< Numbers 12 >
1 Now Miriam and Aaron said evil against Moses, because of the Cushite woman to whom he was married, for he had taken a Cushite woman as his wife.
Miriam na Erọn malitere ikwu okwu megide Mosis, nʼihi na ọ lụrụ nwunye onye Kush.
2 And they said, Have the words of the Lord been given to Moses only? have they not come to us? And the Lord took note of it.
Ha kwuru sị, “Ọ bụ naanị site nʼọnụ Mosis ka Onyenwe anyị si agwa ndị ya okwu? Ọ naghị esitekwa nʼọnụ anyị kwuo okwu?” Onyenwe anyị nụrụ ihe ndị a ha kwuru.
3 Now the man Moses was more gentle than any other man on earth.
(Ma nwoke ahụ bụ Mosis dị umeala nʼobi nke ukwuu karịa onye ọbụla nọ nʼelu ala.)
4 And suddenly the Lord said to Moses and Aaron and Miriam, Come out, you three, to the Tent of meeting. And the three of them went out.
Na mberede, Onyenwe anyị sịrị Mosis, na Erọn, na Miriam, “Pụtanụ, bịa nʼụlọ nzute, unu mmadụ atọ” Ya mere ha atọ pụtara.
5 And the Lord came down in a pillar of cloud, taking his place at the door of the Tent, and made Aaron and Miriam come before him.
Mgbe ahụ, Onyenwe anyị rịdatara nʼime igwe ojii, guzoro na mbata ọnụ ụzọ ụlọ nzute ahụ, kpọpụta Erọn na Miriam. Mgbe ha abụọ bịara nso.
6 And he said, Now give ear to my words: if there is a prophet among you I will give him knowledge of myself in a vision and will let my words come to him in a dream.
Onyenwe anyị gwara ha sị, “Geenụ ntị nʼokwu m ndị a: “Mgbe onye amụma nọ nʼetiti unu, Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị na-egosi ya onwe m site nʼọhụ. Ana m agwa ya okwu site na nrọ.
7 My servant Moses is not so; he is true to me in all my house:
Ma nʼebe ohu m Mosis nọ, o sighị otu a dịrị, ọ bụ onye kwesiri ntụkwasị obi nʼụlọ m niile.
8 With him I will have talk mouth to mouth, openly and not in dark sayings; and with his eyes he will see the form of the Lord: why then had you no fear of saying evil against my servant Moses?
Nʼebe ọ nọ, ana m agwa ya okwu ihu na ihu nʼụzọ doro anya, ọ bụghị site nʼilu, ọ na-ahụkwa ụdịdị Onyenwe anyị. Gịnị mere ụjọ atụghị unu ikwu okwu megide ohu m Mosis?”
9 And burning with wrath against them, the Lord went away.
Mgbe ahụ, Onyenwe anyị were iwe dị ọkụ megide ha. O si nʼebe ha nọ pụọ.
10 And the cloud was moved from over the Tent; and straight away Miriam became a leper, as white as snow: and Aaron, looking at Miriam, saw that she was a leper.
Ma mgbe igwe ojii ahụ hapụrụ ụlọ nzute ahụ, lee Miriam ebe o guzo, ekpenta tiwapụtara ya nʼahụ dịka nzu ọcha. Mgbe Erọn tụgharịrị ebe ọ nọ hụ na ọ ghọọla onye ekpenta,
11 Then Aaron said to Moses, O my lord, let not our sin be on our heads, for we have done foolishly and are sinners.
ọ gwara Mosis okwu sị, “Biko, onyenwe m, atala anyị ahụhụ nʼihi mmehie anyị sitere na nzuzu mee.
12 Let her not be as one dead, whose flesh is half wasted when he comes out from the body of his mother.
Ekwela ka Miriam dịrị ka nwa ọhụrụ nwụrụ anwụ nke akpụkpọ ahụ ya rere ure nʼoge o si nʼakpanwa nne ya na-apụta.”
13 And Moses, crying to the Lord, said, Let my prayer come before you, O God, and make her well.
Ya mere Mosis tikuru Onyenwe anyị mkpu akwa sị ya, “Chineke, biko, gwọọ ya!”
14 And the Lord said to Moses, If her father had put a mark of shame on her, would she not be shamed for seven days? Let her be shut up outside the tent-circle for seven days, and after that she may come in again.
Ma Onyenwe anyị zara Mosis sị ya, “Ọ bụrụ na nna ya gbụrụ ya asụ nʼihu, ọ gaghị abụ onye rụrụ arụ abalị asaa? Ya mere, hapụ ya ka ọ bụrụ onye e sitere nʼogige ọmụma ụlọ ikwu Izrel wezuga abalị asaa. Mgbe oge a gafesịrị, o nwere ike ịlọghachi.”
15 So Miriam was shut up outside the tent-circle for seven days: and the people did not go forward on their journey till Miriam had come in again.
Ya mere e wezugara Miriam site nʼogige ọmụma ụlọ ikwu Izrel abalị asaa. Ndị Izrel niile nọdụrụ chere ya ruo mgbe ọ lọghachiri, tutu ha ebilie nʼije ọzọ.
16 After that, the people went on from Hazeroth and put up their tents in the waste land of Paran.
Mgbe ihe ndị a gasịrị, ha hapụrụ Hazerọt rute nʼọzara Paran ebe ha wuru ogige ụlọ ikwu ha.