< Joshua 24 >

1 Joshua gathered all the tribes of Israel to Shechem, and called for the elders of Israel, for their heads, for their judges, and for their officers; and they presented themselves before God.
Joshua kpọkọtara ebo Izrel niile na Shekem. Ọ kpọrọ ndị okenye Izrel na ndịisi ha na ndị ikpe ha na ndị nlekọta ha. Ha niile bịara chee onwe ha nʼihu Chineke.
2 Joshua said to all the people, “The LORD, the God of Israel, says, ‘Your fathers lived of old time beyond the River, even Terah, the father of Abraham, and the father of Nahor. They served other gods.
Mgbe ahụ, Joshua gwara ndị Izrel niile sị, “Otu a ka Onyenwe anyị, Chineke nke Izrel kwuru, ‘Nna nna unu ochie ha, nke bụ Tera, nna Ebraham, na Nahọ, bikwara nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ nke ofe osimiri Yufretis, ebe ha nọ fee chi ndị ọzọ ofufe.
3 I took your father Abraham from beyond the River, and led him throughout all the land of Canaan, and multiplied his offspring, and gave him Isaac.
Ma mụ onwe m kpọpụtara nna nna unu Ebraham site nʼala ahụ dị nʼofe osimiri dubata ya nʼala Kenan, nye ya ọtụtụ ụmụ ụmụ, site na nwa ya bụ Aịzik.
4 I gave to Isaac Jacob and Esau: and I gave to Esau Mount Seir, to possess it. Jacob and his children went down into Egypt.
Ụmụ m nyere Aịzik bụ Jekọb na Ịsọ. Ịsọ ka m nyere ala ugwu ugwu Sia, ka o nweta ma Jekọb na ezinaụlọ ya gara nʼala Ijipt.
5 “‘I sent Moses and Aaron, and I plagued Egypt, according to that which I did among them: and afterward I brought you out.
“‘Emesịa, ezigara m Mosis na Erọn, ma wetara ndị Ijipt ihe otiti ọjọọ niile dị iche iche site nʼihe m mere nʼebe ahụ. Nʼikpeazụ, akpọpụtara m ndị m site nʼala Ijipt.
6 I brought your fathers out of Egypt: and you came to the sea. The Egyptians pursued your fathers with chariots and with horsemen to the Red Sea.
Ma mgbe unu rutere nʼOsimiri Uhie, ndị agha Ijipt gbapụtara chịrị ụgbọ agha ha na ndị agha na-agba ịnyịnya ha chụwa unu ọsọ.
7 When they cried out to the LORD, he put darkness between you and the Egyptians, and brought the sea on them, and covered them; and your eyes saw what I did in Egypt. You lived in the wilderness many days.
Mgbe ndị Izrel hụrụ ha, ha tiri mkpu kpọkuo Onyenwe anyị. O tinyere oke ọchịchịrị nʼetiti unu na ndị Ijipt. O mere ka oke osimiri kpuchie ha, mee ka ha mikpuo nʼosimiri ahụ. Unu niile hụkwara ihe m mere ndị Ijipt. Emesịa, unu bikwara nʼọzara ọtụtụ afọ.
8 “‘I brought you into the land of the Amorites, that lived beyond the Jordan. They fought with you, and I gave them into your hand. You possessed their land, and I destroyed them from before you.
“‘Ma emesịa, emere m ka unu bata nʼime ala ndị Amọrait, ndị bi nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ osimiri Jọdan. Ha lụsoro unu ọgụ, ma eweere m ha nyefee unu nʼaka. E bibiri m ha nʼihu unu, ma unu nwetara ala ha.
9 Then Balak the son of Zippor, king of Moab, arose and fought against Israel. He sent and called Balaam the son of Beor to curse you,
Mgbe Balak nwa Zipoa, eze Moab, jikeere ibuso Izrel agha, o zigaara Belam, nwa Beoa ozi ka ọ bịa bụọ unu ọnụ.
10 but I would not listen to Balaam; therefore he blessed you still. So I delivered you out of his hand.
Ma egeghị m Belam ntị. Kama emere m ya ka ọ gọzie unu. Anapụtara m unu site nʼaka ya.
11 “‘You went over the Jordan, and came to Jericho. The men of Jericho fought against you, the Amorite, the Perizzite, the Canaanite, the Hittite, the Girgashite, the Hivite, and the Jebusite; and I delivered them into your hand.
“‘Emesịa, unu gafere osimiri Jọdan bịaruo Jeriko. Ndị ikom Jeriko busoro unu agha, otu a kwa ka ndị Amọrait, na ndị Periz, na ndị Kenan, na ndị Het, na ndị Gigash, na ndị Hiv, na ndị Jebus. Ma eweere m ha niile nyefee unu nʼaka.
12 I sent the hornet before you, which drove them out from before you, even the two kings of the Amorites; not with your sword, nor with your bow.
E zigara m ebu nʼihu unu nke chụpụrụ ha nʼihu unu, bụ eze abụọ ndị Amọrait. Ọ bụghị mma agha na ụta unu ka unu ji mee nke a.
13 I gave you a land on which you had not labored, and cities which you did not build, and you live in them. You eat of vineyards and olive groves which you did not plant.’
Ya mere enyere m unu ala ahụ, nke unu na-adọgbughị onwe unu nʼihi ya, nyekwa unu ọtụtụ obodo nke unu na-ewughị, bụ ala ndị a unu bi nʼime ya ugbu a. Enyere m unu ubi vaịnị na ubi oliv nke unu na-akụghị, nke unu na-eri mkpụrụ ha.’
14 “Now therefore fear the LORD, and serve him in sincerity and in truth. Put away the gods which your fathers served beyond the River, in Egypt; and serve the LORD.
“Ya mere ugbu a, tụọnụ egwu Onyenwe anyị, feekwanụ ya ofufe nʼụzọ ikwesi ntụkwasị obi na nʼeziokwu. Wezuganụ chi ndị ahụ niile nna nna unu ha fere ofufe nʼofe osimiri Yufretis ahụ, na nʼIjipt. Feenụ naanị Onyenwe anyị ofufe.
15 If it seems evil to you to serve the LORD, choose today whom you will serve; whether the gods which your fathers served that were beyond the River, or the gods of the Amorites, in whose land you dwell; but as for me and my house, we will serve the LORD.”
Ọ bụrụkwanụ na ọ masịghị unu ife Onyenwe anyị, họpụtaranụ onwe unu taa onye unu ga-efe. Ma ọ bụ chi ndị ahụ nna nna unu ha fere nʼofe ọzọ nke osimiri, maọbụ chi ndị Amọrait, ndị unu bi nʼala ha. Ma nʼebe mụ onwe m na ezinaụlọ m nọ, anyị ga-efe Onyenwe anyị.”
16 The people answered, “Far be it from us that we should forsake the LORD, to serve other gods;
Ndị Izrel niile zara sị ya, “O nweghị ihe ga-eme ka anyị hapụ Onyenwe anyị fee chi ndị ọzọ!
17 for it is the LORD our God who brought us and our fathers up out of the land of Egypt, from the house of bondage, and who did those great signs in our sight, and preserved us in all the way in which we went, and among all the peoples through the middle of whom we passed.
Ọ bụ Onyenwe anyị Chineke anyị, ya onwe ya si nʼala Ijipt, ebe anyị bụ ndị ohu, kpọpụta anyị na nna anyị ha. Ọ rụrụ ọrụ ịrịbama ndị ahụ niile dị oke egwu nʼihu anyị. O chebere anyị nʼije anyị niile nʼetiti mba ndị ahụ niile anyị si nʼala ha gafee.
18 The LORD drove out from before us all the peoples, even the Amorites who lived in the land. Therefore we also will serve the LORD; for he is our God.”
Ọ bụ Onyenwe anyị chụpụrụ ndị Amọrị na ọtụtụ mba ndị ọzọ bi nʼala a. E, anyị onwe anyị ga-efe Onyenwe anyị, nʼihi na ọ bụ Chineke anyị.”
19 Joshua said to the people, “You cannot serve the LORD, for he is a holy God. He is a jealous God. He will not forgive your disobedience nor your sins.
Joshua zaghachiri ndị Izrel sị, “Unu apụghị ife Onyenwe anyị ofufe; nʼihi na ọ bụ Chineke dị nsọ, bụrụkwa Chineke ekworo. Ọ gaghị agbaghara unu nnupu isi unu na mmehie unu niile.
20 If you forsake the LORD, and serve foreign gods, then he will turn and do you evil, and consume you, after he has done you good.”
Ọ bụrụ na unu agbakụta Onyenwe anyị azụ, fee chi ala ọzọ ofufe, ọ ga-echigharị laa unu nʼiyi, nʼagbanyeghị na ọ nọnyerela unu ụbọchị ndị a niile.”
21 The people said to Joshua, “No, but we will serve the LORD.”
Ma ndị Izrel sịrị Joshua, “Mba, kama Onyenwe anyị ka anyị ga-efe ofufe.”
22 Joshua said to the people, “You are witnesses against yourselves that you have chosen the LORD yourselves, to serve him.” They said, “We are witnesses.”
Mgbe ahụ, Joshua sịrị, “Unu bụ ndị ama megide onwe unu na unu ahọrọla ife Onyenwe anyị ofufe.” Ha zara sị, “E, anyị bụ ndị akaebe.”
23 “Now therefore put away the foreign gods which are among you, and incline your heart to the LORD, the God of Israel.”
Joshua sịrị, “Ugbu a, wezuganụ chi ndị mba ọzọ niile dị nʼetiti unu. Werekwanụ obi unu nye maka irubere Onyenwe anyị Chineke Izrel isi.”
24 The people said to Joshua, “We will serve the LORD our God, and we will listen to his voice.”
Ndị ahụ sịrị Joshua, “Anyị ga-efe Onyenwe anyị Chineke anyị ofufe. Anyị ga-egekwa ntị nʼolu ya, mee ihe o nyere nʼiwu.”
25 So Joshua made a covenant with the people that day, and made for them a statute and an ordinance in Shechem.
Ya mere, Joshua na ndị Izrel gbara ndụ nʼụbọchị ahụ na Shekem. O nyere ha iwu na ụkpụrụ ha ga-edebe.
26 Joshua wrote these words in the book of the law of God; and he took a great stone, and set it up there under the oak that was by the sanctuary of the LORD.
Joshua dere iwu ndị a ụmụ Izrel kwere na ha ga-eme nʼAkwụkwọ Iwu Chineke. Emesịa, o bupụtara otu nkume buru ibu guzo ya nʼokpuru osisi ukwu ook dị nʼakụkụ ebe nsọ Onyenwe anyị.
27 Joshua said to all the people, “Behold, this stone shall be a witness against us, for it has heard all the LORD’s words which he spoke to us. It shall be therefore a witness against you, lest you deny your God.”
Joshua sịrị ndị ahụ niile, “Lee, nkume a ga-abụ ihe ama megide anyị. Nʼihi na ọ nụla okwu niile nke Onyenwe anyị gwara anyị. Ọ ga-abụkwa ihe ama megide unu, ma ọ bụrụ na unu mee ihe mmekpu megide Chineke unu.”
28 So Joshua sent the people away, each to his own inheritance.
Emesịa, Joshua zilara onye ọbụla, ka ha laa nʼihe nketa nke aka ha.
29 After these things, Joshua the son of Nun, the servant of the LORD, died, being one hundred ten years old.
Ọ dịghị anya, mgbe ihe ndị a gasịrị, Joshua nwa Nun, odibo Onyenwe anyị nwụrụ, mgbe ọ gbara narị afọ na iri.
30 They buried him in the border of his inheritance in Timnathserah, which is in the hill country of Ephraim, on the north of the mountain of Gaash.
E liri ya nʼoke ala nke ihe nketa ya, na Timnat Sera, nʼime ala ugwu ugwu Ifrem, nʼakụkụ ugwu dị nʼala Gaash.
31 Israel served the LORD all the days of Joshua, and all the days of the elders who outlived Joshua, and had known all the work of the LORD, that he had worked for Israel.
Ndị Izrel fere Onyenwe anyị ofufe ụbọchị niile nke ndụ Joshua, na nke ndụ ndị okenye ahụ, bụ ndị gara nʼihu bie ndụ mgbe ọ nwụsịrị, ndị maakwara ihe niile nke Onyenwe anyị rụụrụ ndị Izrel.
32 They buried the bones of Joseph, which the children of Israel brought up out of Egypt, in Shechem, in the parcel of ground which Jacob bought from the sons of Hamor the father of Shechem for a hundred pieces of silver. They became the inheritance of the children of Joseph.
Ọkpụkpụ Josef ndị Izrel chịtara mgbe ha si nʼala Ijipt pụta, ka ha liri na Shekem, nʼime ala ahụ Jekọb zụrụ narị mkpụrụ ọlaọcha nʼaka ụmụ Hamọ nna Shekem. Ala a ghọrọ nʼihe nketa ụmụ Josef.
33 Eleazar the son of Aaron died. They buried him in the hill of Phinehas his son, which was given him in the hill country of Ephraim.
Elieza nwa Erọn, nwụkwara. E liri ya nʼala ugwu ugwu ndị Ifrem, na Gibea, obodo e nyere nwa ya bụ Finehaz.

< Joshua 24 >