< Joshua 8 >

1 Then the Lord said to Joshua, Have no fear and do not be troubled: take with you all the fighting-men and go up against Ai: for I have given into your hands the king of Ai and his people and his town and his land:
Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sịrị Joshua, “Atụla egwu, adakwala mba. Chịrị ndị agha gị niile gaa Ai, nʼihi na ugbu a, unu onwe unu ga-emeri ha. Aga m eme ka i merie eze ndị Ai, na ndị ya na obodo ya, na ala ya.
2 And you are to do to Ai and its king as you did to Jericho and its king: but their goods and their cattle you may take for yourselves: let a secret force be stationed to make a surprise attack on the town from the back.
Ị ga-emekwa obodo Ai na eze ya ihe i mere Jeriko na eze ya. Ma ihe dị iche na nke a bụ na unu ga-edebere onwe unu ihe niile unu kwatara nʼagha, ya bụ anụ ụlọ niile na ngwongwo obodo ahụ niile. Jikerenụ ibuso ha agha. Ọ bụkwa nʼazụ obodo ha ka unu ga-esi lụso ha agha.”
3 So Joshua and the fighting-men got ready to go up against Ai; and Joshua took thirty thousand men of war, and sent them out by night.
Mgbe ahụ, Joshua na ndị agha ya niile, biliri gaa ibuso Ai agha. Joshua họpụtara iri puku ndị agha atọ zipụ ha nʼabalị
4 And he gave them their orders, saying, Go and take up your position secretly at the back of the town: do not go very far away, and let all of you be ready:
o nyere ha iwu a, “Lee! Unu ga-aga zoo onwe unu nʼọhịa dị nʼazụ obodo Ai. Unu ezola onwe unu nʼebe dị anya site nʼobodo ahụ, kama nọọnụ nso, nọọkwanụ na njikere.
5 And I and all the people with me will come near the town, and when they come out against us as they did before, we will go in flight from them;
Mụ na ndị niile so m ga-abịaru obodo ahụ nso. Mgbe ha ga-apụta ịlụso anyị ọgụ dịka ha mere na mbụ, anyị ga-agbakwa ọsọ nʼihu ha,
6 And they will come out after us, till we have got them away from the town; for they will say, They have gone in flight from us as before; so we will go in flight before them;
Ha ga-achụ anyị ọsọ, tutu ruo mgbe anyị mere ka ha niile hapụ nʼobodo ha pụta. Nʼihi nʼuche ha, ha ga-asị, ‘Ha na-agbara anyị ọsọ dịka ha mere na mbụ, bịanụ ka anyị chụọ ha ọsọ gbuo ha.’ Ya mere, dịka anyị na-agbapụ site nʼebe ha nọ,
7 Then you will get up from your secret position and take the town, for the Lord your God will give it up into your hands.
unu ga-esite nʼebe unu zoro onwe unu bilie, nweta obodo ahụ, nʼihi na Onyenwe anyị Chineke unu ga-enyefe ya nʼaka unu.
8 And when you have taken the town, put fire to it, as the Lord has said: see, I have given you your orders.
Mgbe unu weere obodo ahụ, unu ga-esunye obodo ahụ ọkụ. Meenụ ihe Onyenwe anyị nyere nʼiwu. Hụnụ na unu mezuru ihe ndị a m nyere unu nʼiwu.”
9 So Joshua sent them out: and they took up a secret position between Beth-el and Ai, on the west side of Ai: but Joshua kept with the people that night.
Mgbe Joshua nyesịrị ha iwu ndị a, o zipụrụ ha. Ha hapụkwara nʼabalị ahụ gaa zoo onwe ha nʼọhịa dị nʼetiti Betel na ọdịda anyanwụ Ai. Ma Joshua na ndị agha ndị ọzọ fọdụrụ nọdụrụ nʼabalị ahụ nʼetiti ndị Izrel.
10 And early in the morning Joshua got up, and put the people in order, and he and the chiefs of Israel went up before the people to Ai.
Nʼisi ụtụtụ echi ya, Joshua chịkọtara ndị agha ya, ya na ndị ndu Izrel gara nʼihu ha, ruo Ai.
11 And all the fighting-men who were with him went up and came near the town, and took up a position on the north side of Ai facing the town, with a valley between him and the town.
Ndị agha niile ha na ya so, chere ihu ha gaa nso obodo ruo nʼihu ya. Ha mara ụlọ ikwu ha nʼakụkụ ugwu obodo Ai, ndagwurugwu bụ ihe kewara ha na obodo ahụ.
12 And taking about five thousand men, he put them in position for a surprise attack on the west side of Ai, between Beth-el and Ai.
Joshua chịịrị ihe ruru puku ndị agha ise, zoo ha nʼakụkụ ọdịda anyanwụ obodo ahụ, nʼetiti Betel na Ai.
13 So all the people were in their places, the army on the north side of the town and the secret force on the west; and that night Joshua went down into the valley.
Ya mere, ndị agha were ọnọdụ ha nʼusoro, ndị ga-ebu agha nọ nʼakụkụ ugwu, ndị niile zoro onwe ha nʼakụkụ ọdịda anyanwụ nke obodo ahụ. Ma nʼabalị ahụ, Joshua gara nọdụ na ndagwurugwu ahụ.
14 Now when the king of Ai saw it, he got up quickly and went out to war against Israel, he and all his people, to the slope going down to the valley; but he had no idea that a secret force was waiting at the back of the town.
Mgbe eze Ai hụrụ nke a, ya na ndị ikom obodo ahụ niile mere ngwangwa pụọ nʼisi ụtụtụ izute ndị Izrel nʼotu ebe, nke chere ihu nʼAraba. Ma ọ mataghị na o nwere ndị agha zubere imegide ya ndị zoro onwe ha nʼọhịa dị nʼazụ obodo.
15 Then Joshua and all Israel, acting as if they were overcome before them, went in flight by way of the waste land.
Joshua na ndị Izrel niile mere ka ha chụghachi ha azụ site nʼihu ha, ha gbara ọsọ na-aga akụkụ ọzara ahụ niile dịka ndị e meriri emeri.
16 And all the people in Ai came together to go after them; and they went after Joshua, moving away from the town.
Nʼihi nke a, a kpọkuru ndị ikom niile nọ nʼime obodo Ai sị ha pụta bịa chụọ ụmụ Izrel ọsọ, ha chụrụ Joshua na-aga, e si otu a rapụta ha nʼebe dị anya site nʼobodo ahụ.
17 There was not a man in Ai and Beth-el who did not go out after Israel; and the town was open and unwatched while they went after Israel.
Ọ dịkwaghị otu onye nwoke nke fọdụrụ na Ai maọbụ na Betel. Ha hapụkwara obodo ahụ ka o ghere oghe, gaa ịchụ ndị Izrel ọsọ.
18 And the Lord said to Joshua, Let your spear be stretched out against Ai; for I will give it into your hands. So Joshua took up his spear, stretching it out in the direction of the town.
Mgbe ahụ, Onyenwe anyị kpọrọ Joshua sị ya, “Setịpụ ùbe dị gị nʼaka nʼụzọ Ai, nʼihi na aga m enye gị obodo a.” Joshua mere dịka Onyenwe anyị gwara ya.
19 Then the secret force came quickly from their place, and running forward when they saw his hand stretched out, went into the town and took it, and put fire to it straight away.
Mgbe ndị agha ahụ zoro onwe ha nʼime ọhịa lere anya hụ na Joshua setịrị aka ya, ngwangwa, ha wụpụtara site nʼebe ha zoro onwe ha, gbara ọsọ gbaba nʼobodo Ai, merie ya, mụnye ya ọkụ.
20 Then the men of Ai, looking back, saw the smoke of the town going up to heaven, and were unable to go this way or that: and the people who had gone in flight to the waste land were turned back on those who were coming after them.
Ma mgbe ndị agha Ai lere anya nʼazụ, hụ ka anwụrụ ọkụ si nʼobodo ha na-alali elu, ha dara mba nʼime onwe ha. Ohere ọbụla adịghịkwa nye ha ịgbalaga gaa otu ụzọ maọbụ ụzọ ọzọ. Nʼihi na ndị Izrel ahụ buuru ụzọ gbaa ọsọ, ndị ahụ gbara na-aga nʼọzara, chigharịrị bido ịlụso ndị agha Ai ahụ na-achụ ha ọsọ ọgụ.
21 And when Joshua and all Israel saw that the town had been taken by the surprise attack, and that the smoke of the town had gone up, turning round they overcame the men of Ai.
Nʼihi na mgbe Joshua na ndị agha Izrel so ya lepụrụ anya hụ ka anwụrụ ọkụ si nʼobodo Ai na-arịgo elu, ha matara na ndị ha zoro onwe ha nʼọhịa abanyela obodo Ai, lụgbuo ya. Ya mere, Joshua na ndị agha so ya tụgharịrị bido igbu ndị agha obodo Ai.
22 Then the other force came out of the town against them, so that they were being attacked on this side and on that: and Israel overcame them and let not one of them get away with his life.
Ndị agha Izrel ahụ gara kpọọ obodo ahụ ọkụ pụtakwara, site nʼobodo ahụ, bido ịlụso ndị agha Ai ọgụ. Nke a mere ka ndị agha Ai nọdụ nʼetiti ụzọ ndị agha Izrel abụọ. Otu nʼihu ha, ndị nke ọzọ nʼazụ ha. Ya mere, ndị agha Izrel menyụrụ ha anya, gbuo ha, ruo na ọ dịkwaghị otu onye fọdụrụ nʼime ha, maọbụ onye gbapụrụ agbapụ.
23 But the king of Ai they made prisoner, and took him to Joshua.
Naanị eze Ai ka e jidere na ndụ. A kpọtakwara ya bịaruo nʼebe Joshua nọ.
24 Then, after the destruction of all the people of Ai in the field and in the waste land where they went after them, and when all the people had been put to death without mercy, all Israel went back to Ai, and put to death all who were in it without mercy.
Mgbe ndị agha Izrel gbusịrị ndị agha Ai niile nọ nʼọhịa na nʼọzara, ha lọghachiri azụ gbuo ndị niile fọdụrụ nʼime obodo ahụ.
25 On that day twelve thousand were put to death, men and women, all the people of Ai.
Ndị niile e gburu nʼụbọchị ahụ, ma nwoke ma nwanyị dị puku iri na abụọ. Ọ bụkwa ndị niile nọ nʼobodo ahụ ka e gburu.
26 For Joshua did not take back his hand with the outstretched spear till the destruction of the people of Ai was complete.
Nʼihi na Joshua nọgidere setịpụ ùbe o ji nʼaka ya, megide obodo Ai, tutu e bibie ndị niile nọ nʼobodo ahụ kpamkpam.
27 But the cattle and the goods from that town, Israel took for themselves, as the Lord had given orders to Joshua.
Ma ndị Izrel kwaara anụ ụlọ, na ihe nkwata nʼagha nke obodo ahụ, dịka okwu Onyenwe anyị nyere Joshua nʼiwu si dị.
28 So Joshua gave Ai to the flames, and made it a waste mass of stones for ever, as it is to this day.
Ya mere, Joshua kpọrọ obodo Ai ọkụ, mee ya ka ọ ghọọ mkpọmkpọ ebe nke tọgbọrọ nʼefu ruo taa.
29 And he put the king of Ai to death, hanging him on a tree till evening: and when the sun went down, Joshua gave them orders to take his body down from the tree, and put it in the public place of the town, covering it with a great mass of stones, which is there to this day.
Ma Joshua kwụbara eze ndị Ai nʼelu osisi site nʼụtụtụ ruo nʼanyasị. Mgbe anyanwụ dara, Joshua nyere iwu ka e wedata ozu eze Ai site nʼosisi ahụ, tụsa ya nʼihu ọnụ ụzọ e si abata obodo ahụ. Emesịa, ha tụkọtara ọtụtụ nkume nʼelu ya. Nkume ahụ ha tụkọtara dịkwa nʼebe ahụ ruo taa.
30 Then Joshua put up an altar to the Lord, the God of Israel, in Mount Ebal,
Mgbe ahụ, Joshua wuuru Onyenwe anyị, Chineke Izrel ebe ịchụ aja nʼelu ugwu Ebal,
31 In the way ordered by Moses, the servant of the Lord, as it is recorded in the book of the law of Moses, an altar of uncut stones, untouched by any iron instrument: and on it they made burned offerings and peace-offerings to the Lord.
dịka Mosis onyeozi Onyenwe anyị nyere ndị Izrel nʼiwu. O wuru ya dịka ihe e dere nʼakwụkwọ iwu Mosis si dị, ebe ịchụ aja a na-ejighị nkume a wara awa wuo, nkume a na-ejighị ngwa ọrụ igwe waa. Nʼelu ebe ịchụ aja a ka ha chụụrụ Onyenwe anyị aja nsure ọkụ na aja udo.
32 And he made there on the stones a copy of the law of Moses, writing it before the eyes of the children of Israel.
Ma mgbe ndị Izrel nọ na-ele anya, Joshua depụtara iwu ndị ahụ Mosis nyere ha nʼelu nkume.
33 And all Israel, those who were Israelites by birth, as well as the men from other lands living with them, and their responsible men and their overseers and judges, took their places round the ark, in front of the priests, the Levites, whose work it was to take up the ark of the Lord's agreement; half of them were stationed in front of Mount Gerizim and half in front of Mount Ebal, in agreement with the orders for the blessing of the children of Israel which Moses, the servant of the Lord, had given.
Izrel niile, ha na ndị okenye ha, na ndị ọchịagha ha, na ndị ikpe ha, guzo nʼakụkụ abụọ nke igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị, na ncherita ihu ndị nchụaja, bụ ndị Livayị ndị na-ebu ya. Ma ndị ọbịa bi nʼetiti ha, ma ndị amụrụ nʼala ahụ nọ nʼebe ahụ. Ọkara nʼime ha gara guzo nʼakụkụ ugwu Gerizim, ọkara ndị ọzọ guzoro nʼakụkụ ugwu Ebal, dịka Mosis onyeozi Onyenwe anyị nyere nʼiwu na mbụ, na ha ga-agọzi ndị Izrel.
34 And after, he gave them all the words of the law, the blessing and the curse, as it is all recorded in the book of the law;
Emesịa, Joshua gụpụtara na ntị ha, okwu niile nke iwu ahụ, ya na ngọzị na ọbụbụ ọnụ so ya, dịka ihe niile e dere nʼAkwụkwọ Iwu si dị.
35 Reading to all the meeting of Israel, with the women and the children and the men from other lands who were living among them, every word of the orders which Moses had given.
Iwu niile Mosis nyere ha ka Joshua gụpụtara na ntị ndị Izrel niile. Ndị inyom na ụmụntakịrị, na ndị ọbịa niile bi nʼetiti ụmụ Izrel so nọkọọ nʼoge a ndị Izrel niile zukọrọ.

< Joshua 8 >