< 1 Mosebog 34 >
1 Da Dina, den Datter, Jakob havde med Lea, engang gik ud for at besøge Landets Døtre,
Ugbu a, Daịna nwa nwanyị Lịa mụụrụ Jekọb pụrụ ileta ndị inyom ala ahụ.
2 så Sikem, en Søn af Egnens Høvding, Hivviten Hamor, hende og greb hende og lå hos hende; og han krænkede hende;
Mgbe Shekem, nwa Hamọ onye Hiv, onye na-achị mpaghara ahụ, hụrụ ya, ọ kpọọrọ ya jiri ike ya na ya dinaa.
3 men hans Hjerte hang ved Jakobs Datter Dina, og han elskede Pigen og talte godt for hende;
Mkpụrụobi ya gara nʼebe Daịna nwa Jekọb, ọ hụrụ nwantakịrị nwanyị ahụ nʼanya, gwakwa ya okwu dị nro.
4 og Sikem sagde til sin Fader Hamor: "Skaf mig den Pige til Hustru!"
Shekem sịrị nna ya bụ Hamọ “Lụtara m nwaagbọghọ a, ka ọ bụrụ nwunye m.”
5 Jakob hørte, at han havde skændet hans Datter Dina; men da hans Sønner dengang var med hans Kvæg på Marken, tav han, til de kom hjem.
Mgbe Jekọb nụrụ na e merụrụ Daịna nwa ya nwanyị, nʼihi na ụmụ ya ndị ikom nọ nʼọhịa ebe ha na-azụ anụ ụlọ, ọ gbara nkịtị na-emeghị ihe ọbụla ruo mgbe ha lọtara.
6 Sikems Fader Hamor gik nu til Jakob for at tale med ham.
Hamọ bụ nna Shekem, pụkwuuru Jekọb ka ha kparịta ụka.
7 Men da Jakobs Sønner hørte det, kom de hjem fra Marken; og Mændene græmmede sig og var såre opbragte, fordi han havde øvet Skændselsdåd i Israel ved at ligge hos Jakobs Datter; thi sligt bør ikke ske.
Ụmụ ndị ikom Jekọb si nʼọhịa na-alọta mgbe ha nụrụ ihe merenụ, iwe na ọnụma juputara ha obi nke ukwuu nʼihi na Shekem mere ihe na-eweta ihere nʼIzrel site nʼidinakwuru ada Jekọb, ihe a na-ekwesighị ime eme.
8 Og Hamor talte med dem og sagde: "Min Søn Sikems Hjerte hænger ved eders Datter; giv ham hende til Hustru
Ma Hamọ sịrị ha, “Nwa m nwoke Shekem hụrụ nwa unu nwanyị nʼanya. Biko, kwerenụ ka ọ lụọ ya.
9 og indgå Svogerskab med os; giv os eders Døtre og gift eder med vore Døtre;
Kwerenụ ka anyị na unu na-alụrịta. Ka anyị na-alụ ụmụ ndị inyom unu, ka unu na-alụkwa ụmụ ndị inyom anyị.
10 tag Ophold hos os, og Landet skal stå eder åbent; slå eder ned og drag frit omkring og saml eder Ejendom der!"
Unu nwere ike biri nʼetiti anyị. Ala a ghere oghe nye unu. Birinụ nʼime ya, na-azụkwanụ ahịa nʼime ya, nwekwanụ akụ nʼime ya nye onwe unu.”
11 Og Sikem sagde til hendes Fader og Brødre: "Måtte jeg finde Nåde for eders Øjne! Alt, hvad I kræver, vil jeg give
Shekem gwara nna na ụmụnne Daịna ndị ikom sị, “Kwerenụ ka m chọta ihuọma nʼebe unu nọ, aga m enyekwa unu ihe ọbụla unu chọrọ ka m nye unu.
12 forlang så høj en Brudesum og Gave, I vil; jeg giver, hvad I kræver, når I blot vil give mig Pigen til Hustru!"
Ihe ọbụla unu sị m kwụọ dịka ego akụ ọlụlụ nwunye, ya na onyinye ọbụla unu si m nye aga m enye unu. Naanị kwerenụ ka nwaagbọghọ a bụrụ nwunye m.”
13 Da gav Jakobs Sønner Sikem og hans Fader Hamor et listigt Svar, fordi. han havde skændet deres Søster Dina,
Ma ụmụ Jekọb jiri aghụghọ zaa Shekem na Hamọ nna ya mgbe ha na-agwa ha okwu, nʼihi na e merụrụ Daịna nwanne ha nwanyị.
14 og sagde til dem: "Vi er ikke i Stand til at give vor Søster til en uomskåren Mand, thi det holder vi for en Skændsel.
Ha sịrị ha, “Anyị enweghị ike ime ihe a, ị kpọrọ nwanne anyị nwanyị kpọnye nwoke a na-ebighị ugwu. Nke a ga-abụrụ anyị ihe ihere.
15 Kun på det Vilkår vil vi føje eder, at I bliver som vi og lader alle af Mandkøn iblandt eder omskære;
Anyị nwere ike ikwenye ka ọ lụọ ya ma ọ bụrụ na unu ga-adị ka anyị, ka e bie ndị nwoke unu niile ugwu.
16 i så Fald vil vi give eder vore Døtre og ægte eders Døtre og bosætte os iblandt eder, så vi bliver eet Folk;
Mgbe ahụ anyị ga-edunye unu ụmụ ndị inyom anyị, ma kpọrọkwa ụmụ ndị inyom unu dịka ndị nwunye anyị. Anyị ga-ebi nʼetiti unu, soro unu bụrụ otu ndị.
17 men hvis I ikke vil høre os og lade eder omskære, så tager vi vor Datter og drager bort"
Ọ bụrụ na unu agaghị ekwe ka e bie unu ugwu, anyị ga-akpọrọ nwanne anyị nwanyị laa.”
18 Deres Tale tyktes Hamor og Sikem, Hamors Søn, god;
Obi tọrọ Hamọ na Shekem nwa ya nwoke ụtọ nʼihi ihe ụmụ ndị ikom Jekọb kwuru.
19 og den unge Mand tøvede ikke med at gøre således, thi han var indtaget i Jakobs Datter, og han var den, der havde mest at sige i sin Faders Hus
Nwokorobịa ahụ bụ onye a na-asọpụrụ karịa onye ọbụla nʼụlọ nna ya egbughị oge ime ihe ha kwuru, nʼihi na ihe banyere nwa nwanyị Jekọb dị ya mma nke ukwuu.
20 og Harnor og hans Søn Siken gik til deres Bys Port og sagde til, Mændene i deres By:
Emesịa, Hamọ na Shekem nwa ya nwoke gara nʼọnụ ụzọ ama nke obodo ha gwa ndị ikom obodo ha okwu, sị.
21 "Disse Mænd er os velsindede; lad dem bosætte sig og drage frit om her i Landet, der er jo Plads nok til dem i Landet; deres Døtre vil vi tage til Hustruer og give dem vore Døtre til Hustruer!
“Ndị ikom ndị a nwere mmasị nʼebe anyị nọ. Kwerenụ ka ha biri nʼala anyị, ka ha na-agagharị kwa nʼime ya. Anyị nwere ala buru ibu nke ga-ezuru anyị na ha. Ha ga-alụ ụmụ nwanyị anyị, anyị ga-alụkwa ndị nke ha.
22 Men kun på det Vilkår vil Mændene føje os og bosætte sig hos os, så vi kan blive eet Folk, at alle af Mandkøn hos os lader sig omskære, således som de er omskårne.
Ma ọ dị otu ihe ha chọrọ ka anyị mee tupu ha ekwere ibi nʼetiti anyị ka anyị na ha bụrụ otu ndị. Ọ bụ ibi ndị ikom anyị niile ugwu dịka e si bie ha ugwu.
23 Deres Hjorde og deres Gods og alt deres Kvæg bliver jo dog vort; lad os derfor føje dem, så de kan blive boende hos os!"
Ọ bụrụ na unu chọrọ ka anụ ụlọ ha niile na akụ ha niile bụrụ nke anyị, ọ dị mma ka anyị kwenyere ha, ka ha binyere anyị.”
24 Så adlød de Hamor og hans Søn Sikem, så mange som færdedes i hans Bys Port, og alle af Mandkøn, alle, som færdedes i hans Bys Port, lod sig omskære.
Ndị ikom niile bịara nʼọnụ ụzọ ama obodo ahụ kwenyere nʼokwu Hamọ na nwa ya nwoke Shekem. E bikwara nwoke ọbụla nọ nʼobodo ahụ ugwu.
25 Men Tredjedagen, da de havde Sårfeber, tog Jakobs to Sønner Simeon og Levi, Dinas Brødre, hver sit Sværd, trængte ind i Byen, uden at nogen anede Uråd, og slog alle Mændene ihjel
O ruo nʼụbọchị nke atọ, mgbe ọnya ugwu ha na-egbu ha mgbu, ụmụ ndị ikom Jekọb abụọ, Simiọn na Livayị, ụmụnne Daịna, jiri mma agha ha pụkwuru ndị bi nʼobodo ahụ na-atụghị anya na ihe dị otu a ga-eme, gbuo ndị ikom niile nọ nʼobodo ahụ.
26 og dræbte Hamor og hans Søn Sikem med Sværdet, tog Dina ud af Sikems Hus og drog bort.
Ha gbukwara Hamọ na Shekem nwa ya nwoke, kpọpụta Daịna site nʼụlọ Shekem, laghachi nʼụlọ ha.
27 Så kastede Jakobs Sønner sig over de faldne og plyndrede Byen, fordi de havde skændet deres Søster;
Mgbe ahụ ụmụ ndị ikom Jekọb niile bịakwasịrị ndị a e gburu egbu, kwakọọ ihe niile dị nʼobodo ahụ niile, nʼihi mmerụ e merụrụ nwanne ha nwanyị.
28 deres Småkvæg, Hornkvæg og Æsler, både hvad der var i Byen og på Markerne, tog de med sig,
Ha kwakọọrọ ngwongwo niile dị nʼobodo ahụ, kpụrụkwa anụ ụlọ niile, igwe ewu na atụrụ, igwe ehi na igwe ịnyịnya ibu niile, na ihe niile dị nʼime obodo ahụ, na ihe niile dị nʼubi ndị ahụ obodo nwere.
29 og al deres Ejendom og alle deres Børn og Kvinder førte de bort som Bytte, og de udplyndrede Byen for alt, hvad der var der.
Akụ ha niile, na ndị inyom ha niile na ụmụntakịrị ha, na ihe niile dị nʼime ụlọ ha, ka ha weere dịka ihe a dọtara nʼagha.
30 Men Jakob sagde til Simeon og Levi: "I styrter mig i Ulykke ved at lægge mig for Had hos Landets Indbyggere, Kana'anæerne og Perizziterne; thi jeg råder kun over få Folk; samler de sig mod mig og slår mig, så er det ude med mig og mit Hus!"
Mgbe Jekọb hụrụ ihe ụmụ ya mere, ọ kpọrọ Simiọn na Livayị sị ha, “Unu ebuterela m nsogbu mee ka m bụrụ ihe na-esi isi ọjọọ nʼetiti ndị Kenan na ndị Periz nwe ala a. Ebe anyị dị ole na ole, ọ bụrụ na ha ejikọta onwe ha ọnụ lụso m agha, ha ga-ekpochapụ mụ na ezinaụlọ m.”
31 Men de svarede: "Skal han behandle vor Søster som en Skøge!"
Ma ha zara sị ya, “O kwesiri ka o meso nwanne anyị nwanyị mmeso dịka ọ bụ akwụna?”