< Salme 140 >
1 (Til Sangmesteren. En Salme af David.) Red mig, HERRE, fra onde Mennesker, vær mig et Værn mod Voldsmænd,
Abụ nke dịrị onyeisi abụ. Abụ Ọma Devid. O Onyenwe anyị, dọpụta m site nʼaka ndị na-eme ihe ọjọọ. Chebe m ka m ghara ịdaba nʼaka ndị na-eme ihe ike dị iche iche.
2 der pønser på ondt i Hjertet og daglig ægger til Strid.
Ndị na-atụ atụmatụ ime ihe ọjọọ nʼobi ha na-akpali agha ụbọchị niile.
3 De hvæsser Tungen som Slanger, har Øglegift under deres Læber. (Sela)
Ha na-eme ire ha ka ha dị nkọ dịka nke agwọ; elo ajụala dị nʼegbugbere ọnụ ha. (Sela)
4 Vogt mig, HERRE, for gudløses Hånd, vær mig et Værn mod Voldsmænd, som pønser på at bringe mig til Fald.
Chebe m Onyenwe anyị, ka m ghara ịdaba nʼaka ndị na-emebi iwu; chebe m ka m ghara ịdaba nʼaka ndị na-eme ihe ike, ndị na-eche echiche ọdịda m.
5 Hovmodige lægger Snarer og Strikker for mig, breder et Net for min Fod, lægger Fælder for mig ved Vejen. (Sela)
Ndị mpako esielera m ọnya igbudu; ha agbasaala ụgbụ ha na udo ha, siekwara m ọnya dị iche iche nʼụzọ m na-aga. (Sela)
6 Jeg siger til HERREN: Du er min Gud, HERRE, lyt til min tryglende Røst!
A sịrị m Onyenwe anyị, “Gị onwe gị bụ Chineke m.” Nụrụ, O Onyenwe anyị, olu arịrịọ m maka amara.
7 HERRE, Herre, min Frelses Styrke, du skærmer mit Hoved på Stridens Dag.
Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị Onye nzọpụta m dị ike, ị na-ekpuchi isi m nʼụbọchị agha.
8 Opfyld ej, HERRE, den gudløses Ønsker, lad ikke hans Råd have Fremgang!
Ekwekwala ka ndị ajọ omume chọta ihe ha na-achọ, o Onyenwe anyị, ekwekwala ka nzube ha mezuo. (Sela)
9 Lad dem ikke løfte Hovedet mod mig, lad deres Trusler ramme dem selv!
Ndị niile gbara m gburugburu na-ebuli isi ha elu na nganga ka ndụ ọjọọ nke egbugbere ọnụ ha rikpuo ha.
10 Det regne på dem med gloende Kul, styrt dem i Dybet, ej stå de op!
Ka icheku ọkụ na-ere ere dakwasị ha; ka a tụba ha nʼime ọkụ na-ere ere, nʼime olulu apịtị jupụtara, nke ha na-enweghị ike isite nʼime ya pụta ọzọ.
11 Lad ikke Bagtaleren holde sig i Landet, ondt ramme Voldsmanden Slag i Slag!
Ekwela ka ndị na-ekwu okwu nkwulu guzosie ike nʼala, ka ihe ọjọọ chụda ndị na-eme ihe ike.
12 Jeg ved, at HERREN vil føre de armes Sag og skaffe de fattige Ret.
Amaara m na Onyenwe anyị ga-ekpe ikpe ziri ezi nye ndị ogbenye na-emekwa ka ndị nọ na mkpa nweta ihe ruuru ha.
13 For vist skal retfærdige prise dit Navn, oprigtige bo for dit Åsyn.
Nʼezie, ndị ezi omume ga-eto aha gị, ndị ziri ezi ga-ebikwa nʼihu gị.