< Deuteronomy 1 >

1 These are the words which Moses spoke to all Israel on this side the Jordan, in the wilderness, in the plain, opposite to Suph, between Paran and Tophel, Laban, Hazeroth, and Dizahab.
Ndị a bụ okwu ahụ Mosis gwara Izrel niile mgbe ha nọ nʼọwụwa anyanwụ Jọdan, nʼọzara nʼAraba, ebe chere ihu nʼobodo Suf, nʼetiti Paran na Tofel na Leban, na Hazerọt, na Dizahab.
2 There are eleven days' journey from Horeb by the way of mount Seir to Kadesh-barnea.
Site nʼugwu Horeb ruo Kadesh Banea, bụ njem abalị iri na otu ma e soro ụzọ gawara ugwu Sia.
3 And it came to pass in the fortieth year, in the eleventh month, on the first of the month, that Moses spoke to the children of Israel, according to all that Jehovah had given him in command to them;
Ọ bụ nʼabalị mbụ nke ọnwa iri na otu, nke afọ iri anọ ka Mosis gwara ụmụ Izrel ihe niile Onyenwe anyị nyere ya nʼiwu banyere ha.
4 after he had smitten Sihon the king of the Amorites, who dwelt at Heshbon, and Og the king of Bashan, who dwelt at Ashtaroth [and] at Edrei.
Nke mere mgbe ọ lụgbuchara Saịhọn, eze ndị Amọrait, onye na-achị na Heshbọn, lụgbukwaa Ọg, eze ndị Bashan na Edrei, onye na-achị nʼAshtarọt.
5 On this side the Jordan, in the land of Moab, began Moses to unfold this law, saying,
Nʼọwụwa anyanwụ Jọdan, nʼala ndị Moab ka Mosis nọ kọwaara ụmụ Izrel iwu ndị a sị ha,
6 Jehovah our God spoke unto us in Horeb, saying, Ye have stayed long enough in this mountain.
Onyenwe anyị Chineke anyị gwara anyị nʼugwu Horeb sị, “Unu anọọla ọtụtụ oge nʼugwu a.
7 Turn and take your journey, and go to the hill-country of the Amorites, and unto all the neighbouring places in the plain, in the mountain, and in the lowland, and in the south, and by the seaside, the land of the Canaanites, and Lebanon, unto the great river, the river Euphrates.
Ugbu a bilienụ ije, baa nʼala ugwu ugwu ndị Amọrait. Gaakwanụ nʼala niile ndị agbataobi ha bụ Araba, nʼugwu niile na nʼebe dị ala ala na Negeb, nʼọnụ mmiri nke oke osimiri, garuokwanụ ala ndị Kenan na nke ndị Lebanọn, gagidekwanụ ruo nʼosimiri ukwu Yufretis.
8 Behold, I have set the land before you: go in and possess the land which Jehovah swore unto your fathers, to Abraham, to Isaac, and to Jacob, to give unto them and to their seed after them.
Lee, enyela m unu ala ahụ niile! Baanụ nʼime ya, bichiekwanụ ala ahụ Onyenwe anyị ṅụrụ iyi na ọ ga-enye nna nna unu bụ Ebraham, Aịzik, Jekọb na ụmụ ụmụ ha niile ndị ga-esote ha.”
9 And I spoke unto you at that time, saying, I am not able to bear you myself alone.
Nʼoge ahụ, agwara m unu ụmụ Izrel okwu sị, “Unu bụụrụ m oke ibu arọ, apụghịkwa m ibu unu naanị m.
10 Jehovah your God hath multiplied you, and behold, ye are this day as the stars of heaven for multitude.
Onyenwe anyị Chineke unu emeela ka unu mụbaa dịka kpakpando nke eluigwe.
11 Jehovah, the God of your fathers, make you a thousand times so many more as ye are, and bless you as he hath said unto you!
Ka Onyenwe anyị Chineke nna nna unu ha meekwa ka unu mụbaa nʼọnụọgụgụ, puku kwụrụ puku, ya gọziekwa unu dịka o kwere na nkwa.
12 How can I myself alone sustain your wear, and your burden, and your strife?
Ma olee otu naanị m ga-esi buo ibu unu, doziekwa ise okwu unu na nsogbu unu niile?
13 Provide you wise and understanding and known men, according to your tribes, that I may make them your chiefs.
Họpụtanụ ụfọdụ ndị ikom nwe amamihe, nghọta, na ndị a na-akwanyere ụgwụ, site nʼebo niile unu nʼotu nʼotu, aga m emekwa ha ndịisi unu.”
14 And ye answered me, and said, The thing that thou hast spoken is good [for us] to do.
Unu zara sị m, “Ihe ahụ i zubere ime dị mma.”
15 So I took the chiefs of your tribes, wise men and known, and made them chiefs over you, captains of thousands, and captains of hundreds, and captains of fifties, and captains of tens, and officers for your tribes.
Ya mere, a kpọọrọ m ndịisi nʼebo dị iche iche, ndị ikom maara ihe, na ndị a na-asọpụrụ, mee ka ha bụrụ ndịisi ọchịchị unu, ụfọdụ ha na-elekọta puku mmadụ, ụfọdụ narị mmadụ, ndị ọzọ na-elekọta iri mmadụ ise, ndị ọzọ mmadụ iri, ka ha bụrụ ndị ndu ebo dị iche iche.
16 And I commanded your judges at that time, saying, Hear [the causes] between your brethren, and judge righteously between a man and his brother, and him also that sojourneth with him.
Adọrọ m ndị ikpe unu a aka na ntị nʼoge ahụ sị ha, “Nụrụnụ ikpe niile metụtara esemokwu dị nʼetiti ụmụnna unu, ma kpeenụ ikpe ọbụla na-eleghị mmadụ anya nʼihu ma ikpe ahụ ọ dị nʼetiti ụmụnna unu ndị Izrel, maọbụ nʼetiti ndị Izrel na ndị ọbịa.
17 Ye shall not respect persons in judgment: ye shall hear the small as well as the great; ye shall not be afraid of the face of man, for the judgment is God's; and the matter that is too hard for you shall ye bring to me, that I may hear it.
Kpeenụ ikpe ziri ezi nye onye ukwu na onye nta. Elekwala ndị unu na-ekpe ikpe anya nʼihu, nʼihi na unu na-ekpe ikpe unu nʼọnọdụ Chineke.” Enyekwara m ha iwu sị ha wetaranụ m ikpe niile siri unu ike ka m leba ha anya.
18 And I commanded you at that time all the things that ye should do.
Nʼoge ahụ, agwara m unu ihe niile unu na-aghaghị ime.
19 And we departed from Horeb and went through all that great and terrible wilderness, which ye saw, on the way to the mountain of the Amorites, as Jehovah our God had commanded us; and we came to Kadesh-barnea.
Emesịa, dịka iwu Onyenwe anyị Chineke anyị nyere si dị, anyị hapụrụ ugwu Horeb, chee ihu gawa nʼala ugwu ugwu ndị Amọrait. Ụzọ anyị si gafee ọzara ukwu ahụ dị egwu nke unu ji anya unu hụ tutu anyị erute Kadesh Banea.
20 And I said unto you, Ye are come unto the mountain of the Amorites, which Jehovah our God giveth us.
Mgbe ahụ agwara m unu okwu sị, “Unu erutela nʼala ugwu ugwu ndị Amọrait, ala ahụ Onyenwe anyị Chineke anyị na-enye anyị.
21 Behold, Jehovah thy God hath set the land before thee: go up, take possession, as Jehovah the God of thy fathers hath said unto thee; fear not, neither be dismayed.
Lee, Onyenwe anyị Chineke unu enyela unu ala ahụ. Gaanụ nweta ya ka ọ bụrụ nke unu dịka Onyenwe anyị Chineke nna nna unu gwara unu sị, Unu atụla egwu, ka obi unu gharakwa ịda mba.”
22 And ye came near to me all of you, and said, We will send men before us, who shall examine the land for us, and bring us word again of the way by which we must go up, and of the cities to which we shall come.
Ma unu niile bịakwutere m sị m, “Ka anyị zipụ ndị nnyocha ka ha gaa mata ezi ụzọ e si abanye nʼala ahụ. Anyị ga-ekpebikwa obodo ndị anyị ga-ebu ụzọ banye.”
23 And the matter was good in mine eyes; and I took twelve men of you, one man for a tribe.
Ntụpụta unu juru m afọ, nʼihi ya, esitere m nʼetiti unu họpụta mmadụ iri na abụọ, otu onye site nʼebo ọbụla.
24 And they turned and went up into the mountain, and came to the valley of Eshcol, and searched it out.
Ndị a pụrụ, gbagoo ala ugwu ugwu ahụ tutu bịaruo na Ndagwurugwu Eshkọl. Ha legharịrị anya nʼala ahụ.
25 And they took of the fruit of the land in their hand, and brought it down unto us, and brought us answer, and said, The land is good that Jehovah our God hath given us.
Ha ghọtara ụfọdụ nʼime mkpụrụ osisi mịrị nʼala ahụ, bulatara anyị. Ha wetakwaara anyị ozi, sị, “Ala ahụ Onyenwe anyị Chineke anyị na-aga inye anyị dị mma.”
26 But ye would not go up, and rebelled against the word of Jehovah your God;
Ma unu jụrụ ịga nʼala ahụ, si otu a nupu isi megide iwu Onyenwe anyị Chineke unu nyere.
27 and ye murmured in your tents, and said, Because Jehovah hated us, he hath brought us forth out of the land of Egypt, to deliver us into the hand of the Amorites, to destroy us.
Unu nọ nʼụlọ ikwu unu tamuo ntamu na-asị, “Nʼezie Onyenwe anyị ahụghị anyị nʼanya. Lee ka o si site nʼala Ijipt dupụta anyị were anyị nyefee nʼaka ndị Amọrait ka ha laa anyị nʼiyi!
28 Whither shall we go up? Our brethren have made our hearts melt, saying, [They are] a people greater and taller than we; the cities are great and walled up to heaven; and moreover we have seen the sons of the Anakim there.
Ebee ka anyị nwere ike ịga ugbu a? Ụmụnna anyị gara nyochaa ala ahụ emenyela anyị egwu. Ha sịrị, ‘Na ndị bi nʼala ahụ toro ogologo karịa anyị bụrụkwa ndị dị ike. Ha sịkwara na mgbidi e ji gbaa obodo ha gburugburu topuru ruo nʼeluigwe! Anyị hụkwara ụmụ Anak nʼebe ahụ.’”
29 And I said unto you, Be not afraid, neither fear them;
Ma agwara m unu sị, “Ka ụjọ ghara ịtụ unu, unu atụla ndị ahụ egwu.
30 Jehovah your God who goeth before you, he will fight for you, according to all that he did for you in Egypt before your eyes;
Onyenwe anyị Chineke unu, onye na-aga nʼihu unu, ga-alụrụ unu ọgụ, dịka o si lụọra unu ọgụ nʼihu anya unu, nʼala Ijipt,
31 and in the wilderness where thou hast seen that Jehovah thy God bore thee, as a man doth bear his son, in all the way that ye went, until ye came to this place.
nakwa nʼime ọzara, ebe unu nọ hụ otu Onyenwe anyị Chineke unu si bulie unu elu dịka nna si ebuli nwa ya elu, nʼụzọ niile unu gbasoro tutu unu erute ebe a.”
32 But In this thing ye did not believe Jehovah your God,
Ma agbanyeghị nke a, unu ekwenyeghị na Onyenwe anyị Chineke unu,
33 who went in the way before you, to search you out a place for your encamping, in fire by night, to shew you by what way ye should go, and in the cloud by day.
bụ onye gara nʼihu unu nʼije unu niile, ịchọpụtara unu ebe unu ga-ama ụlọ ikwu unu, onye jikwa ọkụ duo unu nʼabalị, jiri igwe ojii duo unu nʼehihie, iji zi unu ụzọ unu ga-agbaso.
34 And Jehovah heard the voice of your words, and was wroth, and swore, saying,
Ma otu o si dị, mgbe Onyenwe anyị nụrụ ntamu unu, iwe dị ukwuu were ya, nʼihi ntamu unu, ọ ṅụrụ iyi sị,
35 None among these men, this evil generation, shall in any wise see that good land, which I swore to give unto your fathers!
“O nweghị otu onye nʼime ọgbọ ọjọọ a ga-anọ ndụ hụ ala ọma ahụ m ṅụrụ iyi inye nna nna unu,
36 Except Caleb the son of Jephunneh, he shall see it, and to him will I give the land that he hath trodden upon, and to his children, because he hath wholly followed Jehovah.
karịakwa Kaleb, nwa Jefune. Ọ ga-ahụ ala ahụ anya, aga m enye ya na ụmụ ụmụ ya ala ahụ ọ zọkwasịrị ụkwụ ya, nʼihi na o ji obi ya niile sogide Onyenwe anyị.”
37 Also Jehovah was angry with me on your account, saying, Thou also shalt not go in thither.
Ọ bụkwa nʼihi unu ka Onyenwe anyị ji weso m iwe, na-asị, “Gị onwe gị kwa, ị gaghị aba nʼebe ahụ!
38 Joshua the son of Nun, who standeth before thee, he shall go in thither: strengthen him, for he shall cause Israel to inherit it.
Kama Joshua, nwa Nun, onye na-enyere gị aka, ga-edu ha banye nʼebe ahụ. Gbaa ya ume nʼihi na ọ bụ ya ga-edu ndị Izrel inweta ala ahụ dịka ihe nketa ha.
39 And your little ones, of whom ye said, They shall be a prey, and your children, who this day know neither good nor evil, they shall go in thither, and unto them will I give it, and they shall possess it.
Ọ bụkwa ụmụntakịrị ahụ na-amaghị ihe dị iche site nʼihe ọma na ihe ọjọọ ka m ga-enye ala ahụ. Ha ga-abanye nʼime ya, nweta ya dịka ihe nketa.
40 But ye, turn, and take your journey into the wilderness by the way of the Red sea.
Ma unu onwe unu, bilienụ, chigharịa gawa nʼime ọzara. Cheenụ ihu unu nʼOsimiri Uhie.”
41 — And ye answered and said unto me, We have sinned against Jehovah, we will go up and fight, according to all that Jehovah our God hath commanded us. And ye girded on every man his weapons of war, and ye would go presumptuously up the hill.
Mgbe ahụ, unu kwupụtara mmehie unu sị, “Anyị emehiela megide Onyenwe anyị. Anyị ga-agbago nʼala ahụ gaa lụọ ọgụ, dịka Onyenwe anyị Chineke anyị nyere anyị nʼiwu.” Ya mere, onye ọbụla nʼime unu yikwasịrị ihe agha ya na-eche na ọ dị mfe ịgbago nʼobodo ndị ahụ dị nʼugwu.
42 And Jehovah said to me, Say unto them, Go not up, neither fight; for I am not among you; lest ye be smitten before your enemies.
Ma Onyenwe anyị sịrị m, “Gwa ha, ‘Unu arịgokwala, gaa buo agha, nʼihi na agaghị m anọnyere unu. Ndị iro unu ga-emerikwa unu.’”
43 And I spoke unto you, but ye would not hear, and ye rebelled against the word of Jehovah, and acted presumptuously, and went up the hill.
Ya mere, agwara m unu, ma unu aṅaghị ntị. Unu nupuru isi nʼiwu Onyenwe anyị, jiri nganga juru unu obi bilie, rigoo nʼobodo ahụ dị nʼugwu.
44 And the Amorite that dwelt on that hill came out against you, and chased you, like as bees do, and cut you in pieces in Seir, as far as Hormah.
Ndị Amọrị bụ ndị bi nʼugwu ahụ pụtara, ha chụsasịrị unu dịka aṅụ si eme, tidaa unu nʼala site na Sia ruo Homa.
45 And ye returned and wept before Jehovah, but Jehovah would not listen to your voice, nor give ear unto you.
Emesịa, unu lọghachiri bịa kwaa akwa nʼihu Onyenwe anyị, ma o geghị ntị nye olu akwa unu, ọ ṅakwaghị unu ntị.
46 And ye abode in Kadesh many days, according unto the days that ye abode [there].
Nʼihi ya, unu nọrọ ọtụtụ oge na Kadesh.

< Deuteronomy 1 >