< Exodus 8 >
1 Then the Lord told Moses, “Go and see Pharaoh and say to him, ‘This is what the Lord says: Let my people go, so that they can worship me.
Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis sị, “Jekwuru Fero gwa ya, ‘Nke a bụ ihe Onyenwe anyị kwuru. Hapụ ndị m, ka ha gaa fee m ofufe.
2 If you refuse to let them leave, I will send a plague of frogs all over your country.
Ọ bụrụ na ị jụ ịhapụ ha ka ha gaa, aga m eme ka awọ jupụta nʼala Ijipt niile.
3 They will swarm out of the Nile, and they will enter your palace and get into your bedroom and jump onto your bed. They will get into the houses of your officials and jump around your people—even into your ovens and breadmaking bowls.
Osimiri Naịl ga-ejupụta nʼawọ. Ha ga-abata nʼụlọeze gị na nʼime ọnụụlọ ndina gị, ma nʼelu ihe ndina gị, ma nʼụlọ ndị na-ejere gị ozi, ma nʼụlọ ndị gị niile, na nʼebe a na-esi nri, ma nʼime ihe e ji agwakọta ụtụ ọka.
4 Frogs will jump all over you, your people, and all your officials.’”
Awọ ndị a ga-arịgokwa nʼahụ gị, na nʼahụ ndị gị, na nʼahụ ndị na-ejere gị ozi.’”
5 The Lord said to Moses, “Tell Aaron, ‘Hold out your walking stick in your hand over the rivers and canals and ponds, and make frogs spread over Egypt.’”
Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis sị, “Gwa Erọn, ‘Setịpụ aka gị ya na mkpanaka gị nʼelu osimiri niile, na mmiri nta na ọdọ mmiri ndị Ijipt, mee ka awọ jupụta ala Ijipt niile.’”
6 So Aaron held out his hand over the waters of Egypt, and frogs came up and covered the land.
Erọn setịpụrụ aka nʼelu mmiri niile nke Ijipt, awọ pụtara kpuchie ala ahụ niile.
7 But the Egyptian magicians did the same thing using their magic arts. They brought up frogs in Egypt.
Ma ndị majiki Ijipt jikwa ihe nzuzo ha mee ihe ahụ Mosis na Erọn mere. Ha mekwara ka awọ jupụta ala ahụ niile.
8 Pharaoh called for Moses and Aaron and pleaded with them, “Pray to the Lord, and ask him to take away the frogs from me and my people. Then I will let your people go so they can offer sacrifices to the Lord.”
Fero kpọrọ Mosis na Erọn rịọọ ha sị, “Rịọọnụ Onyenwe anyị ka o wepụrụ mụ na ndị m awọ ndị a. Emesịa aga m ekwe ka ndị gị gaa chụọrọ Onyenwe anyị aja.”
9 “You may have the honor of deciding when I'll pray for you, your officials, and your people that the frogs will be removed from you and your houses. They will remain only in the Nile.”
Mosis zaghachiri Fero sị, “Gị ka ọ dịrị ịgwa m mgbe m ga-arịọ arịrịọ a nʼisi gị na nʼisi ndị gị, ka e wezuga awọ ndị a site nʼụlọ unu, ma hapụ naanị ndị nọ nʼosimiri Naịl.”
10 “Do it tomorrow,” Pharaoh replied. Moses said, “It will happen as you have requested so you will know that there is no one like the Lord our God.
Mgbe ahụ Fero sịrị Mosis, “Achọrọ m ka i mee ya echi.” Mosis zaghachiri Fero sị, “Ọ dị mma, ka ọ dịrị dịka i kwuru. Mgbe ahụ, ị ga-amata na o nweghị onye dịka Onyenwe anyị Chineke anyị.
11 The frogs will leave you and your houses, your officials and your people, and they will remain only in the Nile.”
Awọ ndị a niile ga-apụ site nʼebe ị nọ, na site nʼụlọ gị na site nʼụlọ ndị na-ejere gị ozi na site nʼụlọ ndị Ijipt niile. Ọ bụ naanị nʼosimiri Naịl ka ha ga-anọ.”
12 Moses and Aaron left Pharaoh, and Moses pleaded with the Lord about the frogs he had sent against Pharaoh.
Mgbe Mosis na Erọn sitere nʼụlọ Fero pụọ, Mosis kpọkuru Onyenwe anyị ka o wepụ awọ ndị a o mere ka ha bịakwasị Fero.
13 The Lord did as Moses asked. The frogs in the houses, the courtyards, and the fields died.
Onyenwe anyị mere ihe Mosis rịọrọ. Awọ ndị ahụ niile nwụrụ nʼime ụlọ, na nʼama, na nʼọhịa.
14 The people collected them in pile upon pile, and the whole country smelled terrible.
E kpokọtara ozu awọ ndị a niile nʼebe dị iche iche. Isi ọjọọ ha wetara nʼala ahụ dị egwu.
15 But when Pharaoh realized the plague had passed he chose to become hard and stubborn again, wouldn't listen to Moses and Aaron, just as the Lord had predicted.
Ma mgbe Fero hụrụ na awọ ndị a anwụchaala, o mechiri obi ya jụ ige Mosis na Erọn ntị, dịka Onyenwe anyị kwuru na ọ ga-eme.
16 The Lord said to Moses, “Tell Aaron, ‘Pick up your walking stick and hit the dust of the ground. The dust will become gnats swarming all over Egypt.’”
Ya mere, Onyenwe anyị gwara Mosis sị ya, “Gwa Erọn, setịpụ mkpanaka gị, tie nʼaja nke ala nʼala Ijipt niile, aja ya ga-aghọ anwụ nta nke na-ata ata.”
17 They did what the Lord said. When Aaron lifted up his walking stick and hit the dust of the earth, gnats swarmed over both people and animals. The dust in the whole of Egypt turned into gnats.
Mosis na Erọn mere nke a. Mgbe Erọn setịpụrụ aka tie mkpanaka ya nʼelu ala, anwụ nta jupụtara nʼala Ijipt niile, nʼahụ ndị mmadụ, na nʼahụ anụmanụ ha. Ndanda ndị a jupụtakwara nʼuzuzu niile dị nʼala ahụ.
18 The magicians also tried to make gnats using their magic arts, but they couldn't. The gnats stayed on both people and animals.
Ndị Ijipt na-eme majiki gbalịrị iji ihe nzuzo ha mee otu ihe ahụ Erọn mere, ma ha enweghị ike ime ka anwụ nta ọbụla pụta. Ebe ọ bụ na anwụ nta ndị a jupụtara nʼahụ mmadụ na nʼahụ anụmanụ niile.
19 “This is an act of God,” the magicians told Pharaoh. But Pharaoh chose to be stubbornly hard-hearted, and he wouldn't listen to Moses and Aaron, just as the Lord had predicted.
Naanị ihe ndị na-eme majiki gwara Fero bụ, “Nke a bụ akaọrụ Chineke.” Ma Fero mere ka obi ya sie ike. Ọ chọghị ige, ọ bụladị ndị majiki ya ntị, dịka Onyenwe anyị kwuru na ọ ga-eme.
20 The Lord told Moses, “Tomorrow morning get up early and block Pharaoh's way as he walks down to the river. Tell him, ‘This is what the Lord says: Let my people go, so that they can worship me.
Onyenwe anyị gwara Mosis sị ya, “Bilie nʼisi ụtụtụ echi jekwuru Fero. Mgbe ọ ga-aga nʼosimiri, gwa ya okwu sị, ‘Nke a bụ ihe Onyenwe anyị kwuru, Hapụ ndị m ka ha gaa fee m ofufe.
21 If you don't let my people leave, I will send swarms of flies on you and your officials, and on your people and your houses. Every Egyptian house and even the ground on which they stand will be filled with swarms of flies.
Ọ bụrụ na ị chọghị ime otu a, aga m eme ka igwe ijiji jupụta nʼala Ijipt niile. Ha ga-ejupụta gị nʼahụ na nʼahụ ndị na-ejere gị ozi, na nʼahụ ndị gị niile, na nʼime ụlọ unu niile.
22 However, on this occasion I will treat the land of Goshen differently—that's where my people live—there won't be any swarms of flies there. This is how you will know that I, the Lord, am here in your country.
“‘Nʼụbọchị ahụ, igwe ijiji ndị a agaghị emetụ ndị nọ na Goshen ebe ndị m bi. Mgbe ahụ ka ị ga-amata na mụ bụ Onyenwe anyị bịara ije nʼala a.
23 I will distinguish my people from your people. You will see this sign that confirms it tomorrow.”
Aga m emekwa ka ọ pụta ìhè na o nwere ihe dị iche nʼetiti ndị m na ndị gị. Ihe ịrịbama a ga-emezukwa echi.’”
24 The Lord did what he had said. Huge swarms of flies swept into Pharaoh's palace and into the houses of his officials. The whole of Egypt was devastated because of these swarms of flies.
Nʼechi ya, Onyenwe anyị mere dịka o kwuru. Igwe ijiji dị egwu nʼọnụọgụgụ bịara nʼala Ijipt, jupụta nʼụlọ Fero, na nʼụlọ ndị niile na-ejere ya ozi, na nʼala Ijipt niile. E mere ka ala Ijipt bụrụ ihe e ji ijiji mebie.
25 Pharaoh called for Moses and Aaron and told them, “Go and offer sacrifices to your God here in this country.”
Mgbe ihe ndị a na-eme, Fero kpọrọ Mosis na Erọn gwa ha okwu sị, “Gaanụ chụọrọ Chineke unu aja, ma ka ọ bụrụ nʼala Ijipt.”
26 “No, that wouldn't be the right thing to do,” Moses replied. “The sacrifices we offer to the Lord our God would be offensive to Egyptians. If we went ahead and offered sacrifices offensive to Egyptians, they'd stone us!
Mosis zaghachiri Fero sị, “Nke ahụ abụghị ihe ziri ezi, nʼihi na aja anyị na-aga ịchụrụ Onyenwe anyị Chineke anyị bụ ihe rụrụ arụ nʼanya ndị Ijipt. Ọ bụrụ na anyị achụọ aja a nʼihu ha, ha ga-eji nkume tugbuo anyị.
27 We must make a three-day journey into the wilderness and offer sacrifices there to the Lord our God as he has told us.”
Anyị ga-aga njem ụbọchị atọ nʼime ọzara gaa chụọrọ Onyenwe anyị Chineke anyị aja, dịka o nyere anyị iwu ka anyị mee.”
28 “I'll let you go and offer sacrifices to the Lord your God in the desert, but don't go very far,” Pharaoh answered. “Now pray for me that this plague ends.”
Fero zaghachiri ha sị, “Aga m ekwenye ka unu ga chụọrọ Onyenwe anyị Chineke unu aja nʼọzara, ma unu agaghị aga ebe dị anya. Ugbu a, kperenụ m ekpere.”
29 “As soon as I leave you, I will pray to the Lord,” Moses replied, “and tomorrow the flies will leave Pharaoh and his officials and his people. But Pharaoh should be sure not to be deceitful again and refuse to let the people go and offer sacrifices to the Lord.”
Mosis zara Fero sị ya, “Ngwangwa m si nʼihu gị pụọ, aga m arịọ Onyenwe anyị arịrịọ. Echi, a ga-esite nʼụlọ Fero, na nʼụlọ ndị na-ejere ya ozi, na nʼụlọ ndị Ijipt niile wezuga ijiji ndị a. Ọ ga-adị mkpa na Fero ga-elezi anya hapụ ịghọ aghụghọ ọzọ site ịjụ ka ụmụ Izrel gaa chụọrọ Onyenwe anyị aja.”
30 Moses left Pharaoh and prayed to the Lord,
Mgbe ahụ, Mosis sitere nʼihu Fero pụọ rịọọ Onyenwe anyị ka o mee ka ijiji ndị a gabiga.
31 and the Lord did as Moses asked, and removed the swarms of flies from Pharaoh and his officials and his people. Not a single fly remained.
Onyenwe anyị mere dịka Mosis rịọrọ. Ijiji ndị a sitere nʼụlọ Fero na ụlọ ndị na-ejere ya ozi na ụlọ ndị Ijipt niile pụọ. O nwekwaghị ijiji ọ bụla fọdụrụ nʼala ahụ.
32 But once again Pharaoh chose to be stubbornly hard-hearted and would not let the people leave.
Ma nʼoge a, Fero gara nʼihu ime ka obi ya sie ike. O kweghị ka ụmụ Izrel laa.