< Leviticus 1 >

1 Then the Lord called Moses and spoke to him from the tabernacle of the testimony, saying:
Onyenwe anyị sitere nʼụlọ nzute ahụ kpọ Mosis oku, gwa ya sị,
2 Speak to the sons of Israel, and you shall say to them: The man among you who will offer to the Lord a sacrifice from the cattle, that is, an offering of victims of oxen or sheep:
“Gwa ụmụ Izrel sị, ‘Mgbe onye ọbụla nʼime unu wetaara Onyenwe anyị onyinye, ka onyinye ọ ga-eweta bụrụ anụ ụlọ si nʼetiti igwe ehi maọbụ igwe ewu na atụrụ.
3 if his offering will be a holocaust, as well as from the herd, he shall offer an immaculate male at the door of the tabernacle of the testimony, to make himself pleasing to the Lord.
“‘Ọ bụrụ na ọ bụ onyinye aja nsure ọkụ e wetara site nʼigwe ehi, ọ bụ oke ehi nke na-enweghị ntụpọ ka ọ ga-eweta. Nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute ka ọ ga-eweta ya, ka ọ bụrụ ihe Onyenwe anyị ga-anabata.
4 And he shall place his hand on the head of the sacrifice, and so it shall be acceptable and effective, in its expiation.
Onye ahụ wetara ya ga-ebikwasị aka ya nʼisi anụ aja nsure ọkụ ahụ, a ga-anabata ya maka iji kpuchie mmehie ya.
5 And he shall immolate the calf in the sight of the Lord. And the priests, the sons of Aaron, shall offer its blood, pouring it all around the altar, which is before the door of the tabernacle.
Nwoke ahụ ga-egbu nwa oke ehi ahụ nʼihu Onyenwe anyị. Ụmụ ndị ikom Erọn, bụ ndị nchụaja ga-ewere ọbara ya fesa ya nʼakụkụ niile nke ebe ịchụ aja, nʼọnụ ụzọ e si abata ụlọ nzute ahụ.
6 And having pulled away the skin of the victim, they shall cut up the joints into pieces,
Ị ga-agba ehi aja nsure ọkụ ahụ akpụkpọ, bọkasịa ya ntakịrị ntakịrị.
7 and they shall toss fire under the altar, having arranged beforehand a stack of wood.
Ụmụ Erọn, ndị nchụaja ga-etinye ọkụ nʼebe ịchụ aja ahụ, doo nkụ nʼusoro nʼelu ya.
8 And they shall lay the parts which are cut up in order upon it: namely, the head, and all the things that adjoin to the liver,
Mgbe ahụ, ụmụ Erọn ndị nchụaja ga-atụkwasị akụkụ ehi ahụ niile, na isi ya, na abụba ya, nʼelu nkụ ahụ na-enwu ọkụ nʼebe ịchụ aja ahụ.
9 the intestines and feet having been washed with water. And the priest shall burn them on the altar as a holocaust and as a sweet odor to the Lord.
Ma a ga-asacha ihe ndị dị nʼime afọ ya, na ụkwụ ya mmiri. Onye nchụaja ga-akpọ ha niile ọkụ nʼebe ịchụ aja ahụ. Ọ bụ onyinye aja nsure ọkụ, onyinye e nyere site nʼọkụ nke dị ezi ụtọ nye Onyenwe anyị.
10 But if the offering is from the flocks, a holocaust either of sheep or goats, he shall offer a male without blemish.
“‘Ọ bụrụ na onyinye aja nsure ọkụ ahụ si nʼigwe ewu na atụrụ, ọ ga-abụrịrị mkpi maọbụ ebule na-enweghị nkwarụ.
11 And he shall immolate it at the side of the altar which looks out toward the north, in the sight of the Lord. Yet truly, the sons of Aaron shall pour its blood upon the altar all around.
Onye wetara ya ga-egbu ya nʼihu Onyenwe anyị nʼakụkụ ebe ịchụ aja chere ihu nʼugwu. Ụmụ ndị ikom Erọn, bụ ndị nchụaja, ga-efesa ọbara ya nʼakụkụ niile nke ebe ịchụ aja ahụ.
12 And they shall divide the limbs, the head, and everything that adjoins to the liver. And they shall place them on the wood, under which the fire is to be thrown.
Mgbe nke a gasịrị, onye ahụ wetara ya, ga-abọ ya. Onye nchụaja ga-ewere akụkụ ya niile, na isi ya, na abụba ya tụkwasị ha nʼelu nkụ ahụ na-enwu ọkụ dị nʼebe ịchụ aja.
13 Yet truly, the intestines and the feet they shall wash with water. And the priest, having offered everything, shall burn it upon the altar as a holocaust and as a most sweet odor to the Lord.
Ma ihe ndị dị nʼime afọ ya, na ụkwụ ya, ka onye ahụ ga-asa mmiri, tupu onye nchụaja eweta ha niile kpọọ ha ọkụ nʼebe ịchụ aja. Ọ bụ onyinye aja nsure ọkụ, onyinye e nyere site nʼọkụ, nke isisi ya dị ezi ụtọ nye Onyenwe anyị.
14 But if the oblation of a holocaust to the Lord is of birds, either of turtledoves, or young pigeons,
“‘Ọ bụrụ na onyinye ọ na-enye Onyenwe anyị dịka aja nsure ọkụ bụ site nʼụmụ anụ ufe, ọ ghaghị ịbụ nduru, maọbụ nwa kpalakwukwu.
15 the priest shall offer it at the altar: and twisting back the neck with the head, and also rupturing the place of the wound, he shall make the blood run down over the edge of the altar.
Onye nchụaja ga-ewebata anụ ufe ahụ nʼebe ịchụ aja, tụbipụ isi ya, wụsa ọbara ya nʼakụkụ ebe ịchụ aja.
16 Yet truly, the craw of the throat and the feathers he shall cast near the altar at the eastern section, in the place where the ashes are usually poured out.
Ọ ga-ewepụ akpa nri ya, na ihe dị ya nʼime, tụnye ha nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ nke ebe ịchụ aja ahụ; ebe a na-ekposa ntụ.
17 And he shall break its wing joints, but he shall neither cut, nor divide it with metal, and he shall burn it upon the altar, placing fire under the wood. It is a holocaust and an oblation of a most sweet odor to the Lord.
Ọ ga-ejide nku ya abụọ nyawaa ha, ma ọ gaghị anyakapụcha ha. Mgbe ahụ, onye nchụaja ahụ ga-akpọ ya ọkụ nʼelu ebe ịchụ aja. Ọ bụ aja nsure ọkụ, onyinye e nyere site nʼọkụ, nke isisi ya dị Onyenwe anyị ezi ụtọ.

< Leviticus 1 >