< Nehemiah 11 >

1 Now the leaders of the people settled in Jerusalem, and the rest of the people cast lots to bring one out of ten to live in the holy city of Jerusalem, while the remaining nine were to dwell in their own towns.
Ugbu a, ndịisi Izrel bi nʼobodo nsọ Jerusalem nʼoge a, ma e sitere nʼife nza họpụta otu ụzọ nʼime ụzọ iri nke ndị bi nʼobodo ndị ọzọ niile ka ha bịa biri na Jerusalem, bụ obodo nsọ ahụ, ebe ụzọ itoolu fọdụrụ bikwa nʼobodo nke aka ha.
2 And the people blessed all the men who volunteered to live in Jerusalem.
Ndị mmadụ toro ndị niile jiri afọ ofufu họrọ ịbịa soro biri na Jerusalem.
3 These are the heads of the provinces who settled in Jerusalem. (In the villages of Judah, however, each lived on his own property in their towns—the Israelites, priests, Levites, temple servants, and descendants of Solomon’s servants—
Ndị a bụ ndịisi ala ahụ a na-achị achị ndị bịara biri na Jerusalem (ma ọtụtụ ndị Izrel, ndị nchụaja, ndị Livayị, ndị na-eje ozi nʼụlọnsọ na ụmụ ndị na-ejere Solomọn ozi biiri nʼobodo Juda, onye ọbụla nʼihe onwunwe ya nʼobodo ha dị iche iche.
4 while some of the descendants of Judah and Benjamin settled in Jerusalem.) From the descendants of Judah: Athaiah son of Uzziah, the son of Zechariah, the son of Amariah, the son of Shephatiah, the son of Mahalalel, a descendant of Perez;
Ebe ndị ọzọkwa bụ ndị sitere na Juda na Benjamin, biiri na Jerusalem). Ndị sitere nʼagbụrụ Juda bụ ndị a: Ataia nwa Uzaya, nwa Zekaraya, nwa Amaraya, nwa Shefataya, nwa Mahalalel, nwa Perez;
5 and Maaseiah son of Baruch, the son of Col-hozeh, the son of Hazaiah, the son of Adaiah, the son of Joiarib, the son of Zechariah, a descendant of Shelah.
na Maaseia nwa Baruk, nwa Kol-Hoze, nwa Hazaia, nwa Adaya, nwa Joiarib, nwa Zekaraya, nwa onye Shilo.
6 The descendants of Perez who settled in Jerusalem totaled 468 men of valor.
Ọnụọgụgụ ụmụ Perez niile bi na Jerusalem dị narị anọ, na iri isii na asatọ. Ha bụ ndị ikom gbara dimkpa.
7 From the descendants of Benjamin: Sallu son of Meshullam, the son of Joed, the son of Pedaiah, the son of Kolaiah, the son of Maaseiah, the son of Ithiel, the son of Jeshaiah;
Ndị sitere nʼagbụrụ Benjamin bụ, Salu nwa Meshulam, nwa Joed, nwa Pedaia, nwa Kolaya, nwa Maaseia, nwa Itiel, nwa Jeshaya,
8 and his followers Gabbai and Sallai—928 men.
ya na ndị na-eso ya bụ ụmụ Gabai na Salai. Ọnụọgụgụ ha dị narị itoolu na iri abụọ na asatọ.
9 Joel son of Zichri was the officer over them, and Judah son of Hassenuah was over the Second District of the city.
Juel nwa Zikri bụ onyeisi ha. Juda nwa Hasenua bụ onye na-eso ya, na onye na-achị akụkụ ọhụrụ nke obodo ahụ.
10 From the priests: Jedaiah son of Joiarib; Jachin;
Ndị sitere nʼetiti ndị nchụaja bụ, Jedaya nwa Joiarib, na Jakin,
11 Seraiah son of Hilkiah, the son of Meshullam, the son of Zadok, the son of Meraioth, the son of Ahitub, the chief official of the house of God;
na Seraya nwa Hilkaya, nwa Meshulam, nwa Zadọk, nwa Meraiot, nwa Ahitub onye na-elekọta ụlọ ukwuu Chineke.
12 and their associates who did the work at the temple—822 men; Adaiah son of Jeroham, the son of Pelaliah, the son of Amzi, the son of Zechariah, the son of Pashhur, the son of Malchijah;
Ọnụọgụgụ ndị ikom ha na ha na-arụkọ ọrụ nʼụlọ ukwu ahụ bụ narị asatọ na iri abụọ na abụọ. Adaya, nwa Jeroham, nwa Pelalaya, nwa Amzi, nwa Zekaraya, nwa Pashua nwa Malkija,
13 and his associates, the leaders of families—242 men; Amashai son of Azarel, the son of Ahzai, the son of Meshillemoth, the son of Immer;
na ndị ikom bụ ndịisi ezinaụlọ ndị so ya rụọ ọrụ dị narị abụọ na iri anọ na abụọ nʼọnụọgụgụ, Amashaị nwa Azarel, nwa Ahazai, nwa Meshilemot, nwa Imea,
14 and his associates —128 mighty men of valor. Zabdiel son of Haggedolim was their overseer.
na ndị otu ya nʼọrụ ndị bụkwa dimkpa, dị otu narị na iri abụọ na asatọ nʼọnụọgụgụ. Onyeisi ha bụ Zabdiel nwa Hagedolin.
15 From the Levites: Shemaiah son of Hasshub, the son of Azrikam, the son of Hashabiah, the son of Bunni;
Site na ndị Livayị: Shemaya nwa Hashub, nwa Azrikam, nwa Hashabaya, nwa Buni,
16 Shabbethai and Jozabad, two leaders of the Levites, who supervised the work outside the house of God;
na Shabetai, na Jozabad, mmadụ abụọ na ndị ndu ndị Livayị, ndị ọ bụ ha na-arụ ọrụ dị nʼezi nke ụlọ Chineke;
17 Mattaniah son of Mica, the son of Zabdi, the son of Asaph, who led in thanksgiving and prayer; Bakbukiah, second among his associates; and Abda son of Shammua, the son of Galal, the son of Jeduthun.
Matanaya nwa Mika, nwa Zabdi, nwa Asaf, bụ onyendu nke duru nʼekpere na ofufe ekele. Bakbukaya onye nke abụọ nʼetiti ndị otu ya, na Abda nwa Shamua, nwa Galal, nwa Jedutun, bụ ndị na-enyere ya aka.
18 The Levites in the holy city totaled 284.
Ọnụọgụgụ ndị Livayị niile nọ na obodo nsọ ahụ dị narị abụọ na iri asatọ na anọ.
19 And the gatekeepers: Akkub, Talmon, and their associates, who kept watch at the gates—172 men.
Ndị nche ọnụ ụzọ ama, Akub, Talmon na ndị otu ha dị otu narị na iri asaa na abụọ nʼọnụọgụgụ, ha bụ ndị na-eche nche nʼọnụ ụzọ ama niile.
20 The rest of the Israelites, with the priests and Levites, were in all the villages of Judah, each on his own inheritance.
Ndị fọdụrụ nʼIzrel, ha na ndị nchụaja, na ndị Livayị, nọ nʼobodo Juda niile, onye ọbụla nʼihe nketa ya.
21 The temple servants lived on the hill of Ophel, with Ziha and Gishpa over them.
Ndị ahụ niile na-eje ozi nʼụlọnsọ bi nʼugwu Ofel. Ndịisi ha bụ Ziha na Gishpa.
22 Now the overseer of the Levites in Jerusalem was Uzzi son of Bani, the son of Hashabiah, the son of Mattaniah, the son of Mica. He was one of Asaph’s descendants, who were the singers in charge of the service of the house of God.
Onye na-elekọta ndị Livayị bi na Jerusalem bụ Uzi, nwa Bani, nwa Hashabaya, nwa Matanaya, nwa Matanaia, nwa Mika. Uzi bụ otu onye si nʼikwu Asaf, ndị ọbụ abụ maka ije ozi nke ụlọ Chineke.
23 For there was a command from the king concerning the singers, an ordinance regulating their daily activities.
Eze họpụtara ndị ọbụ abụ nyekwa ha ọrụ ha kwesiri ịrụ ụbọchị niile.
24 Pethahiah son of Meshezabel, a descendant of Zerah son of Judah, was the king’s agent in every matter concerning the people.
Petahaya nwa Meshezabel, onye bụ otu nʼagbụrụ Zera, nwa Juda, bụ onyeozi eze banyere ihe niile gbasara ndị mmadụ ahụ.
25 As for the villages with their fields, some of the people of Judah lived in Kiriath-arba, Dibon, Jekabzeel, and their villages;
Obodo ụfọdụ ebe ndị Juda bi bụ ndị a: Kiriat Aba, Dibọn, Jekabzeel na obodo nta ndị dị ha gburugburu,
26 in Jeshua, Moladah, and Beth-pelet;
Jeshua, Molada, Bet-Pelet,
27 in Hazar-shual; in Beersheba and its villages;
Haza Shual, Bịasheba na obodo ya niile,
28 in Ziklag; in Meconah and its villages;
Ziklag, Mekona na obodo ya niile,
29 in En-rimmon, Zorah, Jarmuth,
En-Rimọn, Zora, Jamut,
30 Zanoah, Adullam, and their villages; in Lachish and its fields; and in Azekah and its villages. So they settled from Beersheba all the way to the Valley of Hinnom.
Zanoa, Adulam na obodo nta dị ha gburugburu, Lakish, ala dị ya gburugburu, Azeka na obodo ya niile. Nke a pụtara na ndị mmadụ bi site na Bịasheba ruo na Ndagwurugwu Hinom.
31 The descendants of Benjamin from Geba lived in Michmash, Aija, and Bethel with its villages;
Ndị agbụrụ Benjamin biri na Geba, Mikmash, Aija, Betel na obodo dị ya gburugburu,
32 in Anathoth, Nob, Ananiah,
Anatot, Nob, Ananaya,
33 Hazor, Ramah, Gittaim,
Hazọ, Rema, Gitaim,
34 Hadid, Zeboim, Neballat,
Hadid, Zeboim, Nebalat,
35 Lod, and Ono; and in the Valley of the Craftsmen.
Lod, Ono na Ge Harashim.
36 And some divisions of the Levites of Judah settled in Benjamin.
Ụfọdụ nʼotu ndị Livayị, ndị ebe obibi ha dị na Juda ka e zigara isoro biri nʼebo Benjamin.

< Nehemiah 11 >