< Wuok 21 >

1 “Magi e chike manyaka iketi e nyimgi.
“Ndị a bụ iwu ị ga-edebe nʼihu ha.
2 “Ka ingʼiewo ja-Hibrania ma misumba, to enotini kuom higni auchiel. To e higa mar abiriyo, enobed thuolo, ka ok ochulo gimoro.
“Ọ bụrụ na ị goro ohu onye Hibru, ọ ga-agbara gị odibo afọ isii. Ma nʼafọ nke asaa, ọ ga-abụ onye nwere onwe ya laakwa nʼakwụghị ụgwọ ọbụla.
3 Kane obiro kapok okendo, to nodog kende; to kane obiro ka osekendo, to nodog gi chiegeno.
Ọ bụrụ na sọọsọ ya bịara, sọọsọ ya ga-ala, ma ọ bụrụ na o nwere nwunye tupu ọ bụrụ ohu, ya na nwunye ya ga-eso ala.
4 Ka ruodhe omiye dhako kendo onywolone yawuowi gi nyiri, dhakono kaachiel gi nyithinde nobed mwandu ruodhe kendo mana misumbano kende ema nobed thuolo.
Ọ bụrụ na nna ya ukwu kpọnyere ya nwunye onye mụtaara ya ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom, nwanyị ahụ na ụmụ ya ga-abụ nke nna ya ukwu, naanị nwoke ahụ ga-enwere onwe ya.
5 “To ka misumba owacho ni, ‘Ahero ruodha kod chiega gi nyithinda kendo ok adwar bedo thuolo,’
“Ma ọ bụrụ na ohu ahụ asị, nʼezie, ‘Ahụrụ m onyenwe m na nwunye m na ụmụ m nʼanya, achọghị m inwere onwe,’
6 to ruodhe nyaka tere e nyim jongʼad bura. Notere e dhoot kata e siro mar dhoot kendo notuch ite gi riwi. Bangʼe obiro bedo misumbane nyaka chiengʼ.
mgbe ahụ, onyenwe ya ga-eduru ya bịakwute Chineke. Mgbe ọ kpọbatasịrị ya nʼọnụ ụzọ, onyenwe ya ga-eji agịga dupuo ntị ya. Malite nʼoge ahụ, ọ ga-abụkwa ohu ya ruo ọgwụgwụ ndụ ya.
7 “Ka ngʼato ouso nyare kaka misumba, to ok noweye obed thuolo kaka iweyo misumba madichwo.
“A sị na nwoke eree nwa ya nwanyị dịka ohu, agaghị ala otu ndị ohu nwoke si ala.
8 To ka ruoth mongʼieweno chunye ok mor kode; to ruodheno noweye mondo oware. Oonge gi thuolo mar use ne jopinje mamoko, nikech oseketho singruokne kode.
Ọ bụrụ na ihe nwanyị ahụ amasịkwaghị onyenwe ya, onye họọrọ ya nye onwe ya, onyenwe ya ga-ekwere ka a gbapụta ya. Ma ọ gaghị eresi ya ndị ọbịa. Nʼihi na onyenwe ya emeela nwanyị ahụ ihe ọjọọ mgbe ọ jụrụ na ọ gaghị alụkwa ya ọzọ.
9 Ka oyiere ni wuode, to nyaka omiye duongʼ kaka nyare.
Ọ bụrụ na ọ chọrọ ka nwa ya nwoke lụọ ya dịka nwunye ya, ọ ga-emeso ya dịka omenaala si kwado e si emeso ndị bụ nwaada.
10 Ka wuowino onywomo dhako machielo, to nyaka omi dhako mokwongo chiemo, lewni kendo nyaka obed kode e achiel.
Ọ bụrụkwa na ọ lụta ya dịka nwunye nke aka ya, mesịakwa lụta nwunye ọzọ, ọ gaghị akwụsị inye ya uwe maọbụ ihe oriri. Ọ gaghị agọnarịkwa ya ihe ọbụla kwesiri ya dịka nwunye.
11 To ka ok ochiwone gik moko adekgi, to dhakono, ni thuolo mar dhi, maonge chudo moro amora mar pesa.
Ọ bụrụ na o mereghị ohu nwanyị a ihe ndị a, nwanyị a pụrụ ịhapụ ya gaara onwe ya na-akwụghị ụgwọ ọbụla. Mgbe ahụ, ọ ga-enwerekwa onwe ya.
12 “Ngʼato angʼata mogoyo ngʼato kendo onego to adier nyaka negi.
“Ọzọkwa, ọ bụrụ na mmadụ etigbuo mmadụ ibe ya, aghaghị ime ka onye dị otu a nwụọ.
13 To kata kamano, ka gima otimono obothne, ma en dwach Nyasaye mondo mi otimre; to Nyasaye nomiye kar tony moseikone.
Ma ọ bụrụ na o mere ya na-amaghị ama, ọ bụrụkwa na Chineke kwagidere omume dị otu a, mgbe ahụ, a ga-ahọpụtara ya ebe ọ ga-agbaga, jee zere ndụ.
14 To ka ngʼato ochano kendo onego ngʼat machielo kuom wangʼ teko, to goleuru oko mabor gi kar kendona mar misango kendo negeuru.
Ọ bụrụkwa na onye ọbụla akpachara anya jiri aghụghọ gbuo mmadụ ibe ya, a ga-adọpụta ya, ọ bụladị site nʼebe ịchụ aja m, gbuo ya.
15 “Ngʼato angʼata ma omonjo wuon kata min nyaka negi.
“Ọ bụrụ na onye ọbụla etie nna ya maọbụ nne ya ihe, a ghaghị ime ka onye dị otu a nwụọ.
16 “Ngʼato angʼata mokawo nyawadgi githuon mi omiye ngʼat machielo kuom chudo kata bed ni pod opande e kindeno moyude gi ngʼatno, to nyaka nege.
“Onye ọbụla tọọrọ mmadụ ibe ya, ma o rere ya nʼahịa, maọbụ na a chọpụtara ya nʼaka ya, a ga-eme ka onye dị otu a nwụọ.
17 “Ngʼato angʼata ma okwongʼo wuon kata min nyaka negi.
“Aghaghị ime ka onye ọbụla ga-akpọ nna ya maọbụ nne ya iyi nwụọ.
18 “Ka chwo gore kendo achiel kuomgi ogoyo nyawadgi gi kidi kata gi adhongʼ to ok otho, to obedo mana matuo kosiko e pien,
“Ọ bụrụ na mmadụ abụọ alụọ ọgụ ma otu nʼime ha ewere nkume maọbụ osisi tie onye nke ọzọ. Ọ bụrụ na ọ nwụghị, kama na o merụrụ ahụ, dinaakwa nʼihe ndina ya,
19 to ngʼatno mane ogocho ok nomok e wachno ka machielono ochungo mi owuotho oko gi ludhe; to kata kamano, nyaka ochul ngʼat mohinyoreno kuom thuolone mokethore kendo one ni ochango chutho.
ọ bụrụ na onye ahụ ebilie were mkpara ya na-ejegharị, ikpe agaghị ama onye ahụ tiri ya ihe, kama ọ ga-akwụ ụgwọ ihe onye ahụ ji gwọọ onwe ya, na oge onye ahụ o tiri ihe ji nọọ nʼihe ndina, ruo mgbe ahụ ya ga-adị mma.
20 “Ka ngʼato ogoyo dichwo kata dhako ma misumba gi luth kendo misumbano otho kaluwore gi gochono, nyaka kume.
“Ọ bụrụ na ohu ọbụla anwụọ site nʼihe otiti nke onyenwe ya tiri ya, ma ohu ahụ ọ bụ nwoke maọbụ nwanyị, a ga-adọ onyenwe ya aka na ntị site nʼinye ya ntaramahụhụ.
21 To ok enokume ka misumbano ochungo oa malo bangʼ ndalo achiel kata ariyo, nimar misumbano en mwandune.
Otu ọ dị, ọ bụrụ na ohu ahụ dị ndụ nʼụbọchị mbụ, maọbụ nʼụbọchị nke abụọ, a gaghị enye onyenwe ya ntaramahụhụ nʼihi na ohu ahụ bụ akụ ya.
22 “Ka chwo magore ogoyo dhako man-gi ich kendo onywol ka kinde nywol pok ochopo to onge hinyruok moro malich, ngʼat motimo marachno nyaka gol chudo moro amora ma chwor dhakono okwayo kendo jangʼad bura oyiego.
“Ọ bụrụ na mmadụ abụọ esite nʼịlụ ọgụ ha merụọ nwanyị dị ime ahụ, mee ka ime ahụ pụọ, ma nwanyị ahụ emerụghị nnukwu ahụ, di nwanyị ahụ ga-anara site nʼaka onye ahụ merụrụ nwunye ya ahụ ihe niile ọbụla o kwuru na a ga-akwụ ya, bụkwa nke ndị na-ekpe ikpe kpebiri.
23 To ka nitie hinyruok marach to nyaka ukaw ngima kar ngima kendo
Ma ọ bụrụ na nwanyị ahụ a nwụọ nʼihi mmerụ ahụ ahụ e merụrụ ya, a ga-eme ka nwoke ahụ merụrụ ya ahụ nwụọ.
24 wangʼ kar wangʼ, kendo lak kar lak, kendo lwedo kar lwedo kendo tielo kar tielo,
Ọ bụrụ na ọ bụ anya ka a kụkpọrọ, anya nʼọnọdụ anya. Ọ bụrụkwa otu eze ka e tipụrụ, eze nʼọnọdụ eze. Otu ahụ kwa, aka nʼọnọdụ aka, ụkwụ nʼọnọdụ ụkwụ.
25 del mowangʼ kar del mowangʼ kendo adhola kar adhola, kendo kama ogwar kar kama ogwar.
Ịda ọkụ nʼọnọdụ ịda ọkụ, ọnya mma, nʼọnọdụ ọnya mma, ihe otiti nʼọnọdụ ihe otiti.
26 “Ka ngʼato ogoyo wangʼ misumba madichwo kata madhako ma wangʼeno okethore, to nyaka owene misumbaneno thuolo kaka chudo mar wangʼeno.
“Ọ bụrụ na mmadụ ọbụla esite nʼihe otiti o tiri ohu ya kụkpọọ ya anya, a ga-eme ka ohu ahụ nwere onwe ya, maọbụ ohu nwoke maọbụ ohu nwanyị, nʼihi na o jirila anya ya gbara onwe ya.
27 Kendo ka omuko lak misumba madichwo kata madhako, to nyaka owene misumbaneno thuolo kaka chudo mar lakeno.
Ọ bụrụ na mmadụ ọbụla etipụ eze ohu ya nwoke maọbụ ohu ya nwanyị, a ga-eme ka ohu ahụ nwere onwe ya nʼihi eze ya nke e tipụrụ.
28 “Ka rwath ochwoyo dichwo kata dhako monego, rwadhno nyaka go gi kite ma tho, kendo ringe kik cham. To wuon rwadhno wachno ok nomake.
“Ọ bụrụ na ehi ejiri mpi ya sọda mmadụ si otu a mee ka onye ahụ nwụọ, a ga-atụgbu ehi ahụ na nkume. Mmadụ ọbụla agaghị erikwa anụ ehi ahụ. Ma a ga-agụ onyenwe ehi ahụ dịka onye ikpe na-amaghị.
29 To kata kamano, ka rwadhno osebedo gi kido mar chwopo kendo wuon-gi osesiem to ok osetweye e dipo mi onego dichwo kata dhako, rwadhno nyaka go gi kite kendo wuon-gi bende nyaka negi.
Ọ bụrụ na ehi ahụ na-asọkarị ndị mmadụ mpi mgbe niile, agaghị eri anụ ya. Kama, ọ bụrụ na adọọla onyenwe ya aka na ntị banyere ehi ahụ ọtụtụ oge, ma o meghị ihe ọbụla banyere ya, a ga-eme ka ehi ahụ na onyenwe ya nwụọ.
30 Kata kamano, ka buch tho oloki, moketne chudo, to nyaka ochul nengo moro amora moketne mondo oresgo ngimane.
Ma ọ bụrụ na ndị nwe mmadụ achọọ ka a kwụọ ha ụgwọ kama igbu onyenwe ehi ahụ, ndị ikpe ga-ekpebi ego ole onyenwe ehi ga-akwụ ha.
31 Chik achielno ema nyaka tigo ka rwadh ochwowo nyathi ma wuowi kata ma nyako
Otu a ka a ga-esikwa kpee ikpe nke ga-apụta ma ọ bụrụ na ehi asọda nwokorobịa maọbụ nwaagbọghọ ọbụla.
32 Ka rwath ochwowo dichwo kata dhako ma misumba, to wuon rwadhno nyaka chul ruodh misumbano fedha ma pekne romo nus kilo, kendo rwadhno nyaka negi.
Kama ọ bụrụ na ehi asọda ohu nwoke maọbụ ohu nwanyị, onyenwe ehi ahụ ga-akwụ onyenwe ohu ahụ iri mkpụrụ ọlaọcha atọ. Emesịa, a ga-eji nkume tugbuo ehi ahụ.
33 “Ka ngʼato oelo dho bur kata okunyo moro kendo oweyo dhoge nono mi rwadh pur kata punda onyumoree,
“Ọ bụrụ onye ọbụla meghere olulu maọbụ gwuo olulu, ghara imechi ya, nke mere na ehi mmadụ maọbụ ịnyịnya ibu adaba nʼime ya,
34 to wuon burno nyaka chul kuom lalno; kendo nyaka ochul wuon gigi kendo jamni mothogo nobed mage.
onye ahụ gwuru olulu ahụ ga-akwụ onyenwe anụ ụlọ ahụ ọnụọgụgụ ego o jiri zụta ya. Mgbe ahụ ọ ga-eburu ozu anụ ahụ nwụrụ anwụ.
35 “Ka rwadh ngʼato ohinyo rwadh ngʼat machielo mi otho, to ginius rwath mangimano kendo ginipog pesa kaachiel gi ring rwath mothono marom.
“Ọ bụrụ na oke ehi mmadụ emerụọ oke ehi onye ọzọ ahụ, emesịa ehi dị otu a anwụọ, a ga-ere ehi nke dị ndụ, kewaa ego ya ụzọ abụọ. Otu a kwa, a ga-ekewa ehi nke nwụrụ anwụ, nye mmadụ abụọ ahụ otu ụzọ otu ụzọ.
36 To kata kamano, kane ongʼere ni rwadhno ne nigi kido mar chwopo, kendo wuon-gi ne osesiem to ne ok otweye, wuon-gi nyaka chul, chiayo kar chiayo kendo chiayo mothono nobed mare.
Ọ bụrụ na amaara na oke ehi ahụ na-asọ mpi mgbe niile nʼoge gara aga, ma onyenwe ya emeghị ihe ọbụla banyere ya, ọ ga-akwụzu ụgwọ ehi ahụ nwụrụ anwụ. Emesịa ehi ahụ nwụrụ anwụ ga-abụrụ nke ya.

< Wuok 21 >