< Job 36 >
1 Elihu also proceeded, and said,
Elihu gara nʼihu sị:
2 Allow me a little, and I will show thee. For I have yet somewhat to say on God's behalf.
“Nyetụ m nwa oge nta, ka m gosi gị na ọ ka dị ọtụtụ ihe e nwere ikwu nyere Chineke.
3 I will fetch my knowledge from afar, and will ascribe righteousness to my maker.
Ana m enweta amamihe m site nʼebe dị anya; aga m enye Onye kere m ezi omume.
4 (For truly my words are not false.) He who is perfect in knowledge is with thee.
Ya doo gị anya na okwu m abụghị okwu ụgha; onye zuruoke nʼihe ọmụma nọnyeere gị.
5 Behold, God is mighty, and does not despise. He is mighty in strength of understanding.
“Chineke dị ike ma ọ dịghị eleda mmadụ ọbụla anya; ọ dị ike, bụrụkwa onye na-eme ihe ọbụla o zubere ime.
6 He does not preserve the life of the wicked, but gives to the afflicted their right.
Ọ naghị edebe ndị ajọ omume ndụ, kama ọ na-enye ndị a na-akpagbu akpagbu ihe ruuru ha.
7 He does not withdraw his eyes from the righteous, but he sets them forever with kings upon the throne, and they are exalted.
Ọ dịghị ewepụ anya ya nʼebe ndị ezi omume nọ, kama ọ na-eme ka ha na ndị eze nọkwasị nʼocheeze, bụrụ ndị e buliri elu ruo mgbe ebighị ebi.
8 And if they be bound in fetters, and be taken in the cords of afflictions,
Ma ọ bụrụ na e kechie ụmụ mmadụ nʼagbụ igwe, jirikwa agbụ nke mkpagbu jidesie ha ike,
9 then he shows them their work, and their transgressions, that they have behaved themselves proudly.
ọ na-agwa ha ihe ha mere, na ha sitere na nganga ha mehie.
10 He also opens their ear to instruction, and commands that they return from iniquity.
Ọ na-eme ka ha ṅaa ntị nye ntụziaka, na-enyekwa ha iwu ka ha chegharịa site nʼajọ ihe ha na-eme.
11 If they hearken and serve him, they shall spend their days in prosperity, and their years in pleasures.
Ọ bụrụ na ha erube isi, jekwaara ya ozi, ha ga-abụ ndị ga-ebi oge ndụ ha fọdụrụ nʼakụnụba, biekwa ogologo ndụ ha niile nʼafọ ojuju.
12 But if they do not hearken, they shall perish by the sword, and they shall die without knowledge.
Ma ọ bụrụ na ha egeghị ntị, ha ga-ala nʼiyi site na mma agha, ha ga-anwụ na-enweghị ọmụma ihe.
13 But those who are godless in heart lay up anger. They do not cry for help when he binds them.
“Ndị ajọ omume na-ebu iro nʼobi ha. Ha adịghị echegharị kpọkuo ya ọ bụladị mgbe o kere ha agbụ.
14 They die in youth, and their life perishes among the unclean.
Ha na-anwụ nʼoge okorobịa ha, nʼetiti ndị ikom na-agba akwụna nʼụlọ arụsị dị iche iche.
15 He delivers the afflicted by their affliction, and opens their ear in oppression.
Ma ndị na-ahụsị anya ka ọ na-azọpụta site nʼahụhụ ha; na-agwa ha okwu site na mkpagbu ha.
16 Yea, he would have allured thee out of distress into a broad place, where there is no confinement, and that which is set on thy table would be full of fatness.
“Ọ na-achọsi ike ịnapụta gị site nʼọnụ mkpagbu, baa nʼebe sara mbara, ebe mkpagbu na-adịghị, baa na tebul nke jupụtara na nri dị ezi ụtọ.
17 But thou have fulfilled the judgment of the wicked. Judgment and justice take hold,
Ma ugbu a, ikpe ọmụma dịịrị ndị ajọ omume na-anyịgbu gị; ikpe ọmụma na ikpe ziri ezi abịakwasịla gị.
18 and there shall be wrath upon the impious because of the ungodliness of bribes which the unrighteous receive.
Lezie anya ka mmadụ ọbụla ghara iji akụnụba rafuo gị; ekwekwala ka ihe ngarị bara ụba wezuga gị nʼọnọdụ gị.
19 Will thy cry not avail in distress, or all the forces of strength?
Akụnụba gị maọbụ ịdị ike gị ha pụrụ ịnapụta gị ka ị ghara ịnọ na mkpagbu?
20 Do not desire the night, when peoples are cut off in their place.
Anọla na-echere ka abalị bịa, mgbe a na-adọkpụrụ ndị ụmụ mmadụ site nʼụlọ ha pụọ.
21 Take heed. Do not turn to iniquity, for thou have fixed on this because of affliction.
Lezie anya, ka i ghara iche ihu nye ajọ ihe, bụ nke ọ dị ka ị na-ahọrọ karịa mkpagbu.
22 Behold, God does loftily in his power. Who is a teacher like him?
“E buliela Chineke elu nʼike ya, onye bụ onye ozizi dịka ya?
23 Who has enjoined him his way? Or who can say, Thou have wrought unrighteousness?
Onye họpụtaara ya ụzọ ọ ga-agbaso, maọbụ sị ya ‘I meela ajọ ihe’?
24 Remember that thou magnify his work, of which men have sung.
Cheta ka i bulie ọrụ aka ya elu, bụ nke ụmụ mmadụ torola site nʼabụ.
25 All men have looked on it. Man beholds it afar off.
Mmadụ niile ahụzuola ya; ụmụ mmadụ nọ nʼebe dị anya na-ele ya anya.
26 Behold, God is great, and we do not know him. The number of his years is unsearchable.
Lee, Chineke dị ukwuu, karịa nghọta anyị. Ọnụọgụgụ afọ ya karịrị mmadụ ịchọpụta.
27 For he draws up the drops of water, which distil in rain from his vapor,
“Ọ bụ ya na-eme ka ukuru mmiri rigoro nʼelu mgbe anwụ na-acha, nke a na-aghọ mmiri ozuzo nye iyi niile.
28 which the skies pour down and drop upon man abundantly.
Igwe ojii na-awụdata mmiri dị nʼime ya mee ka mmiri ozuzo dị ukwuu zokwasị ụmụ mmadụ.
29 Yea, can any understand the spreadings of the clouds, the thunderings of his pavilion?
Onye pụrụ ịghọta ka o si gbasaa igwe ojii, ka o si ebigbọ site nʼebe obibi ya?
30 Behold, he spreads his light around him, and he covers the bottom of the sea.
Lee, ọ gbasaala amụma ya gburugburu ya na-ekpuchi ebe niile dịkarịsịrị omimi nke oke osimiri.
31 For by these he judges the peoples. He gives food in abundance.
Nke a bụ ụzọ o si achị mba niile na-enyejukwa ha nri afọ.
32 He covers his hands with the lightning, and gives it a command that it strike the mark.
O ji amụma nke egbe eluigwe kpojuo aka ya, ma na-enye ya iwu itida ihe ọbụla ọ chọrọ.
33 The noise of it tells concerning him. The cattle also concerning the storm that comes up.
Ịda ụda nke egbe eluigwe na-akọwa ọbịbịa nke oke ifufe mmiri; ọ bụladị ehi na-eme ka a mara na ọ nọ nso.