< Ruth 3 >
1 And Naomi her mother-in-law said to her, My daughter, shall I not seek rest for thee, that it may be well with thee?
Otu ụbọchị, Naomi, nne di Rut, gwara ya okwu sị, “Nwa m nwanyị, ọ bụ na o rubeghị mgbe m ga-achọtara gị ụlọ nke aka gị, ebe a ga-anọ lekọtazie gị anya nke ọma?
2 And now is not Boaz our kinsman, with whose maidens thou were? Behold, he winnows barley tonight in the threshing-floor.
Ọ bụ na Boaz, onye gị na ụmụ agbọghọ ya so rụọ ọrụ ịchịkọta ọka abụghị onye agbụrụ anyị? Lee, nʼabalị taa ka ọ ga-afụcha ọka balị nʼebe ịzọcha ọka.
3 Wash thyself therefore, and anoint thee, and put thy raiment upon thee, and get thee down to the threshing-floor. But do not make thyself known to the man until he shall have done eating and drinking.
Ugbu a, gaa saa ahụ gị, teekwa mmanụ isi ụtọ, yirikwa uwe mara mma. I mesịa, gaa nʼebe ịzọcha ọka, ma ekwekwala ka ọ hụ gị, tutu ruo mgbe o risiri nri ṅụọkwa ihe ọṅụṅụ.
4 And it shall be, when he lies down, that thou shall notice the place where he shall lie. And thou shall go in, and uncover his feet, and lie thee down. And he will tell thee what thou shall do.
Leziekwa anya chọpụta ebe ọ ga-edina rahụ ụra. Mgbe ị maara na ọ rahụla ụra nke ọma, gaa kpughepụ akwa o ji kpuchie ụkwụ ya, dinaakwa ala nʼebe ahụ. Ọ ga-agwa gị ihe ị ga-eme.”
5 And she said to her, All that thou say I will do.
Rut zara sị, “Aga m eme ihe ọbụla ị sị m mee.”
6 And she went down to the threshing-floor, and did according to all that her mother-in-law bade her.
Ya mere, Rut pụrụ nʼabalị ahụ gaa nʼebe ịzọcha ọka ahụ, meekwa dịka nne di ya gwara ya.
7 And when Boaz had eaten and drunk, and his heart was merry, he went to lie down at the end of the heap of grain. And she came softly, and uncovered his feet, and laid down.
Mgbe Boaz risiri nri ma ṅụọkwa ihe ọṅụṅụ, mmụọ ya dịkwa mma, ọ gara ka ọ dinaa ala na nsọtụ ebe atụkọtara akpa ọka. Rut jiri nwayọọ gaa nʼebe ahụ, kpughepụ akwa o ji kpuchie ụkwụ ya abụọ, dina nʼakụkụ ụkwụ ya.
8 And it came to pass at midnight, that the man was startled, and turned himself, and, behold, a woman lay at his feet.
Nʼetiti abalị Boaz kụjara teta na mberede, tụgharịa, ma lee o nwere nwanyị dina nʼala ala ụkwụ ya.
9 And he said, Who are thou? And she answered, I am Ruth thy handmaid. Spread therefore thy skirt over thy handmaid, for thou are a near kinsman.
Ọ jụrụ ya sị, “Ị bụ onye?” Rut zara ya sị, “Abụ m Rut, ohu gị nwanyị, onyenwe m. Were ọnụ ọnụ akwa gị kpukwasị m, nʼihi na ị bụ onye agbụrụ mgbapụta m dị nso.”
10 And he said, Blessed be thou of Jehovah, my daughter. Thou have shown more kindness in the latter end than at the beginning, inasmuch as thou did not follow young men, whether poor or rich.
Boaz zara sị ya, “Onyenwe anyị gọzie gị, nwa m nwanyị. Ịhụnanya i gosiri ugbu a akarịala nke i gosiri na mbụ, nʼihi na i gbasoghị ụmụ okorobịa, ma ha bụ ọgaranya maọbụ ogbenye.
11 And now, my daughter, fear not. I will do to thee all that thou say, for all the city of my people know that thou are a worthy woman.
Ma ugbu a, nwa m nwanyị, atụla ụjọ. Aga m emezuru gị dịka i si rịọọ, nʼihi na mmadụ niile maara na ị bụ onye nwere ezi agwa.
12 And now it is true that I am a near kinsman. However there is a kinsman nearer than I.
Ọ bụ ezie na m bụ onye mgbapụta dị nso nke ezinaụlọ anyị, ma o nwere onye ọzọ dị ezi nso karịa m.
13 Remain this night, and it shall be in the morning that if he will perform to thee the part of a kinsman, well; let him do the kinsman's part. But if he will not do the part of a kinsman to thee, then I will do the part of a kinsman to thee, as Jehovah lives. Lie down until the morning.
Nọdụ nʼebe a nʼabalị a. Nʼụtụtụ, ọ bụrụ na onye ahụ ekwere imezu ọrụ ya dịka onye mgbapụta, ya rụzuo ya. Ọ bụrụ na o kwere, ọ dị mma, ọ bụrụkwanụ na o kweghị, dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, aga m emezu ya. Ugbu a, dinara ala ruo ụtụtụ.”
14 And she lay at his feet until the morning. And she rose up before one could discern another. For he said, Let it not be known that the woman came to the threshing-floor.
Ya mere, Rut dinara nʼụkwụ ya ruo ụtụtụ. Ma chi abọzibeghị nke ọma mgbe o si nʼebe ahụ bilie nʼihi na Boaz sịrị ya, “Ekwela ka onye ọbụla mata na nwanyị bịara nʼebe ịzọcha ọka.”
15 And he said, Bring the mantle that is upon thee, and hold it. And she held it, and he measured six measures of barley, and laid it on her, and he went into the city.
O gwakwara Rut okwu sị ya, “Chịta akwa mgbokwasị gị, gbasaa ya.” Ya mere Rut gbasara akwa ya, Boaz manyere ya ọtụtụ ọka balị isii, bokwasị ya Rut, onye buuru ya banye nʼime obodo.
16 And when she came to her mother-in-law, she said, Who are thou, my daughter? And she told her all that the man had done to her.
Mgbe Rut bịakwutere nne di ya, Naomi jụrụ ya sị, “Nwa m nwanyị, olee otu ihe si gaa?” Rut gwara ya ihe niile Boaz meere ya, sị,
17 And she said, He gave me these six measures of barley, for he said, Go not empty to thy mother-in-law.
“Ọ manyeere m ọtụtụ ọka balị isii ndị a si m, ‘O kwesighị ka ị gbara aka lakwuru nne di gị.’”
18 Then she said, Sit still, my daughter, until thou know how the matter will fall, for the man will not rest until he has finished the thing this day.
Naomi zara si ya, “Chere, nwa m nwanyị, ruo mgbe ị ga-ahụ otu okwu a ga-esi bie. Nwoke a agaghị ezu ike tutu ruo mgbe o kwubiri okwu a taa.”