< Rut 2 >

1 No'omi havde en Slægtning på sin Mands Side, en formuende Mand af Elimeleks Slægt ved Navn Boaz.
Ma Naomi nwere otu nwanne di ya, onye bara ụba, bụrụkwa onye a maara nke ọma, onye si nʼagbụrụ Elimelek. Aha nwoke a bụ Boaz.
2 En Dag sagde Moabiterinden Rut til No'omi: "Jeg vil gå ud i Marken og sanke Aks efter den, for hvis Øjne jeg finder Nåde." Hun svarede hende: "Ja, gør det, min Datter!"
Rut onye Moab, gwara Naomi okwu sị ya, “Kwere ka m gaa nʼubi ebe a na-aghọ ọka, ka m lee ma m ga-achọta ihuọma nʼihu ndị na-aghọ ọka, ndị ga-ekwere ka m tụtụkọta ọka ndị ha hapụrụ.” Naomi zara sị ya, “Ọ dị mma nwa m, gaa.”
3 Så gik hun hen og sankede Aks på Marken efter Høstfolkene; og det traf sig, at Marken tilhørte Boaz, som var af Elimeleks Slægt.
Ya mere, Rut pụrụ gaa na-atụtụ ọka nʼazụ ndị na-ewe ihe ubi. Ma dịka ihe si dị, Rut chọpụtara na ubi ọ na-atụtụ ọka bụ ubi Boaz, onye si nʼagbụrụ Elimelek.
4 Boaz kom just gående fra Betlehem; han sagde da til Høstfolkene: "HERREN være med eder!" Og de svarede: "HERREN velsigne dig!"
Nʼoge ahụ, Boaz nʼonwe ya si na Betlehem bịarute nʼubi ahụ, kelee ndị ahụ na-aghọ mkpụrụ nʼubi sị ha, “Onyenwe anyị nọnyere unu.” Ha niile zakwara sị ya, “Onyenwe anyị gọzie gị.”
5 Derpå sagde Boaz til den Karl, som havde Opsyn med Høstfolkene: "Hvor hører denne unge Kvinde hjemme?"
Mgbe Boaz hụrụ Rut, ọ jụrụ onyeisi ndị ọrụ ubi ya sị, “Onye ka nwanyị a bụ?”
6 Karlen, som havde Opsyn med Høstfolkene, svarede: "Det er en moabitisk Pige; det er hende, som fulgte med No'omi tilbage fra Moab;
Onye nlekọta ọrụ ubi ahụ zaghachiri, “Ọ bụ onye Moab ahụ so Naomi lọta.
7 hun sagde: Lad mig få Lov at sanke og samle Aks blandt Negene efter Høstfolkene! Så kom hun og har holdt ud lige fra i Morges tidlig til nu uden at unde sig et Øjebliks Hvile."
Ọ sịrị, ‘Biko kwere ka m soro ndị ọrụ nʼazụ tụtụkọtaa ukwu ọka ha hapụrụ.’ Kemgbe ụtụtụ ọ bịara, ọ kwụsịbeghị ọrụ ya karịakwa naanị nwa mgbe nta o zuru ike nʼokpuru ndo.”
8 Da sagde Boaz til Rut: "Hør, min Datter! Du skal ikke gå hen og sanke Aks på nogen anden Mark! Nej, gå ikke herfra, men hold dig til mine Piger her;
Ya mere, Boaz gwara Rut okwu sị ya, “Nwa m nwanyị, gee m ntị. Agakwala ịtụtụ ọka nʼubi ọzọ, esitekwala nʼebe a pụọ. Soro ụmụ agbọghọ na-ejere m ozi nọdụ nʼebe a.
9 hold Øje med, hvor de høster på Marken, og gå bag efter. Jeg har pålagt Karlene, at de ikke må fortrædige dig; og bliver du tørstig, kan du gå hen til Karrene og drikke af det, Karlene øser op!"
Lezie anya nʼubi ebe ndị ikom na-ewe ihe ubi, ma soro ụmụ agbọghọ ndị a. Enyela m ndị ikom ndị a iwu ka ha ghara ịmetụ gị aka. Mgbe ọbụla agụụ mmiri gụrụ gị, gaa nʼite mmiri ndị ahụ ndị ikom gbanyere mmiri kuru mmiri ṅụọ.”
10 Da faldt hun på sit Ansigt, bøjede sig til Jorden og sagde til ham: "Hvorledes har jeg fundet Nåde for dine Øjne, så du viser mig Velvilje, skønt jeg er fremmed?"
Mgbe Boaz na-agwa ya okwu, Rut hulatara isi ya ala. Emesịa o kwuru sị, “Gịnị mere m ji chọta ụdị amara dị otu a nʼebe ị nọ, na ị hụtara m, ebe ị maara na m bụ naanị onye mba ọzọ?”
11 Boaz svarede hende: "Man har fortalt mig alt, hvad du har været for din Svigermoder efter din Mands Død, hvorledes du forlod din Fader og din Moder og dit Fædreland for at drage til et Folk, du ikke tidligere kendte;
Boaz zara sị ya, “Anụla m ihe niile i meere nne di gị site nʼoge di gị nwụrụ, na otu i si hapụ nne gị na nna gị, na ala ebe amụrụ gị, bịa nʼebe a ibi nʼetiti ndị ị na-amaghị na mbụ.
12 HERREN gengælde dig, hvad du har gjort, og din Løn blive rigelig fra HERREN, Israels Gud, under hvis Vinger du kom og søgte Ly!"
Ka Onyenwe anyị kwụghachi gị ụgwọ ihe ọma ndị a i mere. Ka Onyenwe anyị onye bụ Chineke Izrel, onye ị gbabara nʼokpuru nku ya izere ndụ kwụghachi gị nkwụghachi dị ukwu nʼihi ezi ọrụ gị niile.”
13 Hun sagde: "Så har jeg da fundet Nåde for dine Øjne, Herre, siden du har trøstet mig og talt venligt til din Trælkvinde, skønt jeg ikke er så meget som en af dine Trælkvinder!"
Rut zara sị ya, “Ka m gaa nʼihu na-achọta amara nʼebe ị nọ, onyenwe m. Nʼihi na ị kasịela m obi, gwakwa m, odibo nwanyị gị, okwu dị nro. Ọ bụ ezie na m abụghị otu nʼime ndị odibo nwanyị gị.”
14 Ved Spisetid sagde Boaz til hende: "Kom herhen og spis med og dyp din Bid i Eddiken!" Så satte hun sig hos Høstfolkene, og han rakte hende så meget ristet Korn, at hun kunde spise sig mæt og endda levne.
Mgbe oge iri nri ruru, Boaz sịrị ya, “Bịa nso nʼebe a, were ụfọdụ nri rie, sunyekwa achịcha gị nʼime mmanya viniga.” Mgbe o soro ndị ahụ na-ewe ihe ubi nọdụ ala iri ihe, o nyere ya ụfọdụ ọka a hụrụ nʼọkụ. O riri, rijuo afọ ma nri e nyere ya fọdụrụ.
15 Da hun rejste sig for at sanke Aks, bød Boaz sine Karle: "Lad hende også sanke mellem Negene og fornærm hende ikke;
Mgbe o biliri ịchịkọtakwa ọka, Boaz nyere ụmụ okorobịa ya iwu, “Hapụnụ ya ka ọ chịkọta ọka ọ bụladị nʼetiti ukwu ọka ndị guzo eguzo, unu agwala ya okwu ihere ọbụla.
16 I kan også trække nogle Aks ud af Knipperne til hende og lade dem ligge, så hun kan sanke dem op, og I må ikke skænde på hende!"
Unu sitekwa nʼukwu ọka mịpụtara ya ụfọdụ tụsara ya nʼala ka ọ tụtụrụ. Unu abarala ya mba.”
17 Så sankede hun Aks på Marken lige til Aften; og da hun tærskede, hvad hun havde sanket, var det omtrent en Efa Byg.
Ya mere, Rut tụtụrụ ọka nʼubi ahụ ruo oge anyasị. Mgbe ọ fuchasịrị ọka balị niile ọ tụtụtara, o nwetara ihe nwere ike iru otu bushel.
18 Derpå tog hun det og gik til Byen, og hendes Svigermoder så, hvad hun havde sanket; og Rut tog og gav hende, hvad hun havde levnet efter at have spist sig mæt.
O buuru ya baa nʼime obodo, bunye ya nne di ya, nyekwa ya nri o rifọrọ mgbe o rijuchara afọ.
19 Da sagde hendes Svigermoder til hende: "Hvor har du sanket Aks i Dag, hvor har du været? Velsignet være han, der viste dig Velvilje!" Så fortalte hun sin Svigermoder, hvem hun havde været hos, og sagde: "Den Mand, jeg var hos i Dag, hedder Boaz!"
Nne di ya jụrụ ya, “Ebee ka ị tụtụrụ ọka taa? Ebee ka ị rụrụ ọrụ? Ka nwoke ahụ hụtara gị bụrụ onye a gọziri agọzi.” Rut kọọrọ nne di ya banyere onye ahụ ọ rụrụ ọrụ na nke ya. Ọ sịrị, “Aha nwoke mụ na ya rụrụ ọrụ bụ Boaz.”
20 Da sagde No'omi til sin Sønnekone: "HERREN, som ikke har unddraget de levende og døde sin Miskundhed, velsigne ham!" Og No'omi sagde fremdeles til hende: "Den Mand er en nær Slægtning af os; han er en af vore Løsere."
Mgbe ahụ Naomi zara nwunye nwa ya sị, “Onye Onyenwe anyị gọziri ka ọ bụ, onye na-ahapụbeghị igosi ebere ya nye ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ. Nwoke a bụ otu nʼime ndị agbụrụ anyị, otu onye nʼime ndị onye mgbapụta anyị.”
21 Moabiterinden Rut sagde: "Han sagde også til mig: Hold dig kun til mine Folk, indtil de er helt færdige med min Høst!"
Mgbe ahụ Rut, onye Moab sịrị, “Ihe ọ sịkwara m bụ, ‘Nọnyere ndị ọrụ m tutu ruo mgbe ha ghọchara ọka niile dị nʼubi m.’”
22 Da sagde No'omi til sin Sønnekone: "Du gør ret, min Datter. i at følge med hans Piger, at man ikke skal volde dig Men på en anden Mark!"
Naomi sịrị Rut, nwunye nwa ya, “Nwa m nwanyị, ọ kaara gị mma ime dịka o kwuru. Soro ụmụ agbọghọ nọ nʼubi ya nʼazụ tụtụọ ọka ị na-atụtụ, nʼihi na nʼubi onye ọzọ, e nwere ike imerụ gị ahụ.”
23 Så holdt hun sig til Boazs Piger og sankede Aks der, indtil Byghøsten og Hvedehøsten var til Ende; og hun blev boende hos sin Svigermoder.
Ya mere, Rut sogidere ụmụ agbọghọ Boaz na-atụtụ ọka, tutu ruo ọgwụgwụ ịghọ ọka balị na wiiti. Ya na nne di ya bigidekwara.

< Rut 2 >