< Revelation 21 >
1 And I saw a new heaven and a new earth; for the first heaven and the first earth had passed away, and the sea exists no more.
Mgbe ahụ, ahụrụ m eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ. Eluigwe nke mbụ na ụwa nke mbụ agabigala, osimiri adịghịkwa.
2 And I saw the holy city, new Jerusalem, coming down out of the heaven from God, prepared as a bride adorned for her husband.
Ahụkwara obodo nsọ ahụ bụ Jerusalem ọhụrụ ka o si nʼeluigwe ebe Chineke nọ na-arịdata. Ọ mara mma dịka nwaagbọghọ ejikwara nke ọma maka ịgakwuru di ya.
3 And I heard a loud voice out of the heaven, saying, Behold, the tabernacle of God [is] with men, and he shall tabernacle with them, and they shall be his people, and God himself shall be with them, their God.
Anụkwara m oke olu si nʼocheeze ahụ kwuo okwu sị, “Leenụ! Ebe obibi Chineke adịla ugbu a nʼetiti ụmụ mmadụ. Ọ ga-ebinyere ha. Ha ga-abụkwa ndị ya, nʼezie, Chineke nʼonwe ya ga-anọkwa nʼetiti ha bụrụkwa Chineke ha.
4 And he shall wipe away every tear from their eyes; and death shall not exist any more, nor grief, nor cry, nor distress shall exist any more, for the former things have passed away.
Ọ ga-ehichapụ anya mmiri niile dị nʼanya ha. Ọnwụ agaghị adịkwa ọzọ. Ọ bụladị iru ụjụ na ịkwa akwa na ahụhụ agaghị adịkwa. Ihe ndị ochie niile agabigala.”
5 And he that sat on the throne said, Behold, I make all things new. And he says [to me], Write, for these words are true and faithful.
Onye ahụ nọ nʼocheeze ahụ kwuru sị, “Lee, ana m eme ka ihe niile dị ọhụrụ.” Mgbe ahụ, ọ sịkwara, “Detuo ihe ndị a, nʼihi na okwu ndị a bụ ihe e kwesiri ịtụkwasị obi, bụrụkwa eziokwu.”
6 And he said to me, It is done. I am the Alpha and the Omega, the beginning and the end. I will give to him that thirsts of the fountain of the water of life freely.
Ọ sịrị m, “E mezuola ihe niile. Abụ m Alfa na Omega, Mmalite na Ọgwụgwụ. Aga m enye onye akpịrị na-akpọ nkụ mmiri nke si nʼisi iyi mmiri nke ndụ dịka ihe onyinye.
7 He that overcomes shall inherit these things, and I will be to him God, and he shall be to me son.
Ndị ọbụla na-emeri emeri ga-enweta ihe nketa ndị a. Aga m abụkwa Chineke ha, ha onwe ha ga-abụ ụmụ m.
8 But to the fearful and unbelieving, [and sinners], and those who make themselves abominable, and murderers, and fornicators, and sorcerers, and idolaters, and all liars, their part [is] in the lake which burns with fire and brimstone; which is the second death. (Limnē Pyr )
Ma ndị na-atụ ụjọ, ndị na-ekweghị ekwe, na ndị na-emetọ onwe ha, na ndị ogbu mmadụ, na ndị na-akwa iko, na ndị ha na mmụọ ọjọọ na-akparịta ụka, na ndị na-ekpere arụsị, na ndị ụgha niile, ihe ha ga-eketa bụ ikpe ọmụma nke ịbanye nʼime olulu ahụ e ji nkume na-enwu ọkụ kwanye ọkụ. Nke bụ ọnwụ nke ugboro abụọ.” (Limnē Pyr )
9 And there came one of the seven angels which had had the seven bowls full of the seven last plagues, and spoke with me, saying, Come here, I will shew thee the bride, the Lamb's wife.
Otu nʼime ndị mmụọ ozi asaa ahụ, nke ji efere asaa ahụ nke ihe ntaramahụhụ dị nʼime ya bịakwutere m sị m, “Soro m, ka m gosi gị nwaagbọghọ ahụ bụ nwunye Nwa Atụrụ ahụ.”
10 And he carried me away in [the] Spirit, [and set me] on a great and high mountain, and shewed me the holy city, Jerusalem, coming down out of the heaven from God,
O buuru m nʼime Mmụọ buga m nʼotu ugwu buru ibu nke ịdị elu ya dịkwa ukwuu. O gosiri m obodo nsọ ahụ bụ Jerusalem ka o si na mbara eluigwe ebe Chineke nọ na-arịdata.
11 having the glory of God. Her shining [was] like a most precious stone, as a crystal-like jasper stone;
O jupụtara nʼebube Chineke, na-enwu ma na-achakwa dịka nkume dịkarịsịrị oke ọnụahịa, dịka nkume jaspa, na-enwu dịka kristal.
12 having a great and high wall; having twelve gates, and at the gates twelve angels, and names inscribed, which are those of the twelve tribes of [the] sons of Israel.
Mgbidi ya niile dị obosara dịkwa elu. O nwekwara ọnụ ụzọ iri na abụọ. Ọ bụkwa ndị mmụọ ozi iri na abụọ na-eche ọnụ ụzọ ndị a nche. E dekwara aha ebo iri na abụọ nke ụmụ Izrel nʼọnụ ụzọ ama ndị a nʼotu nʼotu.
13 On [the] east three gates; and on [the] north three gates; and on [the] south three gates; and on [the] west three gates.
Ọnụ ụzọ ama atọ dị nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ, atọ dị nʼakụkụ ugwu, atọ dị nʼakụkụ ndịda, ebe atọ dị nʼakụkụ ọdịda anyanwụ.
14 And the wall of the city had twelve foundations, and on them twelve names of the twelve apostles of the Lamb.
Mgbidi ahụ nwere nkume iri na abụọ e ji tọọ ntọala ya. Nʼelu nkume ndị a nʼotu nʼotu ka e dere aha ndị ozi iri na abụọ nke Nwa Atụrụ ahụ.
15 And he that spoke with me had a golden reed [as] a measure, that he might measure the city, and its gates, and its wall.
Onye ahụ na-agwa m okwu ji osisi e ji atụ ihe, nke e ji ọlaedo mee, nʼaka ya. O ji ya tụọ obodo ahụ na ọnụ ụzọ ama ya, na mgbidi ya.
16 And the city lies four-square, and its length [is] as much as the breadth. And he measured the city with the reed — twelve thousand stadia: the length and the breadth and height of it are equal.
Nʼobodo ahụ, enweghị otu akụkụ nʼime akụkụ anọ nke mgbidi ya karịrị ibe ya. Ogologo ya na obodobo ya ha otu. O ji ihe ọtụtụ tụọ ya, ogologo ya na obodobo nakwa ịdị elu ya ha, ọtụtụ ya dị puku kilomita abụọ na narị kilomita abụọ.
17 And he measured its wall, a hundred [and] forty-four cubits, [a] man's measure, that is, [the] angel's.
Ọ tụkwara ịdị igbidi nke mgbidi ahụ chọpụta na ọ dị narị nzọ ụkwụ atọ, dịka ihe ọtụtụ nke mmụọ ozi ahụ si gụpụta.
18 And the building of its wall [was] jasper; and the city pure gold, like pure glass:
Ihe e ji rụọ mgbidi ya bụ nkume dị oke ọnụahịa a na-akpọ jaspa, jiri ezi ọlaedo a nụchara anụcha, nke na-enwu dịka enyo dị ọcha rụọ obodo ahụ.
19 the foundations of the wall of the city [were] adorned with every precious stone: the first foundation, jasper; the second, sapphire; the third, chalcedony; the fourth, emerald;
E ji nkume niile dị oke ọnụahịa chọọ ntọala mgbidi obodo ahụ mma. Ntọala nke mbụ, bụ nkume a na-akpọ jaspa, ntọala nke abụọ, nkume a na-akpọ safaia, ntọala nke atọ, nkume a na-akpọ kaldoni, nke anọ, nkume a na-akpọ emeralụdụ,
20 the fifth, sardonyx; the sixth, sardius; the seventh, chrysolite; the eighth, beryl; the ninth, topaz; the tenth, chrysoprasus; the eleventh, jacinth; the twelfth, amethyst.
nke ise, nkume a na-akpọ ọniks, nke isii, nkume a na-akpọ kanelian, nke asaa, nkume a na-akpọ krisolaịt, nke asatọ, nkume a na-akpọ beril, nke itoolu, nkume a na-akpọ topaazi, nke iri, nkume a na-akpọ krisoprez, nke iri na otu, nkume a na-akpọ jasint, nke iri na abụọ, nkume a na-akpọ ametisiti.
21 And the twelve gates, twelve pearls; each one of the gates, respectively, was of one pearl; and the street of the city pure gold, as transparent glass.
Ọnụ ụzọ ama iri na abụọ ahụ bụ pieal iri na abụọ, ọnụ ụzọ ama ọbụla ka e ji otu nkume pieal rụọ nʼotu nʼotu. Ihe e ji rụọ okporoụzọ dị nʼobodo ahụ bụ naanị ọlaedo a nụchara anụcha ọbụla, nke dị ọcha dịka enyo e hichaziri nke ọma.
22 And I saw no temple in it; for the Lord God Almighty is its temple, and the Lamb.
O nweghị ụlọnsọ ukwu ọbụla m hụrụ nʼime obodo ahụ nʼihi na Onyenwe anyị Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile na Nwa Atụrụ ahụ bụ ụlọnsọ ukwu obodo ahụ nwere.
23 And the city has no need of the sun nor of the moon, that they should shine for it; for the glory of God has enlightened it, and the lamp thereof [is] the Lamb.
Ọ dịkwaghị mkpa ọ dịrị obodo ahụ ka anwụ maọbụ ọnwa mụkwasị ya, nʼihi na ebube nke Chineke bụ ìhè ya, oriọna ya bụkwa Nwa atụrụ ahụ.
24 And the nations shall walk by its light; and the kings of the earth bring their glory to it.
Mba niile ga-eji ìhè ya jegharịa. Ndị eze ụwa niile ga-abịakwa webata ebube ha nʼime ya.
25 And its gates shall not be shut at all by day, for night shall not be there.
A naghị emechi ọnụ ụzọ ama obodo ahụ emechi. Ha na-eghe oghe ụbọchị niile nʼihi abalị ọbụla adịghịkwa nʼebe ahụ.
26 And they shall bring the glory and the honour of the nations to it.
Ebube na nsọpụrụ nke mba niile ka a ga-ewebata nʼime ya.
27 And nothing common, nor that maketh an abomination and a lie, shall at all enter into it; but those only who [are] written in the book of life of the Lamb.
Ọ dịkwaghị ihe ọbụla rụrụ arụ ga-abata nʼime ya. Otu a kwa, ọ dịkwaghị onye na-eme ihe arụ, maọbụ onye ụgha ga-abata nʼime ya, kama ọ bụ naanị ndị ahụ e dere aha ha nʼakwụkwọ nke ndụ Nwa Atụrụ ahụ.