< Isaiah 13 >
1 This is the burden against Babylon that Isaiah son of Amoz received:
Nke a bụ amụma megide Babilọn nke Aịzaya nwa Emọz hụrụ.
2 Raise a banner on a barren hilltop; call aloud to them. Wave your hand, that they may enter the gates of the nobles.
Welienụ ọkọlọtọ agha nʼelu ugwu tọgbọrọ nʼefu. Kpọkuonụ ndị agha. Feerenụ ha aka, ka ha site nʼọnụ ụzọ ama nke ndị a maara aha ha bata nʼime obodo ukwu ahụ na-anya isi.
3 I have commanded My sanctified ones; I have even summoned My warriors to execute My wrath and exult in My triumph.
Enyela m ndị m kwadoro maka agha iwu; akpọọla m ndị ọka agha m oku, bụ ndị na-aṅụrị ọṅụ na mmeri m, ka ha gosipụta oke iwe m. E, ndị m kpọrọ bụ ndị ahụ na-aṅụrị ọṅụ ịhụ na m meriri ndị iro m.
4 Listen, a tumult on the mountains, like that of a great multitude! Listen, an uproar among the kingdoms, like nations gathered together! The LORD of Hosts is mobilizing an army for war.
Gee ntị nụrụ ụzụ na-ada nʼugwu niile; gee ntị nụrụ ụzụ yiri ụzụ nke igwe mmadụ na-eme. Gee ntị nụrụ mkpọtụ na-ada nʼetiti alaeze dị iche iche. Dịka mkpọtụ na-eme mgbe ọtụtụ mba na-ezukọta nʼotu ebe. Ọ bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-achịkọta ndị agha ya nʼihi ibu agha.
5 They are coming from faraway lands, from the ends of the heavens— the LORD and the weapons of His wrath— to destroy the whole country.
Ha si nʼobodo dị iche iche, nke dị anya na nke dị na nsọtụ ụwa na-abịa. Ha bu ngwa agha na-egosi oke iwe Onyenwe anyị na-abịa imebi ala ahụ niile.
6 Wail, for the Day of the LORD is near; it will come as destruction from the Almighty.
Kwasienụ akwa ike nʼihi na ụbọchị Onyenwe anyị dị nso, ụbọchị ahụ oke mbibi ga-esi nʼaka Onye pụrụ ime ihe niile bịara unu.
7 Therefore all hands will fall limp, and every man’s heart will melt.
Nʼihi nke a, aka ndị mmadụ ga-ada mba, obi ga-alọkwa ndị mmadụ mmiri.
8 Terror, pain, and anguish will seize them; they will writhe like a woman in labor. They will look at one another, their faces flushed with fear.
Ha ga-ama jijiji nʼihi oke egwu. Ahụ mgbu ga-abịakwasị ha mee ka ha sụọ ude dịka nwanyị ime na-eme. Ha ga-elerịta onwe ha anya nʼọnọdụ mgbagwoju anya, ha agaghị amakwa ihe ha ga-eme. Ọnọdụ dị otu a ga-apụta ihe nʼihu ha.
9 Behold, the Day of the LORD is coming— cruel, with fury and burning anger— to make the earth a desolation and to destroy the sinners within it.
Nʼihi na lee, ụbọchị Onyenwe anyị na-abịa, ụbọchị nke obi ebere na-agaghị adịkwa, ụbọchị iwe na oke ọnụma. A ga-ekpochapụ ala ahụ, ya na ndị mmehie niile dị nʼime ya.
10 For the stars of heaven and their constellations will not give their light. The rising sun will be darkened, and the moon will not give its light.
Nʼihi na kpakpando niile nke eluigwe na kpakpando ndị ọzọ gbara ha gburugburu agaghị egosipụta ìhè ha. Anyanwụ ga-agba ọchịchịrị nʼọwụwa ya ọnwa agakwaghị enye ìhè ya.
11 I will punish the world for its evil and the wicked for their iniquity. I will end the haughtiness of the arrogant and lay low the pride of the ruthless.
Aga m ata ụwa ahụhụ nʼihi mmehie ya, taakwa ndị na-emebi iwu ahụhụ nʼihi mmehie ha. Ịnya isi nke onye mpako ka m ga-egwepịa, ya na nganga onye na-adịghị eme ebere.
12 I will make man scarcer than pure gold, and mankind rarer than the gold of Ophir.
Aga m eme ka mmadụ dị ụkọ karịa ọlaedo a nụchara anụcha, ha ga-akọ ụkọ karịa ọlaedo si Ọfịa.
13 Therefore I will make the heavens tremble, and the earth will be shaken from its place at the wrath of the LORD of Hosts on the day of His burning anger.
Nʼihi na m ga-eme ka eluigwe maa jijiji, meekwa ka e wezuga ụwa site nʼọnọdụ ya, nʼihi oke iwe ga-ewe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile. Ha ga-emezu nʼụbọchị ahụ ọ ga-ezipụta oke iwe ya dị ọkụ.
14 Like a hunted gazelle, like a sheep without a shepherd, each will return to his own people, each will flee to his native land.
Ọ ga-erukwa na onye ọbụla nʼime ha ga-eche ihu ya nʼụzọ gawara ebe ndị ya nọ. Ha ga-agbarakwa ọsọ laghachi nʼala nke aka ha dịka mgbada na-agbanarị ndị na-achụ nta, maọbụ ụmụ atụrụ ndị na-enweghị onye na-azụ ha.
15 Whoever is caught will be stabbed, and whoever is captured will die by the sword.
Onye ọbụla e jidere nʼime ha ka a ga-amapu afọ, onye ọbụla nke e jidere ka a ga-eji mma agha gbuo.
16 Their infants will be dashed to pieces before their eyes, their houses will be looted, and their wives will be ravished.
A ga-etipịa ụmụ ha na-aṅụ ara nʼihu ha; a ga-anapụ ha ụlọ ha, merụkwaa ndị nwunye ha.
17 Behold, I will stir up against them the Medes, who have no regard for silver and no desire for gold.
Nʼihi na lee, aga m eme ka ndị Midia pụọ imegide ha; ọ dịkwaghị ọlaedo maọbụ ọlaọcha ha pụrụ iji megharịa ha anya.
18 Their bows will dash young men to pieces; they will have no mercy on the fruit of the womb; they will not look with pity on the children.
Ha ga-eji ụta ha gbatusịa ụmụ okorobịa; ha agaghị emekwara ụmụntakịrị ebere, maọbụ gosi ụmụ na-etopụta etopụta obi ebere.
19 And Babylon, the jewel of the kingdoms, the glory of the pride of the Chaldeans, will be overthrown by God like Sodom and Gomorrah.
Babilọn, bụ ọla mma nke alaeze niile, ịma mma na ebube ndị Kaldịa, mgbe Chineke ga-akwatu ya ọ ga-adị ka Sọdọm na Gọmọra.
20 She will never be inhabited or settled from generation to generation; no nomad will pitch his tent there, no shepherd will rest his flock there.
Ọ gaghị abụ ebe obibi ọzọ ruo mgbe ebighị ebi. Site nʼotu ọgbọ ruo nʼọgbọ ọzọ ndị mmadụ agaghị ebi nʼime ya. Ọ dịghị onye Arebịa na-ejegharị ejegharị ga-ama ụlọ ikwu ya nʼime ya; ndị ọzụzụ atụrụ agaghị ekwe ka atụrụ ha makpuru nʼebe ahụ.
21 But desert creatures will lie down there, and howling creatures will fill her houses. Ostriches will dwell there, and wild goats will leap about.
Ọ ga-abụ ebe obibi nye anụ ọhịa niile bi nʼọzara. Ụlọ dị nʼebe ahụ ga-abụkwa ebe obibi nye nkịta ọhịa, na ikwighịkwighị, nʼebe ahụ kwa ka ụmụ mkpi ọhịa ga na-awụgharị.
22 Hyenas will howl in her fortresses and jackals in her luxurious palaces. Babylon’s time is at hand, and her days will not be prolonged.
A ga-anụkwa ụda akwa anụ ọhịa, na ịgbọ ụja nkịta ọhịa nʼime ụlọ ha niile e wusiri ike. Nkịta ọhịa ga-ebikwa nʼime ụlọ ọma niile dị nʼebe ahụ. Lee na oge ha ji emezu adịla nso, a gaghị emekwa ka oge imezu ihe ndị a dị anya.