< 1 Korinterne 5 >
1 I det hele taget høres der om Utugt iblandt eder, og det sådan Utugt, som end ikke findes iblandt Hedningerne, at en lever med sin Faders Hustru.
Ọ bụ akụkọ doro anya na-enwe ịkwa iko nʼetiti unu, ụdị nke ndị na-ekweghị ekwe na-apụghị ime, ka unu na-eme. Otu onye nʼime ụlọ unu kpọọrọ nwunye nna ya, ha abụọ e biri.
2 Og I ere opblæste og bleve ikke snarere bedrøvede, for at den, som har gjort denne Gerning, måtte udstødes af eders Midte!
Ma unu na-akpa nganga? Ihe unu kwesiri ime ọ bụghị ịkwa akwa na iru ụjụ, na ime ka onye mere ihe dị otu a si nʼọgbakọ unu pụọ?
3 Thi jeg for min Del, fraværende med Legemet, men nærværende med Ånden, har allerede, som om jeg var nærværende, fældet den Dom over ham, som på sådan, Vis har bedrevet dette,
Ọ bụ ezie na mụ na unu anọghị ugbu a, ma mụ na unu nọkwa nʼime mmụọ. Amaala m rịị onye ahụ ikpe dịka a ga-asị na mụ na unu nọ.
4 at, når i vor Herres Jesu Navn I og min Ånd ere forsamlede, så med vor Herres Jesu Kraft
Eji m aha Onyenwe anyị ma ya ikpe. Mgbe unu zukọrọ, aga m anọnyere unu na mmụọ. Nʼoge ahụ, site nʼike Onyenwe anyị Jisọs,
5 at overgive den pågældende til Satan til Kødets Undergang, for af Ånden kan frelses på den Herres Jesu dag.
werenụ nwoke a nyefee nʼaka ekwensu, ka ọ taa anụ ahụ ya ahụhụ, ka e nwee ike ịzọpụta mmụọ ya, mgbe Onyenwe anyị lọghachiri.
6 Det er ikke noget smukt, I rose eder af! Vide I ikke, at en liden Surdejg syrer hele Dejgen?
Ịnya isi unu ezighị ezi. Ọ bụ unu amaghị na nwantakịrị yiist a gwakọrọ nʼụtụ ọka na-eme ka o koo?
7 Udrenser den gamle Surdejg, for at I kunne være en ny Dejg, ligesom I jo ere usyrede; thi også vort Påskelam er slagtet, nemlig Kristus.
Wepụnụ ihe nʼeko achịcha a nọ nʼetiti unu, ka unu bụrụ ndị dị ọhụrụ, na ndị dị ọcha. Nʼihi na a chụọlarị Kraịst, bụ aja nwa atụrụ, nke Ngabiga anyị.
8 Derfor, lader os holde Højtid, ikke med gammel Surdejg, ej heller med Sletheds og Ondskabs Surdejg, men med Renheds og Sandheds usyrede Brød.
Nʼihi ya ka anyị mee mmemme a na-ejighị ihe na-eko achịcha nke bụ ihe ọjọọ na obi ọjọọ, kama ka anyị jiri achịcha na-ekoghị eko nke bụ obi ọcha na eziokwu.
9 Jeg skrev eder til i mit Brev, at I ikke skulle have Samkvem med utugtige,
E dere m unu nʼime akwụkwọ ozi m, ka unu na ndị na-akwa iko ghara inwe mmekọ ọbụla.
10 ikke i al Almindelighed denne Verdens utugtige eller havesyge og Røvere eller Afgudsdyrkere; ellers måtte I jo gå ud af Verden.
Ọ bụghị ihe gbasara ndị nke ụwa ndị na-akwa iko, maọbụ ndị anya ukwu, na ndị na-apụnara mmadụ ihe, maọbụ ndị na-ekpere arụsị. Ọ bụrụ otu a, ọ pụtara na unu ga-esi nʼụwa pụọ.
11 Men nu skrev jeg til eder, at I ikke skulle have Samkvem, om nogen, der har Navn af Broder, er en utugtig eller en havesyg eller en Afgudsdyrker eller en Skændegæst eller en Dranker eller en Røver, ja, end ikke spise sammen med en sådan.
Ma ugbu a, a na m edere unu ka unu na onye ọbụla nke na-akpọ onwe ya nwanna nwoke maọbụ nwanna nwanyị ghara imekọ ihe, ma ọ bụrụ na ọ na-ebi ndụ ịkwa iko, maọbụ nwee anya ukwu, maọbụ na-ekpere arụsị, onye na-ekwutọ ibe ya, onye na-aṅụbiga mmanya oke, maọbụ onye na-apụnara mmadụ ihe. Unu na ndị dị otu a erikọla nri.
12 Thi hvad kommer det mig ved at dømme dem, som ere udenfor? Dømme I ikke dem, som ere indenfor?
Kedụ nke gbasara m ikpe ndị na-esoghị na chọọchị ikpe? Ọ bụghị ndị nọ nʼime ka unu ga-ekpe ikpe.
13 Men dem udenfor skal Gud dømme. Bortskaffer den onde fra eder selv!
Chineke ga-ekpe ndị nọ nʼezi ikpe. “Chụpụnụ onye ajọọ mmadụ ahụ site nʼetiti unu.”