< Proverbs 8 >

1 Does not wisdom cry out, and understanding put forth her voice?
Ọ bụ na amamihe adịghị eti mkpu? Ọ bụ na nghọta anaghị eme ka olu ya daa ụda?
2 On the top of high places by the way, where the paths meet, she stands.
Ọ na-eguzo nʼelu ebe niile dị elu nʼokporoụzọ, nʼagbata ụzọ niile.
3 Beside the gates, at the entry of the city, at the coming in at the doors, she cries aloud:
Nʼọnụ ụzọ nke obodo niile na nʼọnụ ụzọ ụlọ niile ka ọ nọ na-eti mkpu,
4 To you, O men, I call. And my voice is to the sons of men.
ọ na-asị, “Ụmụ mmadụ geenụ m ntị; ọ bụ unu ndị dị ndụ ka m na-agwa okwu.
5 O ye simple, understand prudence, and, ye fools, be of an understanding heart.
Unu ndị na-enweghị uche, nweenụ uche zuruoke; unu ndị nzuzu, nweenụ nghọta.
6 Hear, for I will speak excellent things. And the opening of my lips shall be right things.
Geenụ m ntị, nʼihi na enwere m okwu dị mkpa m ga-agwa unu; Ihe ọbụla m kwuru bụ ihe ziri ezi,
7 For my mouth shall utter truth. And wickedness is an abomination to my lips.
Ọnụ m na-ekwu eziokwu nʼihi na akpọrọ m okwu ụgha asị.
8 All the words of my mouth are in righteousness. There is nothing crooked or perverse in them.
Ndụmọdụ m zuruoke, ọ dịkwa mma. Ihe ọjọọ ọbụla adịghị nʼime ya.
9 They are all plain to him who understands, and right to those who find knowledge.
Nʼebe onye nwetara nghọta nọ, okwu m doro anya; nʼebe ndị chọtara ihe ọmụma nọ, okwu m ziri ezi.
10 Receive my instruction, and not silver, and knowledge rather than choice gold.
Họrọ ịdọ aka na ntị m karịa ọlaọcha họrọkwa ihe ọmụma karịa ọlaedo dị ezi mma.”
11 For wisdom is better than rubies, and all the things that may be desired are not to be compared to it.
Amamihe dị mkpa karịa nkume rubi dị oke ọnụahịa. Ọ dịkwaghị ihe a ga-eji tụnyere ya.
12 I, wisdom, have made prudence my dwelling, and find out knowledge and discretion.
“Mụ onwe m bụ amamihe na ezi nghọta na-agakọta. Enwere m ọmụma ihe na ezi izuzu.
13 The fear of Jehovah is to hate evil. Pride, and arrogance, and the evil way, and the perverse mouth, do I hate.
Ịtụ egwu Onyenwe anyị bụ ịkpọ ihe ọjọọ asị. Akpọrọ m nganga na mpako, omume ọjọọ nakwa okwu gbagọrọ agbagọ asị.
14 Counsel is mine, and sound knowledge. I am understanding, I have might.
Ndụmọdụ na ezi nghọta bụ nke m; enwekwara m ọmụma ihe na ike.
15 By me kings reign, and rulers decree justice.
Site na m ka ndị eze ji achị, ọ bụ m na-eme ka ndị na-achị achị mee iwu ziri ezi.
16 By me rulers rule, and ranking men, even all the judges of the earth.
Site na m ka ndị eze ji achị bụ ndịisi niile na-achị nʼụwa.
17 I love those who love me, and those who seek me diligently shall find me.
Ndị niile hụrụ m nʼanya ka m na-ahụ nʼanya. Ndị niile na-achọ m aghakwaghị ịchọta m.
18 Riches and honor are with me, durable wealth and righteousness.
Ana m ekenye ụba na nsọpụrụ, na ikpe ziri ezi na ezi omume.
19 My fruit is better than gold, yea, than fine gold, and my revenue than choice silver.
Onyinye m na-enye dị mma karịa ọlaọcha, ọ karịkwara ọlaedo.
20 I walk in the way of righteousness, in the midst of the paths of justice,
Ana m aga ije nʼụzọ ezi omume, nʼokporoụzọ ikpe ziri ezi.
21 that I may cause those who love me to inherit substance, and that I may fill their treasuries.
Ndị niile hụrụ m nʼanya, na-eketa akụnụba. Ana m emejupụtakwa ụlọakụ ha.
22 Jehovah possessed me in the beginning of his way, before his works of old.
“Onyenwe anyị kpụrụ m dịka mmalite ụzọ ya, tupu o bido ike ihe ọbụla ọzọ.
23 I was set up from everlasting, from the beginning, before the earth was,
Site nʼebighị ebi gara aga ka m dị; adịkwa m adị tupu e kee ụwa.
24 when there were no depths. I was brought forth when there were no fountains abounding with water,
Anọ m na-adị tupu e kee ogbu mmiri, tupu isi iyi ọbụla agbapụta mmiri nʼelu ụwa,
25 before the mountains were settled, before the hills. I was brought forth
tupu e kee ugwu ukwu na ugwu nta.
26 while as yet he had not made the earth, nor the fields, nor the beginning of the dust of the world.
E, amụọla m rịị tupu Chineke ekee ụwa na osisi niile, na aja niile dị nʼime ya.
27 When he established the heavens, I was there. When he set a circle upon the face of the deep,
Anọ m ya mgbe o doziri mbara eluigwe nʼọnọdụ ya, mgbe ọ tụsara ha nʼelu ogbu mmiri niile;
28 when he made firm the skies above, when the fountains of the deep became strong,
mgbe o hiwere mbara eluigwe, mgbe o mere ka isi iyi niile nke ogbu mmiri dị ike,
29 when he gave to the sea its bound that the waters should not transgress his commandment, when he marked out the foundations of the earth,
mgbe ọ kpara oke nye osimiri ebe ọ ga-akwụsị, ka mmiri ya ghara ịgafe iwu ya, mgbe ọ kara akara ebe a tọrọ ntọala nke ụwa.
30 then I was by him, a master workman. And I was daily his delight, rejoicing always before him,
Oge ahụ niile ka m na-anọ nʼakụkụ ya dịka onye ǹka. Ihe banyere m na-atọkwa ya ụtọ; ana m egwuri egwu nʼihu ya.
31 rejoicing in his habitable earth. And my delight was with the sons of men.
Ihe niile o kere tọkwara m ụtọ, ụwa niile na ụmụ mmadụ!
32 Now therefore, ye sons, hearken to me. For blessed are those who keep my ways.
“Nʼihi ya, ụmụ m ndị ikom, geenụ m ntị; nʼihi na ndị niile na-eso ụzọ m na-enwe ọṅụ.
33 Hear instruction, and be wise, and do not refuse it.
Gee ntị na ndụmọdụ m ka ị bụrụ onye maara ihe, agbakụtakwala ndụmọdụ m azụ.
34 Blessed is the man who hears me, watching daily at my gates, waiting at the posts of my doors.
Ngọzị dịrị mmadụ ahụ na-aṅa ntị nʼokwu m, onye na-anọ na nche nʼọnụ ụzọ m ụbọchị niile, onye na-anọ na-echere m nʼọnụ ụzọ ụlọ m;
35 For he who finds me finds life, and shall obtain favor of Jehovah.
nʼihi na onye ọbụla chọtara m chọtara ndụ; ọ natakwala ihuọma nʼebe Onyenwe anyị nọ.
36 But he who sins against me wrongs his own soul. All those who hate me love death.
Ma onye na-enweghị ike chọta m na-emerụ onwe ya ahụ; ndị niile kpọrọ m asị hụrụ ọnwụ nʼanya.”

< Proverbs 8 >