< Isaiah 11 >
1 And there shall come forth a rod out of the root of Jesse, and a flower shall rise up out of his root.
Ome ga-epupụta site nʼogwe osisi Jesi; otu Alaka ga-esitekwa na mgbọrọgwụ ya tolite ga-amịkwa mkpụrụ.
2 And the spirit of the Lord shall rest upon him: the spirit of wisdom, and of understanding, the spirit of counsel, and of fortitude, the spirit of knowledge, and of godliness.
Mmụọ Onyenwe anyị ga-enwekwa ọnọdụ nʼime ya, inye ya Mmụọ amamihe na Mmụọ nghọta, Mmụọ ndụmọdụ na ike, Mmụọ ihe ọmụma na nke ịtụ egwu Onyenwe anyị.
3 And he shall be filled with the spirit of the fear of the Lord. He shall not judge according to the sight of the eyes, nor reprove according to the hearing of the ears.
Ihe ga-amasị ya bụ egwu Onyenwe anyị. Ọ gaghị ekpe ikpe site naanị nʼihe o ji anya ya abụọ hụ, maọbụ gbubie ikpe site naanị nʼihe ọ nụrụ na ntị ya.
4 But he shall judge the poor with justice, and shall reprove with equity for the meek of the earth: land he shall strike the earth with the rod of his mouth, and with the breath of his lips he shall slay the wicked.
Kama ọ bụ ezi omume ka ọ ga-eji kpee ndị ogbenye ikpe; ọ bụkwa ikpe ziri ezi ka ọ ga-ekpere ndị na-adịghị ike nke ụwa. Okwu ọnụ ka ọ ga-eji nye ndị mmadụ ahụhụ, ọ bụ okwu ọnụ ka ọ ga-eji maa ndị ajọ omume ikpe ọnwụ.
5 And justice shall be the girdle of his loins: and faith the girdle of his reins.
Ezi omume ya ga-adị ka ihe ike nʼume, ma ikwesi ntụkwasị obi ga-abụ ihe okike ukwu ya.
6 The wolf shall dwell with the lamb: and the leopard shall lie down with the kid: the calf and the lion, and the sheep shall abide together, and a little child shall lead them.
Nʼụbọchị ahụ, nkịta ọhịa na nwa atụrụ ga-ebikọ nʼudo; agụ na nwa ewu ga-amakpukọkwa. Nwa ehi na ụmụ ọdụm na nwa ịnyịnya mara abụba ga-anọkọtakwa, ọ bụkwa nwantakịrị ga na-edugharị ha.
7 The calf and the bear shall feed: their young ones shall rest together: and the lion shall eat straw like the ox.
Nne ehi na anụ ọhịa bịa ga-atakọkwa ahịhịa nʼotu ebe, ụmụ ha ga-amakpukọkwa nʼudo nʼotu ebe. Ọdụm ga-atakwa ahịhịa dịka ehi.
8 And the sucking child shall play on the hole of the asp: and the weaned child shall thrust his hand into the den of the basilisk.
Ụmụntakịrị ga-egwugharị egwu nʼakụkụ ọnụ ajụala; nwantakịrị ga-etinyekwa aka nʼakwụ ibi.
9 They shall not hurt, nor shall they kill in all my holy mountain, for the earth is filled with the knowledge of the Lord, as the covering waters of the sea.
Ha agaghị eme ihe mmerụ maọbụ bibikwa ihe, nʼelu ugwu nsọ m niile. Nʼihi na ụwa niile ga-ejupụta na ihe ọmụma nke Onyenwe anyị dịka mmiri si ekpuchi oke osimiri.
10 In that day the root of Jesse, who standeth for an ensign of the people, him the Gentiles shall beseech, and his sepulchre shall be glorious.
Nʼụbọchị ahụ, mgbọrọgwụ Jesi ga-eguzo ka ọkọlọtọ nye ndị dị iche iche. Mba niile ga-abịakwute ya; ebe izuike ya ga-ejupụtakwa nʼebube.
11 And it shall come to pass in that day, that the Lord shall set his hand the second time to possess the remnant of his people, which shall be left from the Assyrians, and from Egypt, and from Phetros, and from Ethiopia, and from Elam, and from Sennaar, and from Emath, and from the islands of the sea.
Nʼụbọchị ahụ, Onyenwe anyị ga-esetikwa aka nke ugboro abụọ inwetaghachiri onwe ya ndị ya fọdụrụ site na Asịrịa, sitekwa na ndịda Ijipt, sitekwa na Mgbago Ijipt, sitekwa na Kush, sitekwa na Elam, sitekwa na Babilọn, bụ Shaịna, sitekwa na Hamat na obodo niile dị nʼala niile osimiri gbara gburugburu.
12 And he shall set up a standard unto the nations, and shall assemble the fugitives of Israel, and shall gather together the dispersed of Juda from the four quarters of the earth.
Ọ ga-ebuliri mba niile ọkọlọtọ ọ ga-akpọghachite ụmụ Izrel achụpụrụ achụpụ, ọ ga-esite na nsọtụ anọ nke ụwa kpokọta ndị Juda niile site nʼebe a chụsasịrị ha.
13 And the envy of Ephraim shall be taken away, and the enemies of Juda shall perish: Ephraim shall not envy Juda, and Juda shall not fight against Ephraim.
Ekworo Ifrem ga-akwụsị, a ga-ebipụ ndị iro Juda. Nʼikpeazụ, ekworo ahụ nke dị nʼetiti Izrel na Juda ga-akwụsị; ha agaghị alụsokwa onwe ha ọgụ ọzọ.
14 But they shall fly upon the shoulders of the Philistines by the sea, they together shall spoil the children of the east: Edom, and Moab shall be under the rule of their hand, and the children of Ammon shall be obedient.
Ha ga-ejikọta aka ha buso ndị Filistia nọ nʼakụkụ ọdịda anyanwụ ala ha agha; ha ga-ebusokwa ndị bichiri nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ ala ahụ agha. Ha ga-emeri ndị Edọm na Moab. Ndị Amọn ga-erubekwara ha isi.
15 And the Lord shall lay waste the tongue of the sea of Egypt, and shall lift up his hand over the river in the strength of his spirit: and he shall strike it in the seven streams, so that men may pass through it in their shoes.
Onyenwe anyị ga-eme ka warawara ọnụ osimiri Ijipt taa. Ọ ga-eji ifufe siri ike, nke na-ekpo ọkụ mikọrọ mmiri dị nʼosimiri Yufretis. Ọ ga-ekewa ya ka ọ bụrụ isi iyi asaa, nke mmadụ nwere ike iji ụkwụ gafee.
16 And there shall be a highway for the remnant of my people, which shall be left from the Assyrians: as there was for Israel in the day that he came up out of the land of Egypt.
Ọ ga-esite nʼAsịrịa kpawaa ụzọ nʼihi ndị ya fọdụrụ nʼebe ahụ, dịka o si meere ndị Izrel nʼoge gara aga, mgbe ha si nʼIjipt na-alọta.