< Psalms 106 >
1 Hallelujah! Give thanks to the LORD, for He is good; His loving devotion endures forever.
Toonu Onyenwe anyị. Keleenụ Onyenwe anyị nʼihi na ọ dị mma; Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.
2 Who can describe the mighty acts of the LORD or fully proclaim His praise?
Onye pụrụ ikwupụtasịcha ihe ukwu niile nke Onyenwe anyị na-arụ maọbụ kwupụta otuto ya niile?
3 Blessed are those who uphold justice, who practice righteousness at all times.
Ndị a gọziri agọzi ka ha bụ, bụ ndị na-edebe ikpe ziri ezi, ndị ahụ na-eme ezi ihe mgbe niile.
4 Remember me, O LORD, in Your favor to Your people; visit me with Your salvation,
O Onyenwe anyị, cheta m mgbe ị ga-egosi ndị gị ihuọma, bịa leta m, mgbe ị na-azọpụta ha,
5 that I may see the prosperity of Your chosen ones, and rejoice in the gladness of Your nation, and give glory with Your inheritance.
ka m soro keta oke na ngọzị ndị gị ị họpụtara, ka m keta oke nʼọṅụ ahụ dịrị mba gị sorokwa ihe nketa gị nye otuto.
6 We have sinned like our fathers; we have done wrong and acted wickedly.
Anyị emehiela, dịka nna nna anyị ha mehiere; anyị emeela ihe ọjọọ, rụọkwa ọrụ ajọ omume.
7 Our fathers in Egypt did not grasp Your wonders or remember Your abundant kindness; but they rebelled by the sea, there at the Red Sea.
Mgbe nna nna anyị ha nọ nʼIjipt, ha echeghị uche banyere ọrụ ebube gị niile; ha echetakwaghị ịba ụba nke ebere gị niile, kama ha nupuru isi nʼakụkụ oke osimiri ahụ, bụ Osimiri Uhie.
8 Yet He saved them for the sake of His name, to make His power known.
Ma ọ zọpụtara ha nʼihi aha ya, ime ka a mara ike ya dị ukwuu.
9 He rebuked the Red Sea, and it dried up; He led them through the depths as through a desert.
Ọ baara Osimiri Uhie mba, ọ tachaa; o dufere ndị ya site nʼebe dị omimi gafee dịka ọ bụ ọzara.
10 He saved them from the hand that hated them; He redeemed them from the hand of the enemy.
Ọ zọpụtara ha site nʼaka ndị kpọrọ ha asị; gbapụtakwa ha site nʼaka ndị iro ha.
11 The waters covered their foes; not one of them remained.
Mmiri ahụ riri ndị iro ha niile; ọ dịghị otu onye nʼime ha fọdụrụ.
12 Then they believed His promises and sang His praise.
Mgbe ahụ, ha kweere okwu gị niile, ma bụkuo gị abụ otuto.
13 Yet they soon forgot His works and failed to wait for His counsel.
Ma o teghị aka, ha chefuru ihe niile ọ rụrụ, ha e chereghị ka ndụmọdụ ya pụta ìhè.
14 They craved intensely in the wilderness and tested God in the desert.
Nʼọzara, ha sooro ọchịchọ nke obi ha; nʼala tọgbọrọ nʼefu, ha nwara Chineke ọnwụnwa.
15 So He granted their request, but sent a wasting disease upon them.
Nʼihi ya, o nyere ha ihe ha rịọrọ ya, ma zite ọrịa na-efe efe ka ọ dakwasị ha.
16 In the camp they envied Moses, as well as Aaron, the holy one of the LORD.
Nʼetiti ọmụma ụlọ ikwu ha, ha kworo ekworo megide Mosis na Erọn, ndị e doro nsọ nye Onyenwe anyị.
17 The earth opened up and swallowed Dathan; it covered the assembly of Abiram.
Ala meghere loda Datan, o likwara Abiram, na ndị otù ya.
18 Then fire blazed through their company; flames consumed the wicked.
Ọkụ repịara ndị niile sonyere ha; ire ọkụ repịara ndị ajọ omume.
19 At Horeb they made a calf and worshiped a molten image.
Na Horeb, ha kpụrụ nwa ehi, kpọọ isiala nye arụsị e jiri igwe pịa.
20 They exchanged their Glory for the image of a grass-eating ox.
Ha jiri oyiyi oke ehi nke na-ata ahịhịa gbanwere Ebube ha.
21 They forgot God their Savior, who did great things in Egypt,
Ha chefuru Chineke, onye zọpụtara ha, onye rụrụ ọtụtụ ọrụ dị ukwuu nʼIjipt,
22 wondrous works in the land of Ham, and awesome deeds by the Red Sea.
ọtụtụ ihe ịrịbama nʼala Ham, na ọtụtụ ọrụ ịtụnanya nʼakụkụ Osimiri Uhie.
23 So He said He would destroy them— had not Moses His chosen one stood before Him in the breach to divert His wrath from destroying them.
Nʼihi ya, o kwuru na ọ ga-ala ha nʼiyi, ma Mosis, onye ya ọ họpụtara, guzoro nʼetiti ndị ahụ na Chineke, ka oke iwe ya ghara ịla ha nʼiyi.
24 They despised the pleasant land; they did not believe His promise.
Emesịa, ha ledara ala ọma ahụ anya, ha ekwenyeghị na nkwa ya.
25 They grumbled in their tents and did not listen to the voice of the LORD.
Ha tamuru ntamu nʼime ụlọ ikwu ha; ha erubekwaghị isi nye Onyenwe anyị.
26 So He raised His hand and swore to cast them down in the wilderness,
Nʼihi nke a, o weliri aka ya elu ṅụọrọ ha iyi na ọ ga-eme ka ha niile nwụọ nʼọzara,
27 to disperse their offspring among the nations and scatter them throughout the lands.
mee ka agbụrụ ha daa nʼetiti mba dị iche iche, ma chụsasịa ha nʼala niile.
28 They yoked themselves to Baal of Peor and ate sacrifices offered to lifeless gods.
Ha dịnyeere ndị na-efe arụsị Baal nke Peoa, riekwa ihe e ji chụọrọ chi na-enweghị ndụ aja;
29 So they provoked the LORD to anger with their deeds, and a plague broke out among them.
ha sitere nʼajọ omume ha kpasuo Onyenwe anyị iwe, nke mere ka ọrịa na-efe efe dakwasị ha.
30 But Phinehas stood and intervened, and the plague was restrained.
Ma Finehaz guzoro ọtọ, mee ihe ziri ezi, ọrịa ahụ na-efe efe kwụsịkwara.
31 It was credited to him as righteousness for endless generations to come.
A gụnyere nke a dịka ezi omume nye ya site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.
32 At the waters of Meribah they angered the LORD, and trouble came to Moses because of them.
Nʼakụkụ mmiri Meriba, ha kpasuru Onyenwe anyị iwe, nʼihi ha, nsogbu dakwasịrị Mosis;
33 For they rebelled against His Spirit, and Moses spoke rashly with his lips.
nʼihi na ha nupuru isi megide Mmụọ nke Chineke, Mosis kwuru okwu, na-echeghị echiche banyere ihe ọ na-ekwu.
34 They did not destroy the peoples as the LORD had commanded them,
Ha egbuchapụghị mba niile bi nʼala ahụ dịka Onyenwe anyị dọrọ ha aka na ntị ka ha mee.
35 but they mingled with the nations and adopted their customs.
Kama ha gwakọtara onwe ha na mba niile nke ala ahụ, site otu a, mụta ime ka ha na-eme.
36 They worshiped their idols, which became a snare to them.
Ha fere arụsị ha ofufe, nke ghọrọ ihe ịma nʼọnya nye ha.
37 They sacrificed their sons and their daughters to demons.
Ha gara nʼihu were ụmụ ha ndị ikom na ndị inyom chụọrọ chi na-abụghị chi aja.
38 They shed innocent blood— the blood of their sons and daughters, whom they sacrificed to the idols of Canaan, and the land was polluted with blood.
Ha na-awụfu ọbara ndị na-emeghị ihe ọbụla, ọbara ụmụ ha ndị ikom na ndị inyom, bụ ndị ha chụrụ dịka aja nye arụsị niile nke ala Kenan, si otu a jiri ọbara ha merụọ ala ahụ.
39 They defiled themselves by their actions and prostituted themselves by their deeds.
Ha sitere nʼihe ha na-eme merụọ onwe ha; site nʼaka ọrụ ha, maka uru ha nyefere onwe ha nʼaka ndị na-emerụ ha.
40 So the anger of the LORD burned against His people, and He abhorred His own inheritance.
Nʼihi nke a, iwe were Onyenwe anyị megide ndị ya; ọ gụkwara ihe nketa ya dịka ihe rụrụ arụ.
41 He delivered them into the hand of the nations, and those who hated them ruled over them.
Ọ raara ha nye nʼaka ndị mba ọzọ dị iche iche, ndị kpọrọ ha asị chịkwara ha.
42 Their enemies oppressed them, and subdued them under their hand.
Ndị iro ha mekpara ha ahụ chie ha ọnụ nʼala nʼokpuru ike ha.
43 Many times He rescued them, but they were bent on rebellion and sank down in their iniquity.
Ọtụtụ oge, ọ napụtara ha, ma ha nọgidesịrị ike nʼinupu isi site na ndụmọdụ ya, bụrụ ndị lara nʼiyi nʼime mmehie ha.
44 Nevertheless He heard their cry; He took note of their distress.
Ma mgbe ọ nụrụ mkpu akwa ha, ọnọdụ mkpagbu ha metụtara ya;
45 And He remembered His covenant with them, and relented by the abundance of His loving devotion.
nʼihi ha, o chetara ọgbụgba ndụ ya, sitekwa nʼoke ịhụnanya ya, meere ha ebere.
46 He made them objects of compassion to all who held them captive.
Ọ na-emekwa ka ndị ahụ dọtara ha nʼagha nwee ọmịiko nʼahụ ha.
47 Save us, O LORD our God, and gather us from the nations, that we may give thanks to Your holy name, that we may glory in Your praise.
O Onyenwe anyị Chineke anyị, zọpụta anyị, chịkọta anyị site nʼaka mba dị iche iche, ka anyị nwee ike nye aha nsọ gị ekele ma nyaakwa isi nʼime otuto gị.
48 Blessed be the LORD, the God of Israel, from everlasting to everlasting. Let all the people say, “Amen!” Hallelujah!
Otuto dịrị Onyenwe anyị, bụ Chineke nke Izrel, site nʼebighị ebi ruo ebighị ebi. Ka mmadụ niile sị, “Amen!” Toonu Onyenwe anyị.