< 1 Chronicles 23 >

1 When David was old, having lived a long life, he made his son Solomon king of Israel.
Mgbe Devid ghọrọ nnọọ agadi, ụbọchị ndụ ya jukwara ya afọ, o mere Solomọn nwa ya, eze Izrel.
2 He also summoned all the leaders of Israel, the priests, and the Levites.
Nʼoge a, ọ kpọkọtara ndị ndu Izrel niile, tinyekwara ndị nchụaja na ndị Livayị.
3 The Levites over thirty years old were counted, and there was 38,000 in total.
A gụrụ ndị Livayị niile ọnụ, bụ ndị gbara iri afọ atọ gbagoo, chọpụta na ha dị iri puku ndị ikom atọ na asatọ nʼọnụọgụgụ.
4 “Of these 24,000 will be in charge of the work of the house of the LORD, while 6,000 will be officers and judges,” David instructed.
Devid sịrị, “Nʼime ndị a, ka iri puku ndị ikom abụọ na anọ bụrụ ndị ga-ahụ maka ọrụ ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, puku ndị ikom isii a bụrụ ndịisi na ndị ikpe,
5 “And 4,000 will be gatekeepers, while 4,000 will praise the Lord using the musical instruments I have provided for praise worship.”
puku ndị ikom anọ abụrụ ndị nche ọnụ ụzọ ama, ebe puku ndị ikom anọ ndị ọzọ ga-eji ihe egwu dị iche iche nke m kwadobere maka ito Onyenwe anyị, na-eto ya.”
6 David divided them into sections corresponding to the sons of Levi: Gershon, Kohath, and Merari.
Devid kewara ndị Livayị nʼoke, nʼoke dịka ụmụ ndị ikom Livayị si dị: Geshọn, Kohat na Merari.
7 The sons of Gershon: Ladan and Shimei.
E kekwara ikwu Geshọn ụzọ abụọ dịka ụmụ ya si dị, Ladan na Shimei.
8 The sons of Ladan: Jehiel (chief), and Zetham, and Joel, three in total.
Ndị sitere nʼezinaụlọ Ladan dị ndị ikom atọ: Jehiel, onyeisi ha, Zetam na Juel.
9 The sons of Shimei: Shelomoth, Haziel, and Haran, three in total. These were the leaders of the families of Ladan.
Ụmụ Shimei bụ, Shelomot, Haziel na Haran, ha dị ndị ikom atọ. Ndị a niile bụ ndịisi ezinaụlọ nʼikwu Ladan.
10 The sons of Shimei: Jahath, Zizah, Jeush, and Beriah—four in total.
Ụmụ Shimei bụ, Jahat, Ziza, Jeush na Beriya. Ha dị ndị ikom anọ.
11 Jahath (chief), and Zizah (second); but because Jeush and Beriah did not have many sons they were counted as a single family.
Jahat bụ onye mbụ, Ziza onye nke abụọ. Ma Jeush na Beriya amụtaghị ọtụtụ ụmụ ndị ikom. Nʼihi ya, a gụnyekọtara ha dịka otu ezinaụlọ, kenye ha otu ọrụ.
12 The sons of Kohath: Amram, Izhar, Hebron, and Uzziel—a total of four.
Ụmụ ndị ikom Kohat bụ Amram, Izha, Hebrọn na Uziel. Ha dị ndị ikom anọ.
13 The sons of Amram: Aaron and Moses. Aaron was dedicated to service with the most holy things, that he and his sons should always present offerings to the Lord, and minister before him, and give blessings in his name forever.
Ụmụ ndị ikom Amram bụ, Erọn na Mosis. Erọn ka e kewapụrụ iche, ido ya nsọ ya na ụmụ ya ruo ebighị ebi, maka ido ihe niile kachasị nsọ nsọ, ịchụ aja nʼihu Onyenwe anyị, ije ozi nʼihu ya nakwa ikwupụta ngọzị nʼaha ya ruo ebighị ebi.
14 As for Moses, the man of God, his sons were included with the tribe of Levi.
Ụmụ Mosis, onye nke Chineke ka a gụnyekọtara dịka ndị si nʼebo Livayị.
15 The sons of Moses: Gershom and Eliezer.
Ụmụ ndị ikom Mosis bụ, Geshọm na Elieza.
16 The sons of Gershom: Shebuel (chief).
Ụmụ ndị ikom Geshọm bụ Shubuel, onye mbụ.
17 The sons of Eliezer: Rehabiah (chief). Eliezer had no other sons, but Rehabiah had many sons.
Ụmụ ụmụ Elieza bụ Rehabaya onye mbụ. Elieza amụtaghị ụmụ ndị ikom ọzọ, ma ụmụ ndị ikom Rohabaya dị ọtụtụ.
18 The sons of Izhar: Shelomith (chief).
Ụmụ ndị ikom Izha bụ Shelomit onye mbụ.
19 The sons of Hebron: Jeriah (chief), Amariah (second), Jahaziel (third), and Jekameam (fourth).
Ụmụ ndị ikom Hebrọn bụ Jereaya onye mbụ, na Amaraya, onye nke abụọ, Jahaziel onye nke atọ, na Jekameam, onye nke anọ.
20 The sons of Uzziel: Micah (chief) and Isshiah (second).
Ụmụ ndị ikom Uziel bụ Maịka, onye mbụ, na Ishaya, onye nke abụọ.
21 The sons of Merari: Mahli and Mushi. The sons of Mahli: Eleazar and Kish.
Ụmụ ndị ikom Merari bụ Mahali na Mushi Ụmụ ndị ikom Mali bụ Elieza na Kish
22 Eleazar died without having sons, only daughters. Their cousins, the sons of Kish, married them.
Elieza nwụrụ na-amụtaghị ụmụ ndị ikom. Ọ bụ naanị ụmụ ndị inyom ka ọ mụtara. Ụmụ nwanne nna ha, ụmụ ndị ikom Kish, lụrụ ha.
23 The sons of Mushi: Mahli, Eder, and Jeremoth—three in total.
Ụmụ ndị ikom Mushi bụ Mahali, Eda na Jeremot. Ha dị ndị ikom atọ.
24 These were the descendants of Levi by family, the heads of families chiefs listed individually by name—those twenty years of age or more who served in the house of the Lord.
Ndị a bụ ụmụ ụmụ Livayị dịka ezinaụlọ ha si dị, ndịisi ezi, dịka e si debanye aha, na dịka e si gụọ ha ọnụ nʼotu nʼotu, ya bụ ndị na-arụ ọrụ nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, ndị gbara iri afọ abụọ gbagoo.
25 For David said, “The Lord, the God of Israel, has given peace to his people, and he will live in Jerusalem forever.
Nʼihi na Devid kwuru sị, “Ebe ọ bụ na Onyenwe anyị, Chineke Izrel enyela ndị ya udo, ebe ọ bụkwa na ọ ga-ebi na Jerusalem ruo ebighị ebi.
26 So the Levites don't need to carry the Tent any longer, or anything needed for its service.”
Ugbu a, ọ dịkwaghị mkpa ọ dị na ndị Livayị ga na-ebugharị ụlọ ikwu, maọbụ ngwongwo ọbụla nke ije ozi niile ya.”
27 In accordance with David's final instructions, Levites twenty years of age or more were counted.
Ịgụ ndị Livayị ọnụ bụ otu nʼime ihe ikpeazụ Devid mere tupu ọ nwụọ. A gụrụ ndị Livayị gbara iri afọ abụọ gbagoo ọnụ.
28 Their assignment was to help the descendants of Aaron with the service of the house of the Lord They were responsible for the courtyards and rooms, for cleansing all the holy things, and the work of the service of the house of God.
Ọrụ e nyere ndị Livayị niile bụ inyere ụmụ Erọn ndị nchụaja aka nʼofufe nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị: ilekọta ogige, na ọnụụlọ nta ndị dị nʼakụkụ ya niile, na ime ka ihe nsọ niile dị ọcha, na ịrụ ọrụ ọbụla e nyere ha nʼụlọ Chineke.
29 They were also responsible for the showbread that was placed on the table, the special flour for the grain offerings, the unleavened bread, the baking, the mixing, and dealing with all amounts and measurements.
Ọ bụkwa ọrụ ha iwebata achịcha a na-eche nʼihu Chineke, na ụtụ ọka e ji enye onyinye mkpụrụ ọka, na achịcha mbadamba a na-ejighị ihe na-eko achịcha mee. Ọrụ ha bụkwa ịgwakọta ihe e ji eme achịcha, na ighe ya, na ilekọta ihe ọtụtụ niile e ji atụ ihe.
30 They also had to stand every morning to give thanks and praise to the Lord, and do the same in the evening,
Ụtụtụ ọbụla, na anyasị ọbụla, ọ bụ ọrụ ha iguzo nʼihu Onyenwe anyị ịbụ abụ otuto, na ekele.
31 and whenever burnt offerings were presented to the Lord whether on Sabbaths, new moons, and feast days. They were to serve regularly before the Lord according to the number required for them.
Ha na-enyekwa aka nʼihe gbasara aja nsure ọkụ a na-achụ nʼụbọchị izuike, na nʼoge mmemme ọnwa ọhụrụ, na mmemme ndị ọzọ niile a kara aka. Mgbe niile ka ha ga-eje ozi ha nʼihu Onyenwe anyị dịka usoro ha na ọnụọgụgụ ha si dị.
32 So the Levites were to carry out the responsibility of caring for the Tent of Meeting and the sanctuary, and with their brothers the descendants of Aaron, they served the house of the Lord.
Ya mere, e tinyere ọrụ ilekọta ụlọ nzute Onyenwe anyị, na ụlọnsọ ukwu ahụ nʼaka ha. Ha ka ọ dịkwara inyere ndị ikwu ha, bụ ndị nchụaja ahụ, ụmụ Erọn, aka nʼọrụ ha niile nʼụlọnsọ ukwu ahụ.

< 1 Chronicles 23 >