< Proverbs 23 >

1 When you sit to eat with a ruler, consider diligently what is before you;
Mgbe gị na onye na-achị achị nọdụrụ irikọ nri, lezie ihe dị nʼihu gị anya,
2 put a knife to your throat if you are a man given to appetite.
tụkwasị mma nʼakpịrị gị, ma ọ bụrụ na ị bụ onye iri oke nri na-atọ ụtọ.
3 Do not be desirous of his dainties, since they are deceitful food.
Achọsila nri ụtọ ya ike, nʼihi na nri ahụ bụ nri aghụghọ.
4 Do not weary yourself to be rich. In your wisdom, show restraint.
Adọgbula onwe gị nʼọrụ maka ịbụ ọgaranya, atụkwasịla obi na nghọta gị.
5 Why do you set your eyes on that which is not? For it certainly sprouts wings like an eagle and flies in the sky.
Nʼihi na akụ nwere ike ifu nʼotu ntabi anya dịka a ga-asị na ha nwere nku dịka nnụnụ ugo.
6 Do not eat the food of him who has a stingy eye, and do not crave his delicacies,
Erila nri onye aka ntagide na-enye gị. Nri ụtọ ya agụkwala gị agụ.
7 for as he thinks about the cost, so he is. “Eat and drink!” he says to you, but his heart is not with you.
Nʼihi na ọ bụ ụdị mmadụ ahụ na-eche ọnụahịa ihe ọ na-emefuru gị. Ọ na-asị gị, “Rie ihe, ṅụọkwa ihe ọṅụṅụ,” ma obi ya adịghị nʼebe ị nọ.
8 You will vomit up the morsel which you have eaten and waste your pleasant words.
Ị ga-agbọkwa nke ntakịrị ahụ i riri mgbe ahụ, okwu ọma ahụ niile i kwuru banyere ya ga-abụ ihe efu.
9 Do not speak in the ears of a fool, for he will despise the wisdom of your words.
Atụfula ume gị ịgwa onye nzuzu okwu, nʼihi na ọ ga-eleda okwu i sitere nʼezi uche kwuo anya.
10 Do not move the ancient boundary stone. Do not encroach on the fields of the fatherless,
Anarala nwa na-enweghị nne na nna ala ya site nʼihigharị oke ala e gwunyere site nʼoge gara aga,
11 for their Defender is strong. He will plead their case against you.
nʼihi na onye mgbapụta ha dị ike; ya onwe ya ga-ekwuchitere ha ọnụ ha.
12 Apply your heart to instruction, and your ears to the words of knowledge.
Tinye uche gị nʼịdọ aka na ntị; gekwaa ntị nụrụ okwu ihe ọmụma niile.
13 Do not withhold correction from a child. If you punish him with the rod, he will not die.
Ahapụla ịdọ ụmụ gị aka na ntị. Ha agaghị anwụ nʼihi na ị tiri ha ihe.
14 Punish him with the rod, and save his soul from Sheol (Sheol h7585).
Jiri mkpara tie ya ihe ma zọpụta ndụ ya site nʼọnwụ. (Sheol h7585)
15 My son, if your heart is wise, then my heart will be glad, even mine.
Nwa m, aga m aṅụrị ọṅụ nke ukwuu ma ọ bụrụ na ị ghọọ onye maara ihe.
16 Yes, my heart will rejoice when your lips speak what is right.
Mkpụrụobi m ga-aṅụrị ọṅụ mgbe egbugbere ọnụ gị abụọ kwuru ihe ziri ezi.
17 Do not let your heart envy sinners, but rather fear the LORD all day long.
Ekwela ka obi gị kwosa ndị mmehie ekworo, kama nọgide nʼịnụ ọkụ nʼobi nʼịtụ egwu Onyenwe anyị mgbe niile,
18 Indeed surely there is a future hope, and your hope will not be cut off.
nʼihi na i nwere ọtụtụ ihe ọma nʼihu gị. Olileanya dị ukwuu dịrị gị.
19 Listen, my son, and be wise, and keep your heart on the right path!
Nwa m, nwee uche, gbasookwa ụzọ Chineke.
20 Do not be among ones drinking too much wine, or those who gorge themselves on meat;
Anọla nʼetiti ndị na-aṅụbiga mmanya oke, na ndị iri oke oriri na-atọ ụtọ,
21 for the drunkard and the glutton shall become poor; and drowsiness clothes them in rags.
nʼihi na ihe niile ga-akọ ha. Ọ bụkwa nkịrịnka akwa ka onye oke ụra na-eyi nʼahụ.
22 Listen to your father who gave you life, and do not despise your mother when she is old.
Ṅaa ntị nʼịdọ aka na ntị nna gị, akpọkwala ịdọ aka na ntị nne gị bụ agadi nwanyị asị.
23 Buy the truth, and do not sell it. Get wisdom, discipline, and understanding.
Zụta eziokwu, erekwala ya, zụtakwa amamihe, ntụziaka, na nghọta.
24 The father of the righteous has great joy. Whoever fathers a wise child delights in him.
Nna onye ezi omume ga-aṅụrị ọṅụ. Ọ bụkwa ihe oke ọṅụ inweta nwa maara ihe.
25 Let your father and your mother be glad! Let her who bore you rejoice!
Ka nne na nna gị nwee obi ụtọ. Ka onye mụrụ gị ṅụrịa.
26 My son, give me your heart; and let your eyes keep in my ways.
Nwa m, nye m obi gị ka ụzọ m niile nyekwa anya gị ọṅụ.
27 For a prostitute is a deep pit; and a wayward wife is a narrow well.
Nʼihi na onye akwụna bụ olulu miri emi, nwanyị nwe di na-akwa iko bụ olulu mmiri dị warawara.
28 Yes, she lies in wait like a robber, and increases the unfaithful among men.
Dịka onye ohi ka ọ na-echere na-emekwa ka ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi baa ụba nʼetiti ụmụ nwoke.
29 Who has woe? Who has sorrow? Who has strife? Who has complaints? Who has needless bruises? Who has bloodshot eyes?
Onye ka obi ya jupụtara nʼahụhụ? Onye nọ na iru ụjụ? Olee onye nwere esemokwu? Onye nwere ọtụtụ ihe mkpesa? Onye nwere mmerụ ahụ nke na-abaghị uru? Onye nwere anya nke na-acha ọbara ọbara?
30 Those who stay long at the wine; those who go to seek out mixed wine.
Ọ bụ ndị na-anọ ogologo oge na-aṅụ mmanya, onye na-aga ịchọpụta mmanya agwara agwa.
31 Do not look at the wine when it is red, when it sparkles in the cup, when it goes down smoothly.
Elekwasịla mmanya anya mgbe ọ na-acha ọbara ọbara, mgbe ọ na-ezipụta ọdịdị ya nʼiko mgbe ọ na-asụgharị nke ọma nʼime iko.
32 In the end, it bites like a snake, and poisons like a viper.
Nʼikpeazụ, ọ na-ata dịka agwọ na-atụkwa dịka ajụala.
33 Your eyes will see strange things, and your mind will imagine confusing things.
Anya gị abụọ ga-ahụ ihe ị na-amaghị isi ya na ọdụ ya, obi gị ga-atụlekwa ihe ndị na-agbagwoju anya.
34 Yes, you will be as he who lies down in the middle of the sea, or as he who lies on top of the rigging:
Ị ga-adị ka onye na-edina nʼetiti oke osimiri, nke na-edinakwa nʼelu ụdọ nʼejide ụgbọ.
35 “They hit me, and I was not hurt! They beat me, and I do not feel it! When will I wake up? I can do it again. I will look for more.”
Ị ga-asị, “Ha tiri m ihe, ma emerụghị m ahụ. Ha pịara m ihe, ma amaghị m. Olee mgbe m ga-eteta, ka m pụọ ga chọọ mmanya ọzọ?”

< Proverbs 23 >