< Ezra 1 >

1 In order to fulfill the Lord's prophecy given through Jeremiah, the Lord encouraged Cyrus, king of Persia, to issue a proclamation throughout his kingdom and also to put it in writing, saying,
Nʼafọ mbụ nke ọchịchị Sairọs, eze Peshịa, ime ka okwu Onyenwe anyị nke sitere nʼọnụ Jeremaya mezuo, Onyenwe anyị kpaliri mmụọ Sairọs, eze Peshịa ka o mee mkpọsa nʼalaeze ya niile, ma denyekwa ya nʼakwụkwọ iwu, sị,
2 “This is what Cyrus king of Persia says: ‘The Lord, the God of heaven, who has given to me all the kingdoms of the earth, has given me the responsibility to build a Temple for him at Jerusalem in Judah.
“Otu a ka Sairọs, eze Peshịa kwuru, “‘Onyenwe anyị Chineke nke eluigwe, e nyela m alaeze niile nke dị nʼụwa, o nyekwala m ọrụ iwuru ya ụlọnsọ na Jerusalem, nke dị na Juda.
3 Anyone among you who belongs to his people can go to Jerusalem in Judah to rebuild this Temple of the Lord, the God of Israel, who lives in Jerusalem. May your God be with you.
Ya mere, onye ya ọbụla nʼetiti ndị ya nwere ike ịga Jerusalem nke dị na Juda, gaa wuo ụlọnsọ Onyenwe anyị, Chineke Izrel, bụ Chineke nọ na Jerusalem. Ka Chineke ha nọnyekwara ha.
4 Wherever survivors are currently living, let them be helped by the people that region with silver, gold, goods, and livestock, together with a voluntary donation for God's Temple in Jerusalem.’”
Ma nʼobodo ọbụla ebe ndị fọdụrụ ndụ bi, ka ndị nọ nʼebe ahụ nye ha onyinye ọlaọcha na ọlaedo, na akụ na anụ ụlọ nʼụzọ enyemaka, tinyere onyinye afọ ofufu maka ụlọnsọ ukwu Chineke nke dị na Jerusalem.’”
5 Then God encouraged the family leaders of Judah and Benjamin, as well as the priests and Levites to go and rebuild the Lord's Temple in Jerusalem.
Mgbe ahụ, Chineke tinyere ọchịchọ ịlaghachi Jerusalem nʼobi ndịisi ezinaụlọ Juda na Benjamin na ndị nchụaja, na ndị Livayị. Ha kwadokwara ịlaghachi maka ịrụ ọrụ ụlọnsọ Onyenwe anyị ahụ na-atụfughị oge.
6 All their neighbors supported them with gifts of silver and gold, with goods and livestock, and with other valuable items, in addition to all their voluntary donations.
Ndị Juu bi na gburugburu Peshịa nyere ndị nke na-alaghachi Jerusalem onyinye ihe ọlaọcha na ọlaedo, na anụ ụlọ na ihe ndị ọzọ, na onyinye dị oke ọnụahịa dị iche iche, tinyere onyinye afọ ofufu ha.
7 King Cyrus also retrieved the items belonging to the Lord's Temple that Nebuchadnezzar had taken from Jerusalem and placed in the temple of his god.
Nke ka nke, eze Sairọs chịpụtara ọtụtụ ngwongwo nke ụlọnsọ Onyenwe anyị nke Nebukadneza sitere na Jerusalem bukọrọ gaa debe nʼụlọ chi ya.
8 Cyrus had Mithredath the treasurer retrieve them, who counted them and gave them to Sheshbazzar, the leader of Judah.
Sairọs bụ eze Peshịa, chịpụtara ha site nʼaka Mitredat, onye bụ odozi akụ, onye gụrụ ha ọnụ nye Sheshbaza, onye bụ onyeisi ndị Juu ahụ na-alaghachi Jerusalem na Juda.
9 This was the list: 30 gold basins, 1,000 silver basins, 29 silver silverware,
Nke a bụ ọnụọgụgụ ngwongwo ndị ahụ: efere ọlaedo iri atọ, efere ọlaọcha otu puku, efere ọlaọcha iri abụọ na itoolu,
10 30 gold bowls, 410 matching silver bowls, and 1,000 other items.
efere nta ọlaedo iri atọ, efere ọlaọcha nta narị anọ na iri, ngwongwo ndị ọzọ otu puku.
11 In total there were 5,400 gold and silver items. When the exiles left Babylon to go to Jerusalem Sheshbazzar took all these along with them.
Nʼime ihe ndị a niile, ọnụọgụgụ ihe e ji ọlaọcha na ọlaedo kpụọ dị puku ise na narị anọ. Sheshbaza bulatara ihe ndị a mgbe ya na ndị ahụ a dọọrọ nʼagha hapụrụ Babilọn na-alọta Jerusalem.

< Ezra 1 >