< Psalms 95 >

1 Oh come, let’s sing to the LORD. Let’s shout aloud to the rock of our salvation!
Bịanụ ka anyị jiri ọṅụ bụkuo Onyenwe anyị abụ; ka anyị tikuo oke nkume nzọpụta anyị mkpu ọṅụ.
2 Let’s come before his presence with thanksgiving. Let’s extol him with songs!
Ka anyị jiri ekele bịakwute ya jirikwa iti egwu na ịbụ abụ jaa ya mma.
3 For the LORD is a great God, a great King above all gods.
Nʼihi na Onyenwe anyị bụ Chineke dị ukwuu, eze ukwuu kachasị chi niile elu.
4 In his hand are the deep places of the earth. The heights of the mountains are also his.
Ebe niile michasịrị emi nke ụwa dị nʼaka ya, ebe kachasị elu nke ugwu niile bụkwa nke ya.
5 The sea is his, and he made it. His hands formed the dry land.
Osimiri niile bụ nke ya, nʼihi na ọ bụ ya kere ha, aka ya kpụrụ ala akọrọ niile.
6 Oh come, let’s worship and bow down. Let’s kneel before the LORD, our Maker,
Bịanụ ka anyị kpọọ isiala nʼofufe, ka anyị gbuo ikpere nʼala nʼihu Onyenwe anyị, onye kere anyị;
7 for he is our God. We are the people of his pasture, and the sheep in his care. Today, oh that you would hear his voice!
nʼihi na ọ bụ Chineke anyị anyị bụkwa ndị ọ na-azụ dịka atụrụ, igwe atụrụ ọ na-elekọta anya. Taa, ọ bụrụ na unu anụ olu ya,
8 Do not harden your heart, as at Meribah, as in the day of Massah in the wilderness,
“Unu emela ka obi unu sie ike dịka unu mere na Meriba, maọbụ dịka unu mere nʼụbọchị ahụ na Masa nʼime ọzara,
9 when your fathers tempted me, tested me, and saw my work.
ebe nna nna unu ha nwara m, nʼagbanyeghị na ha hụrụ ihe niile m mere.
10 Forty long years I was grieved with that generation, and said, “They are a people who err in their heart. They have not known my ways.”
Iri afọ anọ ka m were iwe megide ọgbọ ahụ; ekwuru m sị, ‘Ndị a bụ ndị obi ha na-akpafu akpafu site nʼebe m nọ, ha amatabeghị ụzọ m niile.’
11 Therefore I swore in my wrath, “They will not enter into my rest.”
Nʼihi nke a, aṅụrụ m iyi nʼiwe, sị, ‘Ha agaghị abanye nʼizuike m ma ọlị.’”

< Psalms 95 >