< 2 Samuel 14 >
1 Now it was clear to Joab, the son of Zeruiah, that the king's heart was turning to Absalom.
Joab, nwa Zeruaya matara na obi eze dị nʼebe Absalọm nọ.
2 And Joab sent to Tekoa and got from there a wise woman, and said to her, Now make yourself seem like one given up to grief, and put on the clothing of sorrow, not using any sweet oil for your body, but looking like one who for a long time has been weeping for the dead:
Joab zigara ozi na Tekoa, si nʼebe ahụ kpọta otu nwanyị maara ihe. Mgbe nwanyị ahụ bịaruru, Joab gwara ya sị, “Mee onwe gị dịka onye na-eru ụjụ. Yiri akwa mkpe, etekwala mmanụ otite. Kpaa agwa dịka nwanyị nọ nʼiru ụjụ ogologo oge.
3 And come to the king and say these words to him. So Joab gave her words to say.
Emesịa, jekwuru eze, gwa ya okwu ndị a m na-agwa gị.” Joab tinyere okwu ndị ahụ nʼọnụ ya.
4 And the woman of Tekoa came to the king, and falling on her face, gave him honour and said, Give me help, O king.
Mgbe nwanyị ahụ si Tekoa gara na nke eze, ọ dara nʼala kpuo ihu ya nʼala ịsọpụrụ eze. Ọ sịrị, “Biko nyere m aka, gị onye a na-asọpụrụ!”
5 And the king said to her, What is your trouble? And her answer was, Truly I am a widow, and my husband is dead.
Eze jụrụ ya ajụjụ sị, “Gịnị bụ mkpa gị?” Ọ zara sị, “Abụ m nwanyị isi mkpe, di m anwụọla.
6 And I had two sons, and the two of them had a fight in the field, and there was no one to come between them, and one with a blow put the other to death.
Enwere m ụmụ ndị ikom abụọ ndị gara lụọ ọgụ nʼọhịa. Mgbe ha na-alụ ọgụ ahụ, o nweghị onye pụtara gboo ha. Nʼihi ya, otu nʼime ha tigburu ibe ya.
7 And now all the family is turned against me, your servant, saying, Give up him who was the cause of his brother's death, so that we may put him to death in payment for the life of his brother, whose life he took; and we will put an end to the one who will get the heritage: so they will put out my last burning coal, and my husband will have no name or offspring on the face of the earth.
Ma ugbu a, ndị ikwu di m na-esogbu m na-asị ‘Kpọpụta onye ahụ gburu nwanne ya ka anyị gbuo ya nʼihi ndụ nwanne ya o wepụrụ, ka anyị si otu a memilaa onye nke fọdụrụ ga-erita oke ezinaụlọ.’ Ha chọrọ isi otu a menyụọ icheku ọkụ nke fọdụụrụ m, nke bụ na di m agaghị enwezikwa aha maọbụ onye fọdụụrụ ya nʼelu ụwa.”
8 And the king said to the woman, Go to your house and I will give orders about this.
Eze sịrị nwanyị ahụ, “Laa nʼụlọ gị, aga m ahụ na o nweghị onye metụrụ ya aka.”
9 And the woman of Tekoa said to the king, My lord, O king, may the sin be on me and on my family, and may the king and the seat of his kingdom be clear of sin!
Ma nwanyị ahụ si Tekoa sịrị ya, “Ka onyenwe m, bụ eze, gbaghara mụ na ezinaụlọ m, ka ikpe ọmụma ọbụla ghara ịdịrị eze na ocheeze ya.”
10 And the king said, If anyone says anything to you, make him come to me, and he will do you no more damage.
Eze zara ya, “Enyela onwe gị nsogbu maka nke ahụ. Ọ bụrụ na onye ọbụla agwa gị okwu ọbụla, kpọtara m ya. Onye dị otu a agaghị enyekwa gị nsogbu ọzọ.”
11 Then she said, Let the king keep in mind the Lord your God, so that he who gives punishment for blood may be kept back from further destruction and that no one may send death on my son. And he said, By the living Lord, not a hair of your son's head will come to the earth.
Mgbe ahụ ọ zara, “Biko, ka eze kpọkuo aha Onyenwe anyị Chineke ya ka ọ kwụsị onye na-agwa ọchụ, ka ọ ghara igbu onye ọzọ, ka a gharakwa ịla nwa m nwoke nʼiyi.” Ọ sịrị, “Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, otu agịrị isi agaghị esi nʼisi nwa gị dapụ nʼala.”
12 Then the woman said, Will the king let his servant say one word more? And he said, Say on.
Mgbe ahụ, nwanyị ahụ sịrị, “Biko kwere ka ohu gị nwanyị gwa onyenwe m eze otu mkpụrụ okwu ọzọ.” Ọ sịrị, “Gaa nʼihu kwuo.”
13 And the woman said, Why have you had such a thought about the people of God? (for in saying these very words the king has put himself in the wrong because he has not taken back the one whom he sent far away.)
Nwanyị ahụ sịrị, “Ọ bụ nʼihi gịnị ka ị chere ihe dị otu a megide ndị nke Chineke? Mgbe eze na-ekwu otu a, ọ bụ na ọ dịghị ama onwe ya ikpe, nʼihi na eze a jụla ịkpọghachi nwa ya a chụpụrụ achụpụ?
14 For death comes to us all, and we are like water drained out on the earth, which it is not possible to take up again; and God will not take away the life of the man whose purpose is that he who has been sent away may not be completely cut off from him.
Anyị niile ga-anwụ. Anyị dịkwa ka mmiri a wụsara nʼala, nke a na-apụghị ịchịkọtakwa ọzọ. Ma Chineke adịghị anapụ mmadụ ndụ ya, ma ọ na-emeghepụ ụzọ ga-eme ka onye ọ chụpụrụ achụpụ lọghachikwutekwa ya.
15 And now it is my fear of the people which has made me come to say these words to my lord the king: and your servant said, I will put my cause before the king, and it may be that he will give effect to my request.
“Ma ugbu a, ebe m bịara ịgwa onyenwe m bụ eze, okwu a, nʼihi na ndị mmadụ emenyela m egwu. Ohu gị chere nʼobi ya, ‘Aga m agwa eze okwu; ma eleghị anya, ọ ga-emezuru ohu ya nwanyị ihe ọ rịọrọ.
16 For the king will give ear, and take his servant out of the power of the man whose purpose is the destruction of me and my son together from the heritage of God.
Ma eleghị anya eze ga-anapụta ohu ya nwanyị site nʼaka nwoke ahụ na-agbalị ibipụ mụ na nwa m nwoke site nʼihe nketa nke Chineke.’
17 Then your servant said, May the word of my lord the king give me peace! for my lord the king is as the angel of God in his hearing of good and bad: and may the Lord your God be with you!
“Ugbu a, ohu gị nwanyị na-asị, ‘Ka okwu onyenwe m eze kwuru wetara m izuike, nʼihi onyenwe m eze na-enyochapụta ihe ọma maọbụ ihe ọjọọ dịka mmụọ ozi Chineke. Ka Onyenwe anyị Chineke gị nọnyere gị.’”
18 Then the king said to the woman, Now give me an answer to the question I am going to put to you; keep nothing back. And the woman said, Let my lord the king say on.
Mgbe ahụ, eze gwara nwanyị ahụ okwu sị, “Achọrọ m ka ị gwa m eziokwu nʼajụjụ a m na-aga ịjụ gị.” Nwanyị ahụ zara sị, “Ka onyenwe m, bụ eze kwuo ihe dị ya nʼobi.”
19 And the king said, Is not the hand of Joab with you in all this? And the woman in answer said, By the life of your soul, my lord the king, it is not possible for anyone to go to the right hand or to the left from anything said by the king: your servant Joab gave me orders, and put all these words in my mouth:
Devid jụrụ ya sị, “Aka Joab ọ dị nʼokwu ndị a niile?” Nwanyị ahụ zara sị ya, “Dịka ị na-adị ndụ, onyenwe m, bụ eze, ọ dịghị onye ọbụla ga-esi nʼihe onyenwe m bụ eze kwuru, chee ihu nʼaka nri maọbụ nʼaka ekpe. E, ọ bụ ohu gị Joab nyere m iwu ime nke a, ya gwakwara ohu gị nwanyị okwu niile ndị a.
20 This he did, hoping that the face of this business might be changed: and my lord is wise, with the wisdom of the angel of God, having knowledge of everything on earth.
Ohu gị bụ Joab mere ihe a ka ọ gbanwee otu ọnọdụ ihe dị ugbu a. Onyenwe m nwere amamihe dịka ndị mmụọ ozi Chineke. Ọ maakwara ihe niile na-eme nʼala.”
21 And the king said to Joab, See now, I will do this thing: go then and Come back with the young man Absalom.
Eze sịrị Joab, “Ọ dị mma, aga m eme ya. Gaa kpọghachite nwokorobịa ahụ bụ Absalọm.”
22 Then Joab, falling down on his face on the earth, gave the king honour and blessing; and Joab said, Today it is clear to your servant that I have grace in your eyes, my lord king, because the king has given effect to the request of his servant.
Joab dara nʼala kpuo ihu ya nʼala, kpọọ isiala, gọzie eze. Joab sịrị, “Taa ka ohu gị maara na ahụtala m amara nʼihu gị, onyenwe m bụ eze, nʼihi na eze e merela ohu ya ihe ọ rịọrọ.”
23 So Joab got up and went to Geshur and came back again to Jerusalem with Absalom.
Joab biliri gaa Geshua, kpọlata Absalọm na Jerusalem.
24 And the king said, Let him go to his house, but let him not see my face. So Absalom went back to his house and did not see the face of the king.
Mgbe ha bịaruru, eze gwara Joab okwu sị, “Gwa ya ka ọ laa nʼụlọ ya. Ọ gaghị abịa nʼihu m, nʼihi na-achọghị m ịhụ ya anya.” Ya mere, Absalọm lara nʼụlọ ya. Ọ hụkwaghị eze anya.
25 Now in all Israel there was no one so greatly to be praised for his beautiful form as Absalom: from his feet to the crown of his head he was completely beautiful.
Ọ dịghị nwoke mara mma dịka Absalọm nʼala Izrel niile. Ọ dịkwaghị onye na-adịghị ekwu okwu banyere ịma mma ya. Nʼihi na ntụpọ ọbụla adịghị ya nʼahụ site nʼopi isi ya ruo nʼọbọ ụkwụ ya.
26 And when he had his hair cut, (which he did at the end of every year, because of the weight of his hair; ) the weight of the hair was two hundred shekels by the king's weight.
Mgbe ọbụla ọ kpụchara ntutu isi ya, nʼihi na ọ bụ otu ugboro nʼafọ ka ọ na-akpụcha agịrị isi mgbe o bidoro ịnyị ya arọ. Ọ na-atụ agịrị isi a na-akpụchapụta ya nʼisi, ịdị arọ ya na-eru narị shekel abụọ ma a tụọ ya nʼihe ọtụtụ eze.
27 And Absalom was the father of three sons and of one daughter named Tamar, who was very beautiful.
Absalọm mụtara ụmụ ndị ikom atọ, na otu nwanyị, aha ya bụ Tama. Nwaagbọghọ a mara mma nke ukwuu.
28 For two full years Absalom was living in Jerusalem without ever seeing the face of the king.
Mgbe Absalọm nọrọ afọ abụọ na Jerusalem na-ahụghị eze anya,
29 Then Absalom sent for Joab to send him to the king, but he would not come to him: and he sent again a second time, but he would not come.
o ziri ozi ka Joab bịa, ka ọ gaa ziere ya eze ozi, ma Joab abịaghị. Absalọm zigakwara ozi ọzọ ka ọ bịa ma Joab ekweghị ịbịa.
30 So he said to his servants, See, Joab's field is near mine, and he has barley in it; go and put it on fire. And Absalom's servants put the field on fire.
Nʼikpeazụ, Absalọm gwara ndị na-ejere ya ozi okwu sị ha, “Gaanụ sunye ubi ọka balị Joab dị nʼakụkụ nke m ọkụ.” Ha mekwara dịka a gwara ha.
31 Then Joab came to Absalom in his house and said to him, Why have your servants put my field on fire?
Mgbe ahụ, Joab biliri jee nʼụlọ Absalọm, ma sị ya, “Gịnị mere ndị na-ejere gị ozi ji gbaa ubi m ọkụ?”
32 And Absalom's answer was, See, I sent to you saying, Come here, so that I may send you to the king to say, Why have I come back from Geshur? it would be better for me to be there still: let me now see the king's face, and if there is any sin in me, let him put me to death.
Absalọm sịrị ya, “Lee ezitere m gị ozi, sị, ‘Bịa nʼebe a ka m ziga gị na nke eze ka ị jụta, “Nʼihi gịnị ka m ji site na Geshua lọghachita? Ọ gara a kara m mma ma a sị na m nọ nʼebe ahụ ruo ugbu a.”’ Ugbu a, achọrọ m ka mụ hụ ihu eze, ọ bụrụ na onwe ajọ omume dị nʼime m, ya mee ka m nwụọ.”
33 So Joab went to the king and said these words to him: and when the king had sent for him, Absalom came, and went down on his face on the earth before the king: and the king gave him a kiss.
Joab gakwuru eze, gwa ya ihe Absalọm kwuru. Mgbe ahụ, eze kpọrọ Absalọm, onye batara ma kpọọ isiala nʼihu eze. Eze sutukwara ya ọnụ.