< 1 Chronicles 26 >

1 This is a list of the divisions of the gatekeepers. From the Korahites: Meshelemiah son of Kore, one of the sons of Asaph.
Usoro otu ndị nche ọnụ ụzọ ụlọnsọ ahụ. Site na ndị Kora: Meshelemaia, nwa Kore, otu nʼime ụmụ Asaf.
2 The sons of Meshelemiah: Zechariah (first), Jediael (second), Zebadiah (third), Jathniel (fourth),
Meshelemaia nwekwara ụmụ ndị ikom: nke mbụ bụ Zekaraya, na Jediael nke abụọ, Zebadaya, bụ nke atọ, Jatniel, nke anọ
3 Elam (fifth), Jehohanan (sixth), and Eliehoenai (seventh).
Elam, nke ise na Jehohanan, bụ nke isii na Eliehoenai bụ onye nke asaa.
4 The sons of Obed-edom: Shemaiah (first), Jehozabad (second), Joah (third), Sacar (fourth), Nethanel (fifth),
Obed-Edọm nwekwara ụmụ ndị ikom. Ha bụ ndị a: Shemaya, nwa mbụ ya, Jehozabad, osote ya, Joa, nke atọ, Saka, bụ onye nke anọ Netanel, nke ise,
5 Ammiel (sixth), Issachar (seventh), and Peullethai (eighth), for God had blessed Obed-edom.
Amiel, nke isii Isaka, nke asaa na Peuletai, onye bụ onye nke asatọ. Nʼihi na Chineke gọziri Obed-Edọm.
6 Shemaiah, Obed-edom's son, had sons who were capable leaders and had great authority in their father's family
Shemaya, nwa ya mụtakwara ụmụ ndị ikom, ndị bụ ndị ndu nʼezinaụlọ nna ha, nʼihi na ha bụ dike na dimkpa.
7 The sons of Shemaiah: Othni, Rephael, Obed, and Elzabad. His relatives, Elihu and Semakiah, were also capable men.
Ụmụ ndị ikom Shemaya bụ, Otni, Refael, Obed na Elzabad; ụmụnne ya bụ Elihu na Semakaya bụkwa dike na dimkpa.
8 All these descendants of Obed-edom, plus their sons and grandsons, a total of sixty-two, were capable men, well qualified for their service.
Ndị a niile bụ ụmụ ụmụ Obed-Edọm; ha na ụmụ ha ndị ikom, na ndị ikwu ha niile bụ dimkpa ndị nwere ike ịrụ ọrụ ahụ. Ha niile bụ ụmụ ụmụ Obed-Edọm. Ha dị iri isii na abụọ nʼọnụọgụgụ.
9 Meshelemiah's eighteen sons and brothers were also capable men.
E sitekwara nʼezinaụlọ Meshelemaia họpụta ndịisi iri na asatọ ndị bụkwa ezi ndị ndu.
10 Hosah, one of the sons of Merari, made Shimri as leader among his sons, though he was not the firstborn.
Hosa, nwa Merari nwekwara ụmụ ndị ikom: Shimri onye nke mbụ (ọ bụ ezie na ọ bụghị ọkpara ya ma nna ya họpụtara ya ka ọ bụrụ onye mbụ).
11 His other sons included Hilkiah (second), Tebaliah (third), and Zechariah (fourth). The total of Hosah's sons and relatives was thirteen.
Hilkaya, nke abụọ, Tebalaya, nke atọ na Zekaraya onye nke anọ. Ụmụ ndị ikom na ụmụnne Hosa nwere dị iri na atọ.
12 These divisions of the gatekeepers, through their family leaders, served in the house of the Lord, just like their brothers.
E kere ndị nche ụlọnsọ ukwu niile nʼotu nʼotu. Otu ndị a nwekwara ndịisi. E kenyekwara otu ọbụla ọrụ dịka e si kenye ụmụnna ha ọrụ ha nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị.
13 Every gate was assigned by lot to different families, the least important equal to the most important.
E sitere nʼife nza kenye ma nwantakịrị ma okenye, ọnụ ụzọ ha ga-eche nche, dịka ezinaụlọ ha si dị.
14 The lot for the east gate fell to Meshelemiah. Then they cast lots for his son Zechariah, a wise counselor with insight, and the lot for the north gate fell to him.
Site nʼife nza, Shelemaya ketara iche ọnụ ụzọ dị nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ nche. Zekaraya nwa ya, onye ndụmọdụ nwere uche, sitekwara nʼife nza keta iche ọnụ ụzọ dị nʼakụkụ ugwu, ya na ndị otu ya.
15 The lot for the south gate fell to Obed-edom, and the lot for the storehouse fell to his sons.
Obed-Edọm na ndị otu ya na-eche ụzọ dị na ndịda. Ụmụ ya bụ ndị na-eche ụlọ ebe a na-achịkọta ihe.
16 Shuppim and Hosah received the west gate and the gate of Shallecheth on the road that leads up. They were always guarded.
Shupim na Hosa na-eche ọnụ ụzọ dị nʼọdịda anyanwụ ya na ọnụ ụzọ ama Shaleket nke dị nʼụzọ elu elu. Ndị nche na-esota ndị nche ibe ha.
17 There were six Levites on duty every day at the east gate, four at the north gate, four at the south gate, and two at a time at the storehouse.
Ya mere, ọ bụ ndị Livayị isii na-eche nche nʼọnụ ụzọ dị nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ ụbọchị niile. Mmadụ anọ na-anọ nʼugwu, anọ na ndịda, abụọ nʼebe a na-achịkọbata ihe.
18 Six were on duty every day at the west gate, four at the main road, and two at the courtyard.
Nʼogige nke dị nʼọdịda anyanwụ e nwere ndị nche anọ nʼụzọ, ndị nche abụọ ọzọ nʼime ogige nʼonwe ya.
19 These were the divisions of the gatekeepers from the sons of Korah and the sons of Merari.
A họpụtara ndị nche ndị a site nʼikwu Kora na Merari.
20 Other Levites under Ahijah were in charge of the treasuries of the house of God and the treasuries of the what had been dedicated to God.
Ụfọdụ ndị Livayị ka e nyefere ọrụ ilekọta ụlọakụ, na ụlọ a na-echekọta onyinye niile e doro nsọ nke e webatara nʼụlọnsọ ukwu Chineke.
21 From the sons of Ladan, who were the descendants of the Gershonites through Ladan, and were the family leaders of Ladan the Gershonite: Jehieli.
Ndị agbụrụ Ladan, ndị si nʼikwu Geshọn, ndị bụ ndịisi ezinaụlọ nna ha Ladan, bụ onye Geshọn, bụ Jehieli,
22 The sons of Jehieli, Zetham and his brother Joel, were in charge of the treasuries of the house of the Lord.
na ụmụ ndị ikom Jehieli, Zetam na nwanne ya nwoke Juel. Ndị a bụ ndị na-elekọta ụlọakụ niile dị nʼụlọnsọ Onyenwe anyị.
23 From the Amramites, the Izharites, the Hebronites, and the Uzzielites:
Site na ndị Amram, na ndị Izha, na ndị Hebrọn, na ndị Uziel.
24 Shebuel, a descendant of Gershom, son of Moses, who was the chief officer in charge of the treasuries.
Shubuel nwa Geshọm, na nwa nwa Mosis ka e nyere ọrụ ịbụ onyeisi ụlọakụ dị nʼụlọnsọ ahụ.
25 His relatives by Eliezer were Rehabiah, Jeshaiah, Joram, Zicri, and Shelomoth.
Ụmụnna ya site na Elieza bụ ndị a, Rehabaya nwa ya nwoke, Jeshaya nwa nwoke Rehabaya, Joram nwa nwoke Jeshaya na Zikri nwa nwoke Shelomit.
26 Shelomoth and his relatives were in charge of all the treasuries for all that had been dedicated by King David, by the family leaders who were the commanders of thousands and of hundreds, and by the army commanders.
Shelomit na ụmụnna ya ka ọ dị nʼaka ilekọta ụlọakụ nke ihe nsọ niile, nke Devid bụ eze, na ndịisi ezinaụlọ niile, ndị bụ ndịisi agha na-achị ọtụtụ puku ndị agha, na ndịisi agha na-achị ọtụtụ narị ndị agha, na ndịisi agha ndị ọzọ, doro nsọ.
27 They dedicated a part of the plunder they had won in battle to help maintain the house of the Lord.
Ụfọdụ ihe agha na ihe sitere nʼihe a kwatara nʼagha ka ha doro nsọ maka idozi ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị.
28 Shelomoth and his relatives also looked after the gifts dedicated to the Lord by Samuel the seer, Saul son of Kish, Abner son of Ner, and Joab son of Zeruiah. All the dedicated gifts were the responsibility of Shelomoth and his relatives.
Ya na ihe niile nke Samuel, bụ onye ọhụ ụzọ, na Sọl, nwa Kish na Abna, nwa Nea na Joab, nwa Zeruaya na ihe niile ndị ọzọ e doro nsọ. Ọ bụ nʼaka Shelomit na ụmụnna ya ka ọ dị ilekọta ha.
29 From the Izharites: Kenaniah and his sons were given outside duties as officials and judges over Israel.
Site nʼikwu Izha, Kenaniya, na ụmụ ndị ikom ya ka ozi dịrị pụọ nʼụlọnsọ, dịka ndịisi na ndị ikpe nye ndị Izrel.
30 From the Hebronites: Hashabiah and his relatives, 1,700 capable men, were put in charge of the Israel west of the Jordan, responsible for everything involving the Lord's work and the king's service.
Site na ndị Hebrọn, Hashabaya na ụmụnna ya ndị bụkwa dimkpa, ọnụọgụgụ ha dị otu puku na narị asaa, ka e mere ndịisi ala Izrel dị nʼakụkụ ọdịda anyanwụ osimiri Jọdan. Ihe niile banyere ọrụ Onyenwe anyị, na ijere eze ozi dị ha nʼaka.
31 Also from the Hebronites came Jerijah, the leader of the Hebronites according to the family genealogies. In the fortieth year of David's reign the records were examined, and men of great ability were discovered at Jazer in Gilead.
Jeraya bụ onyendu ndị Hebrọn, dịka akwụkwọ e dekọrọ usoro ọmụmụ si gosi. Nʼihi na nʼafọ nke iri anọ nke ọchịchị eze Devid nʼIzrel, ka e mere nnyocha nʼakwụkwọ usoro ọmụmụ chọpụta na e nwere ndị dị ike ọrụ nʼetiti ndị Hebrọn. A chọpụtara ndị a nʼobodo Jeza nke dị na Gilead.
32 Among the relatives of Jerijah were 2,700 capable men who were family leaders. King David put them in charge of the tribes of Reuben and Gad and the half-tribe of Manasseh. They were responsible for everything involving the Lord's work and the king's service.
Jeraya nwere ndị ikwu ya, ndị bụ dimkpa, na ndị dị ike ọrụ, ọnụọgụgụ ha dị puku abụọ na narị asaa. Ndị a niile bụkwa ndị ndu ezinaụlọ dị iche iche. Ya mere, Devid, eze Izrel, mere ha ndịisi ebo Ruben, na ebo Gad, na ọkara ebo Manase. Ọrụ ha bụ ilekọta ihe banyere ofufe Chineke na ije ozi niile metụtara eze.

< 1 Chronicles 26 >