< Ezekiel 37 >

1 The Lord picked me up and carried me away by his Spirit. He set me down in the middle of a valley that was full of bones.
Aka nke Onyenwe anyị dịkwasịrị m, o sitekwara nʼike Mmụọ nke Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị bulie m, debe m nʼetiti ndagwurugwu nke jupụtara nʼọkpụkpụ.
2 He led me around them, and in all directions I saw many, many bones on the valley floor. They were really dry.
O mere ka m jegharịa nʼetiti ha. Ahụrụ m ọkpụkpụ kpọrọ nkụ, nke dị ukwuu nʼọnụọgụgụ, ka ha ghasa na ndagwurugwu ahụ.
3 Then he asked me, “Son of man, can these bones come back to life?” “Lord God, only you know the answer,” I replied.
Ọ sịrị m, “Nwa nke mmadụ, ọkpụkpụ ndị a ha pụrụ ịdị ndị ọzọ?” Asịrị m, “Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ọ bụ naanị gị onwe gị maara.”
4 He told me, “Prophesy to these bones and tell them, Dry bones, listen to this message from the Lord!
Mgbe ahụ, ọ sịrị m, “Buo amụma nye ọkpụkpụ ndị ahụ, gwa ha, ‘Unu ọkpụkpụ niile kpọrọ nkụ, geenụ ntị nʼokwu nke Onyenwe anyị.
5 This is what the Lord God says to these bones: I will breathe into you, and you will come back to life.
Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-agwa ọkpụkpụ ndị a. Lee, aga m eme ka ume baa nʼime unu, unu ga-adịkwa ndụ.
6 I will give you tendons and have flesh grow over you and cover you with skin. I will breathe into you so that you will come back to life. Then you will know that I am the Lord.”
Aga m etinyekwasị unu akwara, na anụ ahụ, werekwa akpụkpọ ahụ kpuchie unu. Aga m etinye ume nʼime unu, unu ga-adịkwa ndụ. Mgbe ahụ, unu ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.’”
7 So I prophesied just as I had been ordered. When I started prophesying, suddenly I heard a rattling noise. The bones joined together, bone attached to bone.
Ya mere, eburu m amụma dịka e sị nye m nʼiwu. Mgbe m nọ na-ebu amụma ahụ, anụrụ m ụzụ, ụzụ mkpọtụ. Ma lee, ọkpụkpụ ndị ahụ niile bịara ibe ha nso; ọkpụkpụ malitekwara ijikọta onwe ha ọnụ.
8 As I watched, I saw tendons and flesh grow on them, and skin covered them; but the bodies didn't breathe.
Mgbe m nọkwa na-ele anya, lee, ahụrụ m ka akwara na anụ ahụ malitere ịbịakwasị nʼelu ọkpụkpụ ndị ahụ, akpụkpọ ahụ kpuchikwara elu ha. Ma nʼoge a ume ọbụla adịghị nʼime ha.
9 Then he told me, “Prophesy to the breath! Prophesy, son of man, and tell the breath that this is what the Lord God says: Breath, come from the four winds, and breathe into these bodies, so that they can come back to life!”
Mgbe ahụ, ọ sịrị m, “Buo amụma nye ifufe; buo amụma, nwa nke mmadụ, sị ifufe, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: site nʼakụkụ anọ nke ụwa bịa, gị ume na-enye ndụ, kukwasị ndị a e gburu egbu ka ha dịkwa ndụ ọzọ.’”
10 So I prophesied just as he had ordered me, and the breath went into the bodies, and they came back to life and stood up, a huge army!
Ya mere, eburu m amụma dịka o si nye m nʼiwu. Ume ndụ banyekwara nʼime ha. Ha niile dịịrị ndụ, bilie ọtọ, guzo nʼụkwụ ha, ghọọ usuu ndị agha dị ukwuu nʼọnụọgụgụ.
11 He told me, “Son of man, these bones represent all the people of Israel. Listen to what the people are saying, ‘Our bones have dried up, and our hope has been crushed. We have been wiped out!’
Mgbe ahụ, ọ gwara m, “Nwa nke mmadụ, ọkpụkpụ ndị a nọchiri anya ụlọ Izrel niile. Ha na-asị, ‘Anyị aghọọla ọkpụkpụ kpọrọ nkụ, olileanya niile agwụkwala, anyị abụrụla ndị e bipụrụ.’
12 So prophesy and tell them that this is what the Lord God says: My people, I'm going to open your graves and lift you out of them, and I will take you back to the country of Israel.
Nʼihi ya, buo amụma gwa ha, ‘otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, Ndị m, aga m emeghe ili unu, si nʼebe ahụ wepụta unu. Aga m eme ka unu lọghachitakwa nʼala Izrel.
13 Then you will know that I am the Lord, when I open your graves and lift you out of them, my people.
Nʼikpeazụ, mgbe m meghere ili unu mee ka unu si nʼime ya pụta, unu bụ ndị m ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.
14 I will put my Spirit in you and you will live again, and I will take you back to your own country. Then you will know that I, the Lord, have spoken, and I will carry it out, declares the Lord.”
Aga m etinye Mmụọ m nʼime unu, unu ga-adị ndụ, lọghachikwa nʼala unu ọzọ. Unu ga-amatakwa na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, ekwuola ya, meekwa ya, otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.’”
15 Another message from the Lord came to me, saying,
Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
16 “Son of man, get one piece of wood and write on it: ‘This belongs to Judah and the Israelite tribes allied to them.’ Then get another piece of wood and write on it: ‘This belongs to Joseph. This is Ephraim's piece of wood, and to the Israelite tribes allied to them.’
“Nwa nke mmadụ, were osisi dee ihe ndị a nʼelu ya, ‘Osisi a nọchiri anya Juda na ndị Izrel e kekọtara ya na ha ọnụ.’ Werekwa osisi ọzọ deekwa okwu ndị a nʼelu ya. ‘Osisi a nọchiri anya Ifrem, na Josef, na ndị Izrel niile e jikọtara ha na ndị a ọnụ.’
17 Then join the two pieces of wood into one, so that you hold them as one in your hand.
Jidekọtaa osisi abụọ ndị a ọnụ, mee ka ha bụrụ otu osisi nʼaka gị.
18 When your people come and ask you, ‘Are you going to explain what this is all about?’
“Mgbe ndị gị jụrụ gị, ‘Ị gaghị egosi anyị ihe nke a pụtara?’
19 tell them that this is what the Lord God says: I'm going to take Joseph's piece of wood, which Ephraim is holding, along with the Israelite tribes allied with them, and I'll join them with Judah's piece of wood. I will make them into a single piece of wood, and they will be as one in my hand.
gwa ha, sị, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu: Lee, agaje m iwere osisi Josef, nke dị Ifrem nʼaka, nke bụkwa ihe nọchiri anya ebo ụfọdụ ndị Izrel, jidekọtaa ya na osisi nọchiri anya Juda, mee ha ka ha ghọọ otu osisi, bụrụkwa otu nʼaka m.’
20 When you're holding the pieces of wood you've written on, and while everyone is watching,
Were mkpirisi osisi ndị ahụ i dere ihe nke dị nʼaka gị, gosi ha,
21 tell them that this is what the Lord God says: I'm going to bring the Israelites back from the nations where they've gone. I will gather them from everywhere and take them back to their own country.
ma gwakwa ha, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu: Aga m esite na mba niile ndị Izrel jere biri kpọpụta ha. Aga m achịkọtakwa ha site nʼakụkụ niile, kpọbata ha nʼala nke aka ha.
22 I will make them one nation in the country, living in the mountains of Israel, and one king will rule them all. They won't be two nations any longer; never again will they be divided into two kingdoms.
Aga m eme ha ka ha bụrụ otu mba nʼala ahụ, nʼugwu niile nke Izrel. Ha ga-enwe naanị otu eze nke ga-achị ha niile. Ha agaghị abụkwa mba abụọ maọbụ alaeze abụọ ọzọ.
23 They won't make themselves unclean anymore with their idols or disgusting images, or with any of their rebellious sins. I will save them from all their sins when they abandoned me, and I will make them clean. They will be my people, and I will be their God.
Ha agaghị ejikwa arụsị ha niile, maọbụ ihe a pịrị apị rụrụ arụ, maọbụ jiri ihe ọjọọ ndị ọzọ dị iche iche merụọ onwe ha ọzọ. Nʼihi na aga m azọpụta ha site na ịlaghachi azụ nʼụzọ mmehie ha niile, meekwa ka ha dị ọcha. Ha ga-abụ ndị m, mụ onwe m ga-abụkwa Chineke ha.
24 My servant David will be their king. They will be united under one ruler. They will follow my laws, and they will observe and practice my regulations.
“‘Ohu m, Devid, ga-abụ eze ga-achị ha, ha ga-enwekwa otu onye ọzụzụ atụrụ. Ha ga-edebezu iwu m niile, na ụkpụrụ m niile.
25 They will live in the country I gave to my servant Jacob where your forefathers lived. They will live there with their children and grandchildren forever, and my servant David will be their prince forever.
Ha ga-ebi nʼala ahụ m nyere ohu m Jekọb, ala ebe nna nna ha biri. Ha na ụmụ ha ga-ebi nʼime ya. Ụmụ ụmụ ha ruo ọgbọ niile ga-ebikwa nʼime ya. Ohu m Devid ga-abụ eze ha ruo ebighị ebi.
26 I will make an agreement of peace with them. This will be an everlasting agreement. I will make them secure and increase their numbers, and I will keep my sanctuary there with them forever.
Mụ na ha ga-agba ndụ udo, ọgbụgba ndụ nke ga-adị ruo mgbe ebighị ebi. Aga m agọzi ha, mee ka ha baa ụba. Nʼetiti ha kwa ka ụlọnsọ m ga-adị ruo mgbe ebighị ebi.
27 My Tabernacle will be with them. I will be their God, and they will be my people.
Ebe obibi m ga-abụkwa nʼetiti ha. E, aga m abụ Chineke ha, ha ga-abụkwa ndị m.
28 The nations will acknowledge that I am the Lord who blesses Israel, when my sanctuary is with them forever.”
Mgbe ụlọnsọ m ga-adị nʼetiti ha ruo ebighị ebi, mba niile ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị na-edo Izrel nsọ.’”

< Ezekiel 37 >