< Exodus 32 >
1 When the people realized how long Moses was taking before he came back down the mountain, they went together to see Aaron. They told him, “Get up! Make some gods for us who can lead us because this man Moses who brought us out of the land of Egypt—we don't know what's happened to him!”
Mgbe ndị mmadụ ahụ hụrụ na Mosis anọọla ọdụ ịrịdata site nʼelu ugwu Saịnaị, ha zukọtara, bịakwute Erọn, sị ya, “Bilie, meere anyị chi ndị ga-edu anyị, nʼihi na nwoke a bụ Mosis onye dupụtara anyị site nʼala Ijipt, anyị amaghị ihe mere ya.”
2 “Bring to me the gold earrings that your wives, sons, and daughters are wearing,” Aaron replied.
Erọn zara sị ha, “Yipụtanụ ọlantị ọlaedo ndị nwunye unu, na ụmụ unu ndị ikom na ndị inyom yi. Wetara m ha.”
3 So everyone took off the gold earrings they were wearing and brought them to Aaron.
Ngwangwa, ha niile yipụrụ ọlantị ha weta ha nye Erọn.
4 He took what they gave him and using a molding tool cast an idol in the shape of a bull calf. They shouted out, “Israel, these are the gods that brought you out of the land of Egypt.”
Ọ naara ya nʼaka ha, were ngwa ọrụ e ji egbunye akara, kpụtara ha arụsị nwa oke ehi. Mgbe ahụ, ha kwuru sị, “Ndị Izrel, ndị a bụ chi unu, nke sitere nʼala Ijipt dupụta unu.”
5 When Aaron saw this, he built an altar in front of the golden calf and shouted out, “Tomorrow will be a festival to honor the Lord!”
Mgbe Erọn hụrụ na ụmụ Izrel jupụtara nʼobi aṅụrị, nʼihi ihe ahụ ọ kpụrụ, o wuru ebe ịchụ aja nʼihu nwa ehi ahụ ọ kpụrụ, kwuo okwu sị, “Echi, a ga-enwe oke mmemme nye Onyenwe anyị!”
6 Early the next day they sacrificed burnt offerings and presented peace offerings. Then they sat down to celebrate with eating and drinking. Then they got up to dance, and it became like an orgy.
Ya mere na echi ya, ha biliri nʼoge, bido ịchụ aja nsure ọkụ, na aja udo, nye nwa ehi ahụ a kpụrụ akpụ. Mgbe nke a gasịrị, ha nọdụrụ ala iri ihe na ịṅụ ihe ọṅụṅụ, biliekwa ọtọ gwurie egwu ime onwe ha obi ụtọ.
7 Then the Lord told Moses, “Get back down, because your people that you brought out of Egypt are acting immorally.
Nʼoge ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị, “Gbada ọsịịsọ, nʼihi na ndị gị, ndị i dupụtara site nʼIjipt emerụọla onwe ha.
8 They have been so quick to abandon the way I ordered them to follow. They have made a metal bull calf idol for themselves, bowing before it in worship and offering sacrifices to it. They're saying, ‘These are the gods that brought you out of the land of Egypt.’”
Nʼotu ntabi anya a, ha ahapụla ụzọ m niile. Ha akpụọlara onwe ha arụsị nwa oke ehi, nke ha na-efe ofufe, nke ha chụkwaara aja nye. Ha kwukwara sị, ‘Ndị Izrel, ndị a bụ chi unu, nke dupụtara unu site nʼala Ijipt.’”
9 “I know what these people are like,” the Lord continued saying to Moses. “They are so rebellious!
Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sịrị Mosis, “Ahụla m na ndị a bụ ndị isiike, na ndị na-enupu isi.
10 Now leave me! I am angry with them—let me finish them off! I will make you into a great nation.”
Ugbu a, hapụ m ka iwe m bịakwasị ha, ka m laa ha nʼiyi. Aga m eme ka gị onwe gị bụ Mosis bụrụ mba ukwu nʼọnọdụ ha.”
11 But Moses pleaded with the Lord his God, saying, “Why are you angry with the people you brought out of the land of Egypt with tremendous power and great strength?
Ma Mosis rịọrọ Onyenwe anyị Chineke ya arịrịọ sị ya, “Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị gịnị mere iwe gị ji dị ọkụ otu a nʼebe ndị gị nọ bụ ndị nke i ji ike ebube gị, na ọtụtụ ihe ịrịbama dị ịtụnanya, dupụta site nʼala Ijipt?
12 Why should the Egyptians be able to say, ‘He brought them out with the evil purpose of killing them in the mountains, wiping them off the face of the earth’? Turn from your fierce anger. Please change your mind over the threat against your people.
Nʼihi gịnị ka ndị Ijipt ga-ekwu sị, ‘Ọ bụghị ime ha ihe ọjọọ ka o ji dupụta ha, ka o nwee ike gbuo ha nʼugwu ndị a, ma kpochapụkwa ha site nʼelu ụwa a?’ Site nʼiwe gị dị ọkụ chigharịa, kwere ka ọ dajụọ. Chigharịakwaa site nʼatụmatụ ọjọọ a nʼebe ndị gị nọ.
13 Remember you swore a promise your servants Abraham, Isaac, and Jacob, telling them, ‘I will make your descendants as numerous as the stars of heaven, and give you all the land I promised to them, and they shall own it forever.’”
Cheta nkwa ahụ i kwere ndị ohu gị bụ Ebraham, Aịzik, na Izrel. Nʼihi na i ji onwe gị ṅụọ iyi nye ha sị, ‘Aga m eme ka mkpụrụ gị mụbaa dịka kpakpando nke eluigwe. Aga m enye ha ala m kwere ụmụ ụmụ gị na nkwa ka ọ bụrụ ihe nketa ha ruo mgbe ebighị ebi.’”
14 The Lord changed his mind over the disaster he threatened to cause his people.
Ya mere, Onyenwe anyị gbanwere obi ya. Ọ lakwaghị ha nʼiyi.
15 Moses turned and went down the mountain, carrying the two stone tablets of the Law written on both sides.
Mgbe ahụ, Mosis tụgharịrị site nʼugwu ahụ rịdata, mbadamba nkume abụọ nke iwu ọgbụgba ndụ ahụ dị ya nʼaka. E dere ha ihe nʼihu abụọ, nʼihu nakwa nʼazụ.
16 God had made the tablets, and God had engraved the writing himself.
Mbadamba nkume ndị ahụ bụ akaọrụ Chineke, ihe e dere nʼelu ha bụ ihe Chineke nʼonwe ya dekwasịrị nʼelu mbadamba nkume ndị ahụ.
17 When Joshua heard all the shouting from the camp, he said to Moses, “It sounds like fighting in the camp!”
Mgbe Joshua nụrụ ụzụ si na ndịda ugwu ahụ, nke ụmụ Izrel niile na-eme, ọ gwara Mosis okwu sị, “Ụzụ agha dị nʼọmụma ụlọ ikwu.”
18 But Moses replied, “These are not the shouts of victory or of defeat. What I'm hearing is people partying!”
Ma Mosis zara sị, “Mba, nke a abụghị ụzụ ndị meriri nʼagha, maọbụ ụzụ ndị e meriri nʼagha, kama ọ bụ olu abụ ka m na-anụ.”
19 As he approached the camp he saw the bull calf idol and the dancing. He got so angry that he threw down the stone tablets and smashed them there at the foot of the mountain.
Mgbe Mosis bịaruru nso ebe ahụ ha mara ụlọ ikwu ha, hụ nwa oke ehi ahụ a kpụrụ akpụ na egwu a na-ete, iwe were ya nke ukwuu. Ọ tụpụrụ mbadamba nkume ndị ahụ o ji nʼaka. Kụrie ha na ndịda ugwu ahụ.
20 He took the bull calf and burned it, and ground it into powder. Then he mixed this with water and made the Israelites drink it.
Mosis weere nwa oke ehi ahụ ha kpụrụ akpụ, kpọọ ya ọkụ. Mgbe ahụ, o gweriri ya dịka ntụ. Fesaa ya nʼelu mmiri mee ka ụmụ Izrel ṅụọ mmiri ahụ.
21 Then Moses asked Aaron, “What did these people do to you that you made them sin so badly?”
Ọ gwara Erọn okwu sị, “Gịnị ka ndị a mere gị i ji bute ụdị mmehie ọjọọ dị otu a tụkwasị ha nʼisi?”
22 “Please don't get angry with me, my lord,” Aaron replied, “You yourself know how liable these people are to do evil.
“Erọn zara sị ya, ka iwe gị ghara ịdị ọkụ, onyenwe m. Gị onwe gị maara ndị a, mata otu ha si bụrụ ndị ọjọọ.
23 They told me, ‘Make some gods for us who can lead us because this man Moses who brought us out of the land of Egypt—we don't know what's happened to him!’
Ha sịrị m, ‘Meere anyị chi ndị ga-edu anyị, nʼihi na nwoke a bụ Mosis onye dupụtara anyị site nʼala Ijipt, anyị amaghị ihe mere ya.’
24 So I said to them, ‘Anybody who has gold jewelry, take it off and give it to me.’ I threw the gold into the furnace and out came this bull calf.”
Asịrị m ha, ‘Onye ọbụla nke nwere ihe ịchọ ọma ọlaedo, ya yipu ya.’ Mgbe ahụ, ha wetara m ọlaedo ndị a, nke m tụbara nʼime ọkụ. Ihe si na ya pụta bụ nwa ehi a kpụrụ akpụ!”
25 Moses saw the people going completely wild because Aaron had let them, and that this had brought ridicule on them from their enemies.
Mosis hụrụ na omume ndị a jọgbuziri onwe ya na njọ nʼihi na Erọn mere ka isi kopu ha. Nke mere ka ha bụrụzia ihe ọchị nʼebe ndị iro ha dị.
26 So he went and stood at the entrance to the camp, and shouted out, “Whoever is on the Lord's side, come and join me!” All the Levites gathered around him.
O guzoro nʼọnụ ụzọ ụlọ ikwu ahụ kwuo sị, “Onye ọbụla dịnyeere Onyenwe anyị ya bịakwute m.” Ndị Livayị niile bịakwutere ya.
27 Moses told them, “This is what the Lord, the God of Israel says: Each of you strap on a sword. Then go all through the camp from one end to the other and kill your brothers, friends, and neighbors.”
Mgbe ahụ, ọ sịrị ha, “Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Chineke nke Izrel kwuru, ‘Nwoke ọbụla nyara mma agha ya nʼakụkụ ya, jegharịa nʼetiti ọmụma ụlọ ikwu ụmụ Izrel, site nʼotu isi ruo nʼisi nke ọzọ. Ya gbuo ọbụladị nwanne ya nwoke, maọbụ enyi ya, maọbụ onye agbataobi ya.’”
28 The Levites did what Moses had told them, and that day around 3,000 men were killed.
Ndị Livayị mezuru ihe Mosis gwara ha. Ya mere ndị nwụrụ nʼụbọchị ahụ dị puku mmadụ atọ.
29 Moses told the Levites, “Today you have dedicated yourselves to the Lord because you took action against your sons and brothers. Today you have gained a blessing for yourselves.”
Mgbe ahụ, Mosis gwara ndị Livayị okwu sị, “Taa, unu ekewapụtala onwe unu nye Onyenwe anyị. Nʼihi na unu gburu ụmụ unu ndị ikom na ụmụnne unu ndị ikom. Ugbu a, ọ gọziela unu taa.”
30 The following day Moses spoke to the people, saying, “You have sinned very badly. But now I will go up to the Lord. Maybe I can get him to forgive your sin.”
Nʼechi ya, Mosis gwara ndị Izrel okwu sị ha, “Unu emeela mmehie dị ukwuu megide Onyenwe anyị. Ma aga m alaghachikwuru Onyenwe anyị nʼelu ugwu ahụ rịọọ ya. Ma eleghị anya, aga m arịọta maka ikpuchi mmehie unu.”
31 So Moses went back to the Lord. He said, “Please—the people have sinned very badly by making gods of gold for themselves.
Ya mere, Mosis jekwuuru Onyenwe anyị sị ya, “Biko Onyenwe anyị, ndị a emeela mmehie dị ukwuu megide gị, nʼihi na ha akpụọlara onwe ha chi ọlaedo.
32 But now, if you will, forgive their sin. Otherwise just blot me out of the scroll in which you keep your records.”
Ma ugbu a, biko, gbaghara mmehie ha. Ọ bụrụ na ị gaghị agbaghara ha, biko hichapụ aha m site nʼakwụkwọ ahụ i dere.”
33 But the Lord replied to Moses, “It's those who sinned against me who will be blotted out of my scroll.
Ma Onyenwe anyị zara sị Mosis, “Onye ọbụla mehiere megide m ka a ga-ehichapụ aha ya site nʼakwụkwọ m.
34 Now go and lead the people to the place I told you about. Look, my angel will go before you, but at the time I decide to punish, I will punish them for their sin.”
Ma ugbu a, duru ndị a gaa ebe ahụ m gwara gị. Mmụọ ozi m ga-edu unu nʼije a. Ma otu ọ dị, mgbe m bịara ileta ndị a, aga m ata ha ahụhụ nʼihi mmehie ha.”
35 The Lord brought a plague on the people because they made Aaron make the bull calf.
Ya mere, Onyenwe anyị mere ka ọrịa dị egwu bịakwasị ha, nʼihi ihe ha ji nwa ehi ahụ, bụ nke Erọn kpụrụ mee.