< Judges 13 >

1 And again, the sons of Israel did evil in the sight of the Lord. And he delivered them into the hands of the Philistines for forty years.
Ndị Izrel mehiekwara ọzọ nʼihu onyenwe anyị. Nʼihi nke a, Onyenwe anyị kwenyere ka ndị Filistia merie ha. Ndị Izrel nọrọ nʼokpuru ọchịchị ha iri afọ anọ.
2 Now there was a certain man from Zorah, and of the stock of Dan, whose name was Manoah, having a barren wife.
Nʼoge ahụ, o nwere otu nwoke onye Zora aha ya bụ Manoa. Nwoke a si nʼagbụrụ Dan, nwunye ya bụ nwanyị aga nke mere na ọ mụtaghị nwa.
3 And an Angel of the Lord appeared to her, and he said: “You are barren and without children. But you shall conceive and bear a son.
Otu ụbọchị, mmụọ ozi Onyenwe anyị gosiri nwanyị a onwe ya, gwa ya okwu sị, “Ọ bụ ezie na ị bụ nwanyị aga nke mere na ị mụtaghị nwa ma na mgbe na-adịghị anya, ị ga-atụrụ ime mụta nwa.
4 Therefore, take care that you do not drink wine or strong drink. Neither shall you eat anything unclean.
Ma site ugbu a, gaa nʼihu, aṅụkwala ihe ọṅụṅụ ọbụla na-aba nʼanya. Erikwala ihe ọbụla rụrụ arụ.
5 For you shall conceive and bear a son, whose head no razor shall touch. For he shall be a Nazirite of God, from his infancy and from his mother’s womb. And he shall begin to free Israel from the hand of the Philistines.”
Ị ga-atụrụ ime, mụkwaa nwa nwoke, onye agụba agaghị aba nʼisi ya, nʼihi na ọ ga-abụ onye e kewapụrụ nye Chineke site nʼime akpanwa. Ọ ga-ebute ụzọ nʼịgbapụta Izrel site nʼaka ndị Filistia.”
6 And when she had gone to her husband, she said to him: “A man of God came to me, having the countenance of an Angel, exceedingly terrible. And when I had inquired of him, who he was, and where he was from, and what name he was called, he was not willing to tell me.
Nwanyị ahụ gbara ọsọ gbalaa gaa gwa di ya sị ya, “Otu onye nke Chineke egosila m onwe ya. O dokwara m anya na ọ bụ mmụọ ozi Chineke, nʼihi na ọ dị oke ebube nʼile anya. Ma ajụghị m ya ebe o siri bịa, ọ gwakwaghị m aha ya.
7 But he responded: ‘Behold, you shall conceive and bear a son. Take care that you do not drink wine or strong drink. And you shall not consume anything unclean. For the boy shall be a Nazirite of God from his infancy, from his mother’s womb, even until the day of his death.’”
Kama ọ sịrị m, ‘Ị ga-adị ime, mụta nwa nwoke. Ma ugbu a, ị gaghị aṅụ mmanya vaịnị maọbụ ihe ọbụla na-aba nʼanya, maọbụ rie ihe ọbụla rụrụ arụ, nʼihi na nwantakịrị ahụ ga-abụ onye e doro nsọ nye Chineke, site nʼime akpanwa ruo nʼọnwụ ya.’”
8 And so Manoah prayed to the Lord, and he said, “I beg you Lord, that the man of God, whom you sent, may come again, and may teach us what we ought to do about the boy who is to be born.”
Mgbe ahụ, Manoa kpere ekpere rịọọ Onyenwe anyị arịrịọ sị, “Biko, Onyenwe anyị, ka onye nke Chineke ahụ i ziteere anyị bịaghachikwa ọzọ, kuziere anyị otu anyị ga-esi zụlite nwa nwoke a ga-amụta.”
9 And the Lord heeded the prayer of Manoah, and the Angel of the Lord appeared again to his wife, sitting in a field. But her husband Manoah was not with her. And when she had seen the Angel,
Chineke zara ekpere ya. Mmụọ ozi ahụ bịakwutekwara nwunye Manoa mgbe ọ nọ nʼubi; maọbụ naanị ya nọ, di ya anọghị ya.
10 she hurried and ran to her husband. And she reported to him, saying, “Behold, the man appeared to me, whom I had seen before.”
Ya mere, nwanyị ahụ gbara ọsọ gaa gwa di ya sị, “Lee, nwoke ahụ bịakwutere m ụbọchị a, abịala ọzọ!”
11 And he rose up and followed his wife. And going to the man, he said to him, “Are you the one who spoke to my wife?” And he responded, “I am.”
Manoa biliri, soro nwunye ya. Mgbe o bịarutere ebe nwoke ahụ nọ, ọ jụrụ ya ajụjụ sị, “Ọ bụ gị bụ nwoke ahụ gwara nwunye m okwu nʼoge gara aga?” Ọ zara sị ya, “E, ọ bụ m.”
12 And Manoah said to him: “When will your word be fulfilled. What do you want the boy to do? Or from what should he keep himself?”
Manoa gwara ya okwu sị, “Mgbe okwu gị mezuru, gịnị bụ iwu banyere ndụ na ọrụ nwa nwoke a?”
13 And the Angel of the Lord said to Manoah: “Concerning all the things about which I have spoken to your wife, she herself should abstain.
Mmụọ ozi Onyenwe anyị zaghachiri, “Nwunye gị aghaghị imezu ihe niile m nke m gwara ya.
14 And let her eat nothing from the vine. She may not drink wine or strong drink. She may consume nothing unclean. And let her observe and keep what I have instructed to her.”
Ka ọ ghara iri ihe ọbụla si nʼosisi vaịnị, maọbụ ṅụọ mmanya ọbụla maọbụ ihe ọbụla na-aba nʼanya, maọbụ rie ihe rụrụ arụ ọbụla.”
15 And Manoah said to the Angel of the Lord, “I beg you to agree to my petition, and to let us prepare a kid from the goats.”
Manoa rịọrọ Mmụọ ozi Onyenwe anyị si ya, “Ọ ga-amasị anyị ma ị nọdụ chere ka anyị kwadoro gị nwa ewu.”
16 And the Angel answered him: “Even if you compel me, I will not eat from your bread. But if you are willing to offer a holocaust, offer it to the Lord.” And Manoah did not know that he was an Angel of the Lord.
Ma Mmụọ ozi Onyenwe anyị zara ya, “A sịkwarị na i mee ka m nọrọ, agaghị m eri nri gị ọbụla. Ma ọ bụrụ na i kwadoo aja nsure ọkụ, were ya chụọrọ Onyenwe anyị aja.” Ma Manoa aghọtaghị na onye ahụ bụ Mmụọ ozi Onyenwe anyị.
17 And he said to him, “What is your name, so that, if your word is fulfilled, we may honor you?”
Mgbe ahụ, Manoa jụrụ Mmụọ ozi Onyenwe anyị ahụ, sị, “Biko, gịnị bụ aha gị, ka anyị nye gị nsọpụrụ dịịrị gị mgbe okwu gị mezuru?”
18 And he answered him, “Why do you ask my name, which is a wonder?”
Ọ zara, “Nʼihi gịnị kwa ka ị na-ajụ banyere aha m? Ọ bụ ihe karịrị nghọta.”
19 And so, Manoah took a kid from the goats, and libations, and he placed them upon a rock, as an offering to the Lord, who accomplishes wonders. Then he and his wife watched.
Mgbe ahụ, Manoa weere nwa ewu, ya na ụfọdụ mkpụrụ ọka, jiri ha chụọrọ Onyenwe anyị aja nʼelu nkume. Mgbe ahụ kwa, Onyenwe anyị mere ihe dị ebube nke ukwuu mgbe Manoa na nwunye ya guzo na-ele anya:
20 And when the flame of the altar ascended to heaven, the Angel of the Lord ascended in the flame. And when Manoah and his wife had seen this, they fell prone on the ground.
Mgbe ire ọkụ ahụ sitere nʼebe ịchụ aja ahụ na-arịgo na-aga elu, Mmụọ ozi Onyenwe anyị wụliri elu soro ire ọkụ ahụ rigoro gawa nʼeluigwe! Mgbe Manoa na nwunye ya hụrụ ka nke a na-eme, ha kpuru ihu ha nʼala.
21 And the Angel of the Lord no longer appeared to them. And immediately, Manoah understood him to be an Angel of the Lord.
Mgbe Mmụọ ozi Onyenwe anyị na-egosighị onwe ya ọzọ nye Manoa na nwunye ya, ka Manoa ghọtara na ọ bụ Mmụọ ozi Onyenwe anyị ka ha hụrụ.
22 And he said to his wife, “We shall certainly die, since we have seen God.”
Manoa gwara nwunye ya sị, “Anyị abụrụla ndị nwụrụ anwụ, nʼihi na anyị ahụla Chineke!”
23 And his wife answered him, “If the Lord wished to kill us, he would not have accepted the holocaust and the libations from our hands. He would not have revealed all these things to us, nor would he have told us the things that are in the future.”
Ma nwunye ya zara sị ya, “Ọ bụrụ na Onyenwe anyị chọrọ igbu anyị, ọ garaghị anara aja nsure ọkụ, na aja mkpụrụ ọka anyị chụrụ nye ya. Ọzọkwa, ọ garaghị egosi anyị ihe ndị a niile maọbụ gwa anyị ihe ndị a.”
24 And so she bore a son, and she called his name Samson. And the boy grew up, and the Lord blessed him.
Emesịa, nwanyị ahụ mụrụ nwa nwoke, onye ha gụrụ Samsin. Onyenwe anyị gọzikwara nwantakịrị ahụ mgbe ọ na-etolite.
25 And the Spirit of the Lord began to be with him in the camp of Dan, between Zorah and Eshtaol.
Mmụọ Onyenwe anyị bidokwara na-agba ya ume nʼoge niile, mgbe ọ nọ Mahane Dan, nke dị nʼetiti Zora na Eshtaol.

< Judges 13 >