< Aabenbaringen 5 >

1 Og jeg så i hans højre Hånd, som sad på Tronen, en Bog, beskreven indeni og udenpå, forseglet med syv Segl.
Mgbe ahụ, ahụrụ m akwụkwọ e dere ihe ihu na azụ, nke a fụkọrọ afụkọ, kakwasịkwa ya akara asaa, ka ọ dị nʼaka nri onye ahụ nọkwasịrị nʼelu ocheeze ahụ.
2 Og jeg så en vældig Engel, som udråbte med høj Røst: Hvem er værdig til at åbne Bogen og bryde dens Segl?
Ahụkwara m otu mmụọ ozi dị ukwuu, ka ọ na-ekwusa okwu nʼoke olu na-asị, “Ọ bụ onye kwesiri ịnyakapụ akara ndị a ma saghee akwụkwọ ahụ a fụkọrọ afụkọ?”
3 Og ingen i Himmelen, ej heller på Jorden, ej heller under Jorden, formåede at åbne Bogen eller at se i den.
Ma ọ dịghị onye ọbụla pụrụ ịsaghe akwụkwọ ahụ maọbụ ilenye ya anya a hụrụ nʼeluigwe, maọbụ nʼụwa, maọbụ nʼokpuru ụwa.
4 Og jeg græd såre, fordi ingen fandtes værdig til at åbne Bogen eller at se i den.
Akwara m akwa nʼobi ilu nʼihi na ọ dịghị onye ọbụla a hụrụ tozuru oke ịsaghe akwụkwọ ahụ maọbụ ileba anya nʼime ya.
5 Og en af de Ældste sagde til mig: Græd ikke! se, sejret har Løven af Judas Stamme, Davids Rodskud, så han kan åbne Bogen og dens syv Segl.
Mgbe ahụ, otu onye nʼime ndị okenye ahụ gwara m sị, “Akwala akwa. Lee, Ọdụm ebo Juda, bụ mgbọrọgwụ Devid, emeriela. Ọ pụrụ ịnyakapụ akara asaa ahụ ma saghekwaa akwụkwọ ahụ.”
6 Og jeg så, midt imellem Tronen med de fire Væsener og de Ældste stod et Lam, ligesom slagtet: det havde syv Horn og syv Øjne, hvilke ere de syv Guds Ånder, som ere udsendte til hele Jorden.
Mgbe ahụ, ahụrụ m Nwa Atụrụ na-eguzo nʼetiti ocheeze ahụ dịka e gburu ya egbu. Anụ anọ ahụ dị ndụ na ndị okenye ahụ gbara ya gburugburu. O nwekwara mpi asaa na anya asaa, nke bụ mmụọ asaa nke Chineke, ndị e zipụrụ nʼime ụwa niile.
7 Og det kom og tog Bogen af hans højre Hånd, som sad på Tronen.
Ọ gara nʼihu were akwụkwọ ahụ site nʼaka nri onye ahụ na-anọkwasị nʼelu ocheeze ahụ.
8 Og da det tog Bogen, faldt de fire Væsener og de fire og tyve Ældste ned for Lammet, holdende hver sin Harpe og Guldskåle fyldte med Røgelse, som er de helliges Bønner.
Mgbe ọ weere ya, anụ anọ ahụ dị ndụ na iri ndị okenye abụọ na anọ ndị ahụ dara nʼala nʼihu Nwa Atụrụ ahụ. Ha niile nʼotu nʼotu jikwa ụbọ akwara na efere e ji ọlaedo mee, nke ihe jupụtara nʼime ha bụ ụda na-esi isi ụtọ, bụ ekpere ndị nsọ.
9 Og de sang en ny Sang og sagde: Du er værdig til at tage Bogen og åbne dens Segl, fordi du blev slagtet og med dit Blod købte til Gud Mennesker af alle Stammer og Tungemål og Folk og Folkeslag,
Ha na-abụ abụ ọhụrụ na-asị, “I kwesiri ịnara akwụkwọ ahụ na ịnyakapụ akara ya, nʼihi na e gburu gị, ma site nʼọbara gị, ị gbataara Chineke ndị mmadụ, ndị si nʼebo niile, na asụsụ niile, na ndị niile, na mba niile.
10 og du har gjort dem for vor Gud til et Kongerige og til Præster, og de skulle være Konger på Jorden.
Ị chịkọtaala ha, mee ha otu alaeze na ndị nchụaja na-ejere Chineke anyị ozi. Ha ga-achịkwa achị nʼụwa.”
11 Og jeg så, og jeg hørte rundt om Tronen og Væsenerne og de Ældste en Røst af mange Engle, og deres Tal var Titusinder Gange Titusinder, og Tusinder Gange Tusinder,
Mgbe ahụ, elere m anya, hụ ma nụkwa olu nke ọtụtụ ndị mmụọ ozi, nke ọnụọgụgụ ha ruru puku kwụrụ puku, na nde kwụrụ nde. Ha gbara ocheeze ahụ gburugburu, na anụ anọ ahụ dị ndụ na ndị okenye ahụ.
12 og de sagde med høj Røst: Værdigt er Lammet, det slagtede, til at få Kraften og Rigdom og Visdom og Styrke og Ære og Pris og Velsignelse!
Ha na-abụ abụ nʼoke olu na-asị, “O kwesiri bụ Nwa Atụrụ ahụ e gburu egbu ịnara ike na akụnụba na amamihe na ike na nsọpụrụ na otuto na ngọzị.”
13 Og hver Skabning, som er i Himmelen og på Jorden og under Jorden og på Havet, ja, alt, hvad der er i dem, hørte jeg sige: Ham, som sidder på Tronen, og Lammet tilhører Velsignelsen og Æren og Prisen og Magten i Evighedernes Evigheder! (aiōn g165)
Mgbe ahụ, anụrụ m ka ihe niile nọ nʼeluigwe na ndị nọ nʼụwa na ndị nọ nʼokpuru ụwa, na ndị nọ nʼokpuru oke osimiri na-eti mkpu abụ na-asị, “Ka ngọzị, na nsọpụrụ niile, na otuto niile, na ike niile dịrị onye ahụ na-anọkwasị nʼocheeze ahụ, na Nwa Atụrụ ahụ (aiōn g165)
14 Og de fire Væsener sagde: Amen! Og de Ældste faldt ned og tilbade.
Anụ anọ ahụ dị ndụ zakwara sị, “Amen!” Ndị okenye ahụ dakwara nʼala nʼihu ya kpọọ isiala nye ya.

< Aabenbaringen 5 >