maher-shalal-hash-baz.’
Onyenwe anyị siri m, “Were otu mbadamba ihe dị ukwuu, were odee nke onye ọbụla na-eji ede ihe dekwasị ya Maha-shalal-Hash-Baz.
2 I will need Uriah the priest and Zechariah, son of Jeberekiah, to be my trustworthy witnesses.”
Aga m akpọbata Ụraya onye nchụaja na Zekaraya nwa Jeberekaya dịka ndị akaebe kwesiri ntụkwasị obi.”
3 Then I slept with my wife the prophetess, and she became pregnant and gave birth to a son. The Lord told me, “Call him Maher-shalal-hash-baz.
Emesịa, mụ na nwunye m, bụ onye amụma dinakọrọ, ọ tụụrụ ime, mụọrọ m nwa nwoke. Ma Onyenwe anyị sịrị m, “Gụọ ya Maha-shalal-Hash-Baz.
4 For even before the boy knows how to say ‘Daddy’ or ‘Mommy,’ the king of Assyria will carry off Damascus' wealth and Samaria's possessions.”
Nʼihi na tupu nwantakịrị ahụ etolite ịkpọ nne maọbụ nna, eze ndị Asịrịa ga-ebuso Damaskọs na Sameria agha, bukọrọkwa akụ ha niile.”
5 Then the Lord spoke to me again, saying,
Onyenwe anyị gwakwara m okwu ọzọ sị,
6 “Because this people has rejected the waters of Shiloah that gently flow and instead have rejoiced with Rezin and Remaliah's son,
“Nʼihi na ndị a ajụla mmiri Shiloa nke ji nwayọọ na-asọ ma na-aṅụrị ọṅụ nʼihi Rezin na nwa nwoke Remalaya,
7 the Lord is going to bring the powerful floodwaters of the Euphrates River against them—the king of Assyria with all his glorious army. It will flood all its channels and overflow all its banks.
ya mere, Onyenwe anyị na-aga iweta iju mmiri nke osimiri Yufretis megide ha, bụ eze ndị Asịrịa ya na ebube ya niile. Ọ ga-erubiga oke, gafee ụzọ ya niile, ọ ga-erubiga ma tofeekwa ọnụ ya niile,
8 It will sweep on into Judah, overflowing and flooding through, reaching up to the neck. Like outspread wings it will engulf the whole of your land, Immanuel!
wụsịakwa nʼala Juda niile. Ọ ga-erikpu ala Juda niile, ọ ga-agabiga, kpuchiekwa ọ bụladị nʼolu ka ọ ga-eru. Nku ya ga-agbasa kpuchie obosara niile nke ala gị, O Ịmanụel.”
9 Pay attention, you nations, and be smashed! Listen, all you distant lands, get ready, but you will be smashed. Get ready, but you will be smashed.
Tienụ mkpu agha unu mba dị iche iche, ma a ga-etipịa unu. Geenụ ntị unu mba niile dị ebe dị anya. Kwadoonụ maka agha ma a ga-etipịa unu. Kwadoonụ maka agha ka e tipịa unu.
10 You can plan your strategy, but it will be foiled; you can say what you're intending, but it won't happen, for God is with us.”
Tụọnụ atụmatụ unu ma a ga-ekposa ya. Wepụtanụ atụmatụ unu ma ọ gaghị eguzo nʼihi na Chineke nọnyere anyị.
11 For this is what the Lord told me, holding me with a strong hand, instructing me not to follow the way of this people. He said,
Otu a ka Onyenwe anyị sịrị m nʼike nke aka ya dị nʼahụ, ọ dọrọ m aka na ntị ka m ghara ije ije nʼụzọ ndị nke a, na-asị:
12 Don't call a conspiracy everything that these people call a conspiracy. Don't fear what they fear. Don't be overawed!
“Adịnyerela ha nʼihe niile ha na-ezube ime na nzuzo megide ọchịchị; ka ihe ha na-atụ egwu hapụ ịbụ ihe ga-eme ka ị tụọ egwu.
13 The Lord Almighty is the one you should see as holy. He is the one you should fear, he is the one you should be in awe of.
Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, ya ka unu ga-edo nsọ. Ya bụ onye unu kwesiri ịtụ ụjọ. Ya bụ onye unu ga-atụ egwu ma jijiji.
14 He will be a sanctuary for you. But to the royal families of both Israel and Judah he will be a stone they trip over and a rock that makes them stumble, a trap and a snare to the people who live in Jerusalem.
Ọ ga-abụkwa ebe nsọ; nye ụlọ Izrel na Juda, ọ ga-aghọrọ ha nkume nke na-eme ka ndị mmadụ sọọ ngọngọ, oke nkume nke na-eme ka ha daa. Ọ ga-abụkwara ndị Jerusalem igbudu na ọnya nke ha ga-adaba nʼime ya.
15 Many people will stumble over them. They will fall and be broken. They will be trapped and caught.
Ọtụtụ nʼime ha ga-asọ ngọngọ; ha ga-ada bụrụ ndị e tipịara. Ha ga-abụ ndị ọnya ga-ama, na ndị a ga-anwude.”
16 Safeguard this testimony, seal these instructions—they are for my disciples.
Kechie ihe ịgba ama nke iwu a kpuchie ntụziaka Chineke nke ọma nʼetiti ndị na-eso ụzọ ya.
17 I will wait for the Lord, the one who is hiding his face from Jacob's descendants. I will wait in hope for him.
Aga m echere Onyenwe anyị, onye na-ezonarị ụlọ Jekọb ihu ya ugbu a. Aga m atụkwasị obi m na ya.
18 Look, I'm here, together with the children the Lord has given me. They are signs and wonders in Israel from the Lord Almighty, who lives on Mount Zion.
Lee mụ onwe m, na ụmụ ndị Onyenwe anyị nyere m. Anyị bụ ihe ịrịbama na ihe iji cheta ihe nye ndị Izrel site na Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, onye na-ebi nʼugwu Zayọn.
19 When someone suggests to you, “Go and ask mediums and spiritists who whisper and mutter,” shouldn't people ask their God? Why should they ask the dead on behalf of the living?
Mgbe onye ọbụla sịrị unu, jụtanụ ndị na-ajụ mmụọ ọjọọ ase na ndị dibịa afa ihe, bụ ndị na-ekwu okwu nʼolu dị nta nke mmadụ na-adịghị anụ nke ọma na ndị na-atamu atamu, ndị mmadụ ọ gaghị ajụ Chineke ha ase? Ọ bụ nʼihi gịnị ka eji jụta ndị nwụrụ anwụ ase nʼihi ndị dị ndụ?
20 Go and examine God's law and his instructions! If what they say doesn't correspond with God's word, there will be no dawn for them.
Lezienụ okwu ntụziaka na nke ịdọ aka na ntị Chineke anya. Ọ bụrụ na ozi ha dị iche na nke a, o gosiri na ha enweghị ìhè maọbụ eziokwu ọbụla nʼime ha.
21 They will wander round the country, depressed and hungry. When they are starving they will become furious, and looking up they will curse their king and their God.
Ndị a ga-awagharị nʼala a niile. Agụụ ga-agụ ha, ha ga-adakwa mba. Nʼọnọdụ oke agụụ nke ga-agụ ha, iwe dị ukwuu ga-ewe ha, mee ka ha lelie anya ha nʼelu, kọchaa eze ha, na Chineke ha.
22 Then they will look towards the earth and see only misery and gloom and agonizing depression, and they will be thrown out into the darkness.
Mgbe ahụ, ọ bụrụ na ha eledata anya ha nʼala ọ bụ naanị oke nsogbu na oke ihe mgbu ka ha ga-ahụ. Ha ga-ahụkwa oke ihe egwu na ọchịchịrị. Ụzọ mgbapụ agaghị adịkwara ha nʼoge nsogbu a. A ga-achụbanye ha nʼime ọchịchịrị.

< Isaiah 8 >