< Isaiah 10 >

1 Tragedy is coming to those who pass evil decrees and who write laws to harm people.
Ahụhụ na-adịrị ndị niile na-atụpụta iwu na-ezighị ezi; ndị niile na-atụpụta iwu mmegbu,
2 They pervert the legal rights of the needy, and rob justice from the poor of my people. They steal from widows and cheat orphans.
iji napụ ndị ogbenye ihe ruru ha nakwa ịnapụ ndị m a na-emegbu emegbu ikpe ziri ezi, na-emekwa ka ụmụ nwanyị di ha nwụrụ bụrụ anụ oriri ha na izunara ụmụ na-enweghị nne na nna ihe ha nwere.
3 What are you going to do on the day you're punished, when disaster falls on you from far away? Who are you going to run to so you can get help? Where are you going to leave all your wealth?
Gịnị ka unu ga-eme nʼụbọchị m ga-abịa ileta unu? Gịnị ka unu ga-eme nʼụbọchị m ga-eweta ịla nʼiyi, nke ga-esi nʼebe dị anya bịara unu? Onye ka unu ga-agbakwuru maka enyemaka? Ọ bụ ebe ka unu ga-ahapụ akụ unu niile?
4 All you'll be able to do is to bow down as prisoners, or lie among the dead! In all of this he is still angry and his hand is still raised.
Mba, ọ dịghị ihe ga-afọdụ; karịa na a ga-egbu unu nʼihu ọgụ, maọbụ dọkpụrụ unu dịka ndị mkpọrọ. Ma nʼagbanyeghị ihe ndị a niile, iwe ya alaghachibeghị azụ, aka ya ka setịpụkwara esetipụ.
5 Tragedy is coming to the Assyrians, even though the rod they use represents my anger and the stick they hold in their hands represents my fury!
“Ahụhụ ga-adịrị Asịrịa onye bụ mkpara nke iwe m. Nʼaka ya ka mkpọ nke ọnụma m dị.
6 I am sending the Assyrians against a nation that has given up on its God, against a people that make me angry. I order the Assyrians to loot them, to take their possessions, and to trample them down like mud in the street.
Ana m ezipu ya imegide mba a na-amaghị Chineke, m na-eziga ya imegide ndị na-akpasu m iwe, ka ha kwakọrọ ihe nkwata nʼagha ha, pụnakwara ha ụfọdụ nʼike, nakwa ịzọtọ ndị ha niile nʼala dịka apịtị nke okporoụzọ.
7 But this isn't what is behind the thinking of the king of Assyria. This isn't the plan he has in mind. What he wants to do is to destroy and eliminate many nations.
Ma ọ bụghị ihe a ka o zubere, nke a abụghị ihe ọ na-eche nʼobi ya; o zubere ịla ndị m nʼiyi, na ibibi ọtụtụ mba dị iche iche.
8 He says: “All my commanders are kings!
Ọ sịrị, ‘Ndị ọchịagha m niile ha abụghị ndị eze?’
9 We conquered Calno like we did Carchemish; Hamath like Arpad; Samaria like Damascus.
‘Ọnọdụ Kalno ọ dịghị ka nke Kakemish? Hamat ọ dịghị ka Apad; Sameria ọ dịghịkwa ka Damaskọs?
10 I was the one who conquered these kingdoms along with the idols of their gods. These kingdoms had images of their gods that were better than those of Jerusalem and Samaria.
Dịka aka m si chịkọta alaeze dị iche iche nke ọtụtụ arụsị, alaeze dị iche iche nke arụsị apịrị apị ha karịrị nke Jerusalem na Sameria.
11 Why shouldn't I do to Jerusalem and her idols just what I did to Samaria and her idols?”
Ọ bụ na m agaghị emekwa Jerusalem na arụsị ya niile apịrị apị dịka m mere Sameria na arụsị ya niile?’”
12 Once the Lord has finished all his work against Mount Zion and Jerusalem, he will punish the king of Assyria for his terrible arrogance and for the conceited look in his eyes.
Mgbe Onyenwe anyị rụsịrị ọrụ ya niile megide ugwu Zayọn na Jerusalem, ọ ga-asị, “Aga m ata eze ndị Asịrịa ahụhụ nʼihi nganga nke obi ha, na ịnya isi nke anya mpako ya.
13 For the king of Assyria says: “I have done this in my own strength. It was through my wisdom, because I'm clever. I have wiped out the boundaries of nations and looted their treasures. Like a bull I knocked their rulers off their thrones.
Nʼihi na ọ na-asị, “‘Ọ bụ site nʼike aka m, ka m ji mee nke a, ọ bụkwa na amamihe m, nʼihi na m nwere nghọta. Ewezugara m oke ala mba niile dị iche iche, apụnara m ha akụ ha niile; dịka onye dị ike, e wedara m ndị eze ha niile nʼokpuru m.
14 Like robbing a bird's nest, I took the wealth of the nations. Like collecting abandoned eggs, I collected the whole the earth. There wasn't a fluttering wing or an open beak, not even a chirp!”
Dịka mmadụ si agbatị aka nʼime akwụ nnụnụ, otu a ka m chịkọtara akụnụba mba dị iche iche, dịka mmadụ si achịkọta akwa ahapụrụ ahapụ, otu a ka m chịkọtara mba ụwa niile; Ọ dịghị onye megharịrị otu nku, maọbụ saghee ọnụ ya ime mkpọtụ!’”
15 Does an ax say it's more important than the person swinging it? Does a saw boast that it's greater than the person sawing with it? It would be as if a rod waved the person holding it, or a walking stick lifted up a person—who certainly wasn't wood!
Anyụike ọ ga-anya isi sị na ya dị ukwuu karịa onye na-eji ya awa nkụ, ka ọ bụ mma nkwọ, ọ ga-aja onwe ya karịa onye na-eji ya akpọwa ihe? Dịka a ga-asị na okporo igwe ga-ebuli onye na-eweli ya elu, maọbụ mkpọ ọ ga-efegharị onye na-abụghị osisi.
16 So the Lord, the Lord Almighty, will send a disease on the king of Assyria's strong warriors that will make them waste away; a flaming fire will be set under everything he's so proud of.
Nʼihi ya, Onyenwe anyị, bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, ga-ezitere ndị agha gị mara abụba ihe otiti; ọ ga-akwanye ọkụ nʼokpuru ihe ngosipụta nke ịdị ebube ya dịka ire ọkụ nke na-ere ere.
17 Israel's light will become a fire, and his Holy One will become a flame. It will burn up his thorns and brambles in just one day.
Ìhè nke Izrel, ga-aghọ ọkụ, Onye nsọ ha, ga-aghọkwa ire ọkụ nke ga-ala ihe niile nʼiyi. Nʼotu abalị ka ọ ga-erechapụ ogwu niile na uke niile ọkụ.
18 It will totally destroy its splendid forests and orchards. Assyria will waste away, staggering off like someone sick.
A ga-ala ịma mma nke oke ọhịa ya na ala ya na-amị ezi mkpụrụ nʼiyi kpamkpam, dịka mgbe ọrịa na-ala mmadụ nʼiyi.
19 The trees left in its forests will be so few that a child could count them.
Naanị osisi ole na ole ga-afọdụ, ha ga-adị ntakịrị ruo na nwantakịrị nwere ike gụọ ha ọnụ.
20 At that time those who are left in Israel and the survivors of the house of Jacob will no longer trust in those who turn on them, but they will truly trust in the Lord, the Holy One of Israel.
Nʼụbọchị ahụ, ndị fọdụrụ nʼala Izrel, na ndị fọdụrụ ndụ nʼụlọ Jekọb, agaghịkwa adabere nʼonye ahụ tidara ha, kama ha ga-adabere naanị na Onyenwe anyị, Onye nsọ nke Izrel.
21 A remnant will return, a remnant of Jacob will come back to the Mighty God.
Ndị fọdụrụ ga-alọghachi, bụ ndị Nke Jekọb fọdụrụ ga-alọghachikwute Chineke dị ukwuu.
22 Israel, even though your people are as numerous as sand on the seashore, only a remnant will return. The Lord has rightly decided to destroy his people.
Ọ bụ ezie na ndị gị Izrel dị ukwuu dịka aja dị nʼakụkụ osimiri, ọ bụ naanị mmadụ ole na ole ga-alọghachi. A kabiela ịla nʼiyi, nke dị oke ukwuu ya na ezi omume.
23 The Lord God Almighty has rightly decided to bring destruction throughout the whole country.
E, Onyenwe anyị, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, ekpebiela na ọ ga-ebibi ala ahụ niile.
24 So this is what the Lord, the Lord Almighty, says, My people living in Zion, don't be afraid of the Assyrians who beat you with rods and hit you with clubs, just like the Egyptians did.
Ya mere, ihe a ka Onyenwe anyị, bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, sịrị, “Unu ndị m, ndị bi na Zayọn, unu atụkwala ndị Asịrịa egwu bụ ndị na-eti unu mkpara igwe, na-ewelikwa mkpọ megide unu dịka ndị Ijipt mere.
25 Very shortly I will stop being angry with you. Then I will turn my anger on them and I will destroy them.
Nʼoge na-adịghị anya, iwe m ga-adajụ nʼebe unu nọ, ma ọ ga-ebili megide ha, laakwa ha nʼiyi.”
26 The Lord Almighty will lash them with a whip, just as he did when he attacked the Midianites at the rock of Oreb. He will hold up his rod over the sea, just as he did in Egypt.
Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, ga-eji ụtarị tie ha ihe dịka o sịrị tie ndị Midia ihe na nkume Oreb. Ọ ga-eweli mkpanaka ya nʼelu oke osimiri, ọ ga-eweli ya dịka o mere nʼIjipt.
27 At that time he will remove the burden from your shoulders and the yoke from your neck. The yoke will be broken because of the anointing with oil.
Nʼụbọchị ahụ, aga m eme ka unu nwere onwe unu site nʼebe ndị Asịrịa nọ. Ụdọ igwe ha kenyere unu nʼolu ka m ga-adọbisi, wezuga ibu arọ unu.
28 The Assyrians came to Aiath, passed through Migron, and stored their supplies at Michmash.
Ha erutela Ayịat; ugbu a, ha nọ na Migrọn. Ha na-edokọta ngwa agha ha na Mikmash.
29 They cross the pass, saying, “We'll stay overnight at Geba.” The people of Ramah tremble in fear; the inhabitants of Gibeah of Saul run away.
Lee ka ha na-agabiga ụzọ warawara; ha ekpebiela ịnọ ọnọdụ abalị na Geba! Ndị Rema na-ama jijiji, obodo Gibea nke bụ obodo Sọl agbapụla ọsọ ndụ.
30 Shout out a warning, people of Gallim! Pay attention, those living in Laishah! You poor people of Anathoth!
Tienụ mkpu akwa unu ada Galim, geenụ ntị unu ndị Laisha! Leenụ ihe na-adanyere gị, gị Anatot!
31 The people of Madmenah, are all running away. The inhabitants of Gebim are looking for somewhere safe.
Lee na Madmena nọ nʼọsọ, ndị Gebim na-ezo onwe ha.
32 Today the invaders stop at Nob, shaking their fists at the mountain of the Daughter of Zion, at the hill of Jerusalem.
Ndị iro akwụsịla nʼobodo Nob taa; ha na-atụ ugwu Zayọn na Jerusalem aka, na-ekwere ya nʼisi.
33 Look how the Lord Almighty is going to chop off the branches with great force. The tall trees will be cut down, the proud trees will be brought crashing down.
Lee Onyenwe anyị, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, ga-eji oke ike gbutuo ngalaba osisi niile. Ọ ga-egbutukwa osisi ndị dị elu, meekwa ka ndị toro ogologo dị ala.
34 He will cut down the thick forest with an ax, and Lebanon will fall at the hand of the Mighty One.
Ya onwe ya ga-egbutu ha niile ka e si eji anyụike egbutu osisi dị nʼoke ọhịa. Lebanọn ga-adakwa nʼihu Onye ahụ dị ike dịka osisi dị nʼoke ọhịa si ada.

< Isaiah 10 >