< Psalms 135 >

1 Hallelujah! Praise the name of the LORD. Give praise, O servants of the LORD,
Toonu Onyenwe anyị. Toonu aha Onyenwe anyị, toonu ya, unu ndị ohu Onyenwe anyị niile,
2 who stand in the house of the LORD, in the courts of the house of our God.
unu ndị na-eje ozi nʼime ụlọ Onyenwe anyị, nʼime ogige ụlọ Chineke anyị.
3 Hallelujah, for the LORD is good; sing praises to His name, for it is lovely.
Toonu Onyenwe anyị, nʼihi na Onyenwe anyị dị mma; bụkuo aha ya abụ otuto, nʼihi na ọ bụ ihe ziri ezi.
4 For the LORD has chosen Jacob as His own, Israel as His treasured possession.
Nʼihi na Onyenwe anyị ahọpụtala Jekọb nye onwe ya, ọ họpụtala Izrel ka ọ bụrụ ihe oke ọnụahịa nke aka ya.
5 For I know that the LORD is great; our Lord is above all gods.
Amaara m na Onyenwe anyị dị ukwuu, na Onyenwe anyị dị ukwuu karịa chi niile.
6 The LORD does all that pleases Him in the heavens and on the earth, in the seas and in all their depths.
Onyenwe anyị na-eme ihe ọbụla masịrị ya nʼeluigwe na elu ụwa na nʼoke osimiri na nʼime ogbu mmiri niile.
7 He causes the clouds to rise from the ends of the earth. He generates the lightning with the rain and brings forth the wind from His storehouses.
Ọ bụ ya na-eme ka igwe ojii na-apụta site nʼakụkụ niile nke ụwa. Ọ bụkwa ya na-ezite amụma nke na-eweta mmiri ozuzo. Ọ na-ewepụtakwa ifufe site nʼụlọ ifufe ya niile.
8 He struck down the firstborn of Egypt, of both man and beast.
O tigburu ụmụ niile e buru ụzọ mụọ nʼala Ijipt, ụmụ mmadụ buru ụzọ mụọ na ụmụ anụ ụlọ e buru ụzọ mụọ.
9 He sent signs and wonders into your midst, O Egypt, against Pharaoh and all his servants.
O zipụrụ ihe ịrịbama ya dị iche iche na ọrụ ebube ya niile nʼetiti unu, o Ijipt, megide Fero na ndị niile na-ejere ya ozi.
10 He struck down many nations and slaughtered mighty kings:
O tigburu ọtụtụ mba dị ukwuu nʼọnụọgụgụ, tigbukwaa ndị eze ha, ndị dị ike nʼagha.
11 Sihon king of the Amorites, Og king of Bashan, and all the kings of Canaan.
Ụfọdụ nʼime ha bụ Saịhọn, eze ndị Amọrait, na Ọg eze Bashan, na ndị eze niile dị na Kenan.
12 He gave their land as an inheritance, as a heritage to His people Israel.
O weere ala ndị obodo ahụ niile nye ndị ya, nye ya ụmụ Izrel dịka ihe nketa ha.
13 Your name, O LORD, endures forever, Your renown, O LORD, through all generations.
O Onyenwe anyị, aha gị na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi a maara aha gị ruo ọgbọ niile.
14 For the LORD will vindicate His people and will have compassion on His servants.
Nʼihi na Onyenwe anyị ga-ekpepụta ndị ya. Ọ ga-enwekwa ọmịiko nʼahụ ndị ohu ya.
15 The idols of the nations are silver and gold, made by the hands of men.
Chi ndị mba ọzọ bụ arụsị e jiri aka kpụọ, nke e ji ọlaọcha na ọlaedo kpụọ.
16 They have mouths, but cannot speak; they have eyes, but cannot see;
Ha nwere ọnụ ma ha adịghị ekwu okwu, ha nwere anya ma ha adịghị ahụ ụzọ.
17 they have ears, but cannot hear; nor is there breath in their mouths.
Ha nwere ntị ma ha adịghị anụ ihe, ọ dịkwaghị nkuume dị nʼime ọnụ ha.
18 Those who make them become like them, as do all who trust in them.
Ndị na-eme ha ga-adị ka ha. Ọ bụkwa otu a ka ndị na-atụkwasị ha obi ga-adị.
19 O house of Israel, bless the LORD; O house of Aaron, bless the LORD;
Ndị Izrel, toonu Onyenwe anyị. Unu ndị ụlọ Erọn, toonu Onyenwe anyị.
20 O house of Levi, bless the LORD; you who fear the LORD, bless the LORD!
Unu ndị ụlọ Livayị, toonu Onyenwe anyị; unu ndị na-atụ egwu ya, toonu Onyenwe anyị.
21 Blessed be the LORD from Zion— He who dwells in Jerusalem. Hallelujah!
Ka otuto dịrị Onyenwe anyị site na Zayọn, nye onye ahụ na-ebi na Jerusalem. Toonu Onyenwe anyị.

< Psalms 135 >