< Psalms 123 >
1 A song of ascents. I lift up my eyes to You, the One enthroned in heaven.
Abụ nrigo. Ana m eweli anya m abụọ elu ile gị, gị onye ocheeze ya dị nʼeluigwe.
2 As the eyes of servants look to the hand of their master, as the eyes of a maidservant look to the hand of her mistress, so our eyes are on the LORD our God until He shows us mercy.
Dịka ohu si elekwasị nna ya ukwu anya ya, na dịka ohu nwanyị na-eje ozi si elekwasị nne ya ukwu anya, ịnata ozi ọ ga-eje, otu a ka anyị si na-elekwasị Onyenwe anyị bụ Chineke anyị anya, ruo mgbe ọ ga-emere anyị ebere.
3 Have mercy on us, O LORD, have mercy, for we have endured much contempt.
Meere anyị ebere, O Onyenwe anyị, meere anyị ebere, nʼihi na anyị abụrụla ndị a na-akọcha akọcha.
4 We have endured much scorn from the arrogant, much contempt from the proud.
Nʼihi na nnagide anyị na-anagide ịchị ọchị ndị nganga, na ileda anya ndị mpako adịla ukwuu.