< Ezra 5 >

1 The prophets Haggai and Zechariah, son of Iddo, gave messages to the Jews in Judah and Jerusalem from the God of Israel, their ruler.
Ugbu a, ndị amụma, bụ Hegai, na Zekaraya nwa Ido buru amụma nye ndị Juu nọ na Juda nakwa Jerusalem. Ọ bụ nʼaha Chineke nke Izrel, onye na-achị ha ka ha buru amụma ahụ.
2 Then Zerubbabel, son of Shealtiel, and Jeshua, son of Jozadak, decided to start work on rebuilding God's Temple in Jerusalem. The prophets of God encouraged them and helped them.
Mgbe ahụ, Zerubabel nwa Shealtiel, na Jeshua nwa Jozadak malitekwara iwu ụlọnsọ Chineke nʼJerusalem. Ndị amụma Chineke ahụ nọnyeere ha na-enyekwara ha aka.
3 Almost immediately Tattenai, the governor of the province west of the Euphrates, Shethar-bozenai, and their fellow officials arrived and asked, “Who gave you permission to rebuild this Temple and finish it?”
Ma Tatenai, onye na-achị mba niile dị nʼọdịda anyanwụ Yufretis, na Sheta Bozenai, na ndị enyi ha, gara Jerusalem jụọ ndị Juu sị; “Onye nyere unu ike ibido iwuzi ụlọnsọ a na mgbidi Jerusalem?”
4 Then they asked, “What are the names of the men who are working on this building?”
Ha jụkwara ha ajụjụ sị: “Gịnị bụ aha ndị na-arụ ụlọ a?”
5 But their God was watching over the Jewish leaders, so that they were not prevented from working until a report could be sent to Darius and a written reply with instructions was received.
Ma anya Chineke ha dịkwasịrị nʼahụ ndị okenye ndị Juu, ha akwụsịghị ha ọrụ ruo mgbe akwụkwọ ozi ruru Daraiọs, na mgbe ọsịsa ya bịara site nʼakwụkwọ ozi.
6 The following is a copy of the letter that Tattenai, the governor of the province west of the Euphrates, Shethar-bozenai, and their fellow officials, officials of the province, sent to King Darius.
Nke a bụ akwụkwọ ozi Tatenai, onye na-achị ala dị nʼọdịda anyanwụ Yufretis, na Sheta Bozenai, na ndịisi ọzọ degara eze Daraiọs:
7 The report they sent him read went like this: “To King Darius: Greetings.
Ha zigara ya akwụkwọ ozi, nke e si otu a dee, Daraiọs bụ eze nwe akwụkwọ a, Anyị ekelee gị.
8 We wish to inform Your Majesty that we went to the province of Judah, to the Temple of the great God. It is being built with large stones, with timber beams being placed on the walls. This work is being done properly and is progressing well.
Ọ dị mma ka eze mata na anyị jeruru mpaghara ala Juda, nʼebe ahụ ụlọnsọ ukwu Chineke dị. Anyị chọpụtara na ndị ahụ ji nkume a wara awa na-ewu ya, na-edokwa osisi na-elu mgbidi ya. Ọrụ ahụ na-agakwa nʼihu nke ọma na-esepụghị aka nʼokpuru nlekọta ha.
9 We questioned the leaders, asking them, ‘Who gave you permission to rebuild this Temple and finish it?’
Anyị jụrụ ndị okenye ajụjụ sị: Onye nyere unu ikike ibido iwuzi ụlọnsọ a na mgbidi Jerusalem?
10 We also asked for their names, so that we could write them down and let you know the names of their leaders.
Anyị jụkwara ha aha ha, ka anyị si otu a mee ka ị mata aha ndị ndu ha.
11 This is the answer they gave us. ‘We are servants of the God of heaven and earth. We are rebuilding the Temple built and completed many years ago by a great king of Israel.
Ma nke a bụ ihe ha zaghachiri anyị: “Anyị onwe anyị bụ ndị ohu Chineke nke eluigwe na ụwa. Anyị na-ewugharị ụlọnsọ nke otu eze ukwu ndị Izrel wuru nʼoge gara aga.
12 But our forefathers made the God of heaven angry, so he handed them over to Nebuchadnezzar, king of Babylon, the Chaldean, who destroyed this Temple and deported the people to Babylon.
Ma nʼihi na nna nna anyị ha mere ka iwe wee Chineke nke eluigwe, o weere ha nyefee nʼaka Nebukadneza, onye Kaldịa, bụ eze Babilọn, onye bibiri ụlọnsọ a ma dọrọ ndị bi nʼala ahụ nʼagha laa Babilọn.
13 However, Cyrus, king of Babylon, in the first year of his reign, issued a decree to rebuild this Temple of God.
“Ma otu ọ dị, nʼafọ mbụ nke ọchịchị Sairọs, eze Babilọn, eze Sairọs nyere iwu ka e wugharịa ụlọnsọ Chineke a.
14 He even gave back the gold and silver items belonging to God's Temple, which Nebuchadnezzar had taken from the Temple in Jerusalem and placed in his temple in Babylon. King Cyrus gave them to a man named Sheshbazzar, whom he had appointed governor,
O sikwa nʼụlọnsọ dị na Babilọn wepụta ngwongwo ọlaọcha na ọlaedo si nʼụlọnsọ Chineke nke Nebukadneza si nʼụlọnsọ Chineke dị na Jerusalem bupụ bulaa nʼụlọnsọ dị na Babilọn. Mgbe ahụ eze Sairọs nyefere ha nʼaka otu nwoke a na-akpọ Sheshbaza, onye ọ họpụtara dịka gọvanọ.
15 telling him, Take these items and place them in the Temple in Jerusalem. Rebuild God's Temple on its original site.
Ọ gwara ya sị, ‘buru ngwongwo ndị a bulaa ha nʼụlọnsọ dị na Jerusalem, wugharịakwa ụlọnsọ Chineke nʼọnọdụ ya mbụ.’
16 So Sheshbazzar came and laid the foundation of God's Temple in Jerusalem. It has been under construction since then, but hasn't yet been completed.’
“Ya mere, ọ bụ Sheshbaza a bịara tọọ ntọala ụlọnsọ dị na Jerusalem. Sitekwa nʼoge ahụ ruo ugbu a, ha nọ na-arụ ya ma ha arụchabeghị ya.”
17 So, if Your Majesty wishes, authorize a search to be made of the royal archives in Babylon to discover if there is a record that King Cyrus issued a decree to rebuild God's Temple in Jerusalem. Then please let us know Your Majesty's decision in this matter.”
Ugbu a, ọ bụrụ na ọ dị eze mma nʼobi, ya nye iwu ka e nyochaa nʼụlọ a na-echebe akwụkwọ ochie nke ndị eze Babilọn, ịchọpụta maọbụ eziokwu na eze Sairọs nyere iwu dị otu a iwugharị ụlọnsọ Chineke dị na Jerusalem. Ka eze gwakwa anyị ihe bụ mkpebi ya banyere okwu a.

< Ezra 5 >