< Aabenbaringen 7 >
1 Og derefter saa jeg fire Engle staa paa Jordens fire Hjørner; de holdt Jordens fire Vinde, for at ingen Vind skulde blæse over Jorden, ej heller over Havet, ej heller over noget Træ.
Mgbe ihe ndị a gasịrị, ahụrụ m ndị mmụọ ozi anọ ka ha guzo nʼakụkụ anọ nke ụwa. Ha na-egbochikwa ka ifufe ọbụla ghara ife nʼelu ala, na nʼelu osimiri, na nʼelu osisi.
2 Og jeg saa en anden Engel stige op fra Solens Opgang med den levende Guds Segl; og han raabte med høj Røst til de fire Engle, hvem det var givet at skade Jorden og Havet, og sagde:
Mgbe ahụ, ahụkwara m mmụọ ozi ọzọ ka o si nʼọwụwa anyanwụ na-apụta, akara Chineke dị ndụ dịkwa nʼaka ya. O tikuru ndị mmụọ ozi anọ ahụ mkpu, bụ ndị ahụ e nyere ike imekpa ụwa ahụ, ya na oke osimiri,
3 Skader ikke Jorden, ej heller Havet, ej heller Træerne, førend vi have beseglet vor Guds Tjenere paa deres Pander.
na-asị, “Unu emebila ụwa maọbụ oke osimiri maọbụ osisi ọbụla tutu ruo mgbe anyị kachara ndị ohu niile nke Chineke anyị akara nʼegedege ihu ha.”
4 Og jeg hørte Tallet paa de beseglede, hundrede og fire og fyrretyve Tusinde beseglede af alle Israels Børns Stammer:
Mgbe ahụ anụrụ m ọnụọgụgụ ndị a kara akara ahụ, ha dị narị puku mmadụ, na iri puku mmadụ anọ na anọ, bụ ndị sitere nʼebo niile nke Izrel.
5 Af Judas Stamme tolv Tusinde beseglede, af Rubens Stamme tolv Tusinde, af Gads Stamme tolv Tusinde,
Ndị a kara akara site nʼebo Juda dị puku mmadụ iri na abụọ. Ndị si nʼebo Ruben dịkwa puku mmadụ iri na abụọ. Ndị si nʼebo Gad dị puku mmadụ iri na abụọ.
6 af Asers Stamme tolv Tusinde, af Nafthalis Stamme tolv Tusinde, af Manasses Stamme tolv Tusinde,
E sitere nʼebo Asha họpụta puku mmadụ iri na abụọ. Ndị sitekwara nʼebo Naftalị dị puku mmadụ iri na abụọ. E sitere nʼebo Manase họpụta puku mmadụ iri na abụọ.
7 af Simeons Stamme tolv Tusinde, af Levis Stamme tolv Tusinde, af Isaskars Stamme tolv Tusinde,
Ndị si nʼebo Simiọn dị puku mmadụ iri na abụọ. Ndị sitere nʼebo Livayị dị puku mmadụ iri na abụọ. Ndị si nʼebo Isaka dị puku mmadụ iri na abụọ.
8 af Sebulons Stamme tolv Tusinde, af Josefs Stamme tolv Tusinde og af Benjamins Stamme tolv Tusinde beseglede.
E sitere nʼebo Zebụlọn họpụta puku mmadụ iri na abụọ. Ndị si nʼebo Josef dị puku mmadụ iri na abụọ. Ndị sikwa nʼebo Benjamin dị puku mmadụ iri na abụọ.
9 Derefter saa jeg, og se en stor Skare, som ingen kunde tælle, af alle Folkeslag og Stammer og Folk og Tungemaal, som stod for Tronen og for Lammet, iførte lange hvide Klæder og med Palmegrene i deres Hænder;
Mgbe ihe ndị a gasịrị, ahụrụ m oke igwe mmadụ, ndị dị ọtụtụ nʼọnụọgụgụ nke onye ọbụla na-apụghị ịgụta ọnụ. Ha sitere na mba dị iche iche na ebo dị iche iche na ndị niile na asụsụ dị iche iche, na-eguzo nʼihu ocheeze ahụ na nʼihu Nwa Atụrụ ahụ. Ha yikwasịrị onwe ha uwe ọcha, jirikwa igu nkwụ nʼaka ha.
10 og de raabte med høj Røst og sagde: Frelsen tilhører vor Gud, som sidder paa Tronen, og Lammet!
Ma ha ji oke olu na-eti mkpu na-asị, “Nzọpụta dịrị Chineke anyị, onye na-anọkwasị nʼocheeze ahụ, dịkwara Nwa atụrụ ahụ.”
11 Og alle Englene stode rundt om Tronen og om de Ældste og om de fire Væsener og faldt ned for Tronen paa deres Ansigt og tilbade Gud og sagde:
Ndị mmụọ ozi niile ahụ guzoro ocheeze ahụ gburugburu, ha na ndị okenye ahụ na anụ anọ ahụ dị ndụ. Ha dara, kpuo ihu ha nʼala nʼihu ocheeze ahụ feekwa Chineke ofufe,
12 Amen! Velsignelsen og Prisen og Visdommen og Taksigelsen og Æren og Kraften og Styrken tilhører vor Gud i Evighedernes Evigheder! Amen. (aiōn )
na-asị, “Amen! Ngọzị niile na otuto niile, na amamihe niile na ekele niile na nsọpụrụ niile na ike niile na ume niile, dịrị Chineke anyị ruo mgbe niile ebighị ebi. Amen.” (aiōn )
13 Og en af de Ældste tog til Orde og sagde til mig: Disse, som ere iførte de lange hvide Klæder, hvem ere de? og hvorfra ere de komne?
Mgbe ahụ, otu nʼime ndị okenye ahụ zara m sị, “Ị maara ndị ahụ, ndị a e gbokwasịrị uwe ọcha ahụ, ebee ka ha siri pụta?”
14 Og jeg sagde til ham: Min Herre! du ved det. Og han sagde til mig: Det er dem, som komme ud af den store Trængsel, og de have tvættet deres Klæder og gjort dem hvide i Lammets Blod.
Asịrị m, “Onyenwe m, ọ bụ gị maara.” Ọ sịrị m, “Ndị a bụ ndị sitere nʼime oke mkpagbu ahụ pụta. Ha bụ ndị sachara uwe ha, mee ha ka ha dịrị ọcha site nʼọbara Nwa Atụrụ ahụ.
15 Derfor ere de foran Guds Trone og tjene ham Dag og Nat i hans Tempel; og han, som sidder paa Tronen, skal opslaa sit Telt over dem.
Ọ bụ nke a mere, “ha ji guzoro nʼihu ocheeze Chineke na-efe ya ofufe ehihie na abalị nʼime ụlọnsọ ya. Onye ahụ na-anọkwasị nʼelu ocheeze ahụ ga-ekpuchikwa ha.
16 De skulle ikke hungre mere, ej heller tørste mere, ej heller skal Solen eller nogen Hede falde paa dem.
‘Agụụ agaghị agụkwa ha ọzọ. Akpịrị agaghị akpọkwa ha nkụ mgbe ọbụla. Anyanwụ agaghị achakwa ha ọzọ,’ okpomọkụ ọbụla agaghị erute ebe ha nọ.
17 Thi Lammet, som er midt for Tronen, skal vogte dem og lede dem til Livets Vandkilder; og Gud skal aftørre hver Taare af deres Øjne.
Nʼihi na Nwa Atụrụ ahụ nke nọ nʼetiti ocheeze ahụ ga-abụ onye ọzụzụ atụrụ ha; ‘ọ ga-edurukwa ha jee nʼisi mmiri nke ndụ ahụ.’ ‘Chineke ga-ehichapụkwa anya mmiri ọbụla site nʼanya ha.’”