< Ordsprogene 29 >
1 Hvo Nakken gør stiv, skønt revset tit, han knuses brat uden Lægedom.
Onye a na-abara mba mgbe niile ma ọ naghị anata ndụmọdụ, nʼotu ntabi anya ka a ga-etipịa ya, ọ gaghị ekulikwa ọzọ.
2 Er der mange retfærdige, glædes Folket, men raader de gudløse, sukker Folket.
Mgbe ndị ezi omume nọ nʼọchịchị, ndị a na-achị na-aṅụrị ọṅụ, ma ha na-asụ ude mgbe onye ajọ omume na-achị.
3 Hvo Visdom elsker, glæder sin Fader, hvo Skøger omgaas, bortødsler Gods.
Nwoke hụrụ amamihe nʼanya na-eme ka nna ṅụrịa, ma onye bụ enyi ụmụ nwanyị akwụna, na-ala akụnụba ya nʼiyi.
4 Kongen grundfæster Landet med Ret, en Udsuger lægger det øde.
Eze na-achị nʼeziokwu na-ewetara obodo ya ọganihu, ma nke na-achọ ngarị na-ala ya nʼiyi.
5 Mand, der smigrer sin Næste, breder et Net for hans Fod.
Onye ahụ ji ire ụtọ na-aja onye agbataobi ya mma bụ ọnya ka ọ na-esiri ya.
6 I sin Brøde hildes den onde, den retfærdige jubler af Glæde.
Ọ bụ onye ajọ omume siri ọnya ka ọnya ahụ na-ama. Ma ndị ezi omume na-anọrọ onwe ha na-agụ egwu ọṅụ.
7 Den retfærdige kender de ringes Retssag; den gudløse skønner intet.
Onye ezi omume na-etinye anya nʼihe banyere ikpe ziri ezi nke ndị ogbenye, ma ụdị echiche ahụ adịghị abata ndị ajọ omume nʼobi.
8 Spottere ophidser Byen, men Vismænd, de stiller Vrede.
Ndị nzuzu na-amalite ọgụ ebe niile, ma ndị nwere uche na-agbalịsị ike ime ka udo dị.
9 Gaar Vismand i Rette med Daare, vredes og ler han, alt preller af.
Ọ bụrụ na onye maara ihe esoro onye nzuzu gaa nʼụlọikpe, onye nzuzu ga-ewe iwe ọkụ, mee mkpọtụ, kwaa emo ma udo agaghị adị.
10 De blodtørstige hader lydefri Mand, de retsindige tager sig af ham.
Ndị ndụ ha na-ebi bụ ime ihe ike na-akpọ onye eziokwu asị, ha na-achọsikwa ike ụzọ ha ga-esi gbuo onye ndụ ya ziri ezi.
11 En Taabe slipper al sin Voldsomhed løs, Vismand stiller den omsider.
Onye nzuzu na-egosi oke iwe ya, ma onye nwere uche na-ejide onwe ya na-emekwa ka mmụọ ya dajụọ.
12 En Fyrste, som lytter til Løgnetale, faar lutter gudløse Tjenere.
Ọ bụrụ na onye na-achị achị aṅaa ntị nʼokwu ụgha, ndị niile na-ejere ya ozi ga-aghọ ndị ajọ omume.
13 Fattigmand og Blodsuger mødes, HERREN giver begges Øjne Glans.
Ogbenye na ọgaranya bụ otu na nke a: ọ bụ Onyenwe anyị na-eme ka ha jiri anya ha na-ahụ ụzọ.
14 En Konge, der dømmer de ringe med Ret, hans Trone staar fast evindelig.
Ọ bụrụ na eze esite nʼizi ezi kpee ndị ogbenye ikpe, a ga-eme ka ocheeze ya guzosie ike ruo mgbe ebighị ebi.
15 Ris og Revselse, det giver Visdom, uvorn Dreng gør sin Moder Skam.
Ịba mba na iti nwantakịrị ihe na-enye aka mee ka ọ bụrụ ezi nwa, ma nwantakịrị a na-adịghị adụ ọdụ na-eme nne ya ihe ihere.
16 Bliver mange gudløse, tiltager Synd; retfærdige ser med Fryd deres Fald.
Mgbe ndị na-emebi iwu na-aga nʼihu, njehie na-aba ụba nʼetiti ndị a na-achị achị, ma ndị ezi omume ga-eguzo hụ ọdịda ha.
17 Tugt din Søn, saa kvæger han dig og bringer din Sjæl, hvad der smager.
Dọọ nwa gị aka na ntị, ndụ ya ga-enye obi gị udo na ọṅụ. Ọ gaghị emekwa ka ihere mee gị.
18 Uden Syner forvildes et Folk; salig den, der vogter paa Loven.
Obodo na-adịghị atụ egwu Chineke bụ obodo na-adịghị agazi nʼusoro, ma ọṅụ na-adịrị obodo ahụ na-edebe ihe Onyenwe anyị nyere nʼiwu.
19 Med Ord lader Træl sig ikke tugte, han fatter dem vel, men adlyder ikke.
Ọ bụghị naanị okwu ọnụ ka e ji adọ ndị na-eje ozi aka na ntị, nʼihi na ha nwere ike ghọta ma ha ga-ajụ ime ihe ị chọrọ.
20 Ser du en Mand, der er hastig til Tale, for en Taabe er der snarere Haab end for ham.
Olileanya dịrị onye nzuzu karịa onye ahụ na-adịghị echezi echiche tupu o kwuo okwu.
21 Forvænner man sin Træl fra ung, vil han til sidst være Herre.
Ị malite na mbụ na-emezi onye na-ejere gị ozi, ọ ga-emesịa chọọ ka i meere ya dịka nwa gị.
22 Hidsig Mand vækker Strid, vredladen Mand gør megen Synd.
Onye na-ewe iwe na-akpali ọgụ, onye na-ewe iwe ọkụ na-eme ọtụtụ mmehie.
23 Et Menneskes Hovmod ydmyger ham, den ydmyge opnaar Ære.
Nganga mmadụ na-eme ka ọ daa, ma mmadụ ahụ dị umeala nʼobi ga-eweta nsọpụrụ.
24 Hæleren hader sit Liv, han hører Forbandelsen, men melder intet.
Ndị ọbụla na-enyere ndị ohi aka bụ ndị iro nke ndụ ha, a na-edu ha nʼịṅụ iyi, ma ha adịghị agba akaebe.
25 Frygt for Mennesker leder i Snare, men den, der stoler paa HERREN, er bjærget.
Ịtụ egwu mmadụ bụ ihe ịma nʼọnya, ma onye ọbụla na-atụkwasị Onyenwe anyị obi na-anọ nʼudo.
26 Mange søger en Fyrstes Gunst; Mands Ret er dog fra HERREN.
Ị chọrọ ikpe ziri ezi? Elela onye ikpe anya nʼihu, kama gwa Onyenwe anyị maka ya.
27 Urettens Mand er retfærdiges Gru, hvo redeligt vandrer, gudløses Gru.
Onye ezi omume na-akpọ ajọ omume asị; ndị na-emebi iwu na-akpọ onye ndụ ya ziri ezi asị.