< Deuteronomy 17 >

1 You shall not sacrifice to the LORD your God an ox or a sheep with any defect or serious flaw, for that is detestable to the LORD your God.
Achụrụla Onyenwe anyị bụ Chineke gị ehi maọbụ atụrụ nwere nkwarụ ọbụla maọbụ ntụpọ. Onyinye dị otu a bụ ihe arụ nʼebe ọ nọ.
2 If a man or woman among you in one of the towns that the LORD your God gives you is found doing evil in the sight of the LORD your God by transgressing His covenant
Ọ bụrụ na ị nụ na onye ọbụla nʼime obodo ndị ahụ Onyenwe anyị nyere gị, nwoke maọbụ nwanyị na-eme ihe dị njọ nʼanya Onyenwe anyị Chineke gị ime ihe megidere ọgbụgba ndụ ya,
3 and going to worship other gods, bowing down to them or to the sun or moon or any of the host of heaven—which I have forbidden—
ọ bụrụ na onye ahụ efee chi ndị ọzọ, maọbụ kpọọ isiala nye ha, maọbụ fee anwụ, maọbụ ọnwa, maọbụ kpakpando nke mbara eluigwe bụ ihe m na-enyeghị nʼiwu,
4 and if it is reported and you hear about it, you must investigate it thoroughly. If the report is true and such an abomination has happened in Israel,
ọ bụrụ na e mere ka ị maara nʼihe dị otu a dị maọbụ ị nụ ya, ị ghaghị ịjụ ase, nyochaa ya nke ọma. Ọ bụrụ na ihe ị nụrụ bụ eziokwu, ọ bụrụ nʼezie na e mere ihe arụ dị otu a nʼala Izrel,
5 you must bring out to your gates the man or woman who has done this evil thing, and you must stone that person to death.
kpọrọ nwoke maọbụ nwanyị ahụ mere ihe ọjọọ dị otu a, kpọpụta ya nʼọnụ ụzọ ama obodo, tụọ ya nkume, tugbuo ya.
6 On the testimony of two or three witnesses a man shall be put to death, but he shall not be executed on the testimony of a lone witness.
Ma otu o si dị, a gaghị eme ka onye ahụ nwụọ site naanị nʼama otu mmadụ, kama ọ ga-anwụ site nʼama mmadụ abụọ maọbụ atọ gbara.
7 The hands of the witnesses shall be the first in putting him to death, and after that, the hands of all the people. So you must purge the evil from among you.
Ndị ahụ gbara akaebe nʼisi ya ga-eburu ụzọ tụọ ya nkume, tupu mmadụ niile esoro tugbuo ya. Site nʼụzọ dị otu a, unu ga-ekpochapụ ihe ọjọọ site nʼetiti gị.
8 If a case is too difficult for you to judge, whether the controversy within your gates is regarding bloodshed, lawsuits, or assaults, you must go up to the place the LORD your God will choose.
Ọ bụrụ na unu enwee okwu siri ike na mkpebi, dịka igbu ọchụ, maọbụ okwu na ụka metụtara mmadụ, maọbụ ịlụ ọgụ nke mmerụ ahụ dapụtara nʼime ya, ihe unu ga-eme bụ iweta ikpe ahụ nʼebe obibi Onyenwe anyị Chineke gị họpụtara,
9 You are to go to the Levitical priests and to the judge who presides at that time. Inquire of them, and they will give you a verdict in the case.
nʼihu ndị nchụaja, bụ ndị Livayị na onye nọ nʼoche ikpe nʼoge ahụ ka ha gbubie ikpe ahụ.
10 You must abide by the verdict they give you at the place the LORD will choose. Be careful to do everything they instruct you,
Ị ga-emekwa dịka mkpebi ha nyere gị nʼebe ahụ Onyenwe anyị ga-ahọpụta. Lezie anya hụ na i mezuru ihe niile dịka ha si tụziere gị aka.
11 according to the terms of law they give and the verdict they proclaim. Do not turn aside to the right or to the left from the decision they declare to you.
Mee dịka iwu ha ziri gị si dị, na dịka mkpebi ha nyere gị si dị. Ewezugala onwe gị site nʼokwu ha nyere gị nʼụzọ ọbụla
12 But the man who acts presumptuously, refusing to listen either to the priest who stands there to serve the LORD your God, or to the judge, must be put to death. You must purge the evil from Israel.
Ma onye ahụ ledara onye nchụaja na onye ikpe ahụ a họpụtara ije ozi nye Onyenwe anyị Chineke gị ga-anwụ. Unu ga-esi nʼala Izrel wezuga ihe ọjọọ dị otu ahụ.
13 Then all the people will hear and be afraid, and will no longer behave arrogantly.
Nʼụzọ dị otu a, mmadụ niile ga-anụ ihe mere onye ahụ nupuru isi, ha ga-atụ egwu ghara ịbụ ndị mpako.
14 When you enter the land that the LORD your God is giving you and have taken possession of it and settled in it, and you say, “Let us set a king over us like all the nations around us,”
Mgbe ị banyere nʼala ahụ Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị, merie ndị bi nʼime ya, biri nʼime ya, i nwere ike malite iche nʼobi gị sị, “Anyị kwesiri inwe eze dịka mba ndị ọzọ niile dị anyị gburugburu.”
15 you are to appoint over yourselves the king whom the LORD your God shall choose. Appoint a king from among your brothers; you are not to set over yourselves a foreigner who is not one of your brothers.
O si otu a dịrị, lezie anya hụ na onye ị ga-eme eze bụ onye ahụ Onyenwe anyị Chineke gị ga-ahọpụta. Onye ahụ aghaghị ịbụ onye Izrel nʼihi na i kwesighị ime onye mba ọzọ eze ka ọ chịa gị.
16 But the king must not acquire many horses for himself or send the people back to Egypt to acquire more horses, for the LORD has said, ‘You are never to go back that way again.’
Hụ na eze ahụ ị họpụtara enweghị ọtụtụ ịnyịnya. Eze ahụ ekwesịkwaghị izipụ ndị ga-aga Ijipt ịzụpụtara ya ọtụtụ ịnyịnya ọzọ, nʼihi na Onyenwe anyị agwala gị sị, “Ị gaghị alaghachi Ijipt ọzọ.”
17 He must not take many wives for himself, lest his heart go astray. He must not accumulate for himself large amounts of silver and gold.
Eze ahụ agaghị enwe ọtụtụ nwunye, nʼihi na nke a ga-eme ka obi ya si nʼebe Onyenwe anyị nọ pụọ. Ọ gakwaghị ababiga ụba ọlaọcha na ọlaedo oke.
18 When he is seated on his royal throne, he must write for himself a copy of this instruction on a scroll in the presence of the Levitical priests.
Mgbe ọ nọkwasịrị nʼocheeze dịka eze, ọ ga-esite nʼakwụkwọ iwu a ndị nchụaja bụ ndị Livayị na-edebe, depụtara onwe ya iwu a metụtara obibi ndụ ndị eze.
19 It is to remain with him, and he is to read from it all the days of his life, so that he may learn to fear the LORD his God by carefully observing all the words of this instruction and these statutes.
Ihe ahụ o depụtara ka ọ ga-agụ mgbe niile na ndụ ya. Nke a ga-eme ka ọ mụta ịtụ egwu Onyenwe anyị Chineke ya, na ịgbaso ihe niile dị nʼiwu na ụkpụrụ ndị a.
20 Then his heart will not be exalted above his countrymen, and he will not turn aside from the commandment, to the right or to the left, in order that he and his sons may reign many years over his kingdom in Israel.
Ịgụ akwụkwọ iwu a mgbe niile ga-eme ka ọ mata na o nweghị ụzọ o si dị elu karịa ụmụnna ya. Ọ ga-emekwa ka ọ ghara iwezuga onwe ya site nʼiwu a nʼụzọ ọbụla. Mgbe ahụ, ya onwe ya, na ụmụ ụmụ ya ga-achị alaeze Izrel ogologo oge.

< Deuteronomy 17 >