< 2 Samuel 2 >

1 Sometime after this, David asked the Lord, “Should I go to one of the towns of Judah?” “Yes, do it,” the Lord replied. “Which one should I go to?” David asked. “Go to Hebron,” said the Lord.
Dịka oge na-aga, Devid jụrụ Onyenwe anyị ase sị, “M ga-ebili gbagoo nʼotu obodo dị na Juda?” Onyenwe anyị sịrị, “Gbagoo.” Devid jụkwara, “Olee ebe m ga-agbago?” Onyenwe anyị zara, “Hebrọn.”
2 So David moved there with his two wives, Ahinoam from Jezreel and Abigail, Nabal's widow from Carmel.
Devid na nwunye ya abụọ, Ahinoam onye Jezril, na Abigel nwunye ochie Nebal onye Kamel gara nʼebe ahụ.
3 He also brought the men who were with him, along with their families, and they settled in the villages near Hebron.
Devid kpọkwaara ndị ikom ahụ ya na ha so, onye ọbụla nʼime ha durukwaara ezinaụlọ ya, ga biri na Hebrọn na obodo ndị ọzọ gbara ya gburugburu.
4 Then the men of Judah came to Hebron, and there they anointed David king of the people of Judah. When David found out that it was the men from Jabesh Gilead who had buried Saul,
Ndị ikom Juda bịakwutere Devid na Hebrọn. Tee ya mmanụ ịbụ eze ebo Juda niile. Mgbe Devid nụrụ na ọ bụ ndị ikom Jebesh Gilead liri Sọl,
5 he sent messengers to them, saying, “May the Lord bless you, because you demonstrated your loyal love to Saul your master, and you buried him properly.
o zigaara ha ndị ozi ka ha sị ha, “Ka Onyenwe anyị gọzie unu nʼihi obiọma unu gosiri site nʼili Sọl, nna unu ukwu, nʼụzọ kwesiri ekwesi.
6 Now may the Lord show you loyal love and trustworthiness, and I will also be good to you because of what you did for Saul.
Ka Onyenwe anyị gosikwa unu obiọma na ikwesi ntụkwasị obi. Mụ onwe m ga-egosikwa unu otu ụdị amara a, nʼihi ihe a unu mere.
7 So be strong and be brave, for even though Saul your master is dead, the people of Judah have anointed me as their king.”
Ma ugbu a, bụrụnụ dike na dimkpa, nʼihi na Sọl nna unu ukwu anwụọla. Ọzọkwa, ndị Juda niile eteela m mmanụ ịbụ eze ha.”
8 However, Abner, son of Ner, commander of Saul's army, had taken Ishbosheth, son of Saul, to Mahanaim.
Ma Abna nwa Nea, ọchịagha ndị agha Sọl edurularịị Ishboshet, nwa Sọl, dubata ya nʼobodo Mahanaim.
9 There he set up Ishbosheth as king over Gilead, Asher, Jezreel, Ephraim, and Benjamin, in fact over all Israel.
Ọ nọrọ nʼebe ahụ mee ya eze ndị Gilead, ndị Ashuri na ndị Jezril; na ndị Ifrem, ndị Benjamin na Izrel niile.
10 Ishbosheth, son of Saul, was forty when he became king over Israel, and he reigned for two years. However, the people of Judah were on David's side.
Ishboshet nwa Sọl gbara iri afọ anọ mgbe ọ ghọrọ eze ndị Izrel. Ọ chịkwara afọ abụọ. Ma otu ọ dị, ndị Juda niile nọgidere nʼokpuru Devid.
11 David ruled in Hebron as king over the people of Judah for seven years and six months.
Ogologo oge niile Devid chịrị dịka eze ndị Juda na Hebrọn bụ afọ asaa na ọnwa isii.
12 One day Abner and Ishbosheth's men left Mahanaim and went to the town of Gibeon.
Otu ụbọchị, Abna nwa Nea, duuru ndị agha Ishboshet nwa Sọl site na Mahanaim jee Gibiọn.
13 Joab, son of Zeruiah, and David's men set off and met them at the pool of Gibeon, where they all sat down, facing each other across the pool.
Ma Joab, nwa Zeruaya dukwaara ndị agha Devid pụọ izute ha nʼọdọ mmiri Gibiọn. Otu ndị nọdụrụ ala nʼotu akụkụ ọdọ mmiri, ndị nke ọzọ nʼakụkụ ọzọ nke ọdọ mmiri ahụ. Ha cherịtara onwe ha ihu.
14 Abner said to Joab, “Why not let's have some of the men fight in hand to hand combat before us.” “Fine,” Joab agreed.
Abna gwara Joab sị, “Ka ụfọdụ ụmụ okorobịa pụta nʼihu anyị maa aka mgba.” Joab sịrị, “Ka ha pụta.”
15 So twelve men came forward from each side—twelve for Benjamin and Ishbosheth, and twelve for David.
Ha pụtara ka a gụpụtachara ha. Ha dị mmadụ iri na abụọ site nʼetiti ndị agha Benjamin na Ishboshet nwa Sọl, mmadụ iri na abụọ site nʼetiti ndị agha Devid.
16 Each man grabbed his opponent's head and drove his sword into his opponent's side so that they all fell down dead together. That's why this place in Gibeon is called the Field of Sword-edges.
Nwoke ọbụla jidere ibe ya nʼisi were mma agha ya manye ya nʼakụkụ, si otu a wetara onwe ha ọnwụ. Ọ bụ nke a mere e ji kpọọ ebe ahụ dị na Gibiọn, Helkat Hazurim, nke pụtara Ala mma agha.
17 The battle that followed was hard-fought, but eventually Abner and his men were defeated by David's men.
Agha siri ike dara nʼụbọchị ahụ. Ma ndị agha Devid lụgburu Abna na ndị agha Izrel.
18 The three sons of Zeruiah were there: Joab, Abishai, and Asahel. Asahel was a fast runner, like a gazelle racing across the open countryside.
Ụmụ Zeruaya atọ nọ nʼebe ahụ, ya bụ, Joab, na Abishai na Asahel. Asahel bụ nwoke na-agba ọsọ dịka mgbada.
19 He chased after Abner with single-minded determination.
Ọ chụwara Abna ọsọ, ọ dịghị mgbe ọ tụgharịrị gaa nʼaka nri maọbụ nʼaka ekpe mgbe ọ nọ na-achụ ya ọsọ.
20 Abner looked back and asked, “Is that you, Asahel?” “Yes, it's me,” Asahel replied.
Mgbe Abna lere anya nʼazụ hụ ya ka ọ na-abịa, ọ kpọrọ ya oku sị ya, “Ọ bụ gị Asahel?” Asahel zara sị, “Ọ bụ m.”
21 Abner told him, “Leave me alone! Go and fight somebody else and take his weapons for yourself!” But Asahel refused to stop chasing him.
Abna gwara ya okwu sị ya, “Tụgharịa nʼakụkụ aka nri maọbụ aka ekpe, jide otu nʼime ụmụ okorobịa ndị a. Napụ ya ngwa agha ya niile.” Ma Asahel akwụsịghị ịchụ ya ọsọ.
22 Abner warned Asahel again. “Stop chasing me!” he shouted. “Why do you want me to kill you? How could I ever face your brother Joab?”
Abna gwara Asahel ọzọ sị, “Laghachi azụ. Kwụsị ịchụ m ọsọ! Gịnị mere m ga-eji tigbuo gị? Olee otu m ga-esi lekwasị nwanne gị Joab anya nʼihu ma m gbuo gị?”
23 But Asahel wouldn't stop chasing him, so Abner drove the handle of his spear into his belly. It came out the back, and he fell down dead right there. Everyone who passed by stopped at the place where Asahel had fallen and died.
Ma Asahel jụrụ ịlaghachi azụ. Nʼihi ya, Abna weere isi ùbe ya mapuo ya afọ. Ùbe ahụ sikwa ya nʼazụ pụta. Ọ dara nʼala, nwụọ otu mgbe ahụ. Ndị niile bịaruru ebe ahụ ọ dara nwụọ kwụsịrị. Ha agakwaghị nʼihu ịchụ ndị ọzọ.
24 But Joab and Abishai set off to chase after Abner. By the time the sun went down they had got as far as the hill of Ammah near Giah, on the way to the wilderness of Gibeon.
Ma Joab na Abishai chụgidere Abna ọsọ. Anwụ adaala mgbe ha bịarutere nʼugwu nta Ama, nke dị Gịa nso, nʼụzọ e si aga nʼọzara Gibiọn.
25 Abner's men from the tribe of Benjamin rallied to him there, forming a tight group around him standing at the top of the hill.
Ndị ikom Benjamin chịkọtara onwe ha ọnụ dịnyere Abna. Ha niile guzooro nʼelu otu ugwu dịka otu usuu ndị agha.
26 Abner shouted to Joab: “Do we have to keep killing each other forever? Don't you realize that if we go on it'll only get worse? How long are you going to wait before you order your men to stop chasing their brothers?”
Mgbe ahụ, Abna kpọrọ Joab oku sị ya, “Ọ bụ ruo ole mgbe ka anyị ga na-eji mma agha na-egburita onwe anyị? Olee mgbe ị ga-akpọghachi ndị gị ka ha hapụ ịchụ na igbu ụmụnne ha? Ị maghị na ihe dị otu a ga-eweta obi ilu?”
27 “As God lives,” Joab replied, “if you had not said anything, my men would have continued chasing their brothers until the morning.”
Joab zara sị, “Eji m aha Chineke ṅụọ iyi na-asị na ọ bụrụ na i gbara nkịtị, ndị a gaara achụso ụmụnna ha ọsọ na-akwụsịghị ruo nʼụtụtụ echi.”
28 Joab blew the horn so all the men stopped—they didn't continue chasing or fighting the Israelites.
Mgbe ahụ, Joab fụrụ opi ike ya. Nke a mere ka ndị ya kwụsị ịchụ ndị Izrel. Ha kwụsịkwara ibu agha.
29 All through the night Abner and his men marched through the Jordan Valley. They crossed the Jordan River, and continued all morning until they arrived back at Mahanaim.
Nʼabalị ahụ, Abna na ndị ikom ya jere ije gafee ndagwurugwu Jọdan, gabigakwa osimiri Jọdan, jee ije nʼụtụtụ echi ya tutu ha eruo Mahanaim.
30 When Joab got back from chasing Abner, he gathered all the men together. Nineteen of David's men were missing in addition to Asahel.
Joab kwụsịrị ịchụ Abna ọsọ, ọ chịkọtara ndị agha niile. Mgbe ọ gụrụ ha ọnụ, ọ chọpụtara na mmadụ iri na itoolu nʼime ndị ikom Devid, tinyere Asahel nwanne ya, bụ ndị na-alọtaghị agha.
31 However, they had killed three hundred and sixty of Abner's men from the tribe of Benjamin.
Ma ndị ikom Devid gburu narị ndị agha Benjamin atọ na iri isii, bụ ndị so Abna.
32 They took Asahel's body and buried him in his father's tomb in Bethlehem. Then they marched all through the night and reached Hebron at dawn.
Emesịa, Joab na ndị agha ya buuru ozu Asahel gaa lie ya na Betlehem, nʼili nna ya. Ha jere ije abalị ahụ niile tutu ha erute Hebrọn mgbe chi bidoro ịbọ.

< 2 Samuel 2 >