< Amos 2 >

1 The LORD says: “For three transgressions of Moab, yes, for four, I will not turn away its punishment, because he burned the bones of the king of Edom into lime;
Otu a ka Onyenwe anyị sịrị, “Nʼihi njehie atọ nke Moab, e, nʼihi nke anọ, agaghị m ahapụ inye ya ntaramahụhụ. Nʼihi na ha surere ọkpụkpụ eze ndị Edọm ọkụ, mee ha ka ha ghọọ ntụ.
2 but I will send a fire on Moab, and it will devour the palaces of Kerioth; and Moab will die with tumult, with shouting, and with the sound of the trumpet;
Ya mere, aga m ezite ọkụ na Moab, nke ga-erepịa ebe niile e wusiri ike nke Keriọt. Moab ga-anwụ nʼime ọgbaaghara, nʼetiti mkpu agha, na ụda opi ike.
3 and I will cut off the judge from among them, and will kill all its princes with him,” says the LORD.
Aga m ala onyeisi ọchịchị ya nʼiyi, gbukwaa ndị ozi niile nọ nʼokpuru ya.” Ọ bụ Onyenwe anyị na-ekwu.
4 The LORD says: “For three transgressions of Judah, yes, for four, I will not turn away its punishment, because they have rejected the LORD’s law, and have not kept his statutes, and their lies have led them astray, after which their fathers walked;
Otu a ka Onyenwe anyị sịrị, “Nʼihi njehie atọ nke Juda, e, nʼihi nke anọ, agaghị m ahapụ inye ya ntaramahụhụ. Nʼihi na ha ajụla iwu Onyenwe anyị. Ha ajụkwala irube isi ha nʼụkpụrụ ya. Ha abụrụla ndị e ji okwu ụgha duhie, bụ okwu ụgha ndị ahụ nna nna ha gbasoro.
5 but I will send a fire on Judah, and it will devour the palaces of Jerusalem.”
Nʼihi nke a, aga m esunye ọkụ na Juda, ọ ga-erepịa ebe niile e wusiri ike nke Jerusalem.”
6 The LORD says: “For three transgressions of Israel, yes, for four, I will not turn away its punishment, because they have sold the righteous for silver, and the needy for a pair of sandals;
Otu a ka Onyenwe anyị sịrị, “Nʼihi njehie atọ nke Izrel, e, nʼihi nke anọ, agaghị m ahapụ inye ya ntaramahụhụ. Ha na-ere ndị ezi omume nʼihi ọlaọcha, reekwa ụmụ ogbenye nʼọnụ ahịa e ji azụ akpụkpọụkwụ abụọ.
7 They trample the heads of the poor into the dust of the earth and deny justice to the oppressed. A man and his father use the same maiden, to profane my holy name.
Ha na-azọpịa isi ndị ike na-adịghị, na-echi ha ọnụ nʼaja, na-ewezuga ndị dị umeala nʼụzọ ezi ihe. Nwoke na nna ya na-edinakwuru otu nwaagbọghọ, si otu a merụọ aha nsọ m.
8 They lay themselves down beside every altar on clothes taken in pledge. In the house of their God they drink the wine of those who have been fined.
Ha na-edina nʼakụkụ ebe ịchụ aja ọbụla, nʼelu uwe ndị anatara na mbe. Nʼime ụlọnsọ chi ha, ha na-aṅụ mmanya ha natara dịka ihe nra.
9 Yet I destroyed the Amorite before them, whose height was like the height of the cedars, and he was strong as the oaks; yet I destroyed his fruit from above, and his roots from beneath.
“Ma a lara m ndị Amọrait nʼiyi nʼihu ha, ndị ahụ dị ogologo dịka osisi sida, ndị sikwara ike dịka osisi ook. Alara m mkpụrụ ha dị nʼelu, na mgbọrọgwụ ha niile dị nʼokpuru nʼiyi.
10 Also I brought you up out of the land of Egypt and led you forty years in the wilderness, to possess the land of the Amorite.
Esitere m nʼala Ijipt kpọpụta unu, duru unu gafee nʼọzara iri afọ anọ, ime ka unu nweta ala ndị Amọrait.
11 I raised up some of your sons for prophets, and some of your young men for Nazirites. Is not this true, you children of Israel?” says the LORD.
“Ahọpụtara m ụmụ unu ụfọdụ ka ha bụrụ ndị amụma, họpụtakwa ụfọdụ ndị okorobịa unu ka ha bụrụ Nazirait. Unu ndị Izrel, unu ga-agọ na nke a abụghị eziokwu?” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara ya.
12 “But you gave the Nazirites wine to drink, and commanded the prophets, saying, ‘Do not prophesy!’
“Ma unu mere ka ndị Nazirait ahụ ṅụọ mmanya. Unu nyekwara ndị amụma iwu ka ha kwụsị ibu amụma.
13 Behold, I will crush you in your place, as a cart crushes that is full of grain.
“Nʼihi ya, aga m abịada unu nʼala nʼọnọdụ unu, dịka ụgbọala nke e bujuru ukwu ọka si abịada.
14 Flight will perish from the swift. The strong will not strengthen his force. The mighty will not deliver himself.
Ịgba ọsọ agaghị azọpụta ọ bụladị ndị dị nwe ụkwụ ọsọ, ndị dị ike agaghị agba onwe ha ume, ndị bụ dike nʼagha agaghị azọpụta onwe ha.
15 He who handles the bow will not stand. He who is swift of foot will not escape. He who rides the horse will not deliver himself.
Ndị na-agba ụta agaghị agbata ihe ọbụla, ndị nwere ụkwụ ọsọ agaghị enwekwa ike ịgba ọsọ. Ọ bụladị onye ịgba ịnyịnya doro anya agakwaghị enwe ike ịgbanarị ihe mberede nke ga-abịakwasị ya.
16 He who is courageous among the mighty will flee away naked on that day,” says the LORD.
Ndị obi siri ike nʼetiti ndị dike unu, ga-agbara ọtọ gbapụ ọsọ nʼụbọchị ahụ.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.

< Amos 2 >