< Aabenbaringen 2 >

1 Skriv til Menighedens Engel i Efesus: Dette siger han, som holder de syv Stjerner i sin højre Haand, han, som vandrer midt imellem de syv Guldlysestager:
“Dee akwụkwọ nye mmụọ ozi ụlọ nzukọ dị nʼEfesọs, sị ya: Ihe ndị a bụ okwu si nʼọnụ onye ahụ na-ejide kpakpando asaa nʼaka ya, ma na-ejegharịkwa nʼetiti ihe ịdọba oriọna ọlaedo asaa ndị ahụ.
2 Jeg kender dine Gerninger og dit Arbejde og din Udholdenhed og at du ikke kan fordrage de onde; og du prøvede dem, som kalde sig selv Apostle og ikke ere det, og du har fundet, at de ere Løgnere;
Amaara m ihe niile banyere ọrụ gị niile. Ahụkwala m ịrụsị ọrụ ike gị na ntachiobi gị. Amaara m na ị dịghị anagide ndị ajọ omume, na ị nwaleela ndị ahụ niile na-akpọ onwe ha ndị ozi, ma ha abụghị ndị ozi nʼezie, chọpụtakwa na ha bụ ndị ụgha.
3 og du har Udholdenhed, og du har døjet ondt for mit Navns Skyld og er ikke bleven træt.
I jirila ntachiobi nagide nhụju anya nʼihi aha m, ma ike agwụghị gị.
4 Men jeg har det imod dig, at du har forladt din første Kærlighed.
Ma enwere m ihe ndị a megide gị. Ị hapụla ịhụnanya mbụ ahụ i nwere.
5 Kom derfor i Hu, hvorfra du er falden, og omvend dig, og gør de forrige Gerninger; men hvis ikke, da kommer jeg over dig, og jeg vil flytte din Lysestage fra dens Sted, hvis du ikke omvender dig.
Cheta ọnọdụ i si na ya daa. Chegharịa, mekwa ihe ndị ahụ ị na-eme na mbụ. Ọ bụrụ na i meghị otu a, aga m abịa wepụ ihe ịdọba oriọna gị site nʼọnọdụ ya.
6 Dog, dette har du, at du hader Nikolaiternes Gerninger, som ogsaa jeg hader.
Ọ bụladị otu a, o nwere ihe ụfọdụ dị mma banyere gị. Ị kpọrọ ọrụ ọjọọ nke ndị Nikolaitan asị, dịka mụ onwe m si kpọọ ya asị.
7 Den, som har Øre, høre, hvad Aanden siger til Menighederne! Den, som sejrer, ham vil jeg give at æde af Livets Træ, som er i Guds Paradis.
Onye ọbụla nwere ntị, ya nụrụ ihe Mmụọ Nsọ na-agwa nzukọ. Onye ahụ na-emeri emeri ka m ga-enye ike iri mkpụrụ sitere nʼosisi ndụ ahụ nke dị na paradaịs nke Chineke.
8 Og skriv til Menighedens Engel i Smyrna: Dette siger den første og den sidste, han, som var død og blev levende:
“Dee akwụkwọ nye mmụọ ozi ụlọ nzukọ dị na Smyrna, sị ya: Ihe ndị a bụ okwu ahụ bụ Mmalite na Ọgwụgwụ ihe niile. Onye nwụrụ anwụ ma dịkwa ndụ ọzọ.
9 Jeg kender din Trængsel og din Fattigdom (dog, du er rig), og Bespottelsen fra dem, som kalde sig selv Jøder og ikke ere det, men ere Satans Synagoge.
Amaara m mkpagbu gị niile na ịda ogbenye gị. Ma nʼezie, ị bụ ọgaranya. Amaara m ihe banyere nkwutọ niile ndị ahụ na-akpọ onwe ha ndị Juu na-ekwutọ gị, ma ha abụghị ndị Juu, nʼezie ha bụ ụlọ nzukọ ekwensu.
10 Frygt ikke, for hvad du vil komme til at lide! Se, Djævelen vil kaste nogle af eder i Fængsel, for at I skulle fristes, og I skulle have Trængsel i ti Dage. Vær tro indtil Døden, saa vil jeg give dig Livets Krone.
Atụkwala egwu nʼihi ihe ahụ gaje ịbịakwasị gị. Nʼihi na ekwensu nʼonwe ya gaje ime ka a tụba ụfọdụ nʼime ndị gị nʼụlọ mkpọrọ, ka o jiri ya nwalee gị. A ga-akpagbu unu abalị iri. Ma gosi onwe gị onye kwesiri ntụkwasị obi, ọ bụladị ruo mgbe ọnwụ ga-abịakwasị gị. Emesịa, a ga m enye gị okpueze ahụ, bụ ndụ.
11 Den, som har Øre, høre, hvad Aanden siger til Menighederne! Den, som sejrer, skal ingenlunde skades af den anden Død.
Onye ọbụla nwere ntị ya nụrụ ihe Mmụọ Nsọ na-agwa nzukọ niile. Onye ọbụla na-emeri emeri, ọnwụ nke ugboro abụọ agaghị emekpa ya ahụ.
12 Og skriv til Menighedens Engel i Pergamus: Dette siger han, som har det tveæggede, skarpe Sværd:
“Dee akwụkwọ nye mmụọ ozi ụlọ nzukọ dị Pegamọm, sị ya: Ndị a bụ okwu si nʼọnụ onye ahụ ji mma agha ahụ dị nkọ nke nwere ihu abụọ nʼaka ya.
13 Jeg ved, hvor du bor, der, hvor Satans Trone er; og du holder fast ved mit Navn og fornægtede ikke min Tro, i Antipas's, mit tro Vidnes Dage, han, som blev ihjelslaaet hos eder, der, hvor Satan bor.
Amaara m ebe i bi, bụ obodo ebe ekwensu nwere ocheeze ya. Ma ị na-anọgidesi ike nʼaha m. Ị jụrụ ịgọnarị okwukwe gị nʼime m, ọ bụladị nʼoge Antipas onyeama m kwesiri ntụkwasị obi, bụ onye e gburu nʼobodo unu, ebe ekwensu bi.
14 Men jeg har noget lidet imod dig, at du har nogle hos dig, som holde fast ved Bileams Lære, der lærte Balak at sætte Snare for Israels Børn, for at de skulde spise Afgudsofferkød og bedrive Utugt.
Ma enwere m ihe ole ma ole megide gị. I nwere ụfọdụ mmadụ ebe ahụ, ndị jidesiri nkuzi Belam ike, bụ onye kuziiri Balak ka o raa ụmụ Izrel ụra nke mere ka ha mehie, rie ihe a chụrụ nʼaja nye arụsị, kwaakwa iko.
15 Saaledes har ogsaa du dem, som holde fast ved Nikolaiternes Lære paa lignende Vis.
Nʼotu aka ahụ, i nwekwara ụfọdụ mmadụ ndị jidesiri nkuzi Nikolaitan ike.
16 Omvend dig! Men hvis ikke, kommer jeg snart over dig og vil stride imod dem med min Munds Sværd.
Ya mere, chegharịa! Ma ọ bụghị otu a, aga m abịakwute gị ọsịịsọ jiri mma agha dị m nʼọnụ buso ha agha.
17 Den, som har Øre, høre, hvad Aanden siger til Menighederne! Den, som sejrer, ham vil jeg give af den skjulte Manna, og jeg vil give ham en hvid Sten og paa Stenen et nyt Navn skrevet, som ingen kender, uden den, der faar det.
Onye ọbụla nwere ntị, ya nụrụ ihe Mmụọ Nsọ na-agwa nzukọ niile. Ọ bụ naanị onye na-emeri emeri ka m ga-enye ụfọdụ nʼime achịcha mánà ahụ e zoro ezo. Aga m enyekwa onye ahụ ezi nkume ọcha ahụ, nke edekwasịrị aha ọhụrụ nʼelu ya, nke onye ọbụla ọzọ na-agaghị amata, karịa onye ahụ natara ya.
18 Og skriv til Menighedens Engel i Thyatira: Dette siger Guds Søn, der har Øjne som Ildslue, og hvis Fødder ere som skinnende Malm:
“Dee akwụkwọ nye mmụọ ozi ụlọ nzukọ dị na Tiatira, sị ya: Ndị a bụ okwu sitere nʼaka Ọkpara Chineke, onye anya ya na-enwuba nʼebe niile dị ka ire ọkụ. Ụkwụ ya kwa na-egbu maramara dị ka bronz a nụchara nke ọma.
19 Jeg kender dine Gerninger og din Kærlighed og Tro og Tjeneste og Udholdenhed, ja, dine Gerninger, de sidste flere end de første.
Amaara m ọrụ gị niile, na ịhụnanya gị, na okwukwe gị. Amakwaara m ije ozi gị na ntachiobi gị, na-ahụkwa na ị na-arụ ọrụ ugbu a karịa ka i mere na mbụ.
20 Men jeg har imod dig, at du finder dig i Kvinden Jesabel, som kalder sig selv en Profetinde og lærer og forfører mine Tjenere til at bedrive Utugt og spise Afgudsofferkød.
Ma enwere m ihe ndị a megide gị. Ị na-anabata nwanyị ahụ a na-akpọ Jezebel, onye na-ekwupụta na ya bụ onye amụma nwanyịnye ya ohere ka o were nkuzi asị na-eduhie ndị ohu m ụzọ, ka ha kwaa iko, riekwa ihe e ji chụọrọ arụsị aja.
21 Og jeg har givet hende Tid til at omvende sig, men hun vil ikke omvende sig fra sin Utugt.
Enyela m ya ohere ka o si na mmehie ya chegharịa, ma ọ jụrụ ichegharị site na ndụ ịkwa iko.
22 Se, jeg kaster hende paa Sygelejet og hendes Bolere i stor Trængsel, dersom de ikke omvende sig fra deres Gerninger.
Lee, aga m etinye ya nʼute ahụhụ, meekwa ka ndị ya na ha na-akwa iko taa ahụhụ dị ukwuu. Ọ bụ naanị ma ha chegharịrị ka ihe ndị a na-agaghị abịakwasị ha.
23 Og hendes Børn vil jeg slaa med Død, og alle Menighederne skulle kende, at jeg er den, som ransager Nyrer og Hjerter; og jeg vil give eder, hver efter eders Gerninger.
Ma nʼebe ụmụ ya nọ, aga m etigbu ha ka ha nwụọ. Nzukọ niile ga-amata na abụ m onye na-enyocha mmụọ na mkpụrụobi niile. Aga m akwụghachikwa onye ọbụla nʼime unu ụgwọ ọrụ kwesiri ọrụ ya.
24 Men til eder, de øvrige, som ere i Thyatira, saa mange som ikke have denne Lære, fordi de ikke kende Satans Dybder, som de kalde det, til eder siger jeg: Jeg lægger ingen anden Byrde paa eder.
Ugbu a, ana m agwa unu ndị fọdụrụ na Tiatira, unu ndị na-agbasoghị ozizi ya, ndị na-amụtabekwaghị ihe ndị ahụ ekwensu kpọrọ ihe nzuzo dị omimi, ‘O nweghị ibu arọ ọzọ m ga-ebokwasị unu,
25 Kun skulle I holde fast ved det, I have, indtil jeg kommer.
ma ọ bụghị, unu jidesienụ ihe unu nwere aka ike tutu ruo mgbe m ga-abịa.’
26 Og den, som sejrer, og som indtil Enden tager Vare paa mine Gerninger, ham vil jeg give Magt over Hedningerne;
Ma onye ọbụla na-emeri emeri, na-anọgidekwa na-eme uche m ruo ọgwụgwụ ihe niile, ka m ga-enye ikike nʼebe mba niile nọ.
27 og med en Jernstav skal han vogte dem, ligesom Lerkar sønderknuses, ligesom ogsaa jeg har modtaget det af min Fader;
Onye ahụ, ‘ga-eji mkpara igwe chịa ha, dịka mgbe a kụwachara ite aja na mpekele na mpekele.’Ọ bụladị ka Nna m si nye m ike,
28 og jeg vil give ham Morgenstjernen.
a ga-enye onye nke meririnụ kpakpando ụtụtụ.
29 Den, som har Øre, høre, hvad Aanden siger til Menighederne!
Onye ọbụla nwere ntị, ya nụrụ ihe Mmụọ Nsọ na-agwa nzukọ niile.

< Aabenbaringen 2 >