< Deuteronomy 12 >

1 These are the rules and regulations you must make sure to follow the whole time you live in the land that the Lord, the God of your forefathers, has given you to own.
Ndị a bụ iwu na ụkpụrụ niile unu na-aghaghị idebe ogologo ụbọchị niile unu ga-ebi nʼala ahụ, Onyenwe anyị Chineke nna unu ha nyere unu, dịka ihe nweta.
2 You are to completely destroy all the pagan shrines where the nations you're driving out worshiped their gods: on the top of high mountains, on the hills, and under every green tree.
Tikpọọnụ ebe niile nke dị nʼelu ugwu niile dị elu na nʼelu ugwu niile dị nta, nakwa nʼokpuru osisi mgbasa ọbụla, bụ ebe mba niile unu na-anapụ ala ha fere chi niile ha ofufe.
3 Tear down their altars, knock down their idolatrous pillars, burn down their Asherah poles, and cut down the idols of their gods. Remove any trace of them from everywhere.
Kwatuokwanụ ebe ịchụ aja ha niile, tijisie ogidi nsọ ha niile, kpọọkwa osisi Ashera ha ọkụ, gbutukwaanụ arụsị niile a apịrị apị nke chi niile ha. Kpochapụkwanụ aha ha niile site nʼebe niile ahụ.
4 You are not to worship the Lord your God in the way that they did.
Unu agaghị efe Onyenwe anyị Chineke unu ofufe dịka ndị ahụ na-efe arụsị na-eme.
5 No, you must go to the place the Lord your God will choose from the territory of all your tribes to set up a place where he will live with you. That's where you must go.
Kama unu chọpụta ebe ahụ Onyenwe anyị Chineke unu ga-ahọpụta, site nʼetiti ebo Izrel niile, ebe ọ ga-akpọkwasị aha ya. Nʼebe ahụ ka unu ga-abịakwute ya.
6 You'll take there your burnt offerings and sacrifices, your tithes and all your offerings—your freewill offerings and offerings to fulfill a promise, along with the firstborn of your herds and flocks.
Ọ bụkwa nʼebe ahụ ka unu ga-ewetara Onyenwe anyị aja nsure ọkụ unu, na aja ndị ọzọ niile, na otu ụzọ nʼụzọ iri unu, na onyinye pụrụ iche unu, bụ onyinye unu kwere nkwa inye, na onyinye afọ ofufu unu, na onyinye ụmụ mbụ igwe ehi, na igwe ewu na atụrụ unu.
7 That's where, in the presence of the Lord your God, you and your families will eat and celebrate everything you've worked for, because the Lord your God has blessed you.
Unu na ezinaụlọ unu ga-anọkwa nʼebe ahụ, nʼihu Onyenwe anyị Chineke unu, rie oriri unu. Nʼihu ya kwa ka unu ga-aṅụrịkwa ọṅụ, nʼihi ihe niile ahụ unu setịpụrụ aka unu ime, na nʼihi ngọzị Onyenwe anyị Chineke unu gọziri unu.
8 You're not to do like we're doing here today. At the moment everyone does what they think is right,
Unu agaghị emekwa ihe masịrị unu, dịka unu si eme taa, nʼihi na onye ọbụla na-eme ihe ọbụla o chere na o ziri ezi nʼanya ya,
9 because you haven't arrived in the land you will own that the Lord your God is giving you and where you will be at peace.
nʼihi na iwu ndị a ebidobeghị ịdị ire, ebe ọ bụ na unu abanyebeghị nʼebe izuike ahụ, na ihe nketa ahụ Onyenwe anyị Chineke unu na-enye unu.
10 After you cross the Jordan and settle down in the country that the Lord your God is giving you to possess, and he lets you rest from fighting all your enemies and you live in safety,
Kama, mgbe unu gafere osimiri Jọdan, birikwa nʼala ahụ Onyenwe anyị Chineke unu na-enye unu dịka ihe nketa, mgbe Onyenwe anyị nyere unu izuike, meekwa ka unu nwere onwe unu site nʼebe ndị iro unu nọ.
11 then the Lord your God will choose a place where he will live with you. That's where you are to bring everything I've order you to do—your burnt offerings and sacrifices, your tithes and freewill offerings, and all the special gifts you promise to give to the Lord.
Mgbe ahụ, unu ga-eweta ihe ndị ahụ niile m nyere unu nʼiwu: aja nsure ọkụ unu niile, na aja ndị ọzọ, na onyinye ahụ pụrụ iche unu kwere nkwa inye, unu ga-eweta ya nʼebe ahụ Onyenwe anyị Chineke unu họpụtara ebe o kpọkwasịrị aha ya.
12 You will celebrate there in the presence of the Lord your God—you, your sons and daughters, your male and female slaves, and the Levites living in your towns, because they don't have any share in the allotment of land.
Unu na ụmụ unu ndị ikom, na ụmụ unu ndị inyom, na ndị odibo nwoke na nwanyị niile unu, na ndị Livayị bi nʼobodo unu, ndị na-enweghị ihe nketa nke aka ha, ga-anọ nʼebe ahụ ṅụrịa ọṅụ nʼihu Onyenwe anyị Chineke unu.
13 Make sure you don't present your burnt offerings just anywhere you want.
Ị gaghị achụ aja nsure ọkụ gị nʼebe ọbụla masịrị gị,
14 You are to offer them only in the place the Lord will choose in the territory of one of your tribes. That's where you are to do everything that I order you to do.
ọ bụ naanị nʼebe ahụ Onyenwe anyị ga-ahọpụta. Ọ ga-ahọpụta otu ebe, nʼala otu ebo. Ọ bụ naanị nʼebe ahụ ka ị ga-esure aja unu niile, ọ bụkwa nʼebe ahụ ka ị ga-eweta onyinye gị niile.
15 Of course you can slaughter and eat meat wherever you are, anytime you want, depending on how much the Lord your God has blessed you. All of you, whether you're ceremonially clean or not, can it eat it just like you would a gazelle or a deer,
Otu ọ dị, ị pụrụ ịnọ nʼebe ọbụla gbuo anụ ị ga-eri, dịka ọ bụ ele maọbụ mgbada ugbu a. Rie anụ mgbe ọbụla ọ gụrụ gị agụụ, na-erikwa ya mgbe ọbụla i nwetara ya, dịka ngọzị Onyenwe anyị Chineke unu na-enye unu. Ma onye dị ọcha, ma onye na-adịghị ọcha nwere ike iso rie ya.
16 but you are not to eat the blood—pour that out on the ground.
Naanị iwu dị nʼiri anụ ndị a bụ na ị gaghị eri ọbara ya, wụsa ọbara ya nʼala, dịka mmiri.
17 In your towns you must not eat the tithe of your grain or new wine or olive oil, the firstborn of your herds or flocks, any of the offerings that you give to fulfill a promise, your freewill offerings, or your special gifts.
Ma o nweghị onyinye ọbụla a na-enye Onyenwe anyị i kwesiri ịnọ nʼụlọ gị rie. I kwesighị ịnọ nʼụlọ gị rie onyinye ndị a: onyinye otu ụzọ nʼụzọ iri nke ọka na mmanya ọhụrụ gị, na nke mmanụ oliv, na ụmụ mbụ nke igwe ehi na igwe ewu na atụrụ gị, na ihe ọbụla i kwere na nkwa, na onyinye afọ ofufu gị, na onyinye ndị ọzọ pụrụ iche.
18 No, you must eat them in the presence of the Lord your God at the place the Lord your God will choose— you, your sons and daughters, your male and female slaves, and the Levites living in your towns. Celebrate in the presence of the Lord your God in everything you do,
Kama unu ga-eri ha nʼihu Onyenwe anyị bụ Chineke unu, nʼebe ahụ Onyenwe anyị Chineke unu ga-ahọpụta, gị onwe gị, na ụmụ gị ndị nwoke na ụmụ gị ndị nwanyị, na ndị odibo nwoke na nwanyị niile unu, na ndị Livayị si nʼobodo unu niile, unu ga-aṅụrịkwa ọṅụ nʼihu Onyenwe anyị bụ Chineke unu, nʼihe niile aka gị rụpụtara.
19 and make sure you don't forget about the Levites as the whole time you live in your land.
Echefukwala ndị Livayị, gị na ha ga na-enwekọ ihe ndị a niile, ogologo ụbọchị niile i biri nʼala ahụ.
20 When the Lord your God gives you more land as he promised, and you feel like some meat, and say, “I want to have some meat,” you may can it whenever you want.
Mgbe Onyenwe anyị, bụ Chineke gị mere ka oke ala gị saa mbara, dịka o kwere gị na nkwa, i nwee oke agụụ maka iri anụ na-asị, “Achọrọ m iri anụ,” mgbe ahụ, i nwere ike rie anụ dịka i si chọọ.
21 If the place where the Lord your God chooses to live with you is a long way away, then you can slaughter any animal from the herd or flock he has given you, following the regulations I have given you, and you can eat it in your town whenever you want.
Ọ bụrụ nʼebe ahụ Onyenwe anyị Chineke gị kpọkwasịrị aha ya dị gị anya site nʼebe i nọ, i nwere ike gbuo anụ ụlọ site nʼigwe ehi maọbụ ewu na atụrụ nke Onyenwe anyị nyere gị, dịka m si nye gị nʼiwu. Gbuo ha nʼobodo ebe i bi, riekwa ha otu ị chọrọ.
22 In fact you can eat it like you would eat a gazelle or deer—whether you're ceremonially clean or not, you can eat it.
Rie ha dịka ị ga-esi rie ele maọbụ mgbada. Onye ọbụla nʼime unu nwere ike rie ya, ma onye dị ọcha ma onye na-adịghị ọcha.
23 Just make sure you don't eat the blood, because the blood is the life, and you must not eat the life with the meat.
Ma lezie anya hụ na i righị ọbara, nʼihi na ndụ dị nʼọbara. Ị gaghị erikọta anụ ọbụla na ndụ ya.
24 You must not eat the blood; pour it out on the ground.
Erila ọbara, wụsa ya nʼala dịka mmiri.
25 Don't eat it, so that all will go well with you and your children, because you will be doing what is right in the Lord's sight.
Erila ya, ka ihe si otu a gaara gị na ụmụ ụmụ gị nke ọma, nʼihi na ị na-eme ihe ziri ezi nʼanya Onyenwe anyị.
26 Take your holy sacrifices and the offerings to fulfill your vows and go to the place the Lord will choose.
Ma were ihe ndị ahụ niile i doro nsọ, ya na ihe ọbụla i kwere Onyenwe anyị na nkwa gaa nʼebe ahụ Onyenwe anyị ga-ahọpụta.
27 Present your burnt offerings, the meat and blood, on the altar of the Lord your God. The blood of your other sacrifices is to be poured out beside the altar of the Lord your God, but you are allowed to eat the meat.
Chụọ aja nsure ọkụ nʼelu ebe ịchụ aja Onyenwe anyị Chineke gị, ma anụ na ọbara. A ghaghị ịwụsa ọbara anụ ahụ e ji chụọ aja nʼakụkụ ebe nchụaja nke Onyenwe anyị Chineke gị. Ma i nwere ike rie anụ ahụ e ji chụọ aja.
28 Make sure you obey everything I'm commanding you, so that it may always go well with you and your children, because you will be following what is good and right in the sight of the Lord your God.
Lezie anya, debe iwu ndị a niile m na-enye gị. Ọ bụrụ na i mee ya, ihe ga-agara gị na ụmụ gị nke ọma, nʼihi na ọ bụ ihe dị mma nʼanya Onyenwe anyị Chineke gị, na ihe ziri ezi ka ị ga na-eme.
29 When the Lord your God destroys the nations ahead of you as you enter the country to possess, and you drive them out and settle down in their land,
Onyenwe anyị Chineke gị ga-ala mba niile bi nʼala ahụ ị na-aga ibuso agha nʼiyi. Ma mgbe i si nʼala ahụ chụpụ ha, ị ga-ebichi nʼala ha.
30 make sure you don't fall into the trap of following their ways after they have been destroyed right in front of you. Don't try and find out about their gods, asking, “I wonder how these people worship their gods? I'll do like they did.”
Mgbe ị lachara ha nʼiyi, lezie anya ka ị ghara ịma nʼọnya, site nʼịjụ ajụjụ ka ịjụpụta otu ha si efe chi ha, na-asị, “Mba ndị a o si aṅaa na-efe chi ha ofufe? Anyị ga-emekwa otu a.”
31 You must not worship the Lord your God like this, because when they worship their gods they do every kind of abominable thing that the Lord hates. They even burn their sons and daughters as sacrifices to their gods!
Efekwala Onyenwe anyị bụ Chineke gị dịka ha si efe chi ha, nʼihi na mgbe ha na-efe chi ha ofufe, ha na-eme ihe arụ dị iche iche nke Onyenwe anyị kpọrọ asị. Ọ bụladị ụmụ ha ndị ikom na ndị inyom ka ha na-esure nʼọkụ nye chi ha dị iche iche dịka aja.
32 Be careful to do everything I order you to do. Don't add or take away anything from these instructions.
Lezienụ anya hụ na unu na-eme ihe niile bụ nke m nyere unu nʼiwu. Unu etinyela ihe nʼime ya maọbụ wepụkwa ihe site na ya.

< Deuteronomy 12 >