< Genesis 50 >
1 Then Joseph fell upon his father’s face, wept over him, and kissed him.
Josef dakwasịrị nʼihu nna ya, kwaa akwa, sutukwa ya ọnụ.
2 And Joseph directed the physicians in his service to embalm his father Israel. So they embalmed him,
Josef nyere iwu, ka ndị dibịa na-ejere ya ozi gbasie ozu nna ya. Ya mere, ndị dibịa ahụ gbasikwara Izrel.
3 taking the forty days required to complete the embalming. And the Egyptians mourned for him seventy days.
O were ha iri ụbọchị anọ ịgbasi ozu, nʼihi na nke a bụ oge o kwesiri iwe ha ime ya. Mgbe nke a gasịrị, a kwara ya nʼala Ijipt iri ụbọchị asaa.
4 When the days of mourning had passed, Joseph said to Pharaoh’s court, “If I have found favor in your eyes, please tell Pharaoh that
Mgbe oge iru ụjụ gafesịrị, Josef gwara ndị ụlọ Fero sị ha, “Ọ bụrụ na m ahụtala amara nʼihu unu, biko, gwaranụ m Fero otu a, sị ya,
5 my father made me swear an oath when he said, ‘I am about to die. You must bury me in the tomb that I dug for myself in the land of Canaan.’ Now let me go and bury my father, and then return.”
‘Nna m mere ka m ṅụọra ya iyi mgbe ọ na-anwụ, sị, “Lee, agala m ịnwụ, ị ga-eli m nʼili m, nke m gwuuru onwe m nʼala Kenan.” Ugbu a, biko ka m gaa lie nna m, ma lọghachikwa.’”
6 Pharaoh replied, “Go up and bury your father, as he made you swear to do.”
Fero zara sị ya, “Gaa lie nna gị dịka o mere ka ị ṅụọ iyi na ị ga-eme.”
7 Then Joseph went to bury his father, and all the servants of Pharaoh accompanied him—the elders of Pharaoh’s household and all the elders of the land of Egypt—
Ya mere, Josef gara ili nna ya. Ọtụtụ ndị mmadụ sokwa ya. Ndịisi ọchịchị Fero, na ndị okenye ụlọ ya, na ndị okenye a ma ama nʼala Ijipt.
8 along with all of Joseph’s household, and his brothers, and his father’s household. Only their children and flocks and herds were left in Goshen.
Ndị ọzọ bụkwa ndị ụlọ Josef niile, ụmụnne ya, na ndị ụlọ nna ya. Naanị ụmụntakịrị, na igwe ewu na atụrụ ha, na igwe ehi ha, ka ha hapụrụ nʼala Goshen.
9 Chariots and horsemen alike went up with him, and it was an exceedingly large procession.
Ma ịnyịnya ụgbọ na ndị na-agba ịnyịnya, so ya gaa. Igwe mmadụ gara ije a buru ibu nke ukwuu.
10 When they reached the threshing floor of Atad, which is across the Jordan, they lamented and wailed loudly, and Joseph mourned for his father seven days.
Mgbe ha ruru ebe ịzọcha ọka nke Atad, nʼofe ọzọ nke Jọdan, ha weere iti aka nʼobi dị ukwuu tie aka nʼobi ha nʼebe ahụ. Josef ruru ụjụ ụbọchị asaa maka nna ya nʼebe ahụ.
11 When the Canaanites of the land saw the mourning at the threshing floor of Atad, they said, “This is a solemn ceremony of mourning by the Egyptians.” Thus the place across the Jordan is called Abel-mizraim.
Mgbe ndị bi nʼala Kenan hụrụ oke iru ụjụ nke ebe ịzọcha ọka nke Atad ahụ, ha sịrị, “Nke a bụụrụ ndị Ijipt iru ụjụ dị ukwuu.” Nʼihi nke a, ha kpọrọ ebe ahụ dị nso na Jọdan Ebel-Mizraim.
12 So Jacob’s sons did as he had charged them.
Ụmụ Jekọb mere dịka nna ha gwara ha.
13 They carried him to the land of Canaan and buried him in the cave at Machpelah in the field near Mamre, which Abraham had purchased from Ephron the Hittite as a burial site.
Nʼihi na ha buuru ozu ya laa nʼala Kenan, lie ya nʼọgba ahụ dị nʼọhịa Makipela, nke bụ ala ubi Ebraham zụrụ dịka ala olili ozu, site nʼaka Efrọn, onye Het; nʼakụkụ Mamre.
14 After Joseph had buried his father, he returned to Egypt with his brothers and all who had gone with him to bury his father.
Emesịa, Josef laghachiri Ijipt ya na ụmụnne ya, na ndị niile sooro ya gaa olili ozu nna ya, ngwangwa elichara nna ya.
15 When Joseph’s brothers saw that their father was dead, they said, “What if Joseph bears a grudge? Then he will surely repay us for all the evil that we did to him.”
Mgbe ụmụnne Josef hụrụ na nna ha anwụọla, ha sịrị, “Eleghị anya Josef ga-akpọ anyị asị, kwụghachi anyị ụgwọ ihe ọjọọ niile anyị mere ya?”
16 So they sent word to Joseph, saying, “Before he died, your father commanded,
Nʼihi nke a, ha zipụrụ Josef ozi sị, “Nna gị nyere iwu a tupu ọ nwụọ.
17 ‘This is what you are to say to Joseph: I beg you, please forgive the transgression and sin of your brothers, for they did you wrong.’ So now, Joseph, please forgive the transgression of the servants of the God of your father.” When their message came to him, Joseph wept.
‘Gwa Josef sị ya, Arịọọ m gị, gbaghara ihe ọjọọ niile ụmụnne gị mere, na mmehie ha mere megide gị.’ Ugbu a, gbaghara mmehie anyị bụ ndị ohu Chineke nna gị.” Mgbe Josef nụrụ ihe ha kwuru, ọ kwara akwa.
18 His brothers also came to him, bowed down before him, and said, “We are your slaves!”
Ụmụnne ya bịakwara daa nʼihu ya, sị, “Anyị bụ ndị ohu gị.”
19 But Joseph replied, “Do not be afraid. Am I in the place of God?
Ma Josef sịrị ha, “Unu atụla egwu. Abụ m Chineke onye na-ekpe ikpe nke m ga-eji taa unu ahụhụ?
20 As for you, what you intended against me for evil, God intended for good, in order to accomplish a day like this—to preserve the lives of many people.
Ọ bụ ezie na unu chere ime m ihe ọjọọ, ma Chineke chere ya ka ọ bụrụ ezi ihe, iji debe ọtụtụ ndụ dịka ọ na-eme taa.
21 Therefore do not be afraid. I will provide for you and your little ones.” So Joseph reassured his brothers and spoke kindly to them.
Ya mere, ụjọ atụla unu. Mụ onwe m ga-azụ unu na ụmụntakịrị unu.” Ọ kasịrị ha obi, gwa ha okwu bara ha nʼobi.
22 Now Joseph and his father’s household remained in Egypt, and Joseph lived to the age of 110.
Josef biri nʼIjipt, ya na ụmụnne ya, na ndị ụlọ ha. Josef gbara narị afọ na iri.
23 He saw Ephraim’s sons to the third generation, and indeed the sons of Machir son of Manasseh were brought up on Joseph’s knees.
Josef hụrụ ụmụ Ifrem, na ụmụ ụmụ ya. Ọ nọkwa ndụ hụ ụmụ Makia nwa Manase, ndị e kukwasịrị nʼikpere ya.
24 Then Joseph said to his brothers, “I am about to die, but God will surely visit you and bring you up from this land to the land He promised on oath to Abraham, Isaac, and Jacob.”
Mgbe ahụ, Josef sịrị ụmụnne ya, “Agala m ịnwụ, ma Chineke ga-abịa ileta unu. Ọ ga-esi nʼala a kpọpụta unu kpọgakwa unu nʼala ahụ ọ ṅụụrụ Ebraham na Aịzik na Jekọb iyi, na ọ ga-enye ha.”
25 And Joseph made the sons of Israel take an oath and said, “God will surely attend to you, and then you must carry my bones up from this place.”
Mgbe ahụ, Josef mere ka ụmụ Izrel ṅụọrọ ya iyi sị, “Mgbe Chineke bịara ileta unu, unu aghaghị ị site nʼebe a chịkọrọ ọkpụkpụ m.”
26 So Joseph died at the age of 110. And they embalmed his body and placed it in a coffin in Egypt.
Josef nwụrụ mgbe ọ gbara narị afọ na iri. Ha gbasiri ozu ya, tinye ya nʼime igbe ozu, nʼala Ijipt.