< Jeremiah 2 >
1 Now the word of the LORD came to me, saying,
Okwu nke Onyenwe anyị bịakwutere m na-asị,
2 “Go and proclaim in the hearing of Jerusalem that this is what the LORD says: ‘I remember the devotion of your youth, your love as a bride, how you followed Me in the wilderness, in a land not sown.
“Gaa, kwupụta na ntị Jerusalem, “Otu a ka Onyenwe anyị kwuru, “‘Echetara m ịnụ ọkụ nʼobi nke okorobịa gị nʼoge gara aga ime ihe ga-atọ m ụtọ, ịhụnanya gị dịka onye a lụrụ ọhụrụ, echetakwara m otu unu si soro m nʼime ọzara, ga nʼala tọgbọrọ nʼefu nke a na-akụghị mkpụrụ.
3 Israel was holy to the LORD, the firstfruits of His harvest. All who devoured her found themselves guilty; disaster came upon them,’” declares the LORD.
Izrel bụ ihe dị nsọ nye Onyenwe anyị, mkpụrụ mbụ nke owuwe ihe ubi ya. Ndị niile ripịara ya ka a gụrụ dị ka ndị ikpe mara. Ihe ọjọọ dakwasịkwara ha.’” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
4 Hear the word of the LORD, O house of Jacob, and all you families of the house of Israel.
Nụrụ okwu nke Onyenwe anyị unu ụlọ Jekọb, na unu ndị bụ agbụrụ niile sitere nʼIzrel.
5 This is what the LORD says: “What fault did your fathers find in Me that they strayed so far from Me, and followed worthless idols, and became worthless themselves?
Ihe a ka Onyenwe anyị kwuru, “Gịnị bụ ihe ọjọọ nna unu ha chọpụtara nʼime m, mere ha ji si nʼebe m nọ kpafuo, nọrọ m ebe dị anya? Nke mere na ha ghọrọ ndị nzuzu site nʼịgbaso arụsị?
6 They did not ask, ‘Where is the LORD who brought us up from the land of Egypt, who led us through the wilderness, through a land of deserts and pits, a land of drought and darkness, a land where no one travels and no one lives?’
Ha ajụghị ‘Olee ebe Onyenwe anyị ahụ nọ, bụ onye sitere nʼala Ijipt kpọpụta anyị, duuru anyị gafee ọzara tọgbọrọ nʼefu, nʼala ọzara na ala olulu jupụtara, ala nke akpịrị ịkpọ nkụ na nke oke ọchịchịrị, ala ebe ọ dịghị onye na-esi na ya agafee na nke mmadụ na-ebighị na ya?’
7 I brought you into a fertile land to eat its fruit and bounty, but you came and defiled My land, and made My inheritance detestable.
Ọ bụ m kpọbatara unu nʼala na-amị ọtụtụ mkpụrụ, ka unu rie ihe dị ukwuu na ihe dị mma si nʼime ya. Ma unu bara merụọ ala m unu mere ihe nketa m ka ọ ghọọ ihe arụ.
8 The priests did not ask, ‘Where is the LORD?’ The experts in the law no longer knew Me, and the leaders rebelled against Me. The prophets prophesied by Baal and followed useless idols.
Ndị nchụaja ajụghị sị, ‘Olee ebe Onyenwe anyị nọ?’ Ndị ikpe ha amaghị m, ndị na-achị ha mehiere megide m, ndị amụma ha bụkwa aha Baal ka ha ji ebu amụma, ha gbasooro ihe na-enweghị isi.
9 Therefore, I will contend with you again, declares the LORD, and I will bring a case against your children’s children.
“Nʼihi ya, aga m ebulite ebubo megide unu,” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya. “M ga-ebulikwa ebubo megide ụmụ ụmụ unu.
10 Cross over to the coasts of Cyprus and take a look; send to Kedar and consider carefully; see if there has ever been anything like this:
Gafee nʼọnụ mmiri Saiprọs lee anya, zie ozi gaa Keda ma leruo anya nke ọma, ma ị ga-ahụ ihe ọbụla yiri nke a.
11 Has a nation ever changed its gods, though they are no gods at all? Yet My people have exchanged their Glory for useless idols.
O nwerela mba gbanwere chi ndị ha na-efe? (Ọ bụ ezie na ha abụghị chi.) Ma ndị m ewerela arụsị na-enweghị isi gbanwere ebube ha.
12 Be stunned by this, O heavens; be shocked and utterly appalled,”
Ka ibubo nwụọ gị, gị eluigwe nʼihi nke a, maa jijiji, tụọkwa oke ụjọ.” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
13 “For My people have committed two evils: They have forsaken Me, the fountain of living water, and they have dug their own cisterns— broken cisterns that cannot hold water.
“Nʼihi na ndị m emeela ihe ọjọọ abụọ. Ha agbakụtala m azụ, bụ Isi iyi mmiri ndụ, gwuoro onwe ha ebe ichebe mmiri nke tipuru etipu na-enweghị ike ịnagide mmiri ọbụla.
14 Is Israel a slave? Was he born into slavery? Why then has he become prey?
Izrel ọ bụ ohu, ka ọ bụ ohu a mụrụ nʼụlọ? Gịnị mere o ji ghọọ ihe nlụta nʼagha?
15 The young lions have roared at him; they have growled with a loud voice. They have laid waste his land; his cities lie in ruins, without inhabitant.
Ọdụm agbọọla ụja, ha ebigbọọla meekwa ka ọ nụ olu ha. Ha ebibiela obodo ya laa ya nʼiyi, suo ya ọkụ, nke mere na o nweghị onye bi na ha.
16 The men of Memphis and Tahpanhes have shaved the crown of your head.
Ọzọkwa, ndị ikom Memfis na Tapanhis a kupuola gị isi.
17 Have you not brought this on yourself by forsaking the LORD your God when He led you in the way?
Ọ bụghị unu onwe unu wetaara onwe unu ihe ọjọọ dị otu a site na ịhapụ Onyenwe anyị bụ Chineke unu, mgbe ọ na-edu unu na-aga nʼụzọ?
18 Now what will you gain on your way to Egypt to drink the waters of the Nile? What will you gain on your way to Assyria to drink the waters of the Euphrates?
Ugbu a, gịnị bụ uru unu nwetara site nʼịga Ijipt sitekwa nʼịṅụ mmiri nke osimiri Naịl? Gịnị bụ uru unu nwetara site nʼịga Asịrịa, sitekwa nʼịṅụ mmiri si na Yufretis?
19 Your own evil will discipline you; your own apostasies will reprimand you. Consider and realize how evil and bitter it is for you to forsake the LORD your God and to have no fear of Me,”
Ọ bụ ajọ omume unu ga-ewetara unu ahụhụ; ahụhụ soo ndaghachi azụ unu bụ ihe ga-adọ unu aka na ntị. Tulee ma matanụ nʼonwe unu otu o si bụrụ ihe ọjọọ na ihe ilu nye unu bụ inupu isi na ịgbakụta Onyenwe anyị bụ Chineke unu azụ na-enweghị egwu ọbụla nʼime unu banyere m,” nke a bụ ihe Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile, kwupụtara.
20 “For long ago you broke your yoke and tore off your chains, saying, ‘I will not serve!’ Indeed, on every high hill and under every green tree you lay down as a prostitute.
“Nʼoge gara aga, unu gbajiri yoku unu dọkapụ agbụ jikọtara mụ na unu, unu sịrị, ‘Agaghị m ejere gị ozi.’ Nʼezie, ọ bụ nʼelu ugwu ọbụla nakwa nʼokpuru osisi na-agbasa agbasa, ka ị na-edina dịka onye akwụna.
21 I had planted you like a choice vine from the very best seed. How could you turn yourself before Me into a rotten, wild vine?
Ma mụ onwe m kụrụ gị dịka osisi vaịnị kachasị mma nke mkpụrụ ya dị ndụ dịkwa mma. Olee otu i siri tụgharịa megide m, ghọọ ihe rụrụ arụ, osisi vaịnị ọhịa?
22 Although you wash with lye and use an abundance of soap, the stain of your guilt is still before Me,”
Nʼagbanyeghị na iji ncha sachaa onwe gị, maọbụ jirikwa ọtụtụ ntụ ncha, ntụpọ nke mmehie gị ka dị nʼihu m,” Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwupụtara.
23 “How can you say, ‘I am not defiled; I have not run after the Baals’? Look at your behavior in the valley; acknowledge what you have done. You are a swift young she-camel galloping here and there,
“Ị ga-esi aṅaa na-asị, ‘A bụghị m onye e merụrụ emerụ; o nwebeghị oge ọbụla m ji gbaso Baal?’ Leruo ụzọ gị anya na ndagwurugwu, tulee ihe ndị i mere. Ị bụ nne ịnyịnya ibu dị nkọ, na-agbagharị ebe a nʼebe nke ọzọ.
24 a wild donkey at home in the wilderness, sniffing the wind in the heat of her desire. Who can restrain her passion? All who seek her need not weary themselves; in mating season they will find her.
Nne ịnyịnya ibu ọhịa nke mara ụzọ ya nke ọma nʼọzara, na-esi imi ma ọ ga-esichapụta oke ịnyịnya ibu, onye pụrụ igbochi ya nʼoge mmekọ ya na oke ịnyịnya zuru? Oke ịnyịnya ọbụla chọọrọ ya agaghị atụfu oge nʼịchụgharị ya, nʼihi nʼoge ha chọrọ mmekọ, ha ga-achọta ya.
25 You should have kept your feet from going bare and your throat from being thirsty. But you said, ‘It is hopeless! For I love foreign gods, and I must go after them.’
Agbala ọsọ ruo mgbe ị ga-agbara ụkwụ efu, mgbe akpịrị ga-akpọ gị nku. Ma ị na-asị, ‘O nweghị uru ọ bara. Nʼihi na ahụrụ m chi ndị mba ọzọ nʼanya, aghaghị m ịgbaso ha.’
26 As the thief is ashamed when he is caught, so the house of Israel is disgraced. They, their kings, their officials, their priests, and their prophets
“Dịka a na-eme onye ohi ihe ihere mgbe e jidere ya, otu a ka a ga-eme ụlọ Izrel ihere, ha onwe ha, ma ndị eze ha, ma ndịisi ha, ndị nchụaja ha na ndị amụma ha.
27 say to a tree, ‘You are my father,’ and to a stone, ‘You gave me birth.’ For they have turned their backs to Me and not their faces, yet in the time of trouble they beg, ‘Rise up and save us!’
Ha na-asị osisi, ‘Nna m ka ị bụ,’ na-asịkwa nkume, ‘Ọ bụ gị mụrụ m.’ Ha agbakụtala m azụ, jụ iche m ihu. Ma mgbe ọbụla nsogbu bịakwasịrị ha, ha na-asị, ‘Bịa, zọpụta anyị.’
28 But where are the gods you made for yourselves? Let them rise up in your time of trouble and save you if they can; for your gods are as numerous as your cities, O Judah.
Olee ebe chi ndị ahụ i meere nye onwe gị nọ? Ka ha bịa, ma ọ bụrụ na ha nwere ike ịzọpụta gị, mgbe nsogbu bịakwasịrị unu. Nʼihi na gị, bụ Juda, nwere ọtụtụ chi dịka i si nwee ọtụtụ obodo.
29 Why do you bring a case against Me? You have all rebelled against Me,”
“Gịnị mere unu ji ekwu okwu ebubo megide m? Unu niile enupula isi megide m,” ka Onyenwe anyị kwupụtara.
30 “I have struck your sons in vain; they accepted no discipline. Your own sword has devoured your prophets like a voracious lion.”
“Nʼefu ka m tiri ụmụ unu ihe; ma nke a emeghị ka ha nabata ịdọ aka na ntị. Dịka ọdụm na-adọgbu anụ, mma agha unu eripịala ndị amụma unu.
31 You people of this generation, consider the word of the LORD: “Have I been a wilderness to Israel or a land of dense darkness? Why do My people say, ‘We are free to roam; we will come to You no more’?
“Unu ndị ọgbọ a, tuleenụ okwu nke Onyenwe anyị: “O nweela mgbe m bụ ọzara nye ndị Izrel ma ọ bụkwanụ ala gbara oke ọchịchịrị? Gịnị mekwaranụ ndị m ji na-asị, ‘Anyị enwerela onwe anyị ịwagharị, anyị agaghị abịakwutekwa gị ọzọ’?
32 Does a maiden forget her jewelry or a bride her wedding sash? Yet My people have forgotten Me for days without number.
Nwaagbọghọ ọ na-echefu ọla ịchọ mma ya, nwanyị a na-alụ ọhụrụ ọ na-echefu ngwa ịchọ mma ya? Ma nʼime ọtụtụ ụbọchị nke a na-apụghị ịgụta ọnụ, ndị m echefuola m.
33 How skillfully you pursue love! Even the most immoral of women could learn from your ways.
Lee ka unu si bụrụ ndị ọka nʼịgbaso ịhụnanya. Ọ bụladị ụmụ nwanyị dị njọ karịsịa nwere ike ịmụta ihe site nʼụzọ unu.
34 Moreover, your skirts are stained with the blood of the innocent poor, though you did not find them breaking in. But in spite of all these things
Nʼuwe unu ka achọtara ọbara ndị ogbenye na-enweghị ihe ọjọọ ha mere, nʼagbanyeghị na unu ejideghị ha ka ha nʼagbaka ụzọ. Ma unu gara nʼihu
35 you say, ‘I am innocent. Surely His anger will turn from me.’ Behold, I will judge you, because you say, ‘I have not sinned.’
na-asịkwa, ‘Emeghị m ihe ọjọọ, ọ dịghị eweso m iwe.’ Ma aga m ekpe unu ikpe, nʼihi na unu na-asị, ‘Emeghị m mmehie.’
36 How unstable you are, constantly changing your ways! You will be disappointed by Egypt just as you were by Assyria.
Gịnị mere unu ji na-akpagharị na-agbanwe ụzọ unu ọtụtụ mgbe? Ijipt ga-etinye unu nʼọnọdụ ihere dịka ndị Asịrịa mere unu.
37 Moreover, you will leave that place with your hands on your head, for the LORD has rejected those you trust; you will not prosper by their help.”
Unu ga-ebu aka unu nʼisi mgbe unu si ebe ahụ na-apụ, nʼihi na Onyenwe anyị ajụla ndị ahụ unu tụkwasịrị obi. Ha agaghị enyere unu aka.