< Esajas 9 >
1 Men engang skal der ikke længer være Mørke i det Land, hvor der nu er Trængsel; i Fortiden bragte han Skændsel over Zebulons og Naftalis Land, Men i Fremtiden bringer han Ære over Vejen langs Søen, Landet hinsides Jordan, Hedningernes Kreds.
Ma otu ọbụla o siri dị, oge ahụhụ na ọchịchịrị na iru ụjụ ahụ agaghị adịgide nye ndị ahụ nọ na nkpa. Nʼihi na nʼoge gara aga, o mere ka e lelịa ala Zebụlọn na ala Naftalị anya, ma nʼoge dị nʼihu, ọ ga-eme ka a asọpụrụ Galili nke mba niile, nke dị nʼakụkụ osimiri, nʼofe Jọdan.
2 Det Folk, som vandrer i Mørke, skal skue så stort et Lys; Lys stråler frem over dem, som bor i Mulmets Land.
Ndị nọ na-agagharị nʼọchịchịrị ahụla ìhè dị ukwuu; ndị ahụ bi nʼala nke onyinyo ọnwụ ka ìhè nwukwasịrị.
3 Du gør Fryden mangfoldig, Glæden stor, de glædes for dit Åsyn, som man glædes i Høst, ret som man jubler, når Bytte deles.
I meela ka mba ahụ baa ụba dịrị ukwuu, mee ka ọṅụ ha dịkwa ukwuu, ha na-enwe ọṅụ nʼihu gị, dịka ọṅụ nke ndị ọrụ ubi nʼoge owuwe ihe ubi, dịka ndị agha na-etegharị egwu ọṅụ mgbe ha na-ekesa ihe a kwatara nʼagha.
4 Thi dets tunge Åg og Stokken til dets Ryg, dets Drivers Kæp, har du brudt som på Midjans Dag;
Nʼihi na dịka nʼụbọchị nke Midia, i gbajisiela ibu arọ niile e bokwasịrị ha, ihe mgbochi nke dị nʼubu ha, nke bụ mkpara ndị na-akpagbu ha.
5 ja, hver en Støvle, der tramper i Striden, og Kappen, der søles i Blod, skal brændes og ende som Luernes Rov.
Nʼihi na akpụkpọụkwụ nke ndị agha na-eyi, na uwe agha nke ọbara mechuru, ha ga-abụ ihe a ga-agba ọkụ, ha ga-abụ ihe ndị ga-eme ka ọkụ ree nke ọma.
6 Thi et Barn er født os, en Søn er os givet, på hans Skulder skal Herredømmet hvile; og hans Navn skal være: Underfuld Rådgiver, Vældig Gud, Evigheds Fader, Fredsfyrste.
Nʼihi na amụọrala anyị otu nwa, e nyekwala anyị otu nwa nwoke. Ọ ga-abụkwa onye ga-achị anyị. Ndị a ga-abụ aha ya, Onye Ndụmọdụ dị Ebube, Chineke bụ dike, Nna nke mgbe ebighị ebi, Eze Udo.
7 Stort bliver Herredømmet, endeløs Freden over Davids Trone og over hans Rige, at det må grundes og fæstnes ved Ret og Retfærd fra nu og til evig Tid. Hærskarers HERREs Nidkærhed gør det.
Alaeze ya ga-aba ụba, ọchịchị eze ya ga-abụ nʼọnọdụ udo nke na-enweghị ọgwụgwụ. Ọ bụ nʼocheeze Devid ka ọ ga-anọkwasị, chịakwa nʼalaeze ya. Ọ ga-eme ka alaeze ahụ guzosie ike; ọ bụkwa ikpe ziri ezi na ezi omume ka ọ ga-eji chịa site nʼoge ahụ ruo mgbe ebighị ebi. Ịnụ ọkụ nke Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, ga-emezukwa nke a.
8 Et Ord sender Herren mod Jakob, i Israel slår det ned;
Onyenwe anyị eziela ozi megide Jekọb ọ ga-adakwasịkwa Izrel.
9 alt Folket får det at kende, Efraim og Samarias Borgere. Thi de siger i Hovmod og Hjertets Stolthed:
Ndị ahụ niile ga-amatakwa ya, Ifrem na ndị bi na Sameria ga-amatakwa bụ ndị na-eji nganga na mpako na-ekwu sị,
10 "Teglsten faldt, vi bygger med Kvader, Morbærtræer blev fældet, vi får Cedre i Stedet!"
“Nkume brik ndị ahụ adakpọsịala ma anyị ga-eji nkume a waziri awazi wughachi ha; ọ bụ ezie na e gbutusịala osisi sikamọ niile anyị ji wuo ụlọ anyị, ma anyị ga-eji osisi ọma sida dochie ha.”
11 Da rejser HERREN dets Uvenner mod det og ægger dets Fjender op,
Ma Onyenwe anyị a kpaliela ndị iro Rezin ka ha bilie megide ha, ọ kwaliekwala ndị iro ha.
12 Syrerne forfra, Filisterne bagfra, de æder Israel med opspilet Gab. Men trods alt har hans Vrede ej lagt sig, hans Hånd er fremdeles rakt ud.
Ndị Aram sitere nʼọwụwa anyanwụ, na ndị Filistia sitere nʼọdịda anyanwụ ha e werela ọnụ ghere oghe richapụ Izrel. Ma nʼagbanyeghị ihe ndị a niile, iwe ya alaghachibeghị azụ, aka ya ka setịpụkwara esetipụ.
13 Men til ham, der slår det, vender Folket ej om, de, søger ej Hærskarers HERRE.
Ma ọ bụ ezie na Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ataala ha ahụhụ dị otu a, ndị Izrel echegharibeghị, ha alọghachikwutebeghị ya.
14 Da hugger HERREN Hoved og Hale af Israel, Palme og Siv på en eneste Dag.
Nʼihi ya, nʼotu ụbọchị, Onyenwe anyị ga-ebibi ndịisi Izrel na ndị ọdụdụ, ọ ga-ebibikwa alaka nkwụ na osisi achara niile.
15 Den ældste og agtede er Hoved, Løgnprofeten er Hale.
Ndị okenye na ndị a maara aha ha bụ ndịisi ha, ndị amụma ụgha bụ ọdụdụ ha.
16 De ledende i dette Folk leder vild, og de, der ledes, opsluges.
Nʼihi na ndị ndu nke ndị ya eduhiela ha; ndị na-ezi ha ụzọ emeela ka ha kpafuo.
17 Derfor glædes ej Herren ved dets unge Mænd, har ej Medynk med dets faderløse og Enker. Thi alle er Niddinger og Ugerningsmænd, og hver en Mund taler Dårskab. Men trods alt har hans Vrede ej lagt sig, hans Hånd er fremdeles rakt ud.
Ya mere, Onyenwe anyị agaghị enwe mmasị nʼụmụ okorobịa ahụ, ọ gaghị enwekwa obi ebere nʼebe ụmụ ndị na-enweghị nna maọbụ nʼebe ụmụ nwanyị na-enweghị dị nọ, nʼihi na onye ọbụla nʼime ha adịghị asọpụrụ Chineke, bụrụkwa ndị ajọ omume, ọnụ onye ọbụla na-ekwu ihe nzuzu. Ma nʼagbanyeghị ihe ndị a niile, iwe ya alaghachibeghị azụ, aka ya ka setịpụkwara esetipụ.
18 Thi Gudløshed brænder som Ild, fortærer Torn og Tidsel, sætter Ild på det tætte Krat, så det hvirvler op i Røg.
Nʼezie, ajọ omume na-ere dị ka ọkụ: ọ na-erepịa ogwu na uke, ọ na-emekwa ka oke ọhịa nwuru ọkụ, mee ka anwụrụ ọkụ si na ya rigoruo na mbara eluigwe.
19 Ved Hærskarers HERREs Vrede står Landet i Brand, og Folket bliver som Føde for Ilden; de skåner ikke hverandre.
Nʼihi iwe ahụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ewe, ahụhụ ọ ga-enye ga-adị ka ọkụ na-ere ere; ọ na-erepịa ala ahụ niile na ndị bi nʼime ya; ọ dịkwaghị onye ga-azọpụta ibe ya.
20 Man snapper til højre og hungrer, æder om sig til venstre og mættes dog ej. Hver æder sin Næstes Kød,
Nʼala ahụ niile, ma nʼaka nri ma nʼaka ekpe, onye ọbụla ga-agbalị ịdọtara onwe ya ihe oriri. Ha ga-eri ma afọ agaghị eju ha; nʼezie, ha ga-eri ọ bụladị anụ ahụ ụmụ nke aka ha.
21 Manasse Efraim, Efraim Manasse, og de overfalder Juda sammen. Men trods alt har hans Vrede ej lagt sig, hans Hånd er fremdeles rakt ud.
Ndị Manase ga-alụso ndị Ifrem ọgụ, ndị Ifrem ga-alụsokwa ndị Manase ọgụ. Ha abụọ kwa ga-ejikọta aka lụso Juda ọgụ. Ma nʼagbanyeghị ihe ndị a niile, iwe ya alaghachibeghị azụ. Aka ya ka setịpụkwara esetipụ.